Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 1/1 p. 30-31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ Gbachiteere Ndị Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ọ Gbachiteere Ndị Chineke
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Esta
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Nwaanyị Obi Kara, nke Na-achọghịkwa Ihe Ga-abara Naanị Ya Uru
    Ṅomie Okwukwe Ha
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 1/1 p. 30-31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

◼Nwa agbọghọ onye Juu ahụ bụ Esta ò sooro eze ndị Peasia nwee mmekọahụ rụrụ arụ iji nweta ihu ọma ya, wee si otú a nweta abamuru dị iche iche?

Ụfọdụ ndị pụrụ ikwubiworịị otú a site n’akụkọ ndị nkịtị kọrọ, ma ihe ndekọ a pụrụ ịdabere na ya nke dị na Bible na-emegide echiche nke a a na-ejighị n’aka.

Ọkọ akụkọ ihe mere eme ndị Juu bụ Flavius Josephus nyere akụkọ efu nke bụ na eze nwanyị ndị Peasia bụ Vashti jụrụ ịpụta n’ihu di ya, bụ́ Ahasuerọs. Ozugbo ahụ, eze ahụ, nke ihe àmà gosiri na ọ bụ Xerxes nke Mbụ nke narị afọ nke ise T.O.A., ji iwe jụ Vashti ma kwe ka a chọzuo na gburugburu alaeze ukwu ahụ iji nweta eze nwanyị ọhụrụ. A chịkọtara ọmarịcha ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke wee nye ha nlekọta ruo ogologo oge ka ha wee makwuo mma.

“Mgbe ahụ, mgbe [onozi eze] chere na e lekọtawo ụmụ agbọghọ ndị ahụ na-amaghị nwoke ruo ókè o kwesịrị . . . na ha eruwokwa eru ịbanye n’àkwà onye eze ahụ, ọ na-ezipụ otu kwa ụbọchị ka ya na eze dinaa, onye, mgbe ya na ya nwesịrị mmekọahụ, na-ezighachiri ya onozi ahụ ozugbo. Ma, mgbe Esta bịakwutere ya, ihe ya masịrị ya, ebe ọ malitewokwara inwe ịhụnanya n’ebe ọ nọ, mere ka ọ ghọọ nwunye ya n’ụzọ iwu kwadoro wee mee ememe agbamakwụkwọ ha.”—Jewish Antiquities, Akwụkwọ XI, 184-202, nke Ralph Marcus sụgharịrị, (Akwụkwọ nke 11, isi 6, paragraf 1, 2, dị ka William Whiston si sụgharịa ya).

Ihe ndekọ nkịtị nke a pụrụ iduje mmadụ n’iche na ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke sooro eze ahụ nwee mmekọahụ na-adịghị ọcha, na nanị ọdịiche e nwere n’ihe banyere Esta bụkwa na mmekọahụ na-adịghị ọcha nke ya dujere n’alụmdi na nwunye nakwa ọbụbụ o mesịrị bụrụ eze nwanyị. Otú ọ dị, Bible na-enye anyị ihe ọmụma ziri ezi karị, nke na-ejukwa afọ karị.

Mgbe ọ kọwasịrị nlekọta ndị ahụ e ji eme ka ha maa mma, Bible na-asị: “Nwa agbọghọ [nke ọ bụla] wee bịakwute eze n’ụzọ dị otú a, . . . N’anyasị ka nwanyị ahụ batara, n’ụtụtụ ka nwanyị ahụ laghachikwara n’ụlọ nke abụọ nke ndị inyom, ruo aka Shaashgaz, bụ́ onozi eze, onye na-edebe ndị iko nwanyị: ọ dịghị abịakwute eze ọzọ ma ọ bụghị na ihe ya tọrọ eze ụtọ, e wee kpọọ ya n’aha.”—Esta 2:13, 14.

Akwụkwọ nsọ na-ekwu na “e kubatara” Esta ‘n’ụlọ ndị inyom’ maka nlekọta ịchọ mma ahụ dị ogologo e kwuru ka e nye: “E wee kuru Esta jekwuru Eze, bụ́ Ahasuerọs . . . Eze wee hụ Esta n’anya karịa ndị inyom ahụ nile, o wee nata amara na ebere n’ihu ya karịa ụmụ agbọghọ ahụ nile ndị na-amaghị nwoke; o wee tụkwasị okpueze alaeze n’isi ya, mee ya nwunye eze n’ọnọdụ Vashti.”—Esta 2:8, 9, 16, 17.

Ị̀ rịbara ama site n’ihe ndekọ Bible ebe a kpọjere ndị inyom ahụ mgbe ha na eze nọsịrị ọnọdụ abalị? ‘Gaa n’ụlọ nke abụọ nke ndị inyom, n’okpuru onye nlekọta nke ndị iko.’ Ya bụ na ha aghọwo ndị iko. Mọdekaị, onye dere akwụkwọ Bible ahụ bụ Esta, bụ onye Hibru, n’etiti ndị ya n’oge ahụ, onye iko nwekwara ọnọdụ ọha mmadụ na-ele anya dị ka nke nwunye nke nọ n’ọkwá nke abụọ. Iwu Chineke nyere ohere na nwoke onye Israel pụrụ iwere nwa agbọghọ bụ onye mba ọzọ a dọtara n’agha, ọ ga-aghọkwa onye iko ya, ma ọ bụ nwunye ya nke nọ n’ọkwá nke abụọ, onye nwere ihe ndị ruuru ya na nchebe ndị iwu kwadoro. (Deuterọnọmi 21:10-17; tụlee Ọpụpụ 21:7-11.) Ụmụ ndị onye bụ onye iko n’ụzọ dị otú ahụ iwu kwadoro na-enwe ọnọdụ ziri ezi n’iwu, ha pụkwara inweta ihe nketa. Ụmụ 12 nke Jekọb, bụ́ ndị nna nna nke ebo 12 nke Israel, bụ ụmụ nke ndị nwunye ya na ndị o nwere dị ka ndị iko n’ụzọ iwu kwadoro.—Jenesis 30:3-13.

Usoro a gbasoro bụ na mgbe ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke sosịrị eze ndị Peasia ahụ nọrịa, ha na-eje n’ụlọ ndị iko. Nke a na-egosi na ha ghọrọ ndị nwunye ya ndị nọ n’ọkwá nke abụọ.

Gịnị banyere Esta? Bible ekwughị na ya na eze ahụ dinara o wee si otú ahụ nweta ihu ọma ya. Ọ kọghị na a kpọjere ya n’ụlọ ndị iko, kama ihe o kwuru bụ nanị: “E wee kuru Esta jekwuru Eze, bụ́ Ahasuerọs, ruo ụlọ alaeze ya . . . Eze wee hụ Esta n’anya karịa ndị inyom ahụ nile.” Cheta na tupu mgbe ahụ, n’ejighị mmekọahụ mebie ọnọdụ dị mma nke nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ọ nọ na ya, o nwetara “ebere” nke “Hegaị, . . . onye na-edebe ndị inyom.” Ọzọkwa: “Esta wee na-anata amara n’anya ndị nile na-ahụ ya anya.” (Esta 2:8, 9, 15-17) Ya mere, ọ pụtara ìhè na Esta mere ihe tọrọ eze ahụ ụtọ, wee nwetakwa nsọpụrụ ya, ọbụna dị ka o nwetaworo nsọpụrụ nke ndị ọzọ.

Lee ka anyị kwesịrị isi nwee ekele n’ihi inwe eziokwu na nghọta ndị ahụ Bible na-enye anyị! Ọ bụ ezie na ọtụtụ puku afọ agafewo kemgbe ihe ndị ahụ mere, anyị na-esi otú a nwee ihe mere anyị ga-eji nwee obi ike na Esta ji ezi ịdị mma mee ihe nakwa n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ nile nke Chineke.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya