Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 6/15 p. 26-29
  • Gị Na Ime Ihe n’Oge

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gị Na Ime Ihe n’Oge
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Bụrụnu Ndị Na-eṅomi Chineke”
  • ‘Na Mgbe Ha A Kara Aka’
  • Ihe Mere Ọ Na-eji Esiri Ụfọdụ Ndị Ike
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Eme Ihe n’Oge?
  • ‘Mara Mgbe A Kara Aka’
  • Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-abịa Ihe n’Oge?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Na-abịa n’Oge
    Ozi Alaeze Anyi—2014
  • Ịbịa Ihe n’Oge
    Teta!—2016
  • Bịa n’Oge!
    Teta!—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 6/15 p. 26-29

Gị Na Ime Ihe n’Oge

OTU onye okenye bụ onye Kraịst n’otu ọgbakọ dị na South America nwere ọtụtụ àgwà ndị dị mma. Ma ezi ndị enyi ya na-eji egwuregwu na-akpọ ya Amagedọn. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ha na-asị, “Anyị maara na ọ na-abịa, ma ọ bụ nanị Chineke ma mgbe ọ ga-abịarute!”

Ee, ime ihe n’oge—ma ọ bụ emeghị ihe n’oge—nwere mmetụta dị ukwuu n’ihe e ji mara mmadụ. Eze onye amamihe bụ Solomọn mere ihe atụ ya n’ụzọ dị otú a: “Ijiji nwụrụ anwụ na-eme ka mmanụ onye na-asụgwa mmanụ otite nke na-esi ísì ụtọ sie ísì ọjọọ, reekwa ure: otú a ka nzuzu nta dị arọ karịa amamihe, karịakwa nsọpụrụ.” (Eklisiastis 10:1) Onye Kraịst pụrụ inwe ọtụtụ àgwà ndị dị mma, ma ọ pụrụ imebi aha ọma ya ma ọ bụrụ na ọ dịghị eji oge eme ihe.

Otu onye nlekọta kwuru, sị, “Ndị na-eme ihe n’oge na-eme ka m nwee obi ike. Ọ bụ ha ka ọ na-amasị m ka ha soro m rụọ ọrụ.” A na-enwekwa mmasị n’ebe ha nọ n’ime ụwa nke azụmahịa. Akwụkwọ bụ Emily Post’s Etiquette nyere ndụmọdụ, sị, “Jee ọrụ n’oge; na-abịa n’oge maka nzukọ dị iche iche; na-enye akụkọ ozi gị nile n’oge kwesịrị ekwesị.” N’otu aka ahụkwa, akwụkwọ bụ The New Etiquette (1987) kwuru na, n’ụzọ bụ isi, “ndị na-abịarute n’azụ oge bụ ndị na-abịarute iji mejọọ ndị ọzọ.” Ndị dere akwụkwọ ahụ wee kwuokwa, sị: “Nnọkọ ofufe bụkwa oge ọzọ a na-ekwesịghị ịbịarute n’azụ oge.”

Ọ na-amasị anyị nile mgbe ndị ọzọ mere ihe n’oge. Ihe àmà gosiri na Pọl onyeozi chere otú ahụ, n’ihi na o degaara ndị Kraịst nọ na Kọlọsi akwụkwọ, sị: “Anọ m n’etiti unu ná mmụọ m, na-aṅụrị, na-elekwa usoro unu.” (Ndị Kọlọsi 2:5) O dokwara anya na anyị nwere otu ụdị mmetụta ahụ Eze Devid nwere n’ihe banyere nkwa Jehova nile mgbe o dere n’Abụ Ọma, sị: “Chineke m, anọla ọdụ.”—Abụ Ọma 40:17; 70:5.

“Bụrụnu Ndị Na-eṅomi Chineke”

N’eziokwu, ọ dịghị mgbe ọ bụla Jehova na-eme ihe n’azụ oge. Ọ bụ onye pụrụ iche n’ihe banyere iji oge eme ihe. Nke a pụtara ìhè n’ọrụ ihe okike ya nile. Site na mbara eluigwe na ala nke a na-akparaghị ókè ruo n’ihe dị ndụ ndị kasị dị nta, ha nile na-arụ ọrụ dị ka à ga-asị na e ji klọkụ a na-adịghị ahụ anya na-eduzi ha. Dị ka ihe atụ, otu ụdị ahịhịa mmiri sea lily nke dị nso Japan na-agbapụtasị mkpụrụ ndụ ndị o ji amịpụta mkpụrụ otu ugbo n’afọ n’ọnwa October, n’ihe dị ka elekere atọ n’ehihie nke ụbọchị ọnwa gbazuru otu ụzọ n’ụzọ anọ ma ọ bụ ụzọ atọ n’ụzọ anọ. N’oge opupu ihe ubi, obere azụ grunion na-eme ka usoro iyi àkwá ya kwekọọ kpọmkwem na minit ole na ole mgbe mmiri na-eji etojupụta ụsọ oké osimiri nke California.

Jehova na-emekwa ihe kpọmkwem n’oge o kwesịrị ekwesị mgbe a bịara n’ihe banyere imezu nkwa ya. Dị ka ihe atụ, anyị na-agụ n’Ọpụpụ 12:41 na “o ruo, n’ọgwụgwụ [narị afọ anọ na iri atọ] ahụ, ọ bụkwa n’otu ụbọchị ahụ ka o ruru, na usuu nile nke ndị agha Jehova siri n’ala Ijipt pụọ.” Otú a, Jehova debere nkwa ahụ o kwere Abram ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ.—Jenesis 15:13-16; Ndị Galetia 3:17.a

Jehova zipụrụ Ọkpara ya, bụ́ Mesaịa ahụ, baa n’ime ụwa kpọmkwem n’oge ahụ e buru amụma ya site n’ọnụ Daniel onye amụma n’ihe karịrị narị afọ ise tupu o mee, nke mere na “mgbe oge ya ruru Kraịst nwụrụ n’ihi ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” (Ndị Rom 5:6; Daniel 9:25) N’ihe banyere ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a, Bible na-egosi na Jehova maara “ụbọchị na oge awa” ọ ga-abụ. (Matiu 24:36) Ọ gaghị egbu oge. N’ụzọ doro anya, ihe nlereanya Jehova n’ime ihe n’oge kwesịrị ka anyị ṅomie ya.—Ndị Efesọs 5:1.

‘Na Mgbe Ha A Kara Aka’

Sitekwarị ná mmalite, Jehova na-atụ anya ka ndị ohu ya bụrụ ndị na-eji oge eme ihe, karịsịa n’ihe banyere ofufe ya. A gbasoro ‘usoro ụbọchị’ mgbe ndị Israel na-achụ àjà. Jehova nyere ha iwu, sị: “Unu ga-elezi anya iweta [àjà] nso m na mgbe ya a kara aka.” O nyekwara Moses ntụziaka nke a banyere nzukọ dị iche iche: ‘Nzukọ ahụ nile aghaghịkwa izukọta na mgbe ahụ a kara aka.’—Levitikọs 23:37; Ọnụ Ọgụgụ 10:3; 28:2.

Mgbe oge gasịrị, ndị Juu debere “oge awa isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.” (Luk 1:10) Ma ndị Juu ma ndị ọzọ debekwara “oge awa ekpere, bụ́ oge awa nke iteghete.” (Ọrụ 3:1; 10: 3, 4, 30) N’ihe banyere nzukọ ndị Kraịst, Pọl dekwara, sị: “Ka e mee ihe nile n’ụzọ dị mma n’anya na n’usoro.”—1 Ndị Kọrint 14:40.

Gịnị ka ihe a nile ga-achọworị n’aka ndị Israel na ndị Kraịst oge mbụ ahụ? Na ha ga-abụ ndị na-eme ihe n’oge n’ihe banyere ịbịa mgbe a kpọrọ ha, karịsịa n’ihe banyere ofufe ha. Ọ dịghị ihe ọ bụla mere a ga-eji chee na Jehova ga-atụ anya ihe dị ala karị n’aka ndị ohu ya nke oge a.

Ihe Mere Ọ Na-eji Esiri Ụfọdụ Ndị Ike

E nwere ụzọ dị iche iche e si ele oge anya site n’akụkụ ụwa dị iche iche. Otu onyeozi ala ọzọ kọrọ na n’otu obodo dị na South America, mgbe ụfọdụ ọ na-abụ nanị nwunye ya na-anọ ya mgbe ọ na-ama ọkwa abụ mmeghe ná mmalite nzukọ ndị Kraịst. Ma mgbe ọ ga-ama ọkwa maka abụ mmechi, 70 mmadụ na-anọ n’ebe ahụ. N’aka nke ọzọ, n’otu mba dị n’Ọdịda Anyanwụ Europe, a jụrụ ihe dị ka otu puku mmadụ, sị: “Ọ bụrụ na a kpọọ gị òkù iri ihe n’elekere asaa nke uhuruchi, ì kwesịrị ịbịaru minit ise ma ọ bụ iri tupu oge ahụ, ka ọ̀ bụ minit ise ma ọ bụ iri mgbe oge ahụ gasịrị, ka ọ̀ bụ kpọmkwem n’oge ahụ a kara aka?” Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ zara na “àgwà ọma chọrọ nsọpụrụ dị ukwu nye onye ahụ kpọrọ òkù nakwa ịbịa kpọmkwem n’oge ahụ a kara aka.”

Otú o sina dị, ime ihe n’oge metụtara ihe karịrị ihe na-amasị ndị bi n’akụkụ dị iche iche. Ọ bụ àgwà e ji amara mmadụ, dị ka ịdị ọcha, ịdị mma n’anya, na inwe ọnụ ọma bụcha àgwà ndị e ji amara mmadụ. N’eziokwu, anyị anaghị ebu àgwà ndị dị otú ahụ apụta ụwa; anyị aghaghị ịzụlite ha azụlite. Ọ bụrụ na a kuziiri gị ime ihe n’oge dị ka nwata, nke ahụ bụ ngọzi. Ma ọtụtụ ndị si n’ezinụlọ ebe ọ na-adịghị adịkebe mkpa inwe oge ndị e setịpụrụ esetịpụ iji mee ka mgbalị nile nke mmadụ kwekọọ ná mgbalị nile nke ndị ọzọ. Ọ bụ nanị mgbe ha sonyeere ọgbakọ ndị Kraịst, malitekwa ikere òkè ná nzukọ ya nile na n’ozi ihu ọha ọ na-eje ka mkpa nke ime ihe n’oge na-abụ ihe pụtara ìhè nye ha. Ọ pụrụ isiri ha ike imeri àgwà nke ime ihe n’azụ oge, bụ́ nke ha mụtara mgbe ha dị na nwata. Otú o sina dị, ịhụnanya maka Jehova Chineke nakwa maka ndị agbata obi pụrụ ịkpali mmadụ ime mgbanwe. Ma, n’ihi gịnị ka a ga-eji eme mgbanwe?

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Eme Ihe n’Oge?

Benjamin Franklin jụrụ n’otu oge gara aga, sj, “Ị̀ hụrụ ndụ n’anya? Ya bụrụ otú ahụ, emefusịla oge, n’ihi na ọ bụ ya ka e ji mee ndụ.” Anyị nile hụtara eziokwu dị n’okwu ahụ. Ma otu ihe ọzọ dịkwa ndị Kraịst mkpa otú ahụ bụ ịghara imebisị oge nke ndị ọzọ. Otu onyeozi ala ọzọ kwuru, sị, “Onye na-abịa na-azụ oge yiri ka ò ji omume ya na-asị, ‘Oge nke m bara uru karịa oge nke gị, ya mere, gị’ onwe gị pụrụ ichere ruo mgbe mụ onwe m dịrị njikere.’” Onye na-adịghị eme ihe n’oge yiri, ọ bụghị nanị onye na-ahazighị onwe ya nke ọma na onye a na-apụghị ịdabere na ya, kamakwa onye dịtụ mpako nke na-adịghị echebakwara ndị ọzọ echiche. Ezi ndị Kraịst ‘achọghị ịdị na-eme ihe ọ bụla n’ụzọ ịkpa iche iche ma ọ bụ n’ụzọ ịchọ otuto efu, kama ha na-eji obi dị umeala na-agụ ndị ọzọ ná ndị ka ha onwe ha mma.’—Ndị Filipaị 2:3.

Ụfọdụ ndị pụrụ iche na ọ masịghị ha ịbụ ndị klọkụ na-ahazi ndụ ha, na-abụ ndị ọ na-achịkwa ihe ọ bụla ha na-eme. Otú ọ dị, ime ihe n’oge abụghị nanị okwu metụtara mmadụ ịbụ onye klọkụ na-achịkwa ndụ ya. Ọ bụ okwu metụtara mmadụ iburu ọdịmma na abamuru nke ndị ọzọ n’obi, “na-elekwasị anya, ọ bụghị nanị n’ọdịmma onwe onye n’ihe nke aka gị, kamakwa n’ọdịmma onwe onye n’ihe nke ndị ọzọ.”—Ndị Filipaị 2:4, NW.

Dị ka ihe atụ, tụlee ndụmọdụ Bible ahụ bụ: “Na-akpọbatanụ ibe unu, dị ka Kraịst anyị kpọbatakwara unu.” (Ndị Rom 15:7) Ruo n’ókè okwu a metụtara ekele ọnụ nkịtị, ọ bụ n’ezie ihe siri ike ime ma ọ bụrụ na mmadụ na-abịa nzukọ nile n’azụ oge. Site n’ịbịa n’oge maka nzukọ dị iche iche, ị pụrụ itinye ihe ná mmụọ ịhụnanya, nke ndị bụ enyi nakwa nke nnabata a na-enwe ná nzukọ ndị dị otú a ruo ókè ka ukwuu. Abamuru ya na-adịkwara ndị nile. Ịbịarute n’oge na-eme ka i nwee ike ikere òkè n’abụ na n’ekpere mmeghe—bú akụkụ dị mkpa nke ofufe a dị n’otu na-efe n’ọgbakọ. Ịnọ mgbe e kwupụtara isiokwu a gaje ikwu ga-enyere gị aka ịgbaso mwulite nke usoro ihe omume ahụ nke ọma karị.

Gị onwe gị ime ihe n’oge na-enyere ndị ọzụ aka ijikọta mgbalị ha nke ọma, a pụkwara imezu ihe dị ukwuu n’ihi nke a. Mgbe ha na-ebuso obodo Ai agha, Joshua zipụrụ otu akụkụ nke ndị agha ya ka ha rara ndị iro ahụ pụọ site n’obodo ahụ mgbe ndị fọdụrụ n’ime ha ga-ezo n’ọhịa iji wee wakwasị obodo ahụ. Mgbe ahụ, mgbe ugo beere ná mgbagbu, Joshua nyere ihe àmà ahụ. Ndị agha ya ‘malitere ịgba ọsọ mgbe o setịrị aka ya,’ obodo ahụ wee daa n’ihu ha. Ị pụrụ iche echiche ihe gaara emeworị ma a sị na ha emeghị ihe kpọmkwem n’oge a chọrọ ya?—Joshua 8:6-8, 18, 19.

Ndị ozi bụ ndị Kraịst n’oge a nwere ọtụtụ ihe mere ha ga-eji bụrụ ndị ji oge kpọrọ ihe. Iso ndị ọzọ jekọọ ọrụ nkwusa Alaeze ahụ, imeghachi ihe omume e nwere ná mgbakọ ma ọ bụ ná nzukọ dị iche iche, ọbụna idebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha, chọchara ime ka ihe omume anyị kwekọọ n’ihe omume nke ndị ọzọ. Site n’ime ihe n’oge, anyị pụrụ imezu ihe ka ukwuu. Nke a bụ eziokwu ọbụna n’ihe dị nta dị ka inye akụkọ ọrụ nkwusa mmadụ n’ọgwụgwụ ọnwa. Mgbe mmadụ nile nyere aka n’ime nke a n’oge, mgbe ahụ, a ga-enwe ike ịchịkọta akụkọ ziri ezi, nke na-agbakwa ume nke ọgbakọ nakwa nke ụwa dum.

Ime ihe n’oge metụtakwara ịbịa mgbe a kara aka nakwa imezu ihe n’oge a chọrọ iji mezuo ya, a na-enwekwa ọtụtụ ọnọdụ ndị dị otú ahụ kwa ụbọchị. Ụfọdụ bụ oké ihe, ndị ọzọ bụ ihe ndị dị nta. Dị ka ihe atụ, agbamakwụkwọ gị kwesịrị ịmalite n’oge a kara aka. Ọ pụrụ ịmasị gị ka e jiri minit ole dị otú a ma ọ bụ otú ọzọ siere gị àkwá. N’agbanyeghị ihe ọ bụ, onye na-eme ihe n’oge ekwesịghị ịdị na-amagharị site n’otu ihe gaa n’ọzọ, na-eme nke ọ bụla n’azụ oge. Kama nke ahụ, ọ na-adị nwayọọ, bụrụ onye a haziri ahazi. Ọ na-emezu ihe ka ukwuu n’ihi na ọ na-eme atụmatụ ihe ndị ọ ga-eme n’ụbọchị, malitekwa n’oge, ọbụna tupu oge eruchaa.

N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ihe mere ndị Kraịst kwesịrị iji jiri oge kpọrọ ihe. Karịsịa ihe nile, ọ bụ otu ụzọ iji gosi ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye anyị nwere n’ebe ndị Kraịst ibe anyị nọ nakwa nsọpụrụ anyị nwere maka ndokwa ọchịchị Chineke maka ezi ofufe.

Ma, olee ụzọ mmadụ pụrụ isi wulite àgwà nke ime ihe n’oge?

‘Mara Mgbe A Kara Aka’

Bible kwuru, sị, “Ọbụna ụgbala . . . maara mgbe ya nile a kara aka,” ọzọkwa, ndanda “na-edozi nri ya na mgbe okpomọkụ” iji chere oge oyi. (Jeremaịa 8:7; Ilu 6:8) N’ebe a ka e nwere isi ihe dị n’ime ihe n’oge na imezu ihe dị iche iche.

Anyị onwe anyị aghaghịkwa ‘ịma oge anyị nile a kara aka.’ Ọ bụ ezie na anyị ekwesịghị ịbụ ndị na-agbaso ụkpụrụ a na-apụghị ịgbanwe agbanwe ma ọ bụ bụrụ ndị ime ihe n’oge ribigara isi ókè, anyị kwesịrị ịbụ ndị ji oge kpọrọ ihe. Ọ dị mkpa ka anyị mara, ọ bụghị nanị ihe anyị kwesịrị ime, kamakwa mgbe anyị kwesịrị ime ya. Anyị kwesịrị ịmalite àgwà nke ichepụ echiche n’ọdịnihu, na-enye ohere maka ihe ndọla azụ ndị pụrụ ịdapụta, na-adịkwa njikere ịkwụsịtụ ọrụ e ji n’aka iji wee mee ihe ndị ka mkpa, dị ka ije nzukọ anyị dị iche iche, ozi ubi, na ihe omume ndị ọzọ metụtara ọchịchị Chineke.

N’ihe banyere nke a, ezinụlọ imekọ ihe n’otu dị mkpa. Ọ bụwo ihe a na-ahụkarị na onye bụ nna na-ahapụkarị ya n’aka nwunye ya ime ka ezinụlọ ha kwadebe. Mgbe ahụ, ọ na-ahapụ ụlọ nanị ya, wee na-elela anya azụ wee kwuo, sị, “Meenụ ngwa ngwa, ma ọ bụghị otú ahụ oge ga-aganarị unu!” Jekọb emeghị otú ahụ; o nyere aka site ‘n’ibili wee kukwasị ụmụ ya ndị ikom na ndị nwnye ya n’elu kamel ya’ mgbe oge ruru ka ha pụọ.—Jenesis 31:17.

Ya mere, olee ụzọ onye bụ nna pụrụ isi nyere ezinụlọ ya aka? A pụrụ ikuziri ụmụntakịrị ụzọ ha ga-esi wepụta oge iji kwadebe maka ihe ndị dị mkpa kama ịhapụ ihe nile ruo mgbe ọ fọrọ nke nta ka oge gwụsịa. A pụrụ inyere ha aka iwulite echiche nke iji ihe kpọrọ ihe nakwa nke inwe ọṅụ n’ime ihe n’oge. Dị ka ezinụlọ, tụlekọọnụ ihe atụ Bible dị iche iche ndị na-egosi ịdị mkpa nke ịdị njikere n’oge. (Jenesis 19:16; Ọpụpụ 12:11; Luk 17:31) Ma eleghị anya, ihe mmụta kasị dịrị irè na nke kasị mma bụ nke ezi ihe nlereanya nke ndị mụrụ ụmụ na-enye.

Ndị nlekọta bụ ndị Kraịst pụkwara inyere ọgbakọ aka site n’isetịpụ ezi ihe nlereanya. A garaghị ahọpụta ha ma a sị na ha abụghị ‘ndị omume ha kwesịrị ekwesị.’ (1 Timoti 3:2) Ma eleghị anya, ụmụnna nwoke na nwanyị ndị ọzọ ga-abịawanye n’oge ma ọ bụrụ na ha maara na ndị okenye ga-anọ n’ebe ahụ ikele ha nakwa iduzi ha. Ya mere, ndị nlekọta ndị ji ezi akọ na uche na-arụ ọrụ kwesịri ịgbalị ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’oge iji nyere ọgbakọ aka. Ndị ohu na-eje ozi, bụ́ ndị na-abịa n’oge iji kelee ụmụnna ha, lekọtakwa mkpa ha dị iche iche bụ ndị a na-enwe mmasị n’ebe ha nọ nke ukwuu.

Otú ọ dị, ime ihe n’oge chọrọ njide onwe onye na inye onwe onye ọzụzụ. Ee e, ọ bụghị iji na-eme ihe dị ka ndị soja, kama ọ bụ site n’ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị Kraịst ibe anyị nọ nakwa nsọpụrụ anyị nwere maka usoro ọchịchị Chineke. Nke a bụ otu akụkụ n’ime mmadụ ọhụrụ ahụ anyị na-agbalị iyikwasị. (Ndị Kọlọsi 3:10, 12) Karịsịa ihe nile, anyị chọrọ ịdị ka Nna anyị nke eluigwe, bú Jehova Chineke, onye na-akuziri anyị na “ihe ọ bụla nwere oge.”—Eklisiastis 3:1.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Maka nkọwa zuru ezu nke amụma nke a, lee akwụkwọ Insight on the Scriptures, Mpịakọta 1, peji 460, 461 na 776, 777.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya