Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 4/1 p. 23
  • Ịnakwere Ozi Ọma ahụ na Belgium

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịnakwere Ozi Ọma ahụ na Belgium
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Site n’Ịda Mbà n’Obi Gaa n’Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • ‘Site n’Ọnụ Ụmụ Ọhụrụ’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 4/1 p. 23

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Ịnakwere Ozi Ọma ahụ na Belgium

“ÒNYE hụworo ihe yiri ihe ndị a?” ka alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Belgium na-ekwu. (Tụlee Aịsaịa 66:8.) Mba nke a mara mma nyere akụkọ ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 24,464 ndị nkwusa maka afọ ije ozi 1989. E nwekwara mmụba 4 pasenti ná nkezi ọnụ ọgụgụ ndị keere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ kwa ọnwa.

◻ Otu onye ụkọchukwu Katọlik kwenyere n’ozi ọma Ndịàmà Jehova na-akpọsa, bụ́ onye gwara ndị bịara chọọchị ya n’otu Mass e doro n’ụbọchị Sunday, si: “Ọ bụrụ na Ndịàmà Jehova abịa n’ụIọ gị, nabata ha nke ọma. Ihe ha ji bịa bụ eziokwu!” Nke a bụ kpọmkwem ihe otu nwanyị mere. Mgbe Ndịàmà ahụ bịara, ọ nabatara ha nke ọma wee nara akwụkwọ ahụ bụ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation? Mgbe e mesịrị, ọ rịọrọ ka e wetara ya akwụkwọ ahụ bụ I Puru Idi Ndu Ebighi Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. A maliteere ya ọmụmụ Bible, ma di ya esonyereghị ya. Ya mere, otu nwanna nwoke kpọrọ ya na telifonu wee jụọ ma ọ̀ ga-amasị ya iso nwunye ya biri n’ime ụwa nke ka mma? Dị ka ihe si na nke a pụta, o sonyere n’ọmụmụ ihe ahụ. Ha abụọ na-ebikọbu n’alụghị di na nwunye n’ụzọ iwu kwadoro, ma ha debaziri njikọ ha n’akwụkwọ iwu, e wee mee ha baptism n’oge na-adịghi anya.

◻ Eziokwu ahụ gbanwere ndụ nke otu nwa agbọghọ. Mgbe ọ na-agbarubeghị 14 afọ, a gbahapụrụ nanị ya. O zutere otu nwa okoro, ha abụọ bikọkwara ọnụ dị ka ndị punk, na-aṅụ ọgwụ ọjọọ, na-egosipụtakwa mmụọ nke ime ihe ike. E mesịa, nwa okoro ahụ nwụrụ n’otu ihe ọghọm okporo ụzọ. Nke a mere ka nwa agbọghọ ahụ nwee obi ịda mbà dị ukwuu, o wee malite iche echiche igbu onwe ya. ‘Olee ebe m pụrụ ịchọta ngwọta nye nsogbu m nile?’ ka o chere n’echiche. O zutere otu onye ya na ndị mmụọ ọjọọ na-enwe mmekọ, bụ́ onye mere ka o kwere na ọ pụrụ ịgwa enyi ya nwoke ahụ nwụrụ anwụ okwu. Ha tinyetụrụ aka n’iji ike ndị mmụọ ekegide mmadụ na ịnwa ịhụta ihe karịrị mmadụ efu. N’enwetaghị ntụsara ahụ ahụ a tụrụ anya ya, nwa agbọghọ ahụ dabaghachiri n’oké obi ịda mbà. Ruo ọtụtụ ọnwa ọ nọpụrụ iche nanị onwe ya. Mgbe ahụ, otu n’ime Ndịàmà Jehova zutere ya wee gbalịa inyere ya aka n’ụzọ ime mmụọ. Ruo nwa mgbe, o si ná nderịta akwụkwọ ozi na-eme nke a, mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ọnọdụ dịtụrụ mma karị n’ihi mgbalị dị ukwuu na obi ike o tinyere. Ugbu a, a tọhapụwo ya site n’ike ndị mmụọ ọjọọ, site n’àgwà nke ise ụtaba, sitekwa ná mmetụta dị omimi nke ikpe ọmụma. Ka oge na-aga, inwetakwu ihe ọmụma Bible na mmụọ Jehova nyeere ya aka nke ukwuu. Ọzọkwa, nzukọ ndị ahụ wusirị ya ike, ebe ọ bụ na ọ na-etinye uchu n’ịkwadebe maka ha. Ugbu a, ọ bụ onye meworo baptism, nweekwụ mmụọ ọsụ ụzọ. Ọ maliteworị iduzi ọtụtụ ọmụmụ Bible, nke otu n’ime ha bụ nke ọ na-eduziri nne ya, onye na-abịakwa nzukọ ụfọdụ ugbu a. N’eziokwu, Jehova enyeworo ya aka!

◻ Ndị na-eji ohere ndị dapụtara n’ulọ akwukwọ eme ihe na-enwe ezi ihe ịga nke ọma n’ịgbasa ozi ọma ahụ. E nyere otu nwanna bụ nwa agbọghọ nọ n’ụlọ akwukwọ na Belgium ihe omume nke ikwu okwu n’isiokwu ọ bula ọ họọrọ, O wee kpebie ikwu okwu banyere Ndịàmà Jehova na ihe ndị ha kweere na ha, na-eme ka okwu ya dabere n’akwukwọ nta ahu bụ Jehovah’s Witnesses in the 20th Century. Nke a kpaliri mmasị onye nkuzi ha. Mgbe o kwusịrị okwu ahụ n’ihu klasị ahụ e kwere ka ụmụ akwụkwọ ahụ jụọ ajụịụ dị iche iche. Mgbe e mesịrị, ọtụtụ n’ime ndị ha na ya nọ n’otu klasị jụrụ ya ihe ha na-aghaghị ime ka ha wee biri n’ime Paradaịs nke Chineke, bụ́ nke a kpọtụrụ aha n’okwu ya. Ọtụtụ ndị, gụnyere onye nkuzi ahụ, rịọrọ ka e wetara ha akwụkwọ nta dị iche iche ndị nwanna nwanyị ahụ ji. Klasị ndị ọzọ rịọrọ ka e wetara ha akwụkwo nta dị iche iche, ka e nyekwuokwa ha ihe ọmụma, otu onye nkuzi n’ihe banyere okpukpe nyochara akwụkwọ nta ndị ahụ wee kwuo ka ndị nọ na klasị ya nweta ha.

Agọziri ihe nwanna anyị nwanyị a ji obi ike mee. E kesara 23 akwụkwọ nta dị iche iche nye ndị nkuzi abụọ na ọtụtụ ụmụ akwụkwọ; otu nwata akwukwọ, mgbe ọ nụsirị banyere okwu ahu, riọrọ ka e nye ya ihe odide ahu iji kọwaara ndị klasị ya ọru Ndịàmà Jehova na-arụ.

Ọtụtụ ndị na-anakwere ozi ọma ahụ na Belgium. Ha na-anakwere Okwu Chineke, ‘ọ bụghi di ka okwu mmadụ, ma, dị ka ọ dị n’ezie, dị ka okwu Chineke, nke na-arụsikwa ọrụ ike n’ime unu ndị kwere ekwe.’—1 Ndị Tesalọnaịka 2:13.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya