Ngọzi Ndụ Na Ije Ozi Jisọs
Nri Anyasị Ememe Ncheta Ahụ
MGBE Jisọs sasịrị ụkwụ ndị ozi ya, o hotara okwu sitere n’akwụkwọ nsọ n’Abụ Ọma 41:9, na-asị: “Onye na-eri nri in buliri ikiri ụkwụ ya imegide m.” Mgbe ahụ, n’ịbụ onye obi lọrọ mmiri n’ime mmụọ ya, ọ kọwara, sị: “Otu onye n’etiti unu ga-arara m nye.”
Ndị ozi ahụ malitere inwe mwute wee na-agwa Jisọs n’otu n’otu, sị: “Ọ̀ bụ mụ?” Ọbụna Judas Iskariọt sonyere n’ịjụ ajụjụ ahụ. Jọn, onye na-anọdụ n’ebe dị Jisọs nso na table ahụ, dabeere n’obi Jisọs wee jụọ, sị: “Onyenwe anyị, ònye ka ọ bụ?
Jisọs zara, sị, “Ọ bụ otu onye n’ime unu iri na abụọ, onye nke mụ na ya na-esukọ nri n’afere. N’ihi na Nwa nke mmadụ na-ala, dị ka e deworo ya n’akwụkwọ nsọ banyere ya: ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ onye a na-esite n’aka ya rara Nwa nke mmadụ nye. Ọ bụrụ na a mụghị nwoke ahụ ọ ga-adị ya mma.” Mgbe nke ahụ gasịrị, Setan banyeghachiri n’ime Judas, na-eji oghere ahụ dị n’obi ya nke ghọworo nke ajọ ihe, mere ihe. Mgbe oge ufọdụ gasịrị n’anyasị ahụ, Jisọs kpọrọ Judas n’ụzọ kwesịrị ekwesị, “nwa nke ịla n’iyi ahụ.”
Ugbu a Jisọs gwara Judas, sị: “Ihe ị na-eme, mee ya ọsọ ọsọ.” Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ndị ozi ndị ọzọ ahụ ghọtara ihe Jisọs na-ekwu. Ufọdụ n’ime ha chere na ebe ọ bụ na Judas na-ejide igbe ego ha, na Jisọs na-agwa ya, sị: “Zụta ihe dị anyị mkpa n’ememe,” ma ọ bụ ka o jee nye ndị ogbenye ihe.
Mgbe Judas pụsịrị, Jisọs malitere otu ememe ọhụrụ pụrụ iche, ma ọ bụ ememe ncheta, nke ya na ndị ozi ya kwesịrị ntụkwasị obi mere. O weere otu ógbè achịcha, kpee ekpere nke inye ekele, nyawaa ya, wee nye ha ya, na-asị: “Naranụ, rie.” Ọ kọwara, sị: “Nke a [pụtara, NW] ahụ m nke a na-enye n’ihi unụ: na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.”
Mgbe nke ọ bụla n’ime ha risịworo achịcha ahụ, Jisọs weere otu iko mmanya, nke ihe àmà gosiri na ọ bụ iko nke anọ e jiri mee ihe n’Ememe Ngabiga ahụ. O kpekwara ekpere iji nye ekele n’elu ya, wee nye ha ya, gwa ha ka ha ṅụọ site na ya, wee kwuo, sị: “Iko a [pụtara, NW] ọgbụgba ndụ ọhụrụ n’ime ọbara m, bụ́ nke a na-awụsị n’ihi unu.”
Ya mere, nke a bụ, n’ezie, ememe ncheta nke ọnwụ Jisọs. Kwa afọ, na Naịsan 14, a ga na-emeghachi ya dị ka Jisọs kwuru, iji wee na-echeta ya. Ọ ga-echetara ndị na-eme ya ihe Jisọs na Nna ya nke eluigwe meworo iji nye ihe a kpọrọ mmadụ mgbapụta site n’amamikpe nke ọnwụ. Nye ndị Jụu ghọrọ ndị na-eso ụzọ Kraịst, ememe ahụ ga-anọchi anya Ememe Ngabiga ahụ.
Ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, nke e mere ka ọ dị irè site n’ọbara Jisọs a wụsiri, na-anọchi anya ọgbụgba ndụ Iwu ahụ nke meworo ochie. Ọ bụ Jisọs Kraịst bụ onye ogbugbo ya n etiti òtù abụọ—Jehova Chineke n’otu akụkụ, nakwa 144,000 ndị Kraịst ahụ e ji mmụọ mụta n’akụkụ nke ọzọ. E wezụgakwa iweta ihe ndabere maka mgbaghara mmehie, ọgbụgba ndụ ahụ na-eme ka o kwe mee iguzobe otu mba eluigwe nke ndị eze bụkwa ndị nchụaja. Matiu 26:21-29; Mak 14:18-25; Luk 22:19-23; Jọn 13:18-30; 17:12; 1 Ndị Kọrint 5:7.
◆ Amụma Bible dị aṅaa ka Jisọs hotara n’ihe banyere onye ya na ya nọ, nkọwa dịkwa aṅaa ka o nyere ya?
◆ N’ihi gịnị ka ndị ozi ahụ ji nwee mwute dị omimi, gịnịkwa ka nke ọ bụla n’ime ha jụrụ?
◆ Gịnị ka Jisọs gwara Judas ka o mee, ma nkọwa dị aṅaa ka ndị na-eso ụzọ ndị ọzọ nyere okwu ndị a?
◆ Ememe dị aṅaa ka Jisọs malitere mgbe Judas pụsịrị, ọ̀ bụkwa nzube dị aṅaa ka o mezuru?
◆ Olee ndị so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, ọ̀ bụkwa gịnị ka ọgbụgba ndụ ahụ mezuru?