Nweta Eziokwu Dum!
‘AHỤTỤBEGHỊ m aha ahụ n’ime Bible m,’ ka Francisco kwuru. Aha ahụ bụ Jehova bilitere ná mkparịta ụka ya na otu n’ime Ndịàmà Jehova. N’eziokwu, ọ pụghị ịhụworị aha Chineke ahụ n’ime Bible ya, bụ́ mbipụta 1969 nke nsụgharị Almeida n’asụsụ Portuguese. Aha ahụ bụ Jehova apụtaghị na ya. Dị ka onye Brazil bụ onye Katọlik, Francisco na-ejechi Mass anya na Sunday, ọ na-amasịkwa ya ịgụ Bible n’ụlọ ya. Ma aha ahụ bụ Jehova kpaliri mmasị ya.
Ònye Bụ Chineke?
N’izu na-eso ya, Ndịàmà ahụ wetaara ya mbipụta ọzọ nke nsụgharị Almeida ahụ. Ha tụlekọrọ mbipụta abụọ ahụ n’Abụ Ọma 83:18. Ọ̀ bụkwa gịnị ka ha chọpụtara? Ee, ná mbipụta 1966 ahụ, ihe odide a na-agụ, sị: ‘Gị, onye ọ bụ nanị ya nwe aha ahụ bụ JEHOVA, bụ Onye Kasị Elu n’elu ala nile’! Otu ọ dị, ná mbipụta 1969 ahụ, kama aha ahụ bụ ‘JEHOVA,’ e jiri okwu ahụ bụ ‘ONYENWE ANYỊ’ mee ihe. Onyeàmà ahụ sịrị ya, ‘Ị̀ hụla, ọ dị ihe ha gbanwere n’ebe a,’ o wee jụọ, sị: ‘O doro nnọọ anya na ‘Onyenwe anyị’ abụghị aha, ọ̀ bụ aha?’ Francisco sịrị, ‘Ee e.’ N’ịbụ onye a kpasutụrụ iwe, o kwukwara, sị: ‘Gịnị medịrị ha ji mee otú ahụ?’
Nke a dujere n’ime obere nchọpụta banyere aha Chineke. Dị ka ihe atụ, Francisco mụtara na dị ka akwụkwọ bụ The Catholic Encyclopedia (1910) si kwuo, Jehova bụ ‘ezi aha nke Chineke n’Agba Ochie.’ Ọ mụtakwara na n’asụsụ Hibru, bụ́ nke e ji dee akụkụ ka ukwuu nke ‘Agba Ochie,’ aha ahụ pụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 7,000 ugbo. Ọ dịghị onye nsụgharị nke nwere ikike ịgbanwe ezi aha ahụ bụ Jehova gaa n’utu aha ahụ nke na-adịghị ezo onye ọ bụla aka kpọmkwem, bụ́ Onyenwe anyị. Francisco chọrọ ịmata eziokwu banyere aha ahụ bụ Jehova, ọ chọtakwara ya, site na Bible n’onwe ya, sitekwa ná nnyocha nke e duziri nke ọma.
Gịnị Bụ Ọnọdụ Jisọs?
Dị ka e hotaworo n’isiokwu bu nke a ụzọ, okpukpe ụwa dị iche iche agwagbuwo ọtụtụ eziokwu. Ọ dabara nnọọ na n’ozi ụlọ n’ụlọ ha, Ndịàmà Jehova na-enwe ohere ịchọpụta ihe ụmụ mmadụ kweere. N’eziokwu, nke a na-adị iche iche site n’otu ebe ruo n’ebe ọzọ, ma echiche ụfọdụ yiri nnọọ otu. Dị ka ihe atụ, mgbe a jụrụ ha, sị, ‘Ònye bụ Chineke?’ ụfọdụ ndị nwe ụlọ na-aza, sị, ‘Jisọs.’ Site na nke a, ihe ha na-ekwu bụ na Jisọs bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. Ma echiche nke a ọ̀ bụ eziokwu?
Chee echiche banyere isi ihe ndị na-eso. Jisọs kpegaara Nna ya ekpere, sị: ‘Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara gị, nke nanị gị bụ ezi Chineke, marakwa onye i zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.’ (Jọn 17:3) Ị̀ hụtara na Jisọs ezoghị aka n’ebe onwe ya nọ, kama ọ bụ n’ebe Nna ya nke eluigwe nọ, dị ka ‘nanị ezi Chineke’? N’ihi ya, ndị mbụ na-eso ụzọ Jisọs ziri ezi mgbe ha gwara ya, sị: ‘Ị bụ Ọkpara Chineke n’ezie.’ Jisọs n’onwe ya sịrị: ‘Abụ m Ọkpara Chineke.’ Ya mere, nke bụ eziokwu bụ na Jisọs abụghị Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, kama ọ bụ Ọkpara Jehova Chineke.—Matiu 14:33; Jọn 10:36.
Gịnị Bụ Ọdịnihu nke Ụwa?
Gịnị banyere ihe ga-abụ ọdịnihu nke ọgbọ nke a na nke ụwa? John F. Kennedy, onye nwụworonụ nke bụbu onyeisi ala mba United States, kwuru n’otu okwu ọ gwara nzukọ General Assembly nke òtù UN (Mba Ndị Dị n’Otu), sị: ‘Anyị nwere ikike iji mee ka nke a bụrụ ọgbọ kasị mma nke ihe a kpọrọ mmadụ n’akụkọ ihe mere eme nke ụwa—ma ọ̀ bụkwa iji mee ka ọ bụrụ nke ikpeazụ.’ Ihe àmà gosiri na ndị ndú ụwa nke oge a na-echekwa otú ahụ. Ịhe Ndịàmà Jehova na-anụkarị n’ozi ha bụ na n’ọgwụgwụ ụwa, a ga-eji ọkụ ma ọ bụ agha nuklia bibie mbara ala bụ Ụwa. Iji kwadoo echiche nke a, ụfọdụ ndị na-ezo aka ná Mkpughe 21:1, nke na-asị: ‘M wee hụ eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ: n’ihi na eluigwe mbụ ahụ na ụwa mbụ ahụ gabigararịị; oké osimiri adịghịkwa ọzọ.’
Bible na-ejikarị okwu ahụ bụ ‘ụwa’ eme ihe n’ụzọ ihe atụ, iji zoo aka n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ dị. A na-ahụta otu ihe atụ na Jenesis 11:1, nke na-asị: ‘Uwa nile wee nwee otu asụsụ na otu ụzọ okwu.’ (Leekwa 1 Ndị Eze 2:1, 2; Abụ Ọma 96:1.) Ná Mkpughe 21:1, ‘ụwa mbụ ahụ’ na-ezo aka, ọ bụghị n’ebe mbara ala nke a dị, kama n’ebe ọha mmadụ ndị na-emebi iwu nọ, bụ́ ndị a ga-ebibi ebibi. Nke a ga-eduje n’iweghachi Paradaịs n’elu ala. (Luk 23:43; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-9; Mkpughe 21:4) Nke a kwekọkwara n’akụkụ ndị ọzọ nke Bible, nke na-egosi na ọ dịghị mgbe ọ bụla a ga-ebibi elu ala nkịtị. Dị ka ihe atụ, Abụ Ọma 104:5 kwuru na Chineke ‘[atọwo] ntọala ụwa n’elu ọnọdụ ya guzosiri ike, ka a ghara iwezụga ya n’ọnọdụ ya ruo mgbe nile ebighị ebi.’ (Tụlee Eklisiastis 1:4.) N’eziokwu, Jehova ‘mere ụwa ka e wee biri n’ime ya’ ruo mgbe ebighị ebi.—Aịsaịa 45:18.
N’ihi Gịnị Ka Ị Ga-eji Nweta Eziokwu Dum?
Ihe ndị a bụ nanị ihe atụ nke echiche hiere ụzọ ndị jupụtara ebe nile taa. Otú ọ dị, mgbe onyenwe ụlọ dị njikere ịtụgharị uche, dị ka ọ dị n’ihe banyere Francisco, ọ na-atọ Ndịàmà Jehova ụtọ na e meghewo ụzọ maka ntụle nke eziokwu Akwụkwọ nsọ ndị na-enye ìhè.
Enwetaghị eziokwu dum pụrụ ịrụpụta ihe ndị ga-akpata ịkwa ụta. Iji mee ihe atụ: Mgbe Jisọs nọ n’elu ala, e mere ka ọtụtụ ndị kwere na ọ bụ nanị nwa ọzọ Meri na Josef mụrụ, onye bụbu nanị onye ọkwa nkà na Nazaret. N’ihi ya, ha egeghị ntị nke ukwuu n’ihe ọ na-ekwu. Ruo n’ókè ụfọdụ, ihe ha mere ziri ezi. Jisọs bụ nwa Meri, bụ́ onye mmụọ nsọ kpatara ọmụmụ ya. Ọ bụ onye Josef weere dị ka nwa ya, ọ rụwokwa ọrụ n’ezie dị ka onye ọkwa nkà. (Mak 6:3) Otú ọ dị, nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu dum dịnụ banyere ya? Ee e! Ọ bụ Mesaịa ahụ nakwa onye gaje ịbụ ‘Eze kachasị ndị eze nile’! (Mkpughe 17:14; Luk 1:32-35; Ọrụ 2:36) Enwetaghị eziokwu dum banyere Jisọs mere ka ihe ùgwù nke na-agajeghị ịbịa ọzọ funarị ọtụtụ ndị—iso Jisọs mekọrịta ihe ihu na ihu n’elu ala.
Chọọ Eziokwu Dum
Obodo Beria (nke a na-akpọ Véroia ugbu a) nke dị na Masedọnia oge ochie bụ nke ndị na-agụ Bible maara nke ọma n’ihi àgwà kwesịri ịja mma nke ndị bi na ya n’ime narị afọ mbụ? Gịnị bụ àgwà ahụ? Ihe ndekọ ahụ na-asị: ‘Ha weere obi dị ọkụ nile nara okwu ahụ [nke Pọl onyeozi kwusara] nke ọma, na-enyocha ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ kwa ụbọchị, ma ihe ndị a [hà] dị otú a.’ Gịnị si na ya pụta? ‘Ọtụtụ mmadụ n’ime ha kwere na Jisọs; ọ dịghịkwa ole na ole kwere n’etiti ndị inyom Grik ndị a na-asọpụrụ, na n’etiti ndị’ ikom.’—Ọrụ 17:11, 12.
Àgwà nke ndị amụma oge ochie nke Chineke kwesịkwara ịja mma. Ha ‘chọrọ, nyochaakwa ihe banyere’ nzọpụta ahụ nke gaje ịbịa site n’aka Mesaịa ahụ. (1 Pita 1:10) Chineke gọziri mgbalị ha nile. Ya mere, o doro anya na o nweghị ụzọ ka mkpirikpi e si enweta ya. Ịnọgide na-achọ, jirikwa nlezianya na-enyocha ozizi dị iche iche—nke a bụ ụzọ e si enweta eziokwu dum site na Bible!
Ị pụrụ iche, sị, ‘Olee ebe m ga-amalite?’ Mgbe ọ gụsịrị ụfọdụ akwụkwọ ndị Kraịst, otu nwanyị bi na Brazil dere, sị: ‘Anyị [ya na di ya] matara n’oge na-adịghị anya na ọ dị anyị mkpa inwetakwu ihe ọmụma dị otú ahụ, iji nweta azịza nye ọtụtụ ajụjụ ndị anyị nwere . . . Biko, olee otú m pụrụ isi nweta Bịble na akwụkwọ ndị ọzọ ndị ga-enyere m aka ịmatakwu ihe banyere Nna anyị nke eluigwe?’ Ọ na-agbaso ụzọ ziri ezi: ịgụ Bible ya na akwụkwọ eziokwu ndị dabeere na Bible. Ọ bụrụ na gị onwe gị chọkwara eziokwu dum, megheere Jehova Chineke obi gị ma rịọ enyemaka ya. Biko, rịbakwa ama okwu ndị a na-agba ume: ‘Ọ bụrụ na amamihe fọdụụrụ onye ọ bụla n’ime unu inwe, ya rịọ n’aka Chineke, onye na-enye mmadụ nile n’afọ ofufo, n’ataghịkwa ụta; a ga-ewerekwa ya nye ya. Ma ya rịọ n’okwukwe, ghara inwe obi abụọ.’—Jemes 1:5, 6.
Ọtụtụ nde mmadụ so Ndịàmà Jehova na-atụle Bible, wee si otú a na-achọ, jirikwa nlezianya na-eme nnyocha maka eziokwu ahụ. Ịnara na itinye ezi ihe ọmụma dị otú ahụ nke ezi Chineke ahụ na nke Jisọs Kraịst pụtara ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3) Nke ahụ pụrụ ịbụ oké ngọzi ga-adịrị gị ma ọ bụrụ na ị chọsie ike ma nweta eziokwu dum.
[Foto dị na peeji nke 7]
Eziokwu dum banyere Jisọs bu na ọ bụ Mesaịa ahụ, ọ bụghi nanị onye ọkwa nkà