“Zi Anyị Ikpe Ekpere”
“Otu onye n’ime ndị na-eso ụzọ ya sị ya, Onyenwe anyị, zi anyị ikpe ekpere”—LUK 11:1.
1-3. (a) N’ihi gịnị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst ji chọọ ntụziaka banyere ekpere? (b) Ajụjụ dịgasị aṅaa banyere ekpere na-ebilite?
E NYERE ụfọdụ ndị onyinye nke olu mara mma maka ịbụ abụ. Ndị ọzọ nwere onyinye e bu pụta ụwa dị ka ndị na-agụ egwu. Ma iji ruo ọ̀tụ̀tụ̀ kachasị nke ikike ha nwere, ọbụna ndị a na-agụ egwu na ndị na-akpọ ngwá egwu chọrọ ntụziaka. Ọ dịkwa otú ahụ n’ebe ekpere dị. Ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst matara na ha chọrọ ntụziaka ka Chineke wee nụ ekpere ha.
2 Dị ka o si emebu, Jisọs gakwuuru Nna ya n’ekpere, dị ka o mere ogologo abalị nile tupu ọ họpụta ndị ozi 12 ahụ. (Luk 6:12-16) Ọ bụ eziokwu na ọ gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha kpee ekpere n’onwe ha, ha nụrụ olu ya ka ọ na-ekpe ekpere n’ihu ọha ma hụ na ọ dịghị dị ka ndị okpukpe ihu abụọ bụ́ ndị na-ekpe ekpere ka ụmụ mmadụ wee hụ ha. (Matiu 6:5, 6) Mgbe ahụ, n’ụzọ ezi uche dị na ya, ndị na-eso ụzọ Jisọs nwere ọchịchọ maka ya ibu ụzọ nye ntụziaka banyere ekpere. Otú a, anyị na-agụ, sị: “O ruo, mgbe ọ na-ekpe ekpere n’otu ebe, mgbe o [kpesịrị ekpere], na otu onye n’ime ndị na-eso ụzọ ya sị ya, Onyenwe anyị, zi anyị ikpe ekpere, dị ka Jọn [Onye na-eme baptism] zikwara ndị na-eso ụzọ ya.”—Luk 11:1.
3 Olee otú Jisọs sị zaghachi? Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya ya? Oleekwa otú anyị pụrụ isi rite uru n’ihe ọ kuziri banyere ekpere?
Ihe Mmụta nye Anyị
4. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji ‘na-ekpe ekpere mgbe nile,’ gịnịkwa ka ọ pụtara ime otú ahụ?
4 Anyị pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu site n’okwu na ihe nlereanya Jisọs dị ka nwoke nke na-ekpe ekpere. Otu ihe a na-amụta bụ na ọ bụrụ na ọ dị Ọkpara Chineke zuru okè mkpa ikpe ekpere mgbe nile, ọ dị ndị na-eso ụzọ ya na-ezughị okè mkpa karị ilega anya n’ebe Chineke nọ mgbe nile maka nduzi, nkasi obi, na agbamume ime mmụọ. Ya mere, anyị kwesịrị ‘ịdị na-ekpe ekpere mgbe nile.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 5:17) N’ezie, nke a apụtaghị na anyị aghaghị igbu ikpere n’ala n’ụzọ nkịtị mgbe nile. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịdị na-adị njikere ikpe ekpere mgbe nile. Anyị kwesịrị ilegara Chineke anya mgbe nile maka nduzi n’akụkụ nile nke ndụ ka anyị wee nwee ike iji amamihe mee ihe ma nwee nkwado ya mgbe nile.—Ilu 15:24.
5. Gịnị pụrụ iwere oge ahụ anyị kwesịrị itinye n’ekpere, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ime banyere nke a?
5 Na “mgbe ikpeazụ” ndị a, ọtụtụ ihe pụrụ iwere oge anyị kwesịrị iji kpee ekpere. (2 Timoti 3:1) Ma ọ bụrụ na nchegbu ndị dị n’ezinụlọ, ihe ndị metụtara azụmahịa, na ihe ndị yiri ha na-egbochi ikpe ekpere mgbe nile gwa Nna anyị nke eluigwe, e ji nchegbu nile nke ndụ a bogbue obi anyị nke ukwuu. E kwesịrị imezi ọnọdụ ahụ n’atufughị oge, n’ihi na ịda mbà n’ikpe ekpere na-eduje n’enweghị okwukwe. Ihe anyị kwesịrị ime bụ ibelata ihe ndị anyị na-eme ma ọ bụ nwee ezi nguzo n’etiti nchegbu nke ndụ na iji obi anyị nile chigharịkwuru Chineke maka nduzi mgbe mgbe. Anyị kwesịrị ‘inwe anya udo ka anyị wee kpee ekpere.’—1 Pita 4:7.
6. Ekpere dị aṅaa ka anyị ga-amụ ugbu a, na-eburukwa gịnị n’uche?
6 N’ihe a kpọworo ekpere ihe nlereanya, Jisọs kuziiri ndị na-eso ụzọ ya otú e si ekpe ekpere, ọ bụghị kpọmkwem ihe a na-aghaghị ikwu. Ihe ndekọ Luk dịtụ iche pụọ na nke Matiu n’ihi na ha metụtara oge ndị dịgasị iche iche. Anyị ga-amụ banyere ekpere nke a dị ka ihe nlereanya nke otú ekpere anyị ga-adị dị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs na Ndịàmà nke Jehova.
Nna Anyị na Aha Ya
7. Olee ndị nwere ihe ùgwù nke ịgwa Jehova okwu dị ka “Nna anyị”?
7 “Nna anyị nke bi n’eluigwe.” (Matiu 6:9; Luk 11:2) Ebe Jehova bụ Onye Okike nke ihe a kpọrọ mmadụ ma na-ebi n’eluigwe, ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ịkpọ ya “Nna anyị nke bi n’elu-igwe.” (1 Ndị Eze 8:49; Ọrụ 17:24, 28) Iji okwu ahụ bụ “anyị” mee ihe na-egosi na ndị ọzọ nwekwara mmekọrịta chiri anya n’ebe Chineke nọ. Ma olee ndị nwere ihe ùgwù a na-akparaghị ókè nke ịkpọ ya Nna ha? Nanị ndị raara onwe ha nye e mere baptism n’ezinụlọ ya nke ndị na-efe ofufe. Ịkpọ Jehova “Nna anyị” na-egosi na anyị nwere okwukwe n’ebe Chineke nọ ma na-amata na nanị ihe ndabere maka anyị na ya ịdị n’otu bụ ịnabata àjà mgbapụta Kraịst kpam kpam.—Ndị Hibru 4:14-16; 11:6.
8. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji chọsie ike itinye oge n’ikpegara Jehova ekpere?
8 Lee ka anyị kwesịrị isi nwee mmetụta nke ịdị Nna anyị nke eluigwe nso! Dị ka ụmụntakịrị ike na-adịghị agwụ mgbe ọ bụla n’ịgakwuru nna ha, anyị kwesịrị ịdị na-achọ iwepụta oge dị ukwuu maka ikpeku Chineke ekpere. Obi ekele dị omimi maka ngọzi ime mmụọ na nke ihe onwunwe ndị ọ na-enye anyị kwesịrị ịkpali anyị ikele ya maka ịdị mma ya. Anyị kwesịrị ịbụ ndị ọ na-adị n’uche mgbe nile ibugara ya ibu arọ ọ bụla nke na-anyịgide anyị, na-enwe obi ike na ọ ga-agba anyị ume. (Abụ Ọma 55:22) Anyị pụrụ ijide n’aka na ọ bụrụ na anyị ekwesị ntụkwasị obi, ihe nile ga-emesịa dị mma n’ihi na ọ na-echebara anyị echiche.—1 Pita 5: 6, 7.
9. Ekpere maka ido aha Chineke nsọ bụ arịrịọ maka gịnị?
9 “Ka e doo aha gi nsọ.” (Matiu 6:9; Luk 11:2) Mgbe ụfọdụ, okwu ahụ bụ “aha” na-anọchite anya mmadụ n’onwe ya, ‘ido nsọ’ pụtakwara “ime ka ọ dị nsọ, wezụga iche ma ọ bụ iwere ihe dị ka ihe dị nsọ.” (Tụlee Mkpughe 3:4.) Mgbe ahụ, ekpere maka ido aha Chineke nsọ bụ arịrịọ ka Jehova mee ihe iji doo onwe ya nsọ. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ikpochapụ ihe ịta ụta nile e bokwasịworo n’ebe aha ya dị mgbe ọ bụla. (Abụ Ọma 135:13) Iji mee nke ahụ, Chineke ga-ewepụ mmebi iwu, bulie onwe ya elu, ma mee ka mba nile mara na ọ bụ ya bụ Jehova. (Ezekiel 36:23; 38:23) Ọ bụrụ na anyị chọsiri ike ịhụ ụbọchị ahụ ma mata ịdị ukwuu nke Jehova n’ezie, anyị ga na-abịakwute ya mgbe nile na-eji ụdị mmụọ nsọpụrụ ahụ bụ nke a na-egosipụta n’okwu ndị ahụ bụ “ka e doo aha gị nsọ.”
Alaeze Chineke na Ihe Ọ Na-achọ
10. Gịnị ka ọ pụtara mgbe anyị na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa?
10 “Ka alaeze gi bịa.” (Matiu 6:10; Luk 11:2) Alaeze a na-ekwu okwu ya n’ebe a bụ ọchịchị ọkaaka nke Jehova, dị ka e gosipụtara ya site n’ọchịchị eluigwe Mesaịa nke dị n’aka Jisọs Kraịst na “ndị nsọ” sonyere ya. (Daniel 7:13, 14, 18, 27; Aịsaịa 9:6, 7; 11:1-5) Gịnị ka ọ pụtara bụ ikpe ekpere ka ọ “bịa”? Nke a pụtara na anyị na-arịọ ka Alaeze Chineke bịa megide ndị nile na-eguzogide ịchịisi Chineke n’ụwa. Mgbe Alaeze ahụ ‘tipịasịrị alaeze nile nke ụwa ma mee ka ha gwụsịa,’ ọ ga-emegharị ụwa ịghọ paradaịs zuru ebe nile.—Daniel 2:44; Luk 23:43.
11. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịhụ ka e mere uche Jehova n’eluigwe na ala, gịnị ka anyị ga-eme?
11 “Ka e mee ihe ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (Matiu 6:10) Nke a bụ arịrịọ ka Chineke mezuo ihe bụ nzube ya n’ebe ụwa dị, bụ́ nke gụnyere iwepụ ndị iro ya. (Abụ Ọma 83:9-18; 135:6-10) N’ezie, ọ na-agụnye na anyị chọsiri ike ịhụ ka e mere ihe Chineke na-achọ n’elu na ala. Ọ bụrụ na nke ahụ bụ obi anyị, anyị ga-eme ihe Jehova na-achọ mgbe nile ruo n’ókè kasị anyị pụrụ ime. Anyị apụghị iji obi eziokwu na-arịọ arịrịọ dị otú a ma ọ bụrụ na anyị adịghị etinyesi mgbalị ike ịhụ na e mere ihe Chineke na-achọ n’ọnọdụ nke anyị. Mgbe ahụ, ọ bụrụ na anyị na-ekpe ekpere n’ụzọ dị otú a, anyị kwesịrị iji n’aka na anyị adịghị eme ihe megidere nzube ahụ, dị ka isoro onye na-ekweghị ekwe na-eme mbedó ma ọ bụ ịnabata ụzọ nke ụwa. (1 Ndị Kọrịnt 7:39; 1 Jọn 2:15-17) Kama nke ahụ, anyị kwesịrị iburu n’uche mgbe nile echiche bụ, ‘Gịnị bụ uche Jehova n’okwu a?’ Ee, ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke n’anya site n’obi anyị dum, anyị ga-achọ nduzi ya n’ihe a na-eme ná ndụ.—Matiu 22:37.
Nri Ụbọchị Anyị
12. Ịrịọ maka nanị ‘nri ụbọchị’ nwere mmetụta ọma dị aṅaa n’ebe anyị nọ?
12 “Nye anyị nri taa nke ga-ezuru anyị n’ụbọchị taa.” (Matiu 6:11) Ihe ndekọ Luk na-agụ, sị: “Na-enye anyị nri kwa ụbọchị nke ga-ezuru anyị n’ụbọchị taa.” (Luk 11:3) Ịrịọ Chineke ka o nye anyị nri dị mkpa ‘n’ụbọchị taa’ na-akwalite okwukwe n’ikike o nwere ịhụ maka mkpa anyị site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị. Ndị Israel ga-atụtụta manna “nke otu ụbọchị n’ụbọchị ya,” ọ bụghị maka otu izu ma ọ bụ karịa. (Ọpụpụ 16:4) Nke a abụghị ekpere maka nri ndị mara abụba nke ukwuu ma ọ bụ inye nri n’ụba gabiga ókè kama ọ bụ maka ihe ndị na-akpa anyị kwa ụbọchị, ka ha na-ebilite. Ịrịọ maka nanị nri ụbọchị na-enyekwara anyị aka ịghara inwe anyaukwu.—1 Ndị Kọrint 6:9, 10.
13. (a) N’echiche nke gbasapụrụ agbasapụ, gịnị ka ọ pụtara bụ́ ịrịọ maka nri ụbọchị? (b) Gịnị kwesịrị ịbụ omume anyị, ọbụna ma ọ bụrụ na anyị arụsie ọrụ ike ma nwee nanị ihe ga-ezuru anyị iji na-adị ndụ?
13 N’echiche nke gbasapụrụ agbasapụ, ịrịọ maka nri ụbọchị na-egosi na anyị adịghị enwe echiche nke adabereghị n’ebe ọ bụla, kama na anyị na-elegara Chineke anya mgbe nile maka nri, ihe ọṅụṅụ, uwe, na ihe ndị ọzọ dị mkpa. Dị ka ndị òtù ezinụlọ nke ndị na-efe ya ofufe raara onwe ha nye, anyị na-atụkwasị Nna anyị obi ma anyị adịghị anọ nkịtị site n’ichere ya ka o nye anyị ihe n’ụzọ ọrụ ebube. Anyị na-arụ ọrụ ma na-eji ihe ọ bụla aka anyị pụrụ iru na ha nweta nri na ihe ndị ọzọ dị mkpa. Ma, n’ụzọ ziri ezi anyị na-ekele Chineke n’ekpere n’ihi na anyị na-ahụ nkwado nke ịhụnanya, amamihe, na ike nke Nna eluigwe anyị n’ihe onyinye ndị a. (Ọrụ 14:15-17; tụlee Luk 22:19.) Anyị ịrụsi ọrụ ike pụrụ ịrụpụta inwe ihe ịga nke ọma. Ma ọ bụrụgodi na anyị na-arụsi ọrụ ike ma na-enweta nanị ihe na-ezuru anyị, ka anyị nwee ekele na afọ ojuju. (Ndị Filipaị 4:12; 1 Timoti 6:6-8) N’ezie, onye na-asọpụrụ Chineke nke nwere nri na uwe oyiyi ndị na-adịghị oké ọnụ ahịa pụrụ inwe obi ụtọ nke ukwuu karịa ụfọdụ ndị ihe na-agara nke ọma n’ụzọ ihe onwunwe. Ya mere, ọbụna ọ bụrụ na anyị nwere ihe dị nta n’ihi ọnọdụ ndị anyị na-apụghị ime ihe ọ bụla banyere ha, ka anyị ghara ịda mbà n’obi. Anyị ka pụkwara ịba ọgaranya n’ime mmụọ. N’ezie, ọ dịghị anyị mkpa ịbụ ndị ihe kọọrọ n’okwukwe, olileanya, na ịhụnanya maka Jehova, bụ́ onye otuto na ekele anyị na-arịgokwuru site n’ekpere nke sitere n’ala ala obi.
Ịgbaghara Mmehie Anyị
14. Maka ụgwọ dị aṅaa ka anyị na-arịọ mgbaghara, gịnịkwa ka Chineke ji eme ihe n’ebe ha dị?
14 “Gbagharakwa anyị ụgwọ nile anyị ji, dị ka anyị onwe anyị gbagharawokwaara ndị ji anyị ụgwọ.” (Matiu 6:12) Ihe ndekọ Luk na-egosi na ụgwọ ndị ahụ bụ mmehie. (Luk 11:4) Mmehie e ketara eketa na-egbochi anyị ime ihe nile dị ka nzube zuru okè nke Nna anyị sị dị. Ya mere, a pụrụ ikwu na agazighị agazi ndị a abụrụwo ụgwọ, ma ọ bụ ihe anyị na-aghaghị ime nye Chineke, ebe ọ bụ na anyị amalitewo ‘ijegharị site na mmụọ nsọ.’ (Ndị Galetịa 5:16-25; tụlee Ndị Rom 7:21-25.) Anyị ji ụgwọ ndị a n’ihi na anyị ezughị okè, anyị apụghịkwa iru eru ugbu a n’ụkpụrụ nile nke Chineke. Ọ bụ maka mgbaghara nke mmehie ndị a ka anyị nwere ihe ùgwù nke ikpe ekpere. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, Chineke pụrụ iji uru nke àjà mgbapụta Jisọs mee ihe n’ụgwọ, ma ọ bụ mmehie ndị a.—Ndị Rom 5:8; 6:23.
15. Omume dị aṅaa ka anyị kwesịrị inwe banyere ịdọ aka ná ntị nke dị mkpa?
15 Ọ bụrụ na anyị lere anya ka Chineke gbaghara ụgwọ anyị ma ọ bụ mmehie, anyị aghaghị ịbụ ndị na-echegharị ma na-adị njikere ịnara ịdọ aka ná ntị. (Ilu 28:13; Ọrụ 3:19) N’ihi na Jehova hụrụ anyị n’anya, ọ na-enye anyị ịdọ aka ná ntị nke dị anyị mkpa n’onwe anyị ka anyị wee nwee ike imezi ihe banyere adịghị ike anyị dị iche iche. (Ilu 6:23; Ndị Hibru 12:4-6) Ee, anyị pụrụ inwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na ito uto n’okwukwe na n’ihe ọmụma emee ka obi anyị kwekọọ kpam kpam n’iwu na ụkpụrụ nile nke Chineke nke na anyị adịghị amara ụma mgbe ọ bụla na-emehie. Ma olee ma ọ bụrụ na anyị ahụ ókè ụfọdụ nke ịmara ụma mee ihe na-adịghị mma? Mgbe ahụ anyị kwesịrị ịbụ ndị o wutere nke ukwuu, anyị kwesịkwara ikpesi ekpere ike maka mgbaghara. (Ndị Hibru 10:26-31) N’itinye ndụmọdụ anyị nataworo n’ọrụ, anyị kwesịrị imezi ụzọ anyị ngwa ngwa.
16. N’ihi gịnị ka o ji baa uru ịnọgide na-arịọ Chineke maka ịgbaghara mmehie anyị?
16 Ịrịọ Chineke mgbe nile ka ọ gbaghara anyị mmehie anyị bara uru. Ime nke a na-eme ka mmehie anyị dịrị n’ihu anyị mgbe nile, o kwesịkwara inwe mmetụta nke mweda n’ala. (Abụ Ọma 51:3, 4, 7) Ọ dị anyị mkpa ka Nna anyị nke eluigwe “gbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị ajọ omume nile.” (1 Jọn 1:8, 9) Ọzọkwa, ịkpọtụ mmehie anyị aha n’ekpere na-enyere anyị aka ịnọgide na-agbasi mgba ike megide ha. Otú a, a na-echetakwara anyị mgbe nile banyere mkpa mgbapụta ahụ dị anyị na uru nke ọbara Jisọs wụsiri.—1 Jọn 2:1, 2; Mkpughe 7:9, 14.
17. Olee otú ịrịọ maka mgbaghara si enyere anyị aka ná mmekọrịta anyị na ndị ọzọ?
17 Ikpe ekpere maka mgbaghara na-enyekwara anyị aka inwe obi ebere, ime ebere na imesapụrụ ndị pụrụ iji anyị ụgwọ n’ihe ndị buru ibu na ndị dị nta aka. Ihe ndekọ Luk na-asị: “Gbagharakwa anyị mmehie nile anyị; n’ihi na anyị onwe anyị na-agbagharakwa onye ọ bụla nke ji anyị ụgwọ.” (Luk 11:4) N’ezie, anyị pụrụ inweta mgbaghara site n’aka Chineke nanị ma ọ bụrụ na anyị ‘agbagharawo ndị ji anyị ụgwọ,’ bụ ndị na-emehie megide anyị. (Matiu 6:12; Mak 11:25) Jisọs kwukwara, sị: “N’ihi na ọ bụrụ na unu agbaghara mmadụ ndahie nile ha, Nna unu ga-agbagharakwa unu. Ma ọ bụrụ na unu agbagharaghị mmadụ ndahie nile ha, Nna unu agaghị agbaghara unu ndahie unu.” (Matiu 6:14, 15) Ịrịọ maka mgbaghara nke mmehie anyị kwesịrị ịkpali anyị ịnagide ndị ọzọ na ịgbaghara ha. Pọl onyeozi dere, sị: “Ọbụna dị ka [Jehova, NW] weere amara gbaghara unu, unu onwe unu meekwa otú a.”—Ndị Kọlọsi 3:13; Ndị Efesọs 4:32.
Ọnwụnwa na Ajọ Onye Ahụ
18. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị ịta Chineke ụta mgbe ọ bụla maka ọnwụnwa na ule ndị anyị na-enwe?
18 “Ewebala anyị n’ime ọnwụnwa.” (Matiu 6:13; Luk 11:4) Okwu ndị a adịghị egosi na Jehova na-anwa anyị ime mmehie. Mgbe ụfọdụ Akwụkwọ nsọ na-ekwu banyere Chineke ime ihe ma ọ bụ ịkpata ihe ndị o kwere ka ha were ọnọdụ. (Rut 1:20, 21; tụlee Eklisiastis 11:5.) Ma Jemes onyeozi dere, sị: “Chineke bụ onye a na-apụghị iwere ihe ọjọọ nwaa ya, ya onwe ya adịghị anwakwa onye ọ bụla.” (Jemes 1:13) Ya mere, ka anyị ghara ịta Nna eluigwe anyị ụta mgbe ọ bụla maka ọnwụnwa na ule nke ihe ọjọọ, n’ihi na Setan bụ Onye Ọnwụnwa, onye na-achọ ime ka anyị mehie megide Chineke. —Matiu 4:3; 1 Ndị Tesalọnaịka 3:5.
19. Olee otú anyị pụrụ isi kpee ekpere banyere ọnwụnwa?
19 N’arịrịọ ahụ bụ, “Ewebala anyị n’ime ọnwụnwa,” anyị na-arịọ Jehova ka ọ ghara ikwe ka anyị kwenye mgbe a nwara ma ọ bụ rụgide anyị inupụrụ ya isi. Anyị pụrụ ịrịọ Nna anyị ka o duzie nzọụkwụ anyị ka ọnwụnwa ọ bụla nke sikarịịrị anyị ike ghara ịbịara anyị. N’akụkụ nke a, Pọl dere, sị: “Ọ dịghị ọnwụnwa ọ bụla nwaworo unu ma ọ bụghị nke mmadụ na-anagide: ma Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, onye na-agaghị ekwe ka a nwaa unu karịa nke unu pụrụ ịnagide; kama n’oge ọnwụnwa ahụ ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ, ka unu wee nwee ike ịnagide ya.” (1 Ndị Kọrint 10:13) Anyị pụrụ ikpe ekpere ka Jehova duzie anyị ka a ghara ịnwa anyị karịa ihe anyị pụrụ ịnagide, ka o gosikwa anyị ụzọ mgbapụ mgbe anyị nọ n’oké ihe isi ike. Ọnwụnwa na-esite n’aka Ekwensu, anụ ahụ anyị nke na-emehie emehie, na adịghị ike nke ndị ọzọ, ma Nna anyị nke na-ahụ n’anya pụrụ iduzi anyị ka ọ ghara irikpu anyị.
20. N’ihi gịnị ka a ga-eji kpee ekpere maka nnapụta pụọ n’aka “ajọ onye ahụ”?
20 “Kama dọpụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.” (Matiu 6:13) N’ezie, Chineke pụrụ igbochi Setan, bụ́ “ajọ onye ahụ,” ka ọ ghara imeri anyị. (2 Pita 2:9) Ọ dịbeghịkwa mgbe ọ bụla e nwere mkpa ka ukwuu maka nnapụta pụọ n’aka Ekwensu karịa otú e nwere ugbu a, n’ihi na ‘o nwere oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.’ (Mkpughe 12:12) Anyị abụghị ndị na-amaghị atụmatụ Setan, ya onwe ya makwaara adịghị ike anyị. N’ihi nke a, ọ dị anyị mkpa ikpe ekpere ka Jehova chebe anyị pụọ n’ike nke Onye Iro ahụ nke yiri ọdụm. (2 Ndị Kọrint 2:11; 1 Pita 5:8, 9; tụlee Abụ Ọma 141:8, 9.) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị nwere mmasị n’ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ịrịọ Jehova ka ọ napụta anyị site n’atụmatụ Setan na ọnwụnwa nke ịzụlite mmekọrịta ndị ụwa, bụ́ nke pụrụ iduje n’omume na-adịghị ọcha ma ọ bụ inupụrụ Chineke isi site n’ịlụ onye na-ekweghị ekwe. (Deuterọnọmi 7:3, 4; 1 Ndị Kọrint 7:39) Ànyị na-achọsi akụ na ụba ike? Mgbe ahụ ekpere pụrụ ịbụ ihe a chọrọ iji nyere anyị aka iguzogide ọnwụnwa nke ịgba chaa chaa ma ọ bụ igwu wayo. N’ọchịchọ ya siri ike imebi mmekọrịta anyị na Jehova, Setan ga-eji ngwá agha ọ bụla nke dị ná nkwakọba ngwá agha nke ọnwụnwa ya mee ihe. Ya mere, ka anyị nọgide na-ekpegara Nna anyị nke eluigwe ekpere, bụ́ onye na-adịghị agbahapụ ndị ezi omume mgbe ọ bụla ka a nwaa ha, onye na-eweta nnapụta pụọ n’aka ajọ onye ahụ.
Ekpere Na-ewulite Okwukwe na Olileanya
21. Olee otú anyị siworo rite uru site n’ikpe ekpere maka Alaeze ahụ?
21 Nna anyị nke eluigwe, bụ́ onye na-anapụta anyị pụọ n’aka ajọ onye ahụ, nwere mmasị n’ịgọzi anyị nke ukwuu. Ma, n’ihi gịnị ka o ji kwe ruo ogologo oge hà otú a ka ndị ọ hụrụ n’anya na-ekpe ekpere, sị, “Ka alaeze gị bịa”? Eri ọtụtụ afọ ndị ahụ gara aga, ikpe ekpere n’ụzọ dị otú a, amụbawo ọchịchọ na nghọta anyị maka Alaeze ahụ. Ekpere dị otú a na-echetara anyị banyere mkpa di ukwuu anyị nwere maka ọchịchị eluigwe nke a dị mma. Ọ na-edebekwa n’ihu anyị olileanya nke ndụ n’okpuru ọchịchị Alaeze.—Mkpughe 21:1-5.
22. Gịnị kwesịrị ịnọgide na-abụ omume anyị n’ebe ikpegara Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova ekpere dị?
22 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ekpere na-ewulite okwukwe n’ebe Jehova nọ. A na-eme ka ihe nkekọ dị n’etiti anyị na ya siwanye ike mgbe ọ zara ekpere anyị. Ya mere, ka ike ghara ịgwụ anyị n’ichigharikwuru ya kwa ụbọchị, na-eji otuto, ekele, na arịrịọ. Ka anyị nweekwa ekele maka nzaghachi na-enye aka nke Jisọs nyere n’arịrịọ ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Onyenwe anyị, zi anyị ikpe ekpere.”
Ị Na-echeta?
◻ Ihe ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ ịmụta site n’okwu na ihe nlereanya Jisọs dị ka nwoke nke na-ekpe ekpere?
◻ Gịnị ka anyị kwesịrị ikpe n’ekpere banyere Nna anyị nke eluigwe na aha ya?
◻ Gịnị ka anyị na-arịọ mgbe anyị na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa, ka e meekwa ihe ọ na-achọ n’ụwa?
◻ Gịnị ka anyị na-arịọ mgbe anyị na-ekpe ekpere maka nri ụbọchị?
◻ Gịnị ka anyị bu n’uche mgbe anyị na-ekpe ekpere maka mgbaghara nke ụgwọ ndị anyị ji?
◻ N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ikpe ekpere banyere ọnwụnwa na nnapụta pụọ n’aka Setan, bụ́ ajọ onye ahụ?
[Foto dị na peeji nke 16]
Ndị na-eso ụzọ Jisọs rịọrọ ya ka ọ kuziere ha otú e si ekpe ekpere. Ị maara otú anyị pụrụ isi rite uru site ná ntụziaka o nyere ha banyere ekpere?