Ịnọ Ná Ntụkwasị Obi N’ụwa Dum Ọ̀ Bụ n’Ụzọ Dị Aṅaa?
CHEEDỊ echiche ihe ọ ga-abụ ibi n’ụwa ebe a na-enweghị ihe ize ndụ na ụkọ ihe ọ bụla. Nke ahụ bụ ihe ịnọ ná ntụkwasị obi n’ụwa dum pụtara. Ọ̀ bụ nrọ efu?
Ee e. Tụlee ihe banyere oge nke Eze Solomọn oge ochie. N’ihe banyere ọchịchị amamihe ya, Bible kwuru, sị: “Juda na Israel wee biri ná ntụkwasị obi, nwoke ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya, . . . ụbọchị nile nke Solomọn.”—1 Ndị Eze 4:25.
Ihe Mmụta Site n’Ọchịchị Solomọn
Ndị na-arụ ụka na-elefuru ihe ndekọ Bible ndị pụrụ iche dị ka nke dị n’elu ebe a anya dị ka ihe e kwuru gabiga otú o mere n’ezie. Otú a, mmadụ pụrụ ịjụ, sị: ‘M̀ pụrụ isi aṅaa jide n’aka na ọchịchị Solomọn abụghị akụkọ ifo nkịtị?’ E wepụtara ihe àmà ndị na-apụtachaghị ìhè, bụ́ ndị sitere n’ọkà igwupụta ihe mgbe ochie ndị e liri n’ala, ná ngwụcha nke isiokwu a. N’ezie, ihe àmà kasị mma nke na-egosi na ọchịchị Solomọn dịrị adị n’ezie bụ nke ahụ a kọrọ n’Okwu Chineke ahụ dị ndụ, bụ́ Jehova, nke na-adịghị ada ada mgbe ọ bụla.—Jọn 17:17; 1 Pita 1:24, 25.
Isi ihe kpatara ịnọ ná ntụkwasị obi nke ndị mmadụ nwere n’okpuru ọchịchị Solomọn dabeere n’itinye iwu ezi omume nile nke Jehova n’ọrụ. Tupu ndị Israel abanye n’Ala Nkwa ahụ, Chineke ekwuwo, sị: ‘Ọ bụrụ na unu anọgide na-eje ije n’ụkpụrụ m nile, na-edebekwa ihe nile m nyere n’iwu, ala ahụ ga-emepụtara unu ihe n’ezie. Unu ga-ebikwa ná ntụkwasị obi n’ala unu. M ga-etinyekwa udo n’ala ahụ, unu ga-edinakwa ala, ọ dịghị onye ga-emekwa ka unu maa jijiji.’—Levitikọs 26:3-6.
Ọ bụ ihe dị mwute na mgbe Solomọn nwụsịrị, ndị Israel kwụsịrị irubere Jehova isi; ha chigharikwuuru ikpere arụsị na ofufe mmekọahụ rụrụ arụ. N’ihi nke a, ha tụfuru ịnọ ná ntụkwasị obi ha, Fero Shaịshak nke Ijipt wakwasịrị ala ha. (1 Ndị Eze 14:21-26) Jehova kọwaara otu nzukọ nke ndị ọchịchị nọ na Jerusalem, sị, “Unu onwe unu ahapụwo m, ọzọkwa, mụ onwe m ahapụwo unu n’aka Shaịshak.”—2 Ihe Emere 12:5.
Onye Ka Solomọn Ukwuu
Jisọs kwadoro ịbụ eziokwu nke akụkọ ihe mere eme banyere Solomọn na “ebube ya nile.” (Matiu 6:29) Ma n’ihe banyere ya onwe ya, Jisọs sịrị: “Lee, onye ka Solomọn nọ n’ebe a.” (Matiu 12:42) Gịnị ka okwu ya pụtara? Ịnọ ná ntụkwasị obi nke e nwetara n’okpuru ọchịchị Solomọn bụ nke a kpaara ókè. Onyeeze ahụ bụ mmadụ apụghị ịtọhapụ ndị ọ na-achị site n’ọrịa, mmehie, na ọnwụ. Otú ọ dị, Jisọs kuziiri ụmụ mmadụ na-emehie emehie otú ha pụrụ isi nweta ndụ nke izu okè n’ịnọ ná ntụkwasị obi nke na-adịru mgbe ebighị ebi.—Jọn 10:10; 13:34, 35; 17:3.
A tọrọ ntọala nke inweta ịnọ ná ntụkwasị obi dị otú ahụ nke zuru ebe nile site n’ọnwụ na mbilite n’ọnwụ nke Jisọs. (Jọn 3:16; 1 Ndị Kọrint 15:20) Site n’aka nri Chineke n’eluigwe, n’oge na-adịghị anya, ọ ga-eweta ịnọ ná ntụkwasị obi zuru ụwa dum nye ndị nile na-edo onwe ha n’okpuru ọchịchị ya. A kpaliri Eze Devid nke oge ochie ide banyere nke a n’Abụ Ọma ya nke Abụ Ọma 72. Okwu ndị a nwere mmezu a kpaara ókè n’oge ọchịchị nke nwa Devid, ọ bụ ya kpatara e ji dee n’elu ya, “Abụ Ọma nke Solomọn.” Otú o sina dị, mmezu ya nke bụ isi metụtara ọchịchị Alaeze nke Solomọn ahụ ka Ukwuu, bụ́ Jisọs Kraịst.
Dị ka Abụ Ọma 72:7, 8 si kwuo, ịnọ ná ntụkwasị obi nke a ga-enwe n’okpuru ọchịchị Kraịst ga-abụ nke zuru ụwa ọnụ, na-adịrukwa mgbe ebighị ebi. “Onye ezi omume ga-ama akwụkwọ n’ụbọchị nile ya dị ka osisi ndụ; ọtụtụ udo ga-adịkwa ruo mgbe ọnwa agaghị adị. Ya nweekwa ike n’ahụ mmadụ site n’otu oké osimiri ruo oké osimiri ọzọ, sitekwa n’Osimiri ruo nsọtụ nile nke ụwa.”—Tụlee Zekaraịa 9:9, 10.
Ndị nọ n’okpuru ọchịchị Kraịst ga-enwerekwa onwe ha pụọ n’ụkọ ihe, n’ihi na Abụ Ọma 72:16 kwere anyị nkwa, sị: “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.” Dị ka a pụrụ ịtụ anya ya, mmadụ ga-enwerekwa onwe ya pụọ n’ịkpa ókè, mkpagbu, na ime ihe ike. “N’ihi na ọ ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha; Ọbara ha ga-adịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya.”—Abụ Ọma 72:12, 14.
Dị ka ọ dị n’oge Eze Solomọn, ntọala nke ịnọ ná ntụkwasị obi zuru ụwa ọnụ dị otú ahụ ga-abụ iji amamihe na-etinye iwu eluigwe na ala nile nke Jehova n’ọrụ. Nke a ga-abụ ná nzaghachi nye arịrịọ ahụ Devid rịọrọ n’ụzọ amụma, sị: “Chineke, nye eze ikpe gị nile, . . . ọ ga-ekpe ndị e wedara n’ala n’etiti ndị gị ikpe, ọ ga-enye ụmụ nke ogbenye nzọpụta, zọpịakwa onye mmegbu.”—Abụ Ọma 72:1, 4.
Gịnị Banyere Mkpa Ndị Anyị Nwere n’Oge A?
Mmadụ pụrụ ikwu, sị, ‘Ihe ndị ahụ nile dị nnọọ mma, ma achọrọ m ịnọ ná ntụkwasị obi n’onwe m ugbu a.’ N’eziokwu, ndị Kraịst ka na-echekwa ọnọdụ anọghị ná ntụkwasị obi ihu, bụ́ nke na-eti ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti —imempụ, ọrịa, ọdachi ndị na-eme n’onwe ha, ịka nká, na ọnwụ. Otú ọ dị, ahụmahụ a na-enwe site n’akụkụ ụwa dum egosiwo na, site n’ihe ọmụma Bible, ha na-enwe ike ịnagide ya nke ọma karị. (Ilu 15:1; 22:3) Ọzọkwa, ha nwere afọ ojuju nke inwe olileanya dị irè. Otu onye malitere ịmụ Bible ọhụrụ site n’otu ógbè nke jupụtara n’imempụ na Johannesburg, South Africa, kọwara otu ụzọ nke Akwụkwọ nsọ siworo nyere ya aka: “Ugbu a, amaara m na imempụ abụghị ihe na-adịgide adịgide; ọ na-adịru nanị nwa oge.”
Ee, e nwere olileanya ọbụna maka ndị ahụ nwụworo site n’ime ihe ike nke ndị omempụ. Jisọs kwere nkwa, sị, “Mụ onwe m bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ,” wee kwuokwa, sị: “Onye na-ekwere na mụ, ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.”—Jọn 11:25.
Iji nweta mmetụta nke ịnọ ná ntụkwasị obi dị otú ahụ, ọ dị mkpa ka i nwee okwukwe siri ike, nke na-abịa site n’ịmụ Okwu Jehova. Site n’iwepụta oge kwa ụbọchị iji mụọ Bible, ị pụrụ inweta mmezu nke nkwa nke a dị ebube: “Ma onye na-ege m ntị ga-ebi ná ntụkwasị obi, ọ ga-anọkwa jụụ n’atụghị oké egwu ihe ọjọọ.”—Ilu 1:33; 2:21, 22.
[Igbe dị na peeji nke 6]
“N’okpuru ọchịchị Solomọn, ọnọdụ ihe onwunwe ndị Israel gara n’ihu n’ime iri afọ atọ karịa ka ọ gara n’ime narị afọ abụọ nke bu ya ụzọ. Anyị na-achọpụta site n’ihe ndị e gwupụtara n’ala, bụ́ ndị dịrị n’oge Solomọn ihe ndị fọdụrụ site n’oké ihe owuwu dị iche iche, oké obodo ukwu dị iche iche, ndị nwere nnukwute mgbidi ájá, mgbasapụ nke ógbè ebe obibi dị iche iche ndị nwere nchịkọta ụlọ obibi dị iche iche e wuru nke ọma nke ndị bara ọgaranya, oké ọganihu site na nkà nke ndị na-akpụ ite na usoro ndị ha ji eme ihe. Anyị chọtakwara ihe nkà dị iche iche ndị nọchiri anya ihe ndị e mepụtara site n’ebe ndị dị anya, bụ́ ihe àmà nke azụmahịa mba na mba.”—The House of David, nke Jerry M. Landay dere.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 5]
NASA photo