Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 6/15 p. 21-25
  • Kpọsaa Alaeze Jehova N’atụghị Egwu!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kpọsaa Alaeze Jehova N’atụghị Egwu!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • O Wuliri Ndị Kwere Ekwe Ibe Ya Elu
  • Ka E Mee Ihe Jehova Na-achọ
  • Igwè Mmadụ Mesoro Ya Ihe Ike ma Ọ Laghị Azụ
  • Atụghị Egwu n’Ihu Ndị Isi Ọchịchị
  • Ihe Ize Ndụ n’Oké Osimiri!
  • Nọgide Na-ekwusa Alaeze Jehova!
  • “Ana M Arịọ Ka Siza Kpegharịa Ikpe M!”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Nwee Obi Ike, Jehova Bụ Onye Na-enyere Gị Aka
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • “Achọrọ M Ka Siza Kpee Ikpe A”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • “Obi Sie Gị Ike”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 6/15 p. 21-25

Kpọsaa Alaeze Jehova N’atụghị Egwu!

“Ọ . . . na-anarakwa ndị nile bịakwutere ya, na-ekwusa alaeze Chineke.’—ỌRỤ 28:30, 31.

1, 2. Ihe àmà dị aṅaa nke nkwado Chineke ka Pọl onyeozi nwere, ihe nlereanya dịkwa aṅaa ka o setịpụrụ?

JEHOVA na-akwado ndị nkwusa Alaeze mgbe nile. Lee nnọọ ka nke ahụ si bụrụ eziokwu n’ihe banyere Pọl onyeozi! Site ná nkwado Chineke, o guzoro n’ihu ndị ọchịchị, nagide ihe omume nke ìgwè ndị na-eme ihe ike, kwusaakwa Alaeze Jehova n’atụghị egwu.

2 Ọbụna mgbe ọ bụ onye mkpọrọ na Rom, Pọl “na-anarakwa ndị nile bịakwutere ya, na-ekwusa alaeze Chineke.” (Ọrụ 28:30, 31) Lee nnọọ ezi ihe nlereanya ọ bụụrụ Ndịàmà Jehova taa! Anyị pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu site n’ije ozi Pọl dị ka Luk kọrọ akụkọ banyere ya n’isiakwụkwọ ndị ikpeazụ nke akwụkwọ Bible ahụ bụ Ọrụ Ndị Ozi.—20:1-28:31.

O Wuliri Ndị Kwere Ekwe Ibe Ya Elu

3. Gịnị mere na Troas, myirịta dị aṅaa ka a pụkwara ịhụ n’etiti ya na oge anyị a?

3 Mgbe ụzụ ahụ a na-eme n’Efesọs dajụrụ, Pọl gara n’ihu na njem ozi ala ọzọ ya nke atọ. (20:1-12) Otú ọ dị, mgbe ọ na-akwadebe ịbanye n’ụgbọ mmiri ije Siria, ọ nụrụ na ndị Juu emewo atụmatụ megide ya. Ebe ọ pụrụ ịbụ na ha emewo atụmatụ ịbanyekwa n’otu ụgbọ ahụ ma gbuo Pọl, o si Masedọnia wee jee. Na Troas, ọ nọrọ otu izu n’ebe ahụ, na-ewuli ndị kwere ekwe ibe ya elu dị ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị n’etiti Ndịàmà Jehova na-eme n’oge a. N’anyasị ga-abọ ụbọchị ọ ga-ahapụ ebe ahụ, Pọl kwuuru okwu ruo etiti abalị. Yutikọs na-anọdụ na windo, ma eleghị anya na-abụ onye ike gwụchasịrị n’ihi ndọgbu ọ dọgburu onwe ya n’ọrụ n’ụbọchị ahụ. Mgbe ụra buuru ya, ọ dapụrụ, wee site n’okpukpu ụlọ nke atọ daa n’ala wee nwụọ, ma Pọl weghachiri ya ná ndụ. Lee nnọọ ọṅụ nke a ga-akpataworị! Ya mere, chee echiche ụdị ọṅụ a ga-enwe mgbe a kpọlitere ọtụtụ nde mmadụ n’ọnwụ n’ime ụwa ọhụrụ ahụ nke na-abịanụ.—Jọn 5:28, 29.

4. N’ihe banyere ozi ahụ, gịnị ka Pọl kuziiri ndị okenye nọ n’Efesọs?

4 Mgbe ọ nọ na-eje Jerusalem, Pọl sooro ndị okenye si Efesọs nwee nzukọ na Militọs. (20:13-21) O chetaara ha na ya ziri ha ihe ‘site n’ụlọ ruo n’ụlọ,’ na ya ‘gbakwara àmà nke ọma nye ma ndị Juu ma ndị Grik, banyere nchegharị n’ebe Chineke nọ na okwukwe n’ebe Onyenwe anyị Jisọs nọ.’ Ndị ahụ mesịrị bụrụ ndị okenye echegharịworị, ha nwekwara okwukwe. Onyeozi ahụ anọwokwa na-enye ha ọzụzụ ikwusa Alaeze ahụ n’atụghị egwu gwa ndị na-ekweghị ekwe n’ozi site n’ụlọ ruo n’ụlọ dị ka nke ahụ Ndịàmà Jehova na-eje taa.

5. (a) Olee ụzọ Pọl si gosi ezi ihe nlereanya n’ihe banyere ịnara nduzi nke mmụọ nsọ? (b) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa inye ndị okenye ndụmọdụ ‘ilezi ìgwè atụrụ ahụ anya’?

5 Pọl bụ ezi ihe nlereanya n’ịnara nduzi nke mmụọ nsọ Chineke. (20:22-30) Ọ bụ ezie na ọ nọ “n’agbụ n’ime mmụọ,” ma ọ bụ na o nwere mmetụta nke bụ na ya aghaghị iso nduzi nke mmụọ ahụ, onyeozi ahụ ga-eje Jerusalem, ọ bụ ezie na agbụ na mkpagbu na-echere ya n’ebe ahụ. O ji ndụ kpọrọ ihe, ma ịnọgide n’ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke bụ ihe kasị mkpa nye ya, dị ka o kwesịrị ịbụrụ anyị. Pọl gbara ndị okenye ahụ ume ka ha ‘lebara ìgwè atụrụ nile ahụ anya, nke mmụọ nsọ meworo ha ndị nlekọta ya.’ Mgbe ọ “lasịrị” (nke ọ pụtara ìhè na ọ bụ n’ọnwụ), “agụ jọgburu onwe ha” agaghị ‘emere ìgwè atụrụ ahụ ebere.’ Ndị dị otú ahụ ga-esi n’etiti ndị okenye ahụ n’onwe ha bilite, ndị na-eso ụzọ, bụ́ ndị na-enwechaghị nghọta, ga-anakwerekwa ozizi ha ndị gbagọrọ agbagọ. —2 Ndị Tesalọnaịka 2:6.

6. (a) N’ihi gịnị ka Pọl ji nwee obi ike ịrara ndị okenye ahụ nye n’aka Chineke? (b) Olee ụzọ Pọl si gbasoo ụkpụrụ ahụ dị n’Ọrụ Ndị Ozi 20:35?

6 Iji wee nọrọ na nche megide ịdapụ n’ezi ofufe, ọ dị mkpa ka ndị okenye ndị ahụ mụrụ anya n’ime mmụọ. (20:31-38) Onyeozi ahụ eziwo ha ihe dị n’Akwụkwọ nsọ Hibru na ozizi Jisọs, nke nwere ike ime ka ha dị nsọ, nke nwekwara ike inyere ha aka ịnata Alaeze eluigwe ahụ, bụ́ “ihe nketa ahụ n’etiti ndị nile e doworo nsọ.” Site n’ịrụ ọrụ iji kwadoo onwe ya na ndị ya na ha so, Pọl gbakwara ndị okenye ahụ ume ka ha bụrụ ndị na-arụsi ọrụ ike. (Ọrụ 18: 1-3; 1 Ndị Tesalọnaịka 2:9) Ọ bụrụ na anyị agbasoo ụzọ yiri nke ahụ, nyekwara ndị ọzọ aka inwe ndụ ebighị ebi, anyị ga-aghọta okwu Jisọs nke ọma, bụ: “Ọ dị [obi ụtọ, NW] inye ihe karị ịnara ihe.” A na-achọta nghọta nke okwu a n’ime Oziọma ndị ahụ, ma ọ bụ nanị Pọl hotara ya, bụ onye ọ pụrụ ịbụ na a gwara ya kpọmkwem n’ọnụ ma ọ bụkwanụ na o nwetara ya site n’ike mmụọ nsọ. Anyị pụrụ inweta obi ụtọ dị ukwu ma ọ bụrụ na anyị bụ ndị na-eji onwe anyị achụ àjà dị ka Pọl bụ. Ee, o nyewo onwe ya n’ókè dị ukwu nke na ọpụpụ ya wutere ndị okenye ahụ nọ n’Efesọs nke ukwuu!

Ka E Mee Ihe Jehova Na-achọ

7. Olee ụzọ Pọl si setịpụ ezi ihe nlereanya n’ido onwe ya n’okpuru uche Chineke?

7 Ka njem ozi ala ọzọ nke atọ ahụ nke Pọl na-abịaru ọgwụgwụ nso (ihe dị ka 56 O.A.), o setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’ido onwe ya n’okpuru uche Chineke. (21:1-14) Na Sizaria ya na ndị ya na ha so nọrọ n’ụlọ Filip, onye ụmụ ya anọ, bụ́ ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke, “na-ebu amụma,” na-akọ ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu site n’ike mmụọ nsọ. N’ebe ahụ, onye amụma ahụ bụ onye Kraịst, bụ́ Agabọs jiri ihe okike nke Pọl kee onwe ya ụkwụ na aka, sitekwa n’ike mmụọ nsọ kwuo na ndị Juu ga-eke onye nwe ihe okike ahụ otú ahụ na Jerusalem, wee rara ya nye n’aka ndị Jentaịl. Pọl sịrị, “Edoziwo m onwe m ọ bụghị nanị ka e wee kee m agbụ, kama ịnwụkwa ọnwụ na Jerusalem n’ihi aha Onyenwe anyị Jisọs.” Ndị ahụ na-eso ụzọ mechiri ọnụ ha, na-asị: “Ka e mee ihe [Jehova, NW] na-achọ.”

8. Ọ bụrụ na ọ dị mgbe ụfọdụ ọ na-esiri anyị ike ịnara ezi ndụmọdụ, gịnị ka anyị pụrụ icheta?

8 Pọl gwara ndị okenye ahụ nọ na Jerusalem ihe Chineke sitere n’ije ozi ya mee n’etiti ndị Jentaịl. (21:15-26) Ọ bụrụ na ọ dị mgbe ọ bụla ọ na-esiri anyị ike ịnara ezi ndụmọdụ, anyị pụrụ ichetaghachi ụzọ Pọl si nara ya. Iji wee gosi na ọ dịghị ezi ndị Juu bi ná mba ọzọ “ịhapụ Moses,” ọ gbasoro ndụmọdụ ndị okenye ahụ nke ịbụ onye e mere ka ọ dị ọcha dị ka omenala ha si dị, wee kwụọkwa ụgwọ mmefu nke ya onwe ya na ndị ikom anọ ndị ọzọ. Ọ bụ ezie na ọnwụ Jisọs wepụrụ Iwu ahụ n’ụzọ, Pọl emeghị ihe ọjọọ ọ bụla site n’imezu akụkụ ya ndị metụtara ikwe nkwa. —Ndị Rom 7:12-14.

Igwè Mmadụ Mesoro Ya Ihe Ike ma Ọ Laghị Azụ

9. N’ihe banyere ìgwè ndị na-eme ihe ike, myirịta dị aṅaa ka e nwere n’etiti ahụmahụ Pọl na nke Ndịàmà Jehova n’oge a?

9 Ọtụtụ mgbe, Ndịàmà Jehova anọgidewo n’ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke n’agbanyeghị ìgwè ndị na-eme ihe ike. (Dị ka ihe atụ, lee 1975 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peji 180-190.) N’otu aka ahụkwa, ndị Juu si Asia Minor kpaliri ìgwè ndị na-eme ihe ike megide Pọl. (21:27-40) Mgbe ha hụrụ Trọfimọs onye Efesọs ahụ ya na ya so, ha boro onyeozi ahụ ebubo ụgha nke imerụ ụlọ nsọ ahụ site n’ịkpọrọ onye Grik banye na ya. Ọ fọrọ ntakịrị ka e gbuo Pọl mgbe onyeisi ọchịagha nke òtù ndị agha bụ Klọdiọs Lisias na ndị agha ya kwụsịrị mkpọtụ ahụ a na-eme! Dị ka e buru n’amụma (ma bụrụkwa ihe ndị Juu kpatara), Lisias mere ka e kee Pọl agbụ. (Ọrụ 21:11) A na-akwado ikuru onyeozi ahụ banye n’ogige ndị agha nke dị nso ogige ụlọ nsọ ahụ mgbe Lisias matara na Pọl bụghị onye na-akpali nnupụisi kama na ọ bụ onye Juu nke iwu kwadoro ịbanye n’ogige ụlọ nsọ ahụ. Mgbe ọ natara ikike ikwu okwu, Pọl gwara ndị ahụ okwu n’asụsụ Hibru.

10. Olee ụzọ ndị Juu nọ na Jerusalem si nara okwu Pọl, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka a na-apịaghị ya ụtarị?

10 Pọl gbara àmà n’atụghị egwu. (22:1-30) Ọ kọwara onwe ya dị ka onye Juu nke Gamaliel ahụ a na-enye nsọpụrụ dị ukwuu zụrụ. Onyeozi ahụ kọwara na mgbe ya nọ n’ụzọ na-eje Damaskọs maka ịkpagbu ndị na-agbaso Ụzọ Ahụ, na e mere ka ya kpuo ìsì mgbe ya hụrụ Jisọs Kraịst ahụ e meworo ka ọ dị ebube, ma Ananaịas weghachiri ọhụhụ ụzọ ya. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, Onyenwe anyị gwara Pọl, sị: “Gaa ije gị: n’ihi na mụ onwe m ga-esi n’ebe a zipụ gị jekwuru ndị mba ọzọ n’ebe dị anya.” Okwu ndị ahụ yiri iré ọkụ mbụ a mụnyere n’oké ọhịa. Mgbe ha na-eti mkpu na Pọl ekwesịghị ịdị ndụ, ìgwè mmadụ ahụ yipụsịrị uwe ha, na-ekpolikwa ájá elu n’oké iwe. Ya mere, Lisias mere ka a kpọrọ Pọl jee n’ụlọ ndị agha ahụ ka e jiri ịpịa ụtarị jụpụta ya ihe mere ndị Juu ji na-emegide ya. E gbochiri ịpịa ya ihe (nke a na-eji ụdọ akpụkpọ anụ, nke e tinyesịrị iberibe ígwè ma ọ bụ ọkpụkpụ anụ, eme) mgbe Pọl jụrụ, sị: ‘Ò ziri ezi n’iwu ịpịa onye Rom ihe, nke bụ onye a na-amaghị ikpe?’ Mgbe ọ nụrụ na Pọl bụ nwa amaala Rom, ụjọ tụrụ Lisias, o wee kpọpụ ya n’ihu Sanhedrin ahụ ka a chọpụta ihe mere ndị Juu ji na-ebo ya ebubo.

11. N’echiche dị aṅaa ka Pọl bụ onye Farisii?

11 Mgbe Pọl malitere okwu o ji agọrọ ọnụ ya n’ihu Sanhedrin ahụ site n’ikwu na ya “ewerewo ezi akọ na uche nile biri n’ihu Chineke,” Onyeisi Nchụaja bụ Ananaịas nyere iwu ka e jee tie ya aka n’ọnụ. (23:1-10) PọI sịrị, “Chineke gaje iti gị aka, gị mgbidi e tere nzu.” Ụfọdụ ndị jụrụ, sị, ‘Ị̀ na-ekwutọ onyeisi nchụaja?” O Pụrụ ịbụ na na n’ihi ahụchaghị ụzọ nke ọma, Pọl amataghị onye Ananaịas bụ. Ma, n’iburu n’uche na ndị mejupụtara nnọkọ ahụ bụ ndị Farisii na ndị Sadusii, Pọl sịrị: ‘Abụ m onye Farisii nke a na-ekpe ikpe banyere olileanya mbilite n’ọnwụ ahụ.’ Nke a kewara Sanhedrin ahụ ụzọ abụọ, n’ihi na ndị Farisii kweere ná mbilite n’ọnwụ ahụ ma ndị Sadusii ekweghị na ya. E nwere oké nrụrịta ụka hie nne nke na ọ dịrị mkpa ka Lisias bịa napụta onyeozi ahụ.

12. Olee ụzọ Pọl si gbanarị atụmatụ e mere igbu ya na Jerusalem?

12 Pọl lanarịkwara atụmatụ ọzọ e mere igbu ya. (23:11-35) Iri ndị Juu anọ aṅụwo iyi na ha agaghị eri ihe ọ bụla ma ọ bụ ṅụọ ihe ọ bụla ruokwa mgbe ha gburu ya. Nwa nwanne Pọl kọọrọ ya banyere nke a, kọọkwara Lisias. E ji ìgwè ndị agha duru onyeozi ahụ jee na nke Onye ọchịchị bụ Antoniọs Filiks na Sizaria, bụ́ isi obodo ọchịchị ndị Rom nke Judia. Mgbe o kwesịrị Pọl nkwa na a ga-anụ olu ya, Filiks mere ka ndị nche legide ya na Pritoriọm nke Herọd Onye Ukwu ahụ, bụ́ isi ụlọ ọrụ nke onyeisi ọchịchị ahụ.

Atụghị Egwu n’Ihu Ndị Isi Ọchịchị

13. Gịnị ka Pọl gbaara Filiks àmà banyere ya, mmetụta dị aṅaa ka nke a nwere?

13 Onyeozi ahụ gọpụrụ onwe ya n’ebubo ụgha nile ahụ e boro ya wee gbaara Filiks àmà n’atụghị egwu. (24:1-27) N’ihu ndị Juu na-ebo ya ebubo, Pọl gosiri na ya akpalighị ìgwè ndị na-eme ihe ike. O kwuru na ya kwenyere n’ihe ndị e setịpụrụ n’Iwu ahụ, na Ndị Amụma, nweekwa olileanya ná “mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị aịọ omume.” Pọl ejiwo ‘onyinye ebere’ dị iche iche jee Jerusalem (bụ́ ihe onyinye a na-atụkọta maka ndị na-eso ụzọ Jisọs, ndị ọ pụrụ ịbụ na ịda ogbenye ha sitere ná mkpagbu), e mewokwa ka ọ dị ọcha dị ka omenala si dị. O bụ ezie na Filiks ekpebighị ikpe ahụ ozugbo, Pọl mesịrị gwa ya na nwunye ya, bụ́ Drusila (nwa nwanyị nke Herọd Agripa nke Mbụ) ozi ọma banyere Kraịst, ezi omume, njide onwe onye, na ikpe ahụ nke na-abịanụ. N’ịbụ onye okwu dị otú ahụ yiri egwu, Filiks hapụrụ Pọl ka ọ laa. Otú ọ dị, o mesịrị na-akpọ onyeozi ahụ ọtụtụ mgbe, na-ele anya ịnata ihe iri ngó, bụ́ nke ọ na-anataghị. Filiks maara na ikpe amaghị Pọl ma ọ hapụrụ ka ọ nọgide n’agbụ, na-enwe olileanya ịnata ihu ọma n’ebe ndị Juu nọ. Mgbe afọ abụọ gasịrị, Pọsiọs Festọs nọchiri ọnọdụ Filiks.

14. Ikike dị aṅaa nke Pọl nwere dị ka iwu si dị ka o jiri mee ihe mgbe o guzoro n’ihu Festọs, olee ihe kwekọrọ na nke a nke ị na-ahụ?

14 Pọl mekwara ngọpụ n’atụghị egwu n’ihu Festọs. (25:1-12) Ọ bụrụ na onyeozi ahụ mere ihe kwesịrị ịnwụ anwụ n’ihi ya, ọ gaghị achọ ihe ọ ga-eji gbanarị ọnwụ, ma ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ inyefe ya n’aka ndị Juu dị ka ihe ịnata ihu ọma. Pọl sịrị, “Ọ bụ Siza ka m na-akpọku,” na-eji ohere nwa amaala Rom nwere ịrịọ ka e kpee ya ikpe na Rom na-eme ihe (nke bụ n’ihu Eze Nero n’oge ahụ). Mgbe e kwere arịrịọ ya ahụ, Pọl ‘ga-agba àmà na Rom,’ dị ka e buru ya n’amụma. (Ọrụ 23:11) Ndịàmà Jehova na-ejikwa ohere ndị e nwere na-eme ihe maka ‘ime ngọpụ nke ozi ọma ahụ na ime ka o guzosie ike.’—Ndị Filipaị 1:7.

15. (a) Amụma dị aṅaa ka e mezuru mgbe Pọl guzoro n’ihu Eze Agripa na Siza? (b) Olee ụzọ o si bụrụ na Sọl ‘gbara ndụdụ e ji achụ ehi ụkwụ’?

15 Eze Herọd Agripa nke Abụọ nke ebe ugwu Judia na nwanne ya nwanyị bụ Benaisi (bụ́ onye o sooro nwee mmekọahụ rụrụ arụ) gere ntị n’okwu Pọl mgbe ọ na-eleta Festọs na Sizaria. (25:13-26:23) Site n’ịgbara Agripa na Siza àmà, Pọl mezuru amụma ahụ nke bụ na ọ ga-eburu aha Onyenwe anyị jee n’ihu ndị eze. (Ọrụ 9:15) Mgbe ọ na-akọrọ Agripa ihe mere n’ụzọ mgbe ọ na-eje Damaskọs, Pọl hotara na Jisọs kwuru, sị: Ịnọgide na-agba ndụdụ e ji achụ ehi ụkwụ na-eme ka ihe siere gị ike.’ Dị ka ehi na-eme isi ike na-emerụ onwe ya abụ site n’ịnọgide na-alụso ndụdụ ahụ e ji achụ ya ọgụ, Sọl emerụwo onwe ya ahụ site n’ịlụso ndị na-eso ụzọ Jisọs ọgụ, bụ́ ndị nwere nkwado nke Chineke.

16. Olee ụzọ Festọs na Agripa si meghachi omume n’àmà Pọl gbara?

16 Olee ụzọ Festọs na Agripa si meghachi omume? (26:24-32) Ebe ọ na-enweghị ike ịghọta mbilite n’ọnwụ ahụ, bụrụkwa onye ọ tụrụ n’anya bụ́ otú Pọl si bụrụ onye ihe ọ na-ekwu doro anya, Festọs sịrị: “Oké mmụta akwụkwọ gị na-eme gị ka ị ghọọ onye anya na-adịghị mma.” Otú ahụkwa, ụfọdụ ndị na-ebo Ndịàmà Jehova ebubo n’oge a ịbụ ndị isi na-adịghị mma, ọ bụ ezie na ha dị ka Pọl n’ezie ‘n’ikwuwa okwu nke eziokwu na nke anya udo.’ Agripa, onye mechiri nnọkọ ahụ ma kwere na a gaara atọhapụworị Pọl ma a sị na ọ kpọkughị Siza sịrị, ‘N’oge na-adịghị anya ị ga-eme ka m kwenye ịbụ onye Kristian.’

Ihe Ize Ndụ n’Oké Osimiri!

17. Olee ụzọ ị pụrụ isi kọwaa ihe ize ndụ ndị e zutere n’oké osimiri n’oge Pọl na-eje Rom?

17 Njem ahụ ha ji jee Rom tinyere Pọl “n’ize ndụ site n’osimiri.” (2 Ndị Kọrint 11:24-27) Otu onye ọchịagha aha ya bụ Julịọs ka e tinyere onyeozi ahụ na ndị mkpọrọ ndị ọzọ e ji ụgbọ mmiri buru site Sizaria na-eje Rom n’aka ya ilekọta. (27:1-26) Mgbe ụgbọ ha kwụsịrị na Saịdọn, e kwere ka Pọl jee leta ndị kwere ekwe, bụ́ ndị nyere ya ume ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ. (Tụlee 3 Jọn 14.) Na Maịra nke dị n’Asia Minor, Juliọs mere ka ndị mkpọrọ ahụ banye n’ụgbọ mmiri na-ebu ọka nke na-eje Itali. N’agbanyeghị oké ifufe, ha garuru n’odụ ụgbọ mmiri a na-akpọ Ọnụ Mmiri Ọma nke dị nso obodo ndị Krit ahụ bụ Lasia. Mgbe ha hapụsịrị ebe ahụ na-aga Finiks, otu oké ifufe si n’ọwụwa anyanwụ nke ebe ugwu jibidoro ụgbọ ahụ. Ebe ha na-atụ egwu na a ga-atụba ụgbọ ha na Satis (ájá mmiri) ndị dị n’ebe ugwu Africa, ndị ọkwọ ụgbọ mmiri ahụ wee “dọda ákwà ifufe,” ndị bụ ma eleghị anya ákwà ndị na-ebugharị ụgbọ mmiri ahụ. E mesịrị were ụdọ kee gburugburu isi ụgbọ ahụ ka ike nke oké ifufe ahụ ghara ịdọkapụsị ebe ndị a kụtara isi osisi abụọ ọnụ n’ụgbọ ahụ. Ma oké ifufe ahụ nọgidere na-ebugharị ha ruo echi ya, e mere ka ụgbọ ahụ dịtụ mfe site n’ịtụfusị ụfọdụ n’ibu ndị o bu. N’ụbọchị nke atọ, ha tụfusịrị ngwá ọrụ nke ụgbọ ahụ (ákwà ifufe ma ọ bụ ngwá ọrụ ndị ọzọ). Ma mgbe o yiri ka ọ dịghị olileanya ọzọ dịnụ, otu mmụọ ozi mere ka Pọl hụ ya anya wee gwa ya ka ọ ghara ịtụ egwu, n’ihi na ọ gaje iguzo n’ihu Siza. Lee nnọọ ụdị ihe ndajụ obi ọ ga-abụworị mgbe onyeozi ahụ kwuru na a ga-azọpụta ndị njem nile ahụ ma mee ka ha kwụsị n’otu agwaetiti!

18. Gịnị mesịrị mee Pọl na ndị ya na ha so na njem ahụ?

18 Ndị njem ahụ lanarịrị. (27:27-44) N’etiti abalị n’ụbọchị nke iri na anọ, ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ hụtara na ala dị nso. Ihe ọ̀tụ̀tụ̀ dị iche iche ha mere kwadoro nke a, ha wee weda arịlịka ha iji zere ihe ọdachi nke ịsọ isi n’oké nkume ndị dị n’okpuru mmiri. Site n’agbamume Pọl, 276 ndị ikom nile ahụ nọ n’ime ụgbọ ahụ riri nri. Mgbe ahụ, e mere ka ụgbọ ahụ dịtụkwuo mfe site n’ịtụba ọka ndị ha bu n’ime oké osimiri. Mgbe chi bọrọ, ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ gbubisịrị eriri arịlịka ha, tọpụ ụdọ ụmara isi ụgbọ ha, wee dọlie ákwà ifufe nke ọnụ ụgbọ nye ifufe. Ụgbọ mmiri ahụ dabara n’ebe dị n’agbata osimiri abụọ, isi ụgbọ ahụ wee malite ịnyajisị. Ma mmadụ nile rutere n’ebe ala akọrọ dị.

19. Gịnị mere Pọl na Malta, gịnịkwa ka o meere ndị ọzọ n’ebe ahụ?

19 N’ịbụ ndị mmiri dere nke ukwuu, ndị ike gwụsịkwara, ndị si n’ụgbọ ahụ chọtara onwe ha na Malta, bụ́ ebe ndị bi n’agwaetiti ahụ gosiri ha ‘obi ọma ha na-ahụtụbeghị mbụ.’ (28:1-16) Otú ọ dị, ka Pọl na-etinye nkụ n’ọkụ, ikuku ọkụ ahụ metere otu ajụala nke na-ehi ụra, bụ́ nke tara ya arụ, kokwasịkwa ya n’aka. (E nwekwaghị agwọ ndị na-atagbu mmadụ na Malta ugbu a, ma nke a bụ “anụ ọhịa.”) Ndị Malta chere na Pọl bụ ogbu mmadụ, na “ikpe ziri ezi” agaghị ekwe ka ọ dị ndụ, mgbe ọ na-adaghị wee nwụọ ma ọ bụ nwee ahụ ọzịza n’ihi nsí agwọ ahụ tanyere ya n’ahụ, ha kwuru na ọ bụ chi. Pọl mesịrị gwọọ ọtụtụ ndị ọrịa, gụnyere nna nke Pọbliọs, bụ́ onyeisi Malta. Mgbe ọnwa atọ gasịrị, Pọl, Luk, na Aristakọs hapụrụ ebe ahụ n’ụgbọ nke ihe ịrịba ama ya bụ ‘Umụ Ndị Ikom nke Zeus’ (Castor na Pollux, bụ́ chi ejima, ndị e chere na ha na-enwe ihu ọma n’ebe ndị na-aga njem ụgbọ mmiri nọ). Mgbe ha ruru Pọtiọli, Juliọs na onye ya na ya so gara n’ihu. Pọl kelere Chineke wee nweekwa obi ike mgbe ndị Kraịst si n’isi obodo nke Rom zutere ha n’Ahịa Apiọs na Ulọ Ndị Ije Atọ nke dị n’ogologo Ụzọ Appian ahụ. Mgbe ha mesịrị rute Rom, e kwere ka Pọl nọrọ nanị ya, ọ bụ ezie na otu onyeagha na-eche ya nche.

Nọgide Na-ekwusa Alaeze Jehova!

20. Ọrụ dị aṅaa ka Pọl nọgidere na-arụ n’ebe obibi ya na Rom?

20 N’ebe obibi ya na Rom, Pọl kwsara Alaeze Jehova n’atụghị egwu. (28:17-31) Ọ gwara ndị isi n’etiti ndị Juu, sị: “Ọ bụ n’ihi olileanya nke Israel ka e kere m mkpọrọ a.” Olileanya ahụ metụtara ịnakwere Mesaịa ahụ, bụ́ ihe anyị na-aghaghị ịdịkwa njikere ịhụ ahụhụ n’ihi ya. (Ndị Filipaị 1:29) O bụ ezie na ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu ndị a ekwereghị, ọtụtụ ndị Jentaịl na ihe fọdụrụ n’etiti ndị Juu nwere ọnọdụ obi ziri ezi. (Aịsaịa 6:9, 10) Ruo afọ abụọ (ihe dị ka 59-61 O.A.) Pọl nabatara ndị nile bịakwutere ya, “na-ekwusa alaeze Chineke, na-ewerekwa nkwuwa okwu nile zie ihe nile banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ọ dịghị onye na-egbochi ya.”

21. Ruokwa ọgwụgwụ nke ndụ elu ala ya, ihe nlereanya dị aṅaa ka Pọl setịpụrụ?

21 Ihe àmà gosiri na Nero kwupụtara na ọ dịghị ikpe mara Pọl wee tọhapụ ya. Mgbe ahụ, onyeozi ahụ maliteghachiri ọrụ ya na Timoti na Taịtọs na-arụ. Otú ọ dị, a tụrụ ya mkpọrọ ọzọ na Rom (n’ihe dị ka 65 O. A.), o yikwara ka Nero ò gburu ya n’ihi okwukwe ya. (2 Timoti 4:6-8) Ma ruokwa ọgwụgwụ, Pọl setịpụrụ ezi ihe nlereanya dị ka onye nkwusa Alaeze nke nwere obi ike. N’iji otu mmụọ ahụ na-eme ihe n’ime mgbe ikpeazụ ndị a, ka ndị nile raara onwe ha nye Chineke kwusaa Alaeze Jehova n’atụghị egwu!

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

◻ Ọzụzụ dị aṅaa n’ije ozi ka Pọl nyere ndị okenye nke Efesọs?

◻ Olee ụzọ Pọl si setịpụ ihe nlereanya n’ido onwe ya n’okpuru uche Chineke?

◻ N’ihe banyere ìgwè ndị na-eme ihe ike, myirịta dị aṅaa ka e nwere n’etiti ahụmahụ ndị Pọl nwere na nke Ndịàmà Jehova na-enwe taa?

◻ Ikike dị aṅaa nke Pọl nwere dị ka iwu si dị ka o jiri mee ihe mgbe o guzo n’ihu Onye ọchịchị bụ Festọs, myirịta dị aṅaa ka e nwekwara n’etiti nke a na ihe ndị na-eme n’oge a?

◻ Ọrụ dị aṅaa ka Pọl nọgidere na-arụ n’ebe obibi ya na Rom, na-esetịpụ ihe nlereanya dị aṅaa?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya