Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
◼ Olee mgbe á malitere ịnụ ụda opi ndị mmụọ ozi asaa ahụ nke Mkpughe?
Ná Mkpughe isi 8, 9, na Mkpu. 11, anyị na-agụ banyere ndị mmụọ ozi asaa ndị fụrụ opi asaa, na-akpọsa ihe otiti siri oké ike nke ga-abịakwasị akụkụ dị iche iche nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ndị a nọchiri anya mkpọsa nke ikpe ọmụma Jehova, bụ́ nke ndị Jehova kpọsaworo n’ime oge ọgwụgwụ a nile malite n’ụzọ pụtara ìhè ná mgbakọ ahụ e mere na cedar Point na 1922.—Lee Revelaton—lts Grand Climax At Hand! isi 21 ruo 23 na isi 26.
Opi anọ ndị nke mbụ ahụ na-ekpughe ọnọdụ ọnwụ ime mmụọ nke akụkụ “ụwa” na “oké osimiri” nke Krisendom, ya na ọdịda nke ndị ndú okpụkpe na ọchịchịrị ime mmụọ nke Krisendọm nọ na ya.—Mkpughe 8:7-12.
Akụkọ ihe mere eme na-egosi na mkpughe nke eziokwu ndị a n’ihu ọha malitere n’ezie tupu 1922. Dị ka ihe atụ, okwu ihu ọha ahụ isiokwu ya bụ “Ọ Pụrụ Ịbụ Na Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Agaghị Anwụ Ma Ọlị,” nke e kwuru nke mbụ ya na 1918, mesịakwa bipụta ya n’ụdị akwụkwọ nta ná” 1920, kwuru banyere ọdịda nke Krisendọm na ọgwụgwụ ụwa nke a nke na-abịa nso. Akwụkwo The Golden Age nke September 29, 1920, kpughere Krisendọm n’ụzọ doro anya dị ka nwanyị na-akwa iko, ihe ụgha na-eduhie eduhie, na ihe na-arafu ụmụ mmadụ.
Ya mere, gịnị mere akwụkwọ Revelation Climax ji kwuo na a malitere ịfụ opi anọ ndị a ná mgbakọ Cedar Point ahụ na 1922? Ọ bụ nihi na ọ bụ mgbe ahụ ka a kpọro òkù ahụ bụ “kpọsaanụ, kpọsaanụ, kpọsaanụ Eze ahụ na Alaeze ya,” bụ́ nke nyere ọrụ nkwusa ozi ọma ahụ oké nkwali. Mbipụta November 1,1922, nke ỤIọ Nche (Bekee) kwụrụ, sị: “Ndị enyi ahụ . . . hụrụ ya dị ka isi ihe nke mgbako ahụ na ihe bụ n’ezie ihe ùgwù na orụ dịịrị ndị e doworo nsọ ndị bi n’elu ala ugbu a ịkpọsa ọnụnọ nke Onyenwe anyị, bụ́ Eze ukwu ahụ nke ndị eze nile, na alaeze ya abịawokwa, na nke a bụkwa ihe kachasị mkpa nye ha ime.”
Ọ bụ ihe kwesịkwara ịrịba ama na o bụ eziokwu na Ndịàmà Jehova akpọsawo ozi ikpe ọmụma ndị a kemgbe 1922, nke ọ bụla n’ime ha nwetara nkwali dị ike site ná nnabata nke nkwupụta okwu anọ dị iche iche ná mụbakọ ndị e nwere malite na 1922 ruo 1925. E mesịrị kesaa ọtụtụ iri nde nkwupụta okwu ndị a n’ụdị mpempe akwụkwọ e biri ebi na-ekpughe ọnọdụ ọnwụ ime mmụọ nke Krisendọm n’ụzọ dị irè.—Lee akwụkwọ Revelation Climax, peji 133, amaokwu 15.
Opi atọ ndị nke ikpeazụ metụtara “ahụhụ” dị iche iche. (Mkpughe 8:13) Ha dị iche n’opi anọ ndị nke mbụ ahụ n’ihi na e jikọtara ha na ihe omume ụfọdụ kpọmkwem. E jikọtara ụda opi nke ise na ntọhapụ nke ndị Chineke site ‘n’abyss’ ahụ na 1919. Nke isii metụtara “usuu ndị aghà” ahụ na oké ọrụ nkwusa ozi ọma zuru ụwa ọnụ nke malitere na 1922. E jikọtara nke asaa na ọmụmụ nke Alaeze Chineke na 1914.—Mkpughe 9:1-19; 11: 15-19.
Nke ọ bụla n’ime ihe omume ndị a wetara ahụhụ nye Setan na ụwa ya. Ntohapụ nke ndị ahụ e tere mmanụ na 1919 sịte n’abyss nke arụghị orụ gbara ndị ndú okpukpe Krịsendom dị ka akpị, gosipụtakwa na Jehova ajụwo ya kpam kpam. Malite na 1922 ruo taa, nnukwute usuu ndị agha ahụ egbuwo Krisendọm, n’ikwu ya n’ụzọ ime mmụo, na-ekpughe ọnọdụ ya nke ịbụ onye nwụrụ anwụ, na-adọkwa aka ná ntj banyere mbibi ya nke na-abịanụ. Mgbe a mụsịrị Alaeze ahụ na 1914, a chụpụrụ Setan site n’eluigwe, na-akpali nsogbu nke wetara oké mbibi n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ. N’oge na-adịghị anya, Alaeze ahụ ga-ewezụga òtù ụmụ mmadụ ahụ yiri ihe guzosiri ike nke Setan wuliteworo (ụwa), na-ekpochapụ ihe a kpọrọ mmadụ na-enupụ ìsi (oké osimiri) n’Amagedọn.—Mkpughe 11:17-12:12; 21:1.
Ná mgbakọ ahụ e mere na Cedar Point na 1922, “ahụhụ” atọ ahụ pụtara ìhè nye ụwa nile. Ọrụ nkwusa nke a malitere mgbe ahụ mere ka ọ pụta ìhè na “igurube” ndị ahụ apụtawo ‘n’abyss’ ahụ, na ịzọ ịje nke “usuu ndị agha” ahụ nọkwa na-aga n’ihu. Òkù ahụ na-akpali akpali ịkposa Eze ahụ na Alaeze ya kwekọkwara nke ọma n’ụda opi nke asaa ahụ. Mbipụta March 1, 1925, nke Ụlọ Nche (Bekee) kọwara na ihe ndị mere na 1914, 1919, na 1922 bụ ndị e buru n’amụma ná Mkpughe isi 12. Nke a bụ nghọta dị omimi karị nke ọmụmụ nke Alaeze ahụ, Ndịàmà Jehova jịkwa ikwesị ntụkwasị obi kpọsaa nke a. Tụkwasị na nke a, mkpọsa nke ihe ọmụma nke a na-eweta ihe otiti natara nkwali bụ isi site ná nnabata na nkesa e mesịrị kesaa nkwupụta okwu ahụ siri ike ná mgbako ndị ahụ e nwere site na 1926 ruo 1928.—Lee Revelation—lts Grand Climax At Hand!, peji 147, 149, 172.
Ya mere, ọfụfụ nke opi asaa ndị ahụ malitere na 1922, gaakwa n’ihu n’afo ndị 1920. Kemgbe ahụ, ndị Jehova esorowo ndị mmụọ ozi ahụ mekoo ihe n’atụghị egwu n’ịgwa ihe nile a kporo mmadụ na Krisendọm bụ ihe nwụrụ anwụ n’ụzọ ime mmụọ, na ndị ndú okpukpe ya bụ ndị ndú dara ada, na n’oge na-adịghị anya a gaje ibibi ya na ihe fodụrụ n’ụwa nke a nke Setan.