Na-ejegharịnụ n”Ịtụ Egwu Jehova
“Ya mere [ọgbakọ ahụ] . . . na-abakwa ụba, ebe ọ na-aga n’egwu (Jehova, NW) na nkasi obi nke mmụọ nsọ.”—ỌRỤ 9:31.
1, 2. (a) Gịnị mere mgbe ọgbakọ ndị Kraịst banyere n’oge udo? (b) Ọ bụ ezie na Jehova na-ekwe ka mkpagbu dịrị, gịnị ọzọ ka ọ na-emekwa?
OTU onye na-eso ụzọ chere otu nnukwute ule ihu. Ọ̀ ga-anọgide n’ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke? Ee, ọ ga-eme nke ahụ! O jewo ije n’egwu Chineke, na-enwe oké egwu nke Onye Mere ya, ọ gajekwa ịnwụ dị ka onyeàmà kwesịrị ntụkwasị obi nke Jehova.
2 Onye ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nke na-atụ egwu Chineke bụ Stifen, “bụ́ nwoke nke jupụtara n’okwukwe na mmụọ nsọ.” (Ọrụ 6:5) Ogbugbu ya kpaliri oké mkpagbu, ma mgbe nke ahụ gasịrị, ọgbakọ nile dị na Judia, Galili, na Sameria banyere n’oge udo, e wulikwara ha elu n’ụzọ ime mmụọ. Ọzọkwa, ‘ebe ọ na-eje ije n’egwu Jehova na ná nkasi obi nke mmụọ nsọ, ọ nọgidere n’amụba.’ (Ọrụ 9:31) Dị ka Ndịàmà Jehova n’oge a, anyị pụrụ ijide n’aka na Chineke ga-agọzi anyị ma ànyị nọ n’udo ma ọ bụ na-enweta mkpagbu dị ka e gosiri ya n’Ọrụ Ndị Ozi isi 6 ruo 12. Ya mere, ka anyị jiri egwu na nsọpụrụ dị omimi nke Chineke na-eje ije mgbe a na-akpagbu anyị ma ọ bụ jiri ohere ọ bụla anyị nwere pụọ ná mkpagbu na-eme ihe maka iwuli onwe anyị elu n’ime mmụọ nakwa ịrụsikwu ọrụ ike n’ijere ya ozi.—Deuterọnọmi 32:11, 12; 33:27.
Ikwesị Ntụkwasị Obi Ruo Ọgwụgwụ
3. Nsogbu dị aṅaa ka e meriri na Jerusalem, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa?
3 Ọbụna ma a sị na nsogbu ebilite n’oge udo, ezi nhazi pụrụ inye aka iji dozie ha. (6:1-7) Ndị Juu na-asụ asụsụ Grik na Jerusalem mere mkpesa na a na-elefuru ndị nke ha bụ ndị inyom di ha nwụrụ anya ná nkesa nri a na-eme kwa ụbọchị ma na-emenyere ndị Juu kwere ekwe, bụ́ ndị na-asụ asụsụ Hibru. E doziri nsogbu nke a mgbe ndị ozi họpụtara ndị ikom asaa iji lekọta “ọrụ a dị mkpa.” Otu n’ime ha bụ Stifen.
4. Olee ụzọ Stifen si meghachi omume n’ebubo ụgha ndị e boro ya?
4 Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, Stifen ahụ na-atụ egwu Chineke chere otu ule ihu. (6:8-15) Ụfọdụ ndị bilitere wee soro Stifen rụrịta ụka. Ụfọdụ n’ime ha sitere “n’ụlọ nzukọ nke ndị Libatin (Ndị Nweere Onwe Ha, NW),” ndị bụ ma eleghị anya ndị Juu ndị Rom dọrọbuuru n’agha, ndị e mesịrị tọhapụ ma ọ bụkwanụ ndị na-eso ụzọ ndị Juu, ndị bụbu ndị ohu. Ebe ha na-enweghị ike iguzogide amamihe na mmụọ nsọ Stifen ji na-ekwu okwu, ndị iro ya kpọjere ya na Sanhedrin. N’ebe ahụ, ndị àmà ụgha kwuru, sị: ‘Anyị nụrụ ka nwoke a na-asị na Jisọs ga-akwatu ụlọ nsọ ahụ, gbanweekwa omenala nile ndị Moses nyere anyị n’aka idebe.’ Ma, ọbụna ndị na-emegide ya pụrụ ịhụ na Stifen abụghị onye na-eme ihe ọjọọ, kama ha hụrụ na ihu ya dị n’udo dị ka nke mmụọ ozi, bụ́ onyeozi nke Chineke onye maara onye na-akwado ya. Lee ka o si dị iche n’ihu nke ha, ebe ajọ ihe jupụtara ha n’obi, ha kwere ka Setan jiri ha mee ihe!
5. Isi ihe dịgasị aṅaa ka Stifen mere ka ọ pụta ìhè mgbe ọ na-agba àmà?
5 Mgbe Onyeisi nchụaja bụ Kaịafas jụrụ ya ajụjụ, Stifen ji anya ike gbaa àmà. (7:1-53) Ntụleghachi ọ tụleghachiri akụkọ ihe mere eme nke ndị Israel gosiri na Chineke zubere iwezụga Iwu na ije ozi ụlọ nsọ ahụ mgbe Mesaịa ahụ bịara. Stifen hotara na Moses, bụ́ onye mgbapụta nke ndị Juu nile na-ekwu na ha na-asọpụrụ, bụ onye ndị Israel jụrụ, ọbụna dị ka ha na-anakwereghị Onye ahụ nke na-ewetara ha nnapụta ka ukwuu ugbu a. Site n’ikwu na Chineke adịghị ebi n’ụlọ e ji aka wuo, Stifen gosiri na ụlọ ukwu ahụ na usoro ofufe ya ga-agabiga. Ma ebe ọ bụ na ndị na-ekpe ya ikpe adịghị atụ egwu Chineke ma ọ bụkwanụ chọọ ịmara nzube Ya, Stifen sịrị: ‘Ndị kwesiri olu ike, unu onwe unu na-alụ ọgụ megide mmụọ nsọ mgbe nile. Ònye n’ime ndị amụma ka nna unu hà na-esogbughị? Ha gburu ndị buru ụzọ kwusaa okwu banyere ọbịbịa nke Onye ezi omume ahụ, onye unu onwe unu ghọworo ndị raara ya nye, na ndị gburu ya.’
6. (a) Tupu ọ nwụọ, ahụmahụ dị aṅaa nke na-ewusi okwukwe ike ka Stifen nwere? (b) N’ihi gịnị ka o ji zie ezie ka Stifen kwuo, sị: “Onyenwe anyị Jisọs, nara mmụọ m nke ọma”?
6 Okwu ahụ Stifen kwuru n’atụghị egwu dujere n’ogbugbu ya. (7:54-60) Mkpughe nke a nke ikpe ọmụma na-adịkwasị ha n’ihi ọnwụ Jisọs kpasuru ndị ikpe ahụ iwe nke ukwuu. Ma lee ka e si wusie okwukwe Stifen ike mgbe o ‘legidere anya n’eluigwe wee hụ ebube Chineke na nke Jisọs ka ọ na-eguzo n’aka nri Ya’! Ugbu a, Stifen pụrụ iji obi ike chee ndị iro ya ihu, na-amata na ya emewo uche Chineke. Ọ bụ ezie na Ndịàmà Jehova adịghị ahụ ọhụụ, ma anyị pụrụ inwe udo dị otú ahụ nke Chineke na-enye mgbe a na-akpagbu anyị. Mgbe ha tụpụsịrị Stifen n’azụ Jerusalem ndị iro ya malitere ịtụ ya nkume, o wee mee mkpọku ahụ bụ: “Onyenwe anyị Jisọs, nara mmụọ m nke ọma.” Nke a kwesịrị ekwesị n’ihi na Chineke enyewo Jisọs ike ịkpọlite ndị ọzọ bịa ná ndụ. (Jọn 5:26; 6:40; 11:25, 26) Stifen gburu ikpere n’ala wee tie mkpu, sị: “[Jehova, NW] atụkwasịla mmehie a n’isi ha.” O wee daa n’ụra ọnwụ dị ka onye e gburu n’ihi okwukwe ya, otú ahụkwa ka ọtụtụ ndị na-eso ụzọ Jisọs ndị ọzọ meworo eri mgbe ahụ, ọbụna n’oge anyị a.
Mkpagbu Agbasaa Ozi Ọma ahụ
7. Gịnị si ná mkpagbu ahụ pụta?
7 N’ezie, ọnwụ Stifen rụpụtara mgbasa nke ozi ọma ahụ. (8:1-4) Mkpagbu chụsasịrị ndị nile na-eso ụzọ Jisọs ma e wezụgakwa ndị ozi ya, gaa n’ime Judia na Sameria nile. Sọl, onye kwadoro ogbugbu nke Stifen, tisasịrị ọgbakọ ahụ dị ka anụ ọhịa, na-awabanye site n’otu ụlọ gaa n’ụlọ ọzọ ije dọpụta ndị na-eso ụzọ Jisọs ka e wee tụọ ha mkpọrọ. Ka ndị ahụ na-eso ụzọ a chụsasịrị achụsasị nọgidere na-ekwusa ozi ọma, atụmatụ Setan nke ịkwụsị ndị mkpọsa Alaeze ahụ na-atụ egwu Chineke site n’ịkpagbu ha bụ nke e mere ka ọ kụọ afọ n’ala. Taa, e nwewokwa ọtụtụ mgbe mgbe mkpagbu gbasara ozi ọma ahụ ma ọ bụ mee ka a dọrọ uche ndị mmadụ bịa n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ.
8. (a) Gịnị ka ọrụ nkwusa a rụrụ na Sameria rụpụtara? (b) Pita si aṅaa jiri mkpịsị ugodi nke abụọ ahụ Jisọs nyeworo ya mee ihe?
8 Onye nkwusa ahụ bụ Filip jere Sameria ‘ikwusara ha banyere Kraịst.’ (8:5-25) Oké ọṅụ jupụtara n’obodo ahụ mgbe a na-akpọsa ozi ọma ahụ, na-achụpụ ndị mmụọ na-adịghị ọcha, na-agwọkwa ndị ọrịa. Ndị ozi nọ na Jerusalem dupụrụ Pita na Jọn ka ha jee Sameria, mgbe ha kpekwara ekpere wee bikwasị aka ha n’isi ndị ahụ e mere baptism, ndị ọhụrụ ahụ na-eso ụzọ natara mmụọ nsọ. Onye ahụ e mere baptism ọhụrụ bụ Saịmọn onye na-emebu mgbaasị nwara ịzụta ikike nke a, ma Pita gwara ya sị: ‘Ka ọlaọcha gị soro gị laa n’iyi. Obi gị ezighị ezi n’ihu Chineke.’ Mgbe a gwara ya ka o chegharịa ma rịọ Jehova mgbaghara, ọ rịọrọ ndị ozi ahụ ka ha kpeere ya ekpere. Nke a kwesịrị ịkwali ndị nile na-atụ egwu Jehova n’oge a ka ha kpee ekpere maka enyemaka Chineke iji chebe obi ha. (Ilu 4:23) (Ọ bụ n’ihe nke a merenụ ka e si nweta okwu Bekee ahụ bụ “simony,” nke pụtara “ịzụ ma ọ bụ ire ọkwá chọọchị ma ọ bụ nhọpụta ndị ụkọchukwu.”) Pita na Jọn kwusara ozi ọma ahụ n’ime ọtụtụ obodo nta nke ndị Sameria. Otú a, Pita jiri mkpịsị ugodi nke abụọ ahụ Jisọs nyere ya mee ihe iji meghee ụzọ nke ihe ọmụma na nke ohere ịbanye n’Alaeze eluigwe ahụ.—Matiu 16:19.
9. Ònye bụ onye Etiopia ahụ onye Filip gbaara àmà, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka a pụrụ iji mee nwoke ahụ baptism?
9 Mgbe ahụ mmụọ ozi Chineke nyere Filip ọrụ ọhụrụ. (8:26-40) Otu onye “onozi,” bụ́ onyeisi nke na-elekọta akụ eze nwanyị Etiopia bụ Kandesi nọ n’otu ụgbọ ala nke na-aga n’ogologo ụzọ ahụ si Jerusalem jee Geza. Ọ bụghị onye onozi n’anụ ahụ, bụ́ nke a na-agaghị ekwe ka ọ bata n’ọgbakọ ndị Juu, kama o jere Jerusalem ife ofufe dị ka onye na-eso ụzọ ndị Juu e biri úgwù. (Deuterọnọmi 23:1) Filip hụrụ ka onozi ahụ na-agụ site n’akwụkwọ Aịsaịa. Mgbe a kpọrọ ya ka ọ rịgota n’ụgbọ ala ahụ, Filip sooro ya tụlerịta amụma Aịsaịa ahụ ma ‘ziekwa ya ozi ọma banyere Jisọs.’ (Aịsaịa 53:7, 8) N’oge na-adịghị anya onye Etiopia ahụ tiri mkpu, sị: “Lee, mmiri; gịnị na-anapụ ime m baptism?” Ọ dịghị ihe gbochiri ya, ebe ọ bụ na ọ maara ihe banyere Chineke, o nwewokwa okwukwe ugbu a n’ebe Kraịst nọ. Ya mere, Filip mere onye Etiopia ahụ baptism, bụ́ onye jewere ebe ọ na-eje, na-aṅụrị ọṅụ. Ọ̀ dị ihe na-egbochi gị ime baptism?
A Tọghata Onye Mmegide
10, 11. Gịnị mere Sọl onye Tasọs mgbe ọ nọ n’ụzọ ije Damaskọs na n’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị?
10 Ka ọ dị ugbu a, Pọl chọrọ ụzọ ime ka ndị na-eso ụzọ Jisọs jụ okwukwe ha n’ihi iyi egwu nke ịtụ mkpọrọ ma ọ bụ ọnwụ. (9:1-18a) Onyeisi nchụaja ahụ (nke pụrụ ịbụworị Kaịafas) nyere ya akwụkwọ ozi ndị ọ ga-eji jee n’ụlọ nzukọ dị na Damaskọs, bụ́ ndị nyere ya ikike ike ndị ikom na ndị inyom agbụ, bụ́ ndị na-agbaso “Ụzọ a,” ma ọ bụ ụzọ ndụ nke dabeere n’ihe nlereanya nke Kraịst, wee dọkpụta ha na Jerusalem. N’ihe dị ka etiti ehihie, n’ebe dị nso Damaskọs, ìhè siri n’eluigwe gbuo àmụ̀mà, otu olu jụkwara, sị: “Sọl, gịnị mere ị na-esogbu m?” Ndị ha na Sọl so nụrụ “[ụda nke, NW] olu ahụ” ma ha aghọtaghị ihe o kwuru. (Tụlee Ọrụ 22:6, 9.) Mkpughe ahụ a kpaara ókè nke Jisọs ahụ e meworo ka ọ dị ebube zuru ezu ime ka Sọl kpuo ìsì. Chineke jiri onye ahụ na-eso ụzọ bụ Ananaịas mee ihe iweghachi ọhụhụ ụzọ ya.
11 Mgbe o mesịrị baptism, onye ahụ bụbu onye na-akpagbu ndị ọzọ ghọrọ onye a na akpagbu. (9:18b-25) Ndị Juu nọ na Damaskọs chọrọ igbufu Sọl. Otú ọ dị, n’anyasị, ndị na-eso ụzọ sitere n’otu oghere dị ná mgbidi ahụ weda ya n’ala, ma eleghị anya ná nnukwute ábọ́ nke e ji eriri na ahịhịa wee kpaa. (2 Ndị Kọrint 11:32, 33) Oghere ahụ pụrụ ịbụworị windo nke ụlọ otu onye na-eso ụzọ nke e wunyere ná mgbidi ahụ. Ọ bụghị ihe omume e ji ịtụ egwu na-enweghị isi mee iji gbanarị ndị iro ma nọgide na-ekwusa ozi ọma.
12. (a) Gịnị mere Sọl na Jerusalem? (b) Gịnị bụ ọnọdụ nke ọgbakọ ahụ?
12 Na Jerusalem, Banabas nyeere ndị na-eso ụzọ aka ịnabata Sọl dị ka onye kwere ekwe ibe ha. (9:26-31) N’ebe ahụ, Sọl sooro ndị Juu na-asụ asụsụ Grik rụrịta ụka n’atụghị egwu, bụ́ ndị nwakwara igbu ya. N’ịchọpụta nke a, ụmụnna ahụ kpọọrọ ya jee Sizaria, wee zipụ ya jee Tasọs, bụ́ obodo ya nke dị na Silisia. N’oge ahụ, ọgbakọ dum dị na Judia, Galili, na Sameria “nwere udo, ebe a na-ewuli [ha] elu dị ka ụlọ” n’ụzọ ime mmụọ. Ebe ọ bụkwa na ọ ‘na-ejegharị n’ịtụ egwu Jehova na ná nkasi obi nke mmụọ nsọ, ọ nọgidere na-amụba.’ Lee nnọọ ezi ihe nlereanya nke a bụụrụ ọgbakọ dị iche iche taa ka ha wee nweta ngọzi Jehova!
Ndị Jentaịl Aghọọ Ndị Kwere Ekwe!
13. Ọrụ ebube dịgasị aṅaa ka Chineke nyere Pita ike ịrụ n’obodo Lida na Jọpa?
13 Pita nọgidekwara na-arụ ọrụ. (9:32-43) N’obodo Lida (nke a na-akpọ Lod ugbu a) nke dị n’Ọzara Sherọn, ọ gwọrọ Ineas onye akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọgwụgwọ nke a mere ka ọtụtụ ndị chigharịkwute Onyenwe anyị. Na Jọpa, onye ahụ na-eso ụzọ a hụrụ n’anya bụ Tabita (Dọkas) dara ọrịa wee nwụọ. Mgbe Pita bịarutere, ụmụ nwanyị di ha nwụrụ ndị na-akwa ákwá gosiri ya uwe ndị Dọkas mere, ndị ha na-eyikwa. O mere ka Dọkas dịghachi ndụ, mgbe akụkọ banyere nke a gbasakwara, ọtụtụ ndị ghọrọ ndị kwere ekwe. Pita nọrọ na Jọpa n’ụlọ Saịmọn, onye na-edozi akpụkpọ anụ, onye ụlọ ya dị n’ụsọ oké osimiri. Ndị na-edozi akpụkpọ anụ na-abanye akpụkpọ anụ n’osimiri, jirikwa mmiri oroma nkịrịsị sachaa ha tupu a kpụchapụ ajị́ ha. Ha na-eme ka akpụkpọ anụ ndị ahụ ghọọ leather site n’ịbanye ha ná mmiri sitere n’osisi dị iche iche.
14. (a) Ònye bụ Kọniliọs? (b) Gịnị bụ eziokwu banyere ekpere ndị Kọniliọs kpere?
14 N’oge ahụ (36 O.A.), e nwere otu oké ihe mere n’ebe ọzọ. (10:1-8) Otu onye Jentaịl nke ji okpukpe kpọrọ ihe bi na Sizaria, bụ́ Kọniliọs, onye bụ ọchịagha onye Rom nke na-achị ihe dị ka otu narị ndị ikom. Ọ bụ onyeisi nke “òtù ndị agha ahụ a na-akpọ òtù Itali,” nke o yiri ka ihe mejupụtara ya ọ̀ bụ ndị e weere n’ọrụ agha site n’etiti ụmụ amaala Rom na ndị nweere onwe ha bi n’Italy. Ọ bụ ezie na Kọniliọs bụ onye na-atụ egwu Chineke, ma ọ bụghị onye na-eso ụzọ ndị Juu. N’otu ọhụụ, otu mmụọ ozi gwara ya na ekpere ya nile “rịgoro ịbụ ihe ncheta n’ihu Chineke.” Ọ bụ ezie na Kọniliọs ararabeghị onwe ya nye Jehova n’oge ahụ, ọ natara azịza nye ekpere ya. Ma dị ka mmụọ ozi ahụ tụziiri ya aka, o ziri ozi ka a kpọọ Pita.
15. Gịnị mere mgbe Pita nọ na-ekpe ekpere n’elu ụlọ nke ụlọ Saịmọn?
15 N’otu oge ahụ, Pita hụrụ otu ọhụụ mgbe ọ na-ekpe ekpere n’elu ụlọ Saịmọn. (10:9-23) N’otu ọhụụ, ọ hụrụ otu ihe dị mbadamba nke si n’eluigwe na-arịdata nke ihe jupụtara ya bụ anụ dị iche iche nwere ụkwụ anọ, ihe na-akpụ akpụ na nnụnụ ndị na-adịghị ọcha. Mgbe a gwara ya ka o gbuo ma rie, Pita sịrị na ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ya riri ihe rụrụ arụ. A gwara ya, sị, “Ihe Chineke mere ka ha dị ọcha, gị onwe gị emela ha ihe rụrụ arụ.” Ọhụụ ahụ gbagwojuru Pita anya, ma ọ gbasoro nduzi nke mmụọ ahụ. Otú a, ya na ụmụnna isii bụ ndị Juu sooro ndị ahụ Kọniliọs dunyere ozi wee jee. —Ọrụ 11:12.
16, 17. (a) Gịnị ka Pita gwara Kọniliọs na ndị ahụ zukọtara n’ụlọ ya? (b) Gịnị mere mgbe Pita ka kpụ okwu n’ọnụ?
16 Ugbu a, ndị Jentaịl mbụ gaje ịnụ ozi ọma ahụ. (10:24-43) Mgbe Pita na ndị so ya rutere na Sizaria, Kọnilịọs, ndị ikwu ya, ezi ndị enyi ya, nọ na-eche ya eche. Kọniliọs dara n’ala n’ụkwụ Pita, ma onyeozi ahụ ji obi dị umeala jụ ịnara ofufe dị otú ahụ. O kwuru okwu banyere otú Jehova si jiri mmụọ nsọ na ike tee Jisọs mmanụ dị ka Mesaịa ahụ ma kọwaa na onye ọ bụla nke tinyere okwukwe n’ebe ọ nọ ga-enweta mgbaghara nke mmehie.
17 Ugbu a, Jehova mere ihe. (10:44-48) Mgbe Pita ka kpụ okwu n’ọnụ, Chineke wụsara mmụọ nsọ ya n’ahụ ndị Jentaịl ahụ kwere ekwe. Kpọmkwem n’ebe ahụ, ha ghọrọ ndị e ji mmụọ Chineke mụta, a kpalikwara ha ịsụ asụsụ dị iche iche na inye ya otuto. Ya mere, e mere ha baptism n’aha Jisọs Kraịst n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Otú ahụ ka o si bụrụ na Pita jiri mkpịsị ugodi nke atọ megheere ndị Jentaịl na-atụ egwu Chineke ụzọ nke ihe ọmụma na nke ohere ịbanye n’ime Alaeze eluigwe ahụ. —Matiu 16:19.
18. Olee otú ụmụnna bụ ndị Juu si meghachi omume mgbe Pita kọwara na ‘e jiri mmụọ nsọ mee ndị Jentaịl baptism’?
18 Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, na Jerusalem, ndị na-akwado obibi úgwù sooro Pita rụrịta ụka. (11:1-18) Mgbe ọ kọwara otú ndị Jentaịl si bụrụ ndị ‘e ji mmụọ nsọ mee baptism,’ ụmụnna ya ndị Juu kpuchiri ọnụ ha wee nye Chineke otuto, na-asị: “Ya mere ọ bụkwa ndị mba ọzọ ka Chineke nyere nchegharị nke na-eduba ná ndụ.” Anyị onwe anyị kwesịkwara ịdị na-anakwere ihe mgbe e mere ka nzube Chineke doo anyị anya.
E Guzobere Ọgbakọ nke Ndị Jentaịl
19. Ò si aṅaa bụrụ na a malitere ịkpọ ndị ahụ na-eso ụzọ ndị Kristian?
19 Ugbu a, e guzobere ọgbakọ mbụ nke ndị Jentaịl. (11:19-26) Mgbe a chụsasịrị ndị na eso ụzọ n’ihi mkpagbu ahụ bilitere n’ihe banyere Stifen, ụfọdụ ndị jere Antiọk, Siria, bụ́ nke a maara nke ọma maka ofufe na-adịghị ọcha na àgwà rụrụ arụ a na-akpa n’ebe ahụ. Ka ha nọ na-ekwusa ozi ọma ahụ gwa ndị bi n’ebe ahụ, bụ́ ndị na-asụ asụsụ Grik, ‘aka Jehova dịnyeere ha,’ ọtụtụ ndị ghọkwara ndị kwere ekwe. Banabas na Sọl ziri ihe n’ebe ahụ ruo otu afọ, “ọ bụkwa n’Antiọk ka e buru ụzọ [site ná nduzi Chineke, NW] kpọọ ndị na-eso ụzọ Jisọs ndị Kristian.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ Jehova duziri ka a kpọọ ha aha dị otú ahụ, ebe ọ bụ na okwu Grik ahụ bụ́ khre·ma·tiʹzo pụtara “ịbụ nke a kpọrọ site ná nduzi Chineke,” a na-ejikarịkwa ya eme ihe n’Akwụkwọ nsọ n’ihe banyere ihe sitere n’ebe Chineke nọ.
20. Gịnị ka Agabọs buru n’amụma, oleekwa otú ọgbakọ ahụ dị n’Antiọk si meghachi omume?
20 Ndị amụma na-atụ egwu Chineke bịakwara Antiọk site na Jerusalem. (11:27-30) Otu n’ime ha bụ Agabọs, onye gosiri “site ná mmụọ nsọ na oké ụnwụ gaje ịda n’elu ụwa dum mmadụ bi.” Amụma ahụ mezuru n’oge ọchịchị nke eze Rom bụ Klọdiọs (41-54 O.A.), odeakụkọ ihe mere eme bụ Josephus zokwara aka ‘n’oké ụnwụ’ nke a. (Jewish Antiquities, XX, 51 [ii, 5]; XX, 101 [v, 2]) N’ịbụ ndị a kpaliri site n’ịhụnanya, ọgbakọ ahụ dị n’Antiọk zijeere ụmụnna nọ na Judia onyinye.—Jọn 13:35.
Mkpagbu Enweghị Ihe Ịga nke Ọma
21. Gịnị ka Herọd Agripa nke Mbụ mere megide Pita, ma gịnị si na nke a pụta?
21 Oge udo ahụ gwụsịrị mgbe Herọd Agripa nke Mbụ malitere ịkpagbu ndị na-atụ egwu Jehova na Jerusalem. (12:1-11) Herọd jiri mma agha gbuo Jemes, ma eleghị anya na-ebepụ ya isi dị ka onyeozi mbụ e gburu n’ihi okwukwe ya. Mgbe ọ hụrụ na nke a masịrị ndị Juu, Herọd tụbara Pita n’ụlọ mkpọrọ. Ma e leghị anya e kere onyeozi ahụ agbụ ígwè ma kegide ya n’aka ndị agha guzo n’akụkụ ya abụọ, ebe ndị agha abụọ ndị ọzọ na-eche ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ya nche. Herọd mere atụmatụ igbu ya mgbe Ememe Ngabiga na ụbọchị achịcha ekoghị eko (Naịsan 14-21) gasịrị, ma a zara ekpere ọgbakọ ahụ na-ekpere ya n’oge kwesịrị nnọọ ekwesị, ọbụna dị ka a na-azakwa nke anyị ọtụtụ mgbe. Nke a mere mgbe mmụọ ozi Chineke tọhapụrụ onyeozi ahụ n’ụzọ ọrụ ebube.
22. Gịnị mere mgbe Pita jere n’ụlọ nne Mak, bụ́ Meri?
22 N’oge na-adịghị anya, Pita nọ n’ụlọ Meri (bụ́ nne Jọn Mak), nke ihe àmà gosiri na ọ bụ ebe ndị Kraịst na-ezukọ. (12:12-19) N’abalị ahụ, nwa agbọghọ nta na-eje ozi nke aha ya bụ Roda matara olu Pita ma hapụ ya n’ọnụ ụzọ ama ahụ nke a kpọchiri akpọchi. Ná mmalite, ndị ahụ na-eso ụzọ pụrụ icheworịị na Chineke ezitewo mmụọ ozi nke na-anọchi anya Pita, nke na-ekwukwa okwu n’olu yiri nke ya. Otú ọ dị, mgbe ha nabatara Pita, ọ gwara ha ka ha jee kọọrọ Jemes na ụmụnna ndị ahụ (ma eleghị anya ndị okenye) banyere nnapụta ya. O wee hapụ ha zopu n’ekwughị ebe ọ na-eje ka ọ ghara itinye ha ma ọ bụ ya onwe ya n’ihe ize ndụ ma ọ bụrụ na a jụọ ha ajụjụ. Herọd chọgharịrị Pita n’efu, e wee taa ndị nche ahụ ahụhụ, ọbụna gbuo ha egbuo ma eleghị anya.
23. Olee otú ọchịchị nke Herọd Agripa nke Mbụ si gwụsịa, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a?
23 N’afọ 44 O.A. ọchịchị nke Herọd Agripa nke Mbụ kwụsịrị na mberede na Sizaria mgbe ọ gbara 54 afọ. (12:20-25) O nwere ọchịchọ ibu agha megide ndị Finisia si Taịa na Saịdọn, bụ́ ndị nyere ohu ya bụ Blastọs ego ka o wee dokwaa nzukọ ebe ha ga-anọ rịọ ka e kpezie. ‘N’ụbọchị ahụ a kara aka’ (bụkwa ụbọchị ememe e ji asọpụrụ Klọdịọs Siza), Herọd yikwasịrị onwe ya uwe onyeeze, nọkwasị n’oche ikpe, wee malite ikwu okwu n’ihu ọha. Ná nzaghachi, ìgwè mmadụ ahụ tiri mkpu, sị: “Ọ bụ olu chi, ọ bụghịkwa olu nke mmadụ.” N’otu ntabi anya ahụ, mmụọ ozi Jehova tiri ya ihe “n’ihi na o nyeghị Chineke otuto ahụ.” “Ikpuru wee tagbuo [Herọd], o wee kubie ume.” Ka ihe nlereanya ịdọ aka ná ntị nke a kpalie anyị ịnọgide na-eje ije n’egwu Jehova, na-ajụ ime mpako, ma na-enyekwa ya otuto maka ihe anyị na-eme dị ka ndị ya.
24. Gịnị ka isiokwu nke ga-abịa n’ọdịnihu ga-egosi banyere mmụba?
24 N’agbanyeghị mkpagbu sitere n’aka Herọd, “okwu [Jehova, NW] na-aga n’ihu, na abakwa ụba.” N’eziokwu, dị ka otu isiokwu ga-abịa n’ọdịnihu ga-egosi, ndị ahụ na-eso ụzọ pụrụ ịtụ anya inwekwu mmụba. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? N’ihi na ha ‘jegharịrị n’egwu Jehova.’
Ị Ga-esi Aṅaa Zaghachi?
◻ Stifen si aṅaa gosi na ya na-atụ egwu Jehova, dịkwa ka ọtụtụ ndị ohu Chineke meworo eri mgbe ahụ?
◻ Mmetụta dị aṅaa ka ọnwụ Stifen nwere n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ, nke a ò nwekwara ihe yiri ya n’oge a?
◻ N’ụzọ dị aṅaa ka onye mmegide ahụ bụ Sọl onye Tasọs si ghọọ onye na-atụ egwu Jehova?
◻ Òle ndị bụ ndị Jentaịl mbụ kwere ekwe?
◻ Olee otú Ọrụ Ndị Ozi isi 12 si gosi na mkpagbu adịghị akwụsị ndị na-atụ egwu Jehova?
[Foto dị na peeji nke 16, 17]
Otu ìhè sitere n’eluigwe gbuo àmụ̀mà, otu olu wee jụọ, sị: “Sọl, Sọl, gịnị mere ị na-esogbu m?”