Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 11/1 p. 3
  • Gịnị Meworo Ọdịdị Mmadụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Meworo Ọdịdị Mmadụ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịgbanwe Ọdịdị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ò Nwere Mgbe Ime Mpụ Ga-akwụsị?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Ọ̀ Dị Mgbe Omume Obi Ọjọọ Ga-akwụsị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • “Unu Atụla Egwu, Unu Atụkwala Ụjọ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 11/1 p. 3

Gịnị Meworo Ọdịdị Mmadụ?

“N’ihi gịnị ka o ji bụrụ na a na-emekpọ ụmụntakịrị ọnụ n’etiti anyị n’ime ọgbọ nke a? N’ihi gịnị ka o ji bụrụ a na-emekpọ ụmụ anụmanụ ọnụ n’etiti anyị? N’ihi gịnị ka o ji bụrụ na a na-eme ihe ike n’etiti anyị? . . . N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji na-eme omume iyi ọha egwu? N’ihi gịnị ka ụmụ mmadụ na-eji amalite ịṅụ ọgwụ ọjọọ? . . . N’ihi gịnị ka o ji bụrụ na, mgbe e nwetasịworo ihe nile, ụfọdụ ụmụ mmadụ na-echigharịkwa gaa n’ime ihe ndị ahụ bụ isi ndị na-eweda mmepeanya nile n’ala?”

ONYE praịm minista mba Britain jụrụ ajụjụ ndị ahụ n’olu dara ụda. Ma eleghị anya ị jụwo ajụjụ ndị yiri ha ọtụtụ mgbe. Ị̀ chọtawo azịza ọ bụla ndị na-eju afọ?

N’ile ajụjụ ya ndị ahụ anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị, onye praịm minista ahụ sịrị: “Ruo ọtụtụ afọ mgbe m ka bụ nwa agbọghọ, nọrọkwa na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na-enwekwa olileanya, echiche ọdịnihu, na ọchịchọ m nile, o yiri nnọọ nye m, nyekwa ọtụtụ n’ime ndị ọgbọ m, na ọ bụrụ na anyị enweta ọgbọ ebe anyị nwere ụlọ obibi dị mma, ezi mmụta akwụkwọ, ọ̀tụ̀tụ̀ ibi ndụ dị mma, mgbe ahụ, ihe nile ga-adị nnọọ mma, anyị ga-enwekwa ọdịnihu nke ka mma, nke dịkwa nnọọ mfe karị. Anyị maara ugbu a na ọ dịghị otú ahụ. Anyị na-eguzo imegide nsogbu ndị bụ ezie nke ọdịdị mmadụ.”—Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.

A pụrụ ịkọwa ọdịdị mmadụ dị ka “njikọta nke àgwà na ihe ndị bụ isi e ji mara mmadụ.” O doro anya na ndịrịta iche nke àgwà na ihe e ji mara mmadụ pụrụ ịkpata nsogbu n’ọ̀tụ̀tụ̀ metụtara mmadụ na ibe ya, mba dum, ma ọ bụ ọbụna n’etiti mba na mba. Ma, ọ̀ bụ ruo n’ókè ha aṅaa ka ụta dịịrị ọdịdị mmadụ n’ezie maka ihe ize ndụ ndị na-eme taa n’ihe banyere ime ihe ike, iyi ọha egwu, ibugharị ọgwụ ọjọọ, na ihe ndị yiri ha?

Ọ̀ bụ nanị ọdịdị mmadụ ka ụta dịịrị maka ọnọdụ ndị na-eyi egwu ‘iweda mmepeanya nile n’ala’? Ka è nwere ihe ndị ọzọ anyị kwesịrị ilebara anya iji kọwaa ihe ọ na-eji adị mfe ụmụ mmadụ ịgbanwe gaa n’omume ndị na-eweda ha n’ala, nke ọchịchọ onwe onye, ebe ọ bụ na ha pụrụ ime mgbalị ịchụso ihe ndị dị elu karị, dịkwa mma karị? Ka anyị hụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya