“Na-eguzosinụ Ike”—Unu Asụla Ngọngọ
IHE iseokwu kasị ukwuu nke na-eche ihe a kpọrọ mmadụ ihu taa bụ nke ahụ metụtara ọkaaka eluịgwe na ala. Jehova na-akpọ anyị òkù ịgosịpụta ebe anyị guzo, ka a gụnyekwa anyị n’okwu a site n’ido onwe anyị n’okpuru Eze ya ọ họpụtara, bụ́ Kraịst Jisọs. Ọ dị oké mkpa ịza ọkpụkpọ òkù a, n’ime nanị afọ ise gara aga, ihe karịrị otu nde ndị mmadụ emewokwa otú ahụ. Ma ndị a achọpụtawo na iwere ọnọdụ nke a gụnyere ihe karịrị nanị ime mkpebi otu mgbe ife Jehova. A ghaghị ime nraranye nke onwe onye nke na-adịru ogologo ndụ nile. Ànyị ga-anọgịde n’ebe ahụ anyị guzo mgbe ọnọdụ siri ike? Ka ànyị ga-eji nwayọọ nwayọọ na-akụda aka, mgbe anyị busịrị ụzọ ‘guzosie ike’?—1 Ndị Kọrint 16:13; Ndị Hibru 2:1.
Ọ bụrụ na ị hụwo ụzọ nke ịbụ onye Kraịst dị ka ihe na-adịghị mfe, nwee nkasị obi n’ịmara na otú ahụ ka ọ dịkwa n’ihe banyere Jisọs Kraịst. Ee, ọ dịrị mkpa ka ọbụna Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya kpee ekpere maka ike iji wee nọgide n’ọnọdụ ya, karịsịa mgbe ule ahụ kasị ukwuu na-eche ya ihu. Jiri anya nke uche gị lee ka ọ nọ n’ogige Getsemane ahụ, na-ekpesị ekpere ike, sị: “Aba, Nna, ị pụrụ ime ihe nile; nara m iko a: ma ọ bụghị ihe mụ onwe m na-achọ, kama ihe gị onwe gị na-achọ.” (Mak 14:36) Ọ maara na ihe na-eche ya n’ihu siri ike. Karịsịa, ọ maara na ọ ga-emetụta aha nke Nna ya. Ya mere, onye ahụ ọ bụ nanị ya bụ mmadụ zuru okè nọ n’elu ala emeghị ihere ịrịọ maka enyemaka.
Mgbe ihe siiri anyị ike, anyị nwere otu isi iyi ahụ nke ike nke Jisọs nwere. Anyị pụrụ ikpeku Jehova ekpere maka enyemaka ka anyị wee ghara ịsụ ngọngọ ma ọ bụ ịda ada. Ma ọ̀ bụ ụdị ọdachị dịgasị aṅaa pụrụ ịdapụta, bụ́ ndị pụrụ ime ka anyị sụọ ngọngọ? Ịmara ihe ndị a na ibu ụzọ mee nkwadebe pụrụ, ma eleghị anya, inyere anyị aka izere ịsụ ngọngọ.
Mkpagbu Pụrụ Ime Ka Anyị Sụọ Ngọngọ
Bible dọrọ aka ná ntị, sị: “A ga-esogbukwa ndị nile ndị na-achọ ịdị ndụ n’ụzọ ịsọpụrụ Chineke n’ime Kraịst Jisọs.” (2 Timoti 3:12) Mkpagbu pụrụ ime ka anyị sụọ ngọngọ, ọ na-abịakwa n’ụdị dị iche iche. (Mak 4:17) Ọ pụrụ ịbụ mmachịbido iwu—na-eweta ihe ize ndụ nke ịbụ onye a tụrụ mkpọrọ na ọbụna ọnwụ—ime ihe ike ọha mmadụ, mmegide na-akụda okwukwe nke onye bụ di ma ọ bụ nwunye nọgidere na-eweta kwa ụbọchị, ma ọ bụ ịkwa emo nke ụmụ akwụkwọ ibe gị.
Ọ bụ ihe siri ike ịnagide mkpagbu, ma a dọrọ anyị aka ná ntị na ọ ga-abịa n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ. Ya mere, anyị pụrụ iwulite okwukwe anyị ugbu a, mụtakwa ụzọ anyị ga-esi dabere n’ike Jehova ka ọ ga-abụ mgbe oge ya ruru, anyị ga-eji ike ahụ nwee ntachị obi. (1 Pita 4:13, 14; 5:6-11) Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe, ihe mkpọbi ụkwụ na-abụkarị ihe zoro ezo karịa mwakwasị pụtara ìhè nke mkpagbu.
Enweghị Mmezu Olileanya Pụrụ Ịkụda Okwukwe
Ọ̀ dị onye na-adịghị echeta oké mwute anyị nwere mgbe anyị bụ ụmụaka wee nwee mmetụta nke ịbụ ndị a na-emeghịrị ihe anyị tụrụ anya ya? Ị pụrụ icheta mgbe Papa kwere nkwa imere ezinụlọ dum otu ihe pụrụ iche ma n’ihi otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ, wee gbanwee uche ya? Ma ọ bụ mgbe o mere nkwadebe ịkpọ gị jee ebe a na-edebe ụmụ anụmanụ ma mgbe ọ fọrọ nnọọ nke nta ka e jebe, o wee sị na a gaghị ejekwa? Lee nnọọ ụdị nkụda aka ị ga-enweworị!
Ndị Kraịst toworo eto pụkwara inwe nkụda aka ndị dị otú a, mgbe ụfọdụ, nke a edujewokwa n’oké ọdachi nke ime mmụọ. Ụfọdụ ndị atụkwasịwo olileanya ha n’otu ụbọchị a kara aka mgbe ha ji n’aka na Amagedọn aghaghị ịbịa. Mgbe ọ na-adịghị ihe ọ bụla mere n’ụbọchị ahụ, ha na-enwe mmetụta nke ndị a na-emezughịrị ihe ha tụrụ anya ya. Ndị ọzọ na-enwe nkụda aka mgbe ha na-enwetaghị ihe ùgwù ije ozi nke ha tụrụ anya ya. Ọzọkwa, ụfọdụ ndị pụrụ ịkpatara ibe ha nkụda aka. Otu nwa agbọghọ dị afọ ịri na asatọ gwara ndị mụrụ ya na àgwà nke ụfọdụ n’ime ụmụ okorobịa nọ n’ime ọgbakọ abụghị dị ka ọ tụrụ anya ya ma ọlị—tinyekwara eziokwu ahụ nke bụ na ndị mụrụ ha adịghị eme ihe ọ bụla iji dụọ ha ọdụ—nke na ya achọkwaghị ihe ọ bụla ga-ejikọta ya eziokwu ahụ.
Ọ bụ ezie na o kwere nghọta na a pụrụ inwe nkụda aka n’ọnọdụ ndị a nile, ma onye ahụ a kụdara aka ọ̀ kwesịrị ịkwe ka ọ bụrụ onye sụrụ ngọngọ wee dapụ ná mmekọrịta nke ya na Jehova? Cheedi echiche ụdị mmechuihu Jisọs ga-enweworị mgbe ndị ozi ya nọgidere na-arụrịta ụka banyere onye kasị ukwuu n’etiti ha, wee si otú a na-egosipụta àgwà nke inwe oké ọchịchọ. (Luk 9:46; 22:24) Cheekwa echiche banyere ụdị mmechuihu Job ga-enweworị mgbe ndị enyị ya atọ ndị e chere na ha ga-abịaworị ebe ahụ inyere ya aka chigharịrị imegịde ya wee malite ịrụ ụka banyere ikwesị ntụkwasị obi ya! (Job 22:5-10) Ma, Jisọs na Job adịghị nke sụrụ ngọngọ.
Mmadụ nile bụ ndị na-adịghị ike, ya mere ọ ga-abụ ihe ezi uche na-adịghị na ya ikwe ka ịda mbà nke ndị ọzọ metụta mmekọrịta anyị na Jehova. (Abụ Ọma 51:5) Ezughị okè nke ụfọdụ ndị ekwesịghị ime ka anyị kpuo ìsì n’ebe ọrụ dị ebube Jehova na-arụ dị, bú nke “ịchịkọta ihe nile n’ime Kraịst anyị.” (Ndị Efesọs 1:9, 10) Buru n’uche na ọ bụ mmadụ ndị na-ezughị okè, ndị dawokwara ada, dị ka anyị, ka Jehova na-achịkọbata, bụ́ mmadụ ndị ọzụzụ na nnụcha dị mkpa ka ha wee bụrụ ndị e wusiri ike. (Abụ Ọma 130:3) Onyeiro anyị abụghị nwanna anyị bụ onye Kraịst na-ezughị okè, kama ọ bụ Setan, onye chọrọ ilomi anyị ma ọ bụrụ na ọ pụrụ ime nke ahụ. Ọ gaghị enwe ihe ịga nke ọma ma ọ bụrụ na ‘e guzogide ya site n’ịdị ike n’okwukwe.’ (1 Pita 5:8, 9) Ọ bụrụ na anyị nwere okwukwe dị otú ahụ, “a gaghị eme ka ihere mee [anyị] n’ihu” ma ọlị.—Ndị Rom 9:33.
Ịma Onwe Onye Ikpe Pụrụ Ibibi Ihe
Ụfọdụ ndị atụfuwo mmekọrịta ha na Jehova Chineke nwere n’ihi inwe echiche nke ịbụ ndị na-abaghị n’ihe. N’iburu n’uche adịghị ike na amaghị eme ha nile, ha na-abịaru ná nkwubi okwu ahụ nke bụ na Jehova adịghị mgbe ọ bụla ọ ga-anakwere ije ozi ha. Ha na-eche na onye dị ka ha ikwu na ya bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova bụ nnọọ omume ihu abụọ efu. Ọ̀ dịwo mgbe i mesiri onwe gị ihe ike otú ahụ? Ya bụrụ otú ahụ, i kwesịrị ịlụso mmetụta ndị dị otú ahụ ọgụ.
Ị na-enwe mmetụta nke onye na-erughị eru ijere Jehova ozi? Ya bụrụ otú ahụ, jụọ onwe gị, sị, ‘Ònye bụ onye ruru eru ịnata oké ihe ùgwù nke a?’ Ndị Kraịst nile anọgidewo na-alụso ezughị okè nke onwe ha ọgụ mgbe nile. Ọbụna Pọl onyeozi mere mkpesa, sị: “Ihe ọjọọ dị m nso n’ebe aka m ga-eru, mụ, bú onye na-achọ ime ihe ọma.” (Ndị Rom 7:21) Pọl ọ̀ bụ onye ihu abụọ n’ihi na o mere ihe ndị na-ezighị ezi mgbe ụfọdụ? Ee e. Onye ihu abụọ bụ onye na-eme ka à ga-asị na ọ bụ ihe ọ na-abụghị n’ezie. Ọ bụrụ na anyị na-agbalịsi ike ime ihe ziri ezi ma na-ada mgbe ụfọdụ n’agbanyeghị mgbalị anyị nile, nke ahụ ọ̀ bụ ime ka à ga-asị na anyị na-eme ihe anyị na-adịghị eme? Ọ dịghị ma ọlị.
Bible na-agba anyị ume ka anyị ‘yikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ.’ (Ndị Efesọs 4:24) Otú ọ dị, nke ahụ ọ̀ pụtara na anyị ga-atụfusịcha ihe nile e ji mara mmadụ ochie ahụ? Ee e. N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kọlọsi, Pọl kwuru na mmadụ ọhụrụ ahụ bụ ihe “a na-eme ya ka ọ dị ọhụrụ” site n’ezi ihe ọmụma. (Ndị Kọlọsi 3:9, 10) Okwu ahụ bụ “nke a na-eme ya ka ọ dị ọhụrụ” gosiri ihe omume nke na-aga n’ihu n’ihu. Ya mere, ịgbanwe ọdịdị mmadụ anyị bụ usoro nke na-aga n’ihu n’ihu. N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya ma ọ bụrụ na anyị achọpụta ntụpọ ụfọdụ n’ime onwe anyị.
Otú ọ dị, nke a abụghị na anyị ga-eweda ịdị njọ nke mmehie ala, ọ pụtaghịkwa na anyị ga na-adaba n’ọnwụnwa n’emeghị mgbalị ọ bụla, na-eche na Jehova ga-agbaghara anyị ozugbo. Ma ọ na-enyere anyị aka ịghara ịdị na-akatọ onwe anyị n’ụzọ ezi uche na-adịghị ya. Ọ na-emekwa ka anyị hụ Jehova n’anya karị n’ihi na o wetara àjà mgbapụta Kraịst ka anyị wee nwee ike ife Ya ofufe n’agbanyeghị ọdịdị mmehịe nke anyị bu pụta ụwa.
Jọn onyeozi wepụtara ụzọ ziri ezi e kwesịrị isi lee okwu ahụ anya mgbe ọ sịrị: “Ihe ndị a ka m na-edegara unu n’akwụkwọ, ka unu wee ghara imehie.” Ma mgbe ahụ, o kwukwara n’ụzọ ziri ezi, sị: “Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla emehie [n’ihi ezughị okè nke mmadụ], anyị nwere otu onye na-ekwu ọnụ anyị n’ebe Nna anyị nọ, ya bụ Jisọs Kraịst.” (1 Jọn 2:1) Kama ịbụ ndị na-ama onwe anyị ikpe gabịga ókè, inwe nghọta nke a banyere ọnọdụ anyị na enyemaka Jehova nyeworo na-eduje anyị n’ikwughachi okwu Pọl bụ: “Ekele dịrị Chineke [site] n’aka Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.”—Ndị Rom 7:25.
Anọgidela n’Ịsụ Ngọngọ
Jisọs nyere ịdọ aka ná ntị siri ike nye onye ọ bụla pụrụ ịbụ ihe na-akpata ịsụ ngọngọ, sị: “Onye ọ bụla nke ga-eme otu n’ime ndị nta ndị a ndị kwere na mụ ka ọ maa n’ọnyà, ihe ga-abara ya uru bụ ka e were nkume igwe nri nke ịnyịnya ibu na-adọkpụgharị kwụba ya n’olu, ka o mịkpuokwa n’ogbu oké osimiri.” (Matiu 18:6) Ma gịnị banyere onye ahụ e mere ka sụọ ngọngọ? Ọ bụrụ na mmadụ ma ọ bụ ọnọdụ ụfọdụ emee ka anyị sụọ ngọngọ, ànyị kwesịrị ịgọpụ onwe anyị wee sị, “Ee, o sịghị m n’aka, ya mere ọ dịghị mkpa ka m nọgide na-efekwa Jehova”?
Tụlee otu ihe atụ. Ọ̀ dịwo mgbe apịtị chịịrị gị ị wee daa ma ọ bụ zọjọọ ụkwụ n’elu stepụ? Eleghị anya ihe ọdachi ahụ mere gị na mberede. O kwere nghọta na ị hụrụ onwe gị ka ị tọgbọ n’ala. Ma gịnị bụ ihe ọzọ i mere? I kwuru, sị: “Ọ bụghị m ka ụta dịịrị na m tọgbọ n’ala ebe a. Ọ bụ apịtị ahụ [ma ọ bụ stepụ ahụ] ka ụta dịịrị. Ya mere agaghị m ebilitekwa ọzọ”? Ọ ghaghị ịbụ na ị bịlitere wee hapụ ọnọdụ ahụ na-eme ihere ngwa ngwa.
Ọ̀ bụ na otu ihe ahụ agaghị abụkwa eziokwu n’ihe ime mmụọ? Ọ bụrụ na ọnọdụ ụfọdụ ma ọ bụ onye Kraịst ibe anyị akpasuo anyị iwe, nke ahụ bụ ihe siri ike e kwesịrị ilebara anya. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị anọgide bụrụ ndị e mere ka ha sụọ ngọngọ, na-ekwesi olu ike na a ghaghị ịta onye ọzọ ụta maka nsogbu anyị na-enwe, ọ̀ bụghị eziokwu na ọnọdụ anyị na-aghọwanye ihe e kwesịrị ịta anyị ụta banyere ya?
Ọ bụ ihe obi ụtọ na, ọ bụrụ na e mee ka anyị sụọ ngọngọ, ndị okenye na ndị ọzọ tozuru okè nọ n’ọgbakọ dị ezi njikere inyere anyị aka. (Ndị Galetia 6:1) Jehova n’onwe ya na-enyekwa ndị ahụ nwere ọchịchọ ịfe ya ofufe ike n’agbanyeghị ihe ịsi ike nile. (Ndị Filipaị 4:13) Ya mere anyị kwesịrị ịdị njikere mgbe nile ịrịọ enyemaka ma ọ bụrụ na o yịe ka o nwere ihe gaje igbochi nguzo siri ike anyị weere n’akụkụ Jehova na Alaeze ya. Mgbe ahụ, anyị agaghị enye Setan mmerị site n’ịbụ ndị e mere ka ha sụọ ngọngọ wee nọdụ n’ala ebe ahụ.
Olee Ebe I Guzo?
Kwa ụbọchị, ndị ohu Chineke raara onwe ha nye na-eche ihu ihe iseokwu ndị na-etinye nrara ha raara onwe ha nye Jehova n’ule. N’agbanyeghị ihe ha na-aghaghị iche ihu, ha aghaghị iguzo ọtọ wee bụrụ ndị a gụnyere n’akụkụ nke Eze Mesaịa nke Jehova. Ndị ọchịchị dị ike nke ụwa nke a ewerewo ọnọdụ ha “imegide Jehova na imegide onye ya e tere mmanụ.” Lee nnọọ ihe ùgwù o bụ iguzo n’akụkụ ya!—Abụ Ọma 2:2.
Otú ọ dị, anyị apụghị iguzogide mmetụta nke usoro ihe ụwa nke a dum n’ike aka anyị, ya mere anyị na-enweta nkasi obi site ná nkwa Jisọs nke ịnọnyere ọgbakọ ya ‘ruo ọgwugwụ usoro ihe nke a.’ (Matiu 28:20) Ọ ga-akwado anyị. Tụkwasị na nke a, enyemaka dị ukwuu na-abịa mgbe anyị nọ Jehova nso, chọọkwa nkwado site n’aka ya. Ichigharịkwuru Okwu ya pụrụ inye anyị ume. Mgbe o yiri ka anyị apụghị ịnagịdekwa ihe na-emenụ, Abụ Ọma 55:22 na-akpọ anyị òkù ka anyị ‘tụkwasị Jehova ihe nile o nyere anyị dị ka ibu, ya onwe ya ga-anagidekwa anyị: ọ gaghị ekwe ka e wezuga onye ezi omume n’ọnọdu ya ruo mgbe ebighị ebi.’ Ee, Bible na-agba ndị Chineke nile ume ka ha ‘na-eguzosi ike n’okwukwe’—ka ha gharakwa ịsụ ngọngọ.—1 Ndị Kọrint 16:13.