Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 4/15 p. 10-15
  • Mgbapụta Dị Nso Nye Ndị Na-asọpụrụ Chineke!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbapụta Dị Nso Nye Ndị Na-asọpụrụ Chineke!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mmụọ nke Jupụtara n’Oge Noa
  • Ụzọ nke Dujere ná Mgbapụta
  • Gịnị ka Ahụmahụ Noa Pụtara nye Gị?
  • Ihe Mere Chineke Ji Nwee Mmasị n’Ebe Noa Nọ—Ihe Mere O Ji Gbasa Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • O “So Ezi Chineke Jee Ije”
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • O “So Ezi Chineke Jee Ije”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Okwukwe Noa Na-ama Ụwa Ikpe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 4/15 p. 10-15

Mgbapụta Dị Nso Nye Ndị Na-asọpụrụ Chineke!

“(Jehova, NW) matara ịdọpụta ha n’ọnwụnwa, bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke, na idebe ndị ajọ omume n’ahụhụ mmehie ruo ụbọchị ikpe.”—2 PITA 2:9.

1. (a) Ọnọdụ ọjọọ dịgasị aṅaa na-eche ihe a kpọrọ mmadụ ihu n’oge anyị a? (b) N’ihi nke a, olee ajụjụ ndị anyị gaje ịtụle?

NSOGBU ndị dị ná ndụ na-amụbawanye nye ihe nile a kpọrọ mmadụ. Nke a bụ eziokwu ma mmadụ ò bi n’ebe ihe onwunwe jupụtara ma ọ bụ n’ebe a na-enweghị nke ga-ezuru mmadụ nile. Anọghị ná ntụkwasị obi dị n’ebe nile. Dị ka à ga-asị na nsogbu a na-enwe banyere ọnọdụ akụ na ụba ezughị ezu, e nwere nsogbu ndị siri oké ike banyere gburugburu ebe obibi, ndị na-awakwasị mbara ala anyị bụ́ Ụwa, na-eyi ihe nile dị ndụ n’elu ya egwu. Ọrịa jupụtara ebe nile. Ọrịa na-efe efe, ọrịa obi, na ihe otiti nke ọrịa cancer na-egbu ọtụtụ mmadụ. Omume na-adịghị ọcha ewetawo oké ihe mgbu nye mmetụta nile nke mmadụ, nyekwa ndụ ezinụlọ. E wezugakwa ihe ndị a nile, ụwa jupụtara n’ime ihe ike. N’ihi ihe na-eche òtù ụmụ mmadụ ihu, o ziri ezi anyị ịjụ, sị: È nwere ezi ihe mere a ga-eji tụọ anya inweta mgbapụta n’oge na-adịghị anya? Ya bụrụ otú ahụ, olee ụzọ ọ ga-esi bịa, ọ̀ bụkwa nye ole ndị?—Tụlee Habakuk 1:2; 2:1-3.

2, 3. (a) N’ihi gịnị ka anyị ji na-ahụ ihe e kwuru na 2 Pita 2:9 dị ka ihe na-emesi obi ike taa? (b) Olee ihe omume ndị e zoro aka na ha kpọmkwem n’ime Bible dị ka ihe ndabere iji nye agbamume?

2 Ihe ndị na-eme eme n’oge anyị a na-echetara anyị oge ndị ọzọ a rịbara ama nke ukwuu n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Pita onyeozi dọọrọ uche gaa n’ihe omume mgbapụta ndị Chineke mere n’oge ndị ahụ, wee bịaruo ná nkwubi okwu nke a na-emesi obi ike, sị: “[Jehova, NW] matara ịdọpụta ha n’ọnwụnwa, bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke.” (2 Pita 2:9) Rịba ama ihe ndị e kwuru na gburugburu okwu ahụ, na 2 Pita 2:4-10:

3 “N’ihi na a sị na Chineke emereghị ndị mmụọ ozi ebere mgbe ha mehiere, kama ọ tụbara ha n’ime ime [Tatarọs, NW], wee rara ha nye n’olulu nke ọchịchịrị, ka e wee debe ha ikpe ikpe; a sịkwa na o mereghị ụwa ochie ebere, kama ọ bụ Noa, onye mere ha asatọ, bụ́ onye na-ekwusa ezi omume, ka o chere, mgbe o mere ka iju mmiri bịakwasị ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke; o wee mee ka obodo Sọdọm na Gọmọra ghọọ ntụ, werekwa ikpu ihu maa ha ikpe, ebe o mere ha rịị ka ha bụrụ ihe ilereanya nye ndị gaje ịbụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke; o wee dọpụta Lọt, bụ́ onye ezi omume, mgbe ibi obi n’agụụ ịkwa iko nke ndị ahụ ndị na-emebi iwu na-ewute ya nke ukwuu (n’ihi na onye ezi omume ahụ, ebe ọ na-ebi n’etiti ha, o weere ọrụ ha nke na-emebi iwu mekpaa mkpụrụ obi ezi omume ya ahụ kwa ụbọchị, n’ile ihe na ịnụ ihe): [Jehova, NW] matara ịdọpụta ha n’ọnwụnwa, bú ndị na-asọpụrụ Chineke, na idebe ndị ajọ omume n’ahụhụ mmehie ruo ụbọch] ikpe; ma nke kachasi ndị na-ejeso anụ ahụ n’agụụ ihe e merụrụ emerụ, ndị na-elelịkwa ịbụ onyenwe mmadụ anya.” Dị ka akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ahụ na-egosi, ihe mere n’oge Noa na n’oge Lọt nwere ihe dị ukwuu ha pụtara nye anyị.

Mmụọ nke Jupụtara n’Oge Noa

4. N’ụbọchị Noa, gịnị mere Chineke ji lee ụwa anya dị ka ihe e bibiri ebibi? (Abụ Ọma 11:5)

4 Ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme ahụ dị na Jenesis isi 6 na-eme ka anyị mara na n’oge Noa, ụwa ghọrọ ihe e bibiri ebibi n’anya ezi Chineke ahụ. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? N’ihi ime ihe ike. Nke a abụghị na a na-anụ akụkọ banyere ime ihe ike n’ebe ole na ole. Jenesis 6:11 na-akọ na “ụwa jupụtakwara n’ihe ike.”

5. (a) Àgwà dị aṅaa ụmụ mmadụ na-akpa nyere aka n’ịkpata ihe ike a na-eme n’oge Noa? (b) Gịnị ka Ịnọk dọwororịị aka ná ntị banyere ya n’ihe metụtara asọpụrụghị Chineke?

5 Gịnị kpatara nke a? Akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ e hotara site na 2 Pita na-ezo aka ná ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. Ee, mmụọ nke asọpụrụghị Chineke jupụtara n’ihe omume nke ụmụ mmadụ. Nke a metụtara ihe karịrị ejighị iwu Chineke kpọrọ ihe, kama ọ gụnyere omume nnupụisi n’ebe Chineke nọ kpọmkwem.a Mgbe ụmụ mmadụ na-egosikwa nnupụisi n’ebe Chineke nọ, à pụrụ isi aṅaa tụọ anya na ha ga-emeso ụmụ mmadụ ibe ha ihe n’obi ebere? Tupu mgbe ahụ rịị, tupu a mụọ Noa, omume asọpụrụghị Chineke nke a abụrụwo nke zuru ebe nile nke na Jehova mere ka Ịnọk buo amụma banyere ihe ọ ga-arụpụta. (Jud 14, 15) Ọ bụ ihe e ji n’aka na nnupụisi ha n’ebe Chineke nọ ga-eweta mmezu nke ihe Chineke kpere n’ikpe n’isi ha.

6, 7. Ọnọdụ dị aṅaa nke metụtara ndị mmụọ ozi rụrụ ọrụ dị ukwuu n’ịkpata ọnọdụ ọjọọ nke dịrị tupu Iju Mmiri ahụ?

6 E nwekwara ihe ọzọ nke so kpata ime ihe ike nke oge ndị ahụ. Jenesis 6:1, 2 na-adọrọ uche gaa n’ebe ihe a dị mgbe ọ na-asị: “O ruo, mgbe mmadụ malitere ịba ụba n’elu ala, mgbe a mụkwara ụmụ ndị inyom nye ha, na ụmụ ndị ikom nke Chineke hụrụ ụmụ ndị inyom nke mmadụ na ha mara mma; ha wee lụtara onwe ha ndị inyom site ná ndị nile ha họpụtara.” Olee ndị bụ ụmụ ndị ikom nke Chineke ndị ahụ? Ha abụghị ụmụ mmadụ nkịtị. Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị ikom bụ mmadụ anọworị na-ahụta ụmụ nwanyị ndị mara mma ma na-alụrụkwa ha. Ụmụ ndị ikom nke Chineke ndị a bụ ndị mmụọ ozi ndị weghaara anụ ahụ nke mmadụ. Na Jud amaokwu 6, a kọwara ha dị ka “ndị mmụọ ozi ndị na-edebeghị ịbụ isi nke aka ha, kama ha hapụrụ ebe obibi nke aka ha.”—Tụlee 1 Pita 3:19, 20.

7 Mgbe ihe ndị a e kere eke, ndị karịrị mmadụ, bụ́ ndị mere ka a hụ ha anya dị ka ndị ikom sooro ndị inyom bụ mmadụ nwee mmekọahụ, gịnị sị n’ime ya pụta? “Nefilim nọ n’ụwa na mgbe ahụ, ha nọkwa ma e mesịa, mgbe ụmụ ndị ikom nke Chineke na-abakwuru ụmụ ndị inyom nke mmadụ, mgbe ha na-amụkwara ha ụmụ: ndị ahụ bụ ndị dike ahụ ndị nọrịị site na mgbe ebighị ebi gara aga, ndị a maara aha ha.” Ee, ndị a mụtara site ná mmekọ nke a nke na-ekwekọghị n’usoro okike bụ ndị Nefilim, ndị dike ndị ji ike dị ukwuu ha nwere na-emekpa ndị ọzọ ahụ.—Jenesis 6:4.

8. Olee ụzọ Jehova si meghachi omume n’ọnọdụ ọjọọ ndị dị n’ụwa?

8 Ruo nnọọ ókè hà aṅaa ka ọnọdụ ahụ dịruru ná njọ? O ruru n’ókè nke na “Jehova [hụrụ] na ihe ọjọọ nke mmadụ hiri nne n’ụwa, ọ hụkwa na nchepụta nile ọ bụla nke echiche obi ya bụ nanị ihe ọjọọ ogologo ụbọchị nile.” Olee ụzọ Chineke si meghachi omume banyere ọnọdụ nke a? “Jehova wee chegharịa na o mere mmadụ n’ụwa, o wee wute ya n’obi ya.” Nke a apụtaghị na Jehova chere na a sị na ya makwaara na ya agaraghị eke mmadụ. Kama nke ahụ, o wutere ya na mgbe o mesịworo ụmụ mmadụ, àgwà ha jọrọ njọ nke ukwuu nke na ya aghaghị ibibi ha.—Jenesis 6:5-7.

Ụzọ nke Dujere ná Mgbapụta

9. (a) N’ihi gịnị ka Chineke ji mesoo Noa omume dị mma? (b) Ihe ọmụma dị aṅaa ka Chineke buru ụzọ nye Noa?

9 N’ihe banyere Noa, ọ “hụtara amara n’ihu Jehova. . . . Noa bụ onye ezi omume, onye zuru okè n’ọgbọ ya nile: Noa na Chineke yikọrọ na-ejegharị.” (Jenesis 6:8, 9) Ya mere Jehova bu ụzọ gbaara Noa àmà na Ya gaje iweta iju mmiri nke ga-ezu ụwa ọnụ wee gwa Noa ka o wuo otu ụgbọ. A gaje ikpochapụ ihe nile a kpọrọ mmadụ, e wezugakwa Noa na ezinụlọ ya, site n’elu ala. Ọbụna na a gaje ibibi ụmụ anụmanụ, e wezugakwa ndị nnọchianya ole na ole nke ụdị ọ bụla bụ isi ndị Noa gaje iweba n’ime ụgbọ ahụ.—Jenesis 6:13, 14, 17.

10. (a) Nkwadebe dị aṅaa ka a na-aghaghị ime maka nchebe, ruokwa ókè hà aṅaa ka ọ bụ ọrụ buru ibu? (b) Gịnị ka e kwesịrị ịrịba ama n’ihe banyere ụzọ Noa si rụzuo ọrụ ya?

10 Ihe ọmụma nke a e buru ụzọ nye Noa bokwasịrị ya ibu ọrụ dị arọ nke ukwuu. A ghaghị iwu ụgbọ ahụ. A ga-eme ka o yie nnukwute igbe, nke ga-enwe ohere dị 1,400, 000 cubic amaụkwụ [40,000 cubic mita] n’ime ya. Noa ga-ebujupụta ihe oriri n’ime ya wee chịkọta ụmụ anụmanụ na nnụnụ, “anụ nile ọ bụla nke dị ndụ,” maka nchebe. Ọ bụ atụmatụ nke ga-ewe ọtụtụ afọ nke ịrụ ọrụ. Olee ụzọ Noa si zaghachi? O “wee mee ya; dị ka iwu nile si dị nke Chineke nyere ya, otú a ka o mere.”—Jenesis 6:14-16, 19-22; Ndị Hibru 11:7.

11. N’ihe banyere ezinụlọ nke ya, ibu ọrụ dị aṅaa nke dị mkpa dịkwasịrị Noa?

11 Mgbe ọ nọ na-arụ ọrụ ahụ, Noa aghaghịkwa itinye oge iji wulite ọdịdị ime mmụọ nke ezinụlọ ya. Ọ dị mkpa ichebe ha pụọ n’ịgbaso ụzọ ime ihe ike na omume nnupụisi nke mmadụ ndị bi ha gburugburu. Ọ dị mkpa ka ha ghara itinyebiga onwe ha ókè n’ihe omume ndị a na-eme kwa ụbọchị ná ndụ. Chineke nwere ọrụ o nyere nke ha ga-arụ, ọ dịkwa mkpa ka ha mee ka ihe nile ha na-eme ná ndụ dịrị gburugburu ọrụ ahụ. Anyị maara na ezinụlọ Noa nakweere ndụmọdụ ya, nweekwa otu okwukwe ahụ o nwere, n’ihi na e kwuru okwu ọma banyere Noa, nwunye ya, ụmụ ha ndị ikom atọ, na ndị nwunye ụmụ ha—ngụkọta nke mmadụ asatọ—n’ime Akwụkwọ nsọ.—Jenesis 6:18; 1 Pita 3:20.

12. Dị ka e gosiri na 2 Pita 2:5, ibu ọrụ dị aṅaa ka Noa ji ikwesị ntụkwasị obi rụzuo?

12 Noa nwekwara ibu ọrụ ọzọ dịịrị ya—ịdọ aka ná ntị banyere Iju Mmiri ahụ nke na-abịanụ, imekwa ka a mara ihe kpatara o ji na-abịa. Ihe àmà gosiri na o jiri ikwesị ntụkwasị obi rụzuo ọrụ nke a, n’ihi na e kwuru okwu banyere ya n’Okwu Chineke dị ka “onye na-ekwusa ezi omume.”—2 Pita 2:5.

13. Ọnọdụ dịgasị aṅaa chere Noa ihu mgbe ọ na-elekọta ọrụ ahụ Chineke kenyere ya?

13 Ụgbu a cheedị nnọọ echiche banyere ọnọdụ ndị Noa rụzuru ọrụ ahụ n’okpuru ha. Tinye onwe gị n’ọnọdụ ya. A sị na ị bụ Noa ma ọ bụ otu onye n’ime ezinụlọ ya, omume ihe ike nke ndị Nefilim na nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke na-eme gaara agba gị gburugburu. Ị gaara eche ihu kpọmkwem ná mmetụta nke ndị mmụọ ozi na-enupụ isi. Ka ị nọ na-arụ ọrụ n’ụgbọ ahụ, ị ga-abụworị onye a na-akwa emo. Mgbe afọ ndị ahụ na-agabiga, mgbe ị na-adọkwa aka ná ntị banyere Iju Mmiri ahụ nke na-abịanụ, ị gaara achọpụtaworị na ihe ndị a na-eme ná ndụ kwa ụbọchị rikpuru ụmụ mmadụ nke ukwuu nke na “ha amaghịkwa”—ya bụ, “ruo mgbe oké iju mmiri ahụ bịara, kpopụ ha nile.”—Matiu 24:39; Luk 17:26, 27.

Gịnị ka Ahụmahụ Noa Pụtara nye Gị?

14. N’ihi gịnị ka ọ na-adịghị esiri anyị ike taa ịghọta ọnọdụ ndị chere Noa na ezinụlọ ya ihu?

14 Ọ gaghị esiri ihe ka ọtụtụ n’ime ndị na-agụ akwụkwọ anyị ike ma ọlị iji anya nke uche ha hụ ọnọdụ dị otú ahụ. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? N’ihi na ọnọdụ ndị nke oge anyị a yiri nnọọ ndị dị n’oge Noa. Jisọs kwuru na nke a bụ ihe a ga-atụ anya ya. N’oké amụma ya banyere oge ọnụnọ ya n’ime mgbe ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a, Jisọs buru amụma, sị: “Dị ka ụbọchị Noa dịrị, otú a ka [ọnụnọ, NW] Nwa nke mmadụ ga-adị.”—Matiu 24:37.

15, 16. (a) Ò si aṅaa bụrụ eziokwu na, dị ka n’ụbọchị Noa, ụwa nke oge a jupụtara n’ime ihe ike? (b) Ime ihe ike dị aṅaa kpọmkwem bịakwasịworo ndị ohu Jehova?

15 Ọ̀ dịwo otú ahụ? Ụwa ò jupụtara n’ime ihe ike taa? Ee! Ihe karịrị otu narị nde mmadụ anwụwo n’agha dị iche iche n’ime narị afọ nke a. Nke a emetụtawo ụfọdụ n’ime ndị na-agụ akwụkwọ anyị kpọmkwem. Ọbụna ọtụtụ ndị ọzọ abụrụwo ndị ndị omekome yiri egwu, bụ́ ndị nzube ha bụ ịnapụ ha ego ma ọ bụ ihe onwunwe ha ndị ọzọ. Ime ihe ike n’ụlọ akwụkwọ emetụtawokwa ndị na-eto eto.

16 Otú ọ dị, ndị ohu Jehova na-enwe ahụmahụ nke ihe karịrị mbibi nke agha na ime ihe ike nkịtị. A na-emesokwa ha ihe ike n’ihi na ha abụghị akụkụ nke ụwa, kama ha na-agbalị ịbụ ndị na-asọpụrụ Chineke. (2 Timoti 3:10-12) Mgbe ụfọdụ, ime ihe ike dị otú ahụ na-abịa n’ụdị dị mfe nke inu aka ma ọ bụ ịma ụra; n’oge ndị ọzọ, ọ na-agụnye ibibisị ihe onwunwe, iti oké ihe, na ọbụna ogbugbu. —Matiu 24:9.

17. Asọpụrụghị Chineke ò jupụtara ebe nile taa? Kọwaa.

17 Mgbe ụfọdụ, mgbe ha na-eme omume aka ike dị otú a, ụmụ mmadụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke ekwupụtawo nnọọ okwu mkparị gwa Chineke n’asọghị anya ọ bụla. N’otu ebe dị n’Africa, ndị uwe ojii kwuru, sị: “Gọọmentị nke a bụ nke anyị. Gakwurunụ Chineke, ma ọ bụrụ na ọ dị adị, ma gwa ya ka ọ bịa nyere unu aka.” N’ụlọ mkpọrọ na n’ogịge ịta ahụhụ dị iche iche, ndị mmadụ dị iche iche echewo Ndịàmà Jehova ihu, ndị dị ka Baranowsky, nke nọ na Sachsenhausen, Germany, bụ́ onye kwara emo, sị: “Echeworo m Jehova aka mgba. Anyị ga-ahụ onye ka ibe ya ike, mụ ma ọ bụ Jehova.” N’oge na-adịghị anya mgbe nke a gasịrị, Baranowsky dara ọrịa wee nwụọ; ma ndị ọzọ nọgịdere na-egosipụta omume dị otú ahụ. Ndị ọchịchị ndị nọ na-eweta mkpagbu abụghị nanị ndị na-egosipụta nnupụisi nye Chineke. Gburugburu ụwa, ndị ohu Chineke na-anụ okwu, na-ahụkwa ihe omume ndị na-enye ihe àmà na ndị na-ekwu ha ma ọ bụ na-eme ha enweghị egwu Chineke ọ bụla n’ime obi ha.

18. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ndị ajọ mmụọ si na-etinye aka n’ịkpata ọgba aghara n’ọnọdụ ihe a kpọrọ mmadụ?

18 N’ụbọchị ndị a ndị yịri nnọọ oge Noa, anyị na-ahụkwa ntinye ndị mmụọ ọjọọ na-etinye aka n’ihe ndị na-emenụ. (Mkpughe 12:7-9) Mmụọ ọjọọ ndị a bụkwa mmụọ ozi ndị ahụ weghaara anụ ahụ nke mmadụ wee lụrụ ụmụ nwanyị n’oge Noa. Mgbe Iju Mmiri ahụ bịara, o bibiri ndị nwunye ha na ụmụ ha, ma a manyere ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi ịbanyeghachị n’ógbè ebe ndị bụ mmụọ. Ha enwekwaghị ọnọdụ ọ bụla ná nzukọ dị nsọ nke Jehova, kama a tụbara ha na tatarọs, bụ́ ọnọdụ nke oké ọchịchịrị, na-ebipụ ha pụọ n’ìhè nke sitere n’aka Chineke. (2 Pita 2:4, 5) N’ịbụ ndị na-eme ihe ná nduzi nke Setan, ha anọgidewo na-enwe mkpakọrịta chiri anya n’ebe ụmụ mmadụ nọ, ọ bụkwa ezie na ha enwekwaghị ike iweghara anụ ahụ mmadụ ọzọ, ha agbalịwo ịchịkwa ndị ikom, ndị inyom, na ọbụna ụmụntakịrị. Ha na-eme ụfọdụ n’ihe omume ndị a site n’ihe omume dị iche iche nke ịgba afa. Ha na-akpalikwa ụmụ mmadụ gaa n’ibibirịta ibe ha n’ụzọ ezi uche ọ bụla na-adịghị na ya. Ọ bụghị nanị ihe ndị ahụ.

19. (a) Ọ̀ bụ megide ole ndị kpọmkwem ka ndị mmụọ ọjọọ na-eche ịkpọasị ha ihu? (b) Gịnị ka ndị mmụọ ọjọọ na-anwa ịrụgide anyị ime?

19 Bible na-ekpughe na ndị mmụọ ọjọọ ahụ na-ebu agha megide “ndị na-edebe ihe nile Chineke nyere n’iwu, ndị na-enwekwa àmà nke Jisọs.” (Mkpughe 12:12, 17) Ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ ndị ahụ bụ ndị bụ isi na-akpali mkpagbu a na-akpagbu ndị ohu Jehova. (Ndị Efesọs 6:10-13) Ha na-eji ụzọ ọ bụla a pụrụ ichepụta n’echiche na-eme ihe ịrụgide ma ọ bụ ịrara ndị mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi gaa n’imebi ikwesị ntụkwasị obi ha nye Jehova, nakwa ịkwụsị ịkpọsa Alaeze Jehova nke nwere Jisọs dị ka Eze Mesaịa ya.

20. Olee ụzọ ndị mmụọ ọjọọ na-esi anwa igbochi ụmụ mmadụ ịtọhapụ onwe ha site n’ike nchịkwa ha? (Jemes 4:7)

20 Ndị mmụọ ọjọọ na-agbalịsi ike igbochi ndị mmadụ ndị nwere ọchịchọ inwere onwe ha pụọ ná mmetụta ha nke na-akpagbu akpagbu. Otu nwanyị bụbu onye dibịa afa na Brazil na-akọ na mgbe Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ ya, olu ndị mmụọ ọjọọ nyere ya iwu ka ọ ghara imepe ụzọ; ma o mepere ụzọ ya, o wee mụta eziokwu ahụ. N’ebe dị iche iche, ndị mmụọ ọjọọ na-eji ndị dibịa afa eme ihe kpọmkwem n’ịnwa ịkwụsị ọrụ nke Ndịàmà Jehova. Dị ka ihe atụ, n’otu obodo nta dị na Suriname, ndị na-emegịde Ndịàmà Jehova jekwuuru otu onye dibịa afa onye a maara nke ọma na ọ pụrụ ịkpatara ndị mmadụ ọnwụ mberede nanị site n’iji osisi anwaansị ya tụgide ha. Onye dibịa afa ahụ, bụ onye mmụọ ọjọọ dakwasịrị, chịịrị ndị òtù na-etiri ya ma na-agbara ya egwu chee Ndịàmà Jehova ihu. O kwughachiri okwu anwaansị ya wee tụgide ha osisi ya. Ndị obodo ahụ tụrụ anya na Ndịàmà ahụ ga-ada n’ala nwụọ, ma ọ bụ onye dịbịa ahụ dara wee tụbọọ, ndị na-akwado ya wee jirikwa anya ihere bupụ ya ngwa ngwa.

21. Dị ka ọ dị n’oge Noa, olee otú ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ na-esi emeghachi omume n’ọrụ nkwusa anyị, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

21 Ọbụna n’akụkụ ebe ịgba afa na ike ndị mmụọ ọjọọ bụ ihe a na-adịghị emepụtacha ìhè, Onyeàmà Jehova ọ bụla enwewo ahụmahụ nke ihe ọ dị ka ya ịnwa ikwusa ozi ọma gwa ndị ihe omume a na-eme kwa ụbọchị rikpuru nke ukwuu nke na ha achọghị ka onye ọ bụla bịa nyee ha nsogbu. Dị ka ọ dị n’oge Noa, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ ‘adịghị amata.’ (Matiu 24:37-39) Ịdị n’otu anyị na ihe ndị anyị rụzuru pụrụ ịdị na-amasị ụfọdụ ndị. Ma ọrụ owuwu ihe ime mmụọ anyị—nke gụnyere ọtụtụ awa nke ọmụmụ ihe onwe onye, ịga nzukọ mgbe nile, na ozi ubi—bụcha ihe nzuzu n’anya ha. Ha na-akwa obi ike anyị nwere ná nkwa nile dị n’Okwu Chineke emo, n’ihi na ndụ ha dabeere n’ihe onwunwe a na-ahụ anya na ihe ụtọ ndị ha pụrụ inweta ugbu a.

22, 23. Olee ụzọ ihe ndị mere n’oge Noa sị na-emesi obi ike na Jehova ga-anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke site n’ọnwụnwa?

22 Ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi hà ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi bụrụ ndị a na-emeso omume ọjọọ site n’aka ndị a na-ahụghị Chineke n’anya? Ọ dịghị ma ọlị! Gịnị mere n’oge Noa? Mgbe Chineke nyere ya ntụziaka, Noa na ezinụlọ ya banyere n’ime ụgbọ ahụ nke e wuzuworo. Mgbe ahụ, n’oge Chineke kara aka, “a gbawara isi iyi nile nke oké ogbu mmiri, e meghekwara windo nile nke eluigwe.” Iju Mmiri ahụ nọgidere na-aga n’ihu ruo mgbe o rikpuru ọbụna oké ugwu nile. (Jenesis 7:11, 17-20) A manyere mmụọ ozi ndị ahụ hapụworo ebe obibi kwesịịrị ha ịgbahapụ ahụ mmadụ nke ha werewooro wee laghachị n’ógbè ebe ndị bụ mmụọ. E bibiri ndị Nefilim na ndị nile ọzọ fọdụrụ n’ime ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, gụnyere ndị ahụ chere na ịdọ aka ná ntị nke Noa agbasaghị ha ruo n’ókè nke na ha emeghị ihe ọ bụla banyere ya. N’aka nke ọzọ, a zọpụtara Noa na nwunye ya na ụmụ ha ndị ikom atọ na ndị nwunye ụmụ ha atọ. Otú a, Jehova napụtara Noa na ezinụlọ ya site n’ọnwụnwa nke ha jiworo ikwesị ntụkwasị obi nagịde ruo ọtụtụ afọ.

23 Jehova ọ̀ ga-emekwara ndị na-asọpụrụ Chineke otu ụdị ihe ahụ taa? O nweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla dị na ya ma ọlị. O kwewo nkwa banyere nke ahụ, ọ pụghịkwa ikwu okwu ụgha.—Taịtọs 1:2; 2 Pịta 3:5-7.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a “Anomia bụ nleda anya nye, ma ọ bụ nnupụisi, n’ebe iwu Chineke dị; asebeia [ụdị mkpọaha nke okwu ahụ a sụgharịrị ịbụ ‘ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke’] bụ otu ụdị àgwà ahụ n’ebe Chineke Onwe ya nọ.”—Vine’s Expository Dictionary of Old and New Testament Words, Mpịakọta 4, peji 170.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Olee ụzọ Pita si gosi na Jehova maara ụzọ ọ ga-esi napụta ndị na-asọpụrụ Chineke n’ọnwụnwa?

◻ Ihe ndị dị aṅaa nyere aka n’ịkpata ime ihe ike n’oge Noa?

◻ N’ihi lju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ nke na-abịanụ, ibu ọrụ dị aṅaa ka Noa nwere?

◻ Myirịta dịgasi aṅaa n’etiti oge Noa na oge anyị a ka anyị na-ahụ?

[Foto dị na peeji nke 12]

Iwu ụgbọ ahụ were ọtụtụ afọ nke ịrụsi ọrụ ike

[Foto dị na peeji nke 13]

Noa tinyere oge n’iwulite ọdịdị ime mmụọ nke ezinụlọ ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya