Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
◻ JỌN Onyeozi sịrị: “Ka anyị ghara ịhụ n’anya n’okwu, ma ọ bu n’ire; kama ka anyị na-ahụ n’anya n’ọrụ na eziokwu.” (1 Jọn 3:18) Jisọs kwuru na ‘anyị ga-ahụ ndị agbata obi anyị n’anya dị ka onwe anyị.’ (Matiu 22:39) Itinye ịhụnanya n’ọrọ na-eme ka a mata eziokwu ahụ, dị ka ahụmahụ na-esonụ sitere Britain na-egosi.
Mgbe Pauline letara nne ya, bụ́ onye nọ n’ọrịa multiple sclerosis, ọ dịbeghị mgbe ọ bịakwutere mmadụ ebe ahụ. Ma n’oge a, mgbe ọ batara n’ụlọ ahụ, ọ pụrụ ịnụ ụzụ ígwè e ji asa ákwà ka ọ na-arụ ọrụ na ka otu onye n’ụlọ nke di n’elu ji ígwè e ji azacha ụlọ na-eme ihe. Ọ jụrụ nne ya, “Gịnị na-eme, ònye nọ n’ebe ahụ?” Nne ya kọwara na Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ ya, hụ nsogbu ya, wee malite inyere ya aka. Mgbe ha rụsịworo ọrụ dị n’ụlọ ma kwadebe nri, ha nọdụrụ ala wee sị: “Ị̀ dịwo njikere?” Pauline jụrụ, sị: “Njikere maka gịnị?” Nne ya kọwara na ya ekwerewo ka e duziere ya ọmụmụ Bible. Pauline latụrụ azụ isonye, ma ebe o siworo ebe dị anya bịa, ọ jụrụ ma ọ ga-adị mma ka ya sonye n’ọmụmụ ihe ahụ. Ọ masịrị ya nke ukwuu nke na ọ dokwara ịbịa n’otu ụbọchị ahụ kwa izu ka o wee nwee ike na-esonye mgbe nile. E mesịa, otu enyi ya nwanyị sonyeere ya, ugbu a e mewo ha abụọ baptism. N’ihi ọmụmụ ihe mbụ ahụ o sonyere na ya, mmadụ iri sitere n’otu ezinụlọ ahụ bụ Ndịàmà Jehova ugbu a! Ee, nye aka “n’ọrụ”!
Onye Pastọ na New Guinea Anabata Eziokwu
◻ N’oge Jisọs ndị nchụàjà ụfọdụ nabatara ozizi Jisọs. Ndị ‘ndú okpukpe obi ha ziri ezi n’oge a na-emekwa otú ahụ, dị ka e gosiri site n’ahụmahụ nke sitere n’ebe ugwu nke New Guinea, bụ́ nke otu onye nlekọta sekit kọrọ. Ọ sịrị: “Otu nwa okorobịa gụrụ akwụkwọ nke ọma, bụ́ pastọ nke chọọchị Pentecostal, nọ na-ewu otu ụlọ chọọchị dị nta nso nso Ụlọ Nzukọ Alaeze. Otu nwanna sitere n’ọgbakọ ahụ gbaara ya àmà, o gosikwara ihu enyi. Ngwa ngwa mgbe nke ahụ gasịrị, eletara m ọgbakọ ahụ ma nọnyere nwanna ahụ onye bi na mgbada mgbada n’otu okporo ámá ahụ onye pastọ ahụ bi. N’uhuruchi mbụ mgbe m bịarutere, nwa okorobịa a ji Bible ya bịa n’ụlọ anyị, ya na ìgwè dị ukwuu sitere ná nzukọ ya. Ha nile chọrọ ịnụ ozi Alaeze ahụ. Ọ jụrụ ọtụtụ ajụjụ, mkparịta ụka ahụ gakwara n’ihu ruo n’ime abalị. N’uhuruchi ọ bula nke nleta m, ya na ndị ọzọ nwere mmasị na-abịa ka a zakwuo ha ajụjụ ha. Akpọrọ m ya oku ịbịa mgbakọ sekit n’izu na-esonụ, ọ bịakwara ya na nwanna ahụ gbaara ya àmà na nke mbụ ya. Nwoke a nọgidere n’ọmụmụ Bible ya, ọ hapụwo Chọọchị Pentecostal, ugbu a ọ bukwa onye nkwusa ozi ọma ahụ nke na-ejechi ozi anya.”
N’eziokwu, ọ bụ uche Chineke ka “a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.”—1 Timoti 2:4.