Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 11/15 p. 28
  • Ịghọta Ihe Dị n’Akụkọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịghọta Ihe Dị n’Akụkọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ̀ Bụ Ụzọ Ịbanye ná Ndụ A Dịrị na Mbụ?
  • Ndị Katọlik na Isikwopụ Afọ Ime
  • Ite Ime Abụghị Ebe Okwu Biri
    Teta!—2009
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ite Ime?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 11/15 p. 28

Ịghọta Ihe Dị n’Akụkọ

Ọ̀ Bụ Ụzọ Ịbanye ná Ndụ A Dịrị na Mbụ?

N’ọnwa ole na ole gara aga. a hụrụ ụmụ agbọghọ atọ nọ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị na kọleji nta ka ha tọgbọ n’amaghị onwe ha n’otu okporo ụzọ dị na Tokushima, Japan, n’ihi ọnwụnwa ha nwara igbu onwe ha. Gịnị kpaliri ha ime ihe ahụ? Akwụkwọ akụkọ bụ Asahi Shimbun kọrọ, sị: “Ha kwere na ha bụ ndị lọrọ ụwa ndị adaeze ndị dịrị n’oge ochie, rụgidekwa onwe ha ikwere na ha pụrụ ileba anya ná ndụ ha dịrị na mbụ ma ọ bụrụ na ha eruo ọnọdụ ebe ọ fọrọ nke nta ka ha nwụruchaa.” Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru na ihe kpatara nke a bụ “omume ahụ dị n’etiti ụmụntakịrị nke iweba onwe ha n’ụwa nke ime anwansi, [nke] nọworo na-amụba nke ukwuu n’ime afọ ole na ole gara aga.” ụmụ agbọghọ ahụ bụ ndị na-agụchi akwụkwọ ihe ọchị ụmụaka anya, bụ ndị na-ekwu ihe banyere ịlọ ụwa.

Otú ọ dị,ịnakwere echiche nke ịlọ ụwa bụ ihe na-abaghị ụrụ dị nnọọ ka ịzọrọ ije na-aga n’ebe e nwere onyinyo yiri mmiri n’ọzara. Bible na-ekpughe na mgbe mmadụ nwụrụ, ‘mmadụ na-alaghachi n’ala ya, n’ụbọchị ahụkwa ka echiche ya nile na-ala n’iyi.’ (Abụ Ọma 146:4) Ozizi ahụ na-eduhie eduhie nke bụ na mkpụrụ obi na-anọgide na-adị ndụ mgbe mmadụ nwụsịrị ekpuchiwo eziokwu nke a banyere ọnwụ. Kama ịkụzi na mmadụ nwere mkpụrụ obi nke na-adịghị anwụ anwụ, Bible na-asị na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ. (Ezikiel 18:4) Ma, nye ndị ahụ nọ ná ncheta nke Chineke, e nwere olileanya ahụ dị ebube nke mbilite n’ọnwụ. (Jọn 5:28, 29) Bible na-ekpughekwa onye bụ isi nke na-akwalite ozizi nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi na nke ịlọ ụwa; ọ bụ Setan bụ Ekwensu, bụ ‘nna nke ụgha.’—Jọn 8:44; tụlee Jenesis 3:4.

Ndị Katọlik na Isikwopụ Afọ Ime

Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ iri agafewo eri mgbe e mere njụta echiche ọha ahụ n’Itali banyere isikwopụ afọ ime, bụ nke e meriri Chọọchị Katọlik na ya. Otú ọ di, n’otu akwụkwọ nke ndị bishọp Itali depụrụ n’oge na-adịghị anya gara aga, ndị ndú okpukpe Katọlik ewelitewokwa okwu ahụ ọzọ nke bụ na “ọjụjụ mmadụ jụrụ isikwopụ afọ ime ma ọ bụ ọbụna nanị inye aka na ya bụ ibu ọrụ nke omume dị oké mkpa, nke gbanyere mkpọrọgwụ n’iwu ahụ nke e dere n’obi mmadụ ọ bụla nke chọọchị ahụ na iwu ya mesikwara ike, bụ́ nke na-eji nchụpụ enye onye Kristian ọ bụla nke sikwopụrụ afọ ime ma ọ bụ onye nyere aka na ya, ahụhụ.”

Gịnị ka ndị Itali na-eche banyere isikwopụ afọ ime? Otu nnyocha e mere na nso nso a n’ebe 2,040 mmadụ nọ kpughere na n’ụzọ megidere ọchịchọ chọọchị ahụ, ndị Itali na-akwado isikwopụ afọ ime n’ọnọdụ anọ dị iche iche. (1) Ọ bụrụ na afọ ime etinye ndụ nke onye bụ nne n’ihe ize ndụ, 83 pasenti kwadoro isikwopụ afọ ime. (2) Mgbe e nwere ihe ize ndụ nke na nwa ahụ e bu n’afọ ga-enwe nkwarụ, 76.3 pasenti kwadoro isikwopụ afọ ime ahụ. (3) Mgbe ahụ ike nke nwanyị ahụ nọ n’ihe ize ndụ, 71.1 pasenti kwadoro isikwopụ afọ ime. (4) Ọ bụrụ na nwanyị tụtara ime ahụ mgbe e dinara ya n’ike, 55.2 pasenti kwenyere na e kwesịrị ikwe ka e sikwopụ afọ ime ahụ. Akwụkwọ La Repubblica ahụ kọrọ na ihe karịrị otu onye Itali n’ime mmadụ anọ ọ bụla kwadoro isikwopụ afọ ime “n’ọnọdụ nile ebe nwanyị ahụ chọrọ ka e mee ya.” A na-esikwopụ ihe a na-eche na o ruru 300,000 afọ ime kwa afọ n’Itali ma n’ụzọ iwu kwadoro ma n’ụzọ iwu na-akwadoghị.

Ihe àmà gosiri na n’okwu ndị a metụtara ndị mmadụ n’ụzọ miri emi, ndị ndú okpukpe Katọlik enwebeghị ike inye ndị òtù ha ezi ntụziaka dabeere n’Akwụkwọ nsọ iji nweta nrubeisi ha. Otú ọ dị, a kụziworo ezi ndị Kraịst ihe Akwụkwọ nsọ kwuru n’isiokwu nke a dị mkpa. N’ihi nsọpụrụ nye ụkpụrụ omume Bible ndị dị elu, ha adịghị esikwopụ afọ ime na nke ọ bụla n’ọnọdụ anọ ndị ahụ a kọwara n’elu.—Ọpụpụ 21:22-25; leekwa Abụ Ọma 139:14-17; Jeremaịa 1:5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya