Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 1/15 p. 3-4
  • Ịmata Mmụọ Nsọ Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịmata Mmụọ Nsọ Ahụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Akwụkwọ Nsọ na Mmụọ Nsọ ahụ
  • ‘N’aha nke Mmụọ Nsọ’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Otú Mmụọ Chineke Si Duo Ndị Kraịst Na Narị Afọ Mbụ Na Otú O si Edu Ndị Kraịst Taa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ụzọ Mmụọ Chineke Pụrụ Isi Metụta Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Mmụọ Nsọ—Ike Ọrụ Chineke
    Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 1/15 p. 3-4

Ịmata Mmụọ Nsọ Ahụ

Ị̀ MAARA na mmụọ nsọ ahụ na-emetụta ndụ nke onye ọ bụla n’ime anyị? Ị̀ matakwara na ọ pụrụ imeziwanye ndụ gị n’ụzọ dị ukwuu? Nke a pụrụ ịbụrụ gị ihe ịtụnanya. N’eziokwu, ị pụrụ ịjụ, sị: ‘Ònye, ma ọ bụ, gịnị, bụ mmụọ nsọ ahụ?’

Ọ bụrụ na ị nọ n’otu n’ime chọọchị ndị dị na Krisendọm, ma eleghị anya ị nụwo ka onye ụkọchukwu na-eme nwa a mụrụ ọhụrụ baptism “n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke Mmụọ Nsọ.” (Matiu 28:19, The New English Bible) Mgbe a jụrụ ha ka ha kwuo ihe mmụọ nsọ ahụ bụ, ọtụtụ ndị ụkọchukwu na-azaghachi ngwa ngwa, sị: ‘Mmụọ nsọ ahụ bụ onye nke atọ n’ime Atọ n’Ime Otu ahụ, nke ya na Chineke Nna na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst hà nhata n’ụzọ nile.’

Otú ọ dị, e nweghị echiche nke a n’ime narị afọ ole na ole ndị mbụ nke Oge Anyị. Iji mee ihe atụ: Ihe dị ka narị afọ atọ mgbe ndị ozi Jisọs Kraịst nwụsịworo, Gregory onye Nazianzus dere, sị: “Ụfọdụ ndị na-eche na [mmụọ nsọ ahụ] bụ ike (energeia), ụfọdụ ndị na-eche na ọ bụ ihe e kere eke, ụfọdụ ndị na-eche na ọ bụ Chineke, ụfọdụ ndị apụghị ikpebi nke ọ bụ n’ime ihe ndị a.”

Taa, ihe ka ọtụtụ na chọọchị ndị dị na Krisendọm nakweere echiche Atọ n’Ime Otu ahụ nke ihe mmụọ nsọ bụ. Ma nke ahụ ọ̀ bụ ihe Bible na-akwado? Ka ọ̀ bụ nanị echiche nke dabeere n’omenala? N’eziokwu, ọ dịghị mgbe ọ bụla Bible kwuru okwu banyere mmụọ nsọ ahụ n’otu ụzọ ahụ o si kwuo okwu banyere Chineke ma ọ bụ Jisọs. Dị ka ihe atụ, n’ime Bible, mmụọ nsọ enweghị aha onwe onye ọ bụla.

Nke ahụ ọ̀ bụ obere nkọwa efu nke na-adịghị oké mkpa? Ee e, aha dị mkpa n’ime Bible. Chineke mesiri ike mkpa nke aha nke onwe ya dị mgbe o kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova; nke ahụ bụ aha m: m gaghị enyekwa onye ọzọ nsọpụrụ m, m gaghị enyekwa arụsị dị iche iche a pịrị apị otuto m.” (Aịsaịa 42:8) E mesiri ịdị mkpa nke aha Jisọs Kraịst ike tupu a mụọ ya mgbe otu mmụọ ozi gwara Meri, sị: ‘Ị ga-akpọ aha ya Jisọs.’ (Luk 1:31) Ọ bụrụ na aha nke Nna na nke Ọkpara ahụ dị mkpa otú a, n’ihi gịnị ka mmụọ nsọ ahụ na-enweghị aha onwe onye? N’eziokwu, nanị nkọwa nke a kwesịrị ime ka mmadụ chee echiche ma mmụọ nsọ ahụ na Nna na Ọkpara ahụ hà hà nhata n’ezie.

Akwụkwọ Nsọ na Mmụọ Nsọ ahụ

N’ime Akwụkwọ Nsọ Hibru, ma ọ bụ “Agba Ochie,” e nwere ebe dị iche iche e zoro aka ná “mmụọ nsọ” ahụ nakwa ná “mmụọ m [nke Chineke].” (Abụ Ọma 51:11; Joel 2:28, 29) Anyị na-agụ na mmụọ nsọ ahụ pụrụ ijupụta n’ime mmadụ, ịbịakwasị ya, na irikpu ya. (Ọpụpụ 31:3; Ndị Ikpe 3:10; 6:34) E nwere ike iwere ụfọdụ n’ime mmụọ nsọ Chineke site n’otu onye wee nye onye ọzọ. (Ọnụ Ọgụgụ 11:17, 25) Mmụọ nsọ pụrụ ịmalite ịrụ ọrụ n’ahụ mmadụ, na-eme ka o nwee ike ime ihe ndị karịrị ike mmadụ.—Ndị Ikpe 14:6; 1 Samuel 10:6.

Nkwubi okwu dị aṅaa nke ezi uche dị na ya ka a pụrụ iru na ya site n’okwu ndị dị otú ahụ? O doro anya na ọ bụghị na mmụọ nsọ ahụ bụ onye. Olee ụzọ a pụrụ isi were otu akụkụ nke otu onye site n’ahụ otu mmadụ wee nye mmadụ ọzọ. Ọzọkwa, e nweghị ihe àmà ọ bụla nke na-egosi na mgbe Jisọs nọ n’elu ala, na ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi lere mmụọ nsọ ahụ anya dị ka onye nke ya na Nna ahụ hà nhata. O doro anya na ha efeghị mmụọ nsọ ahụ ofufe. Kama nke ahụ, ofufe ha bụ nye nanị Jehova, Onye ahụ nke Jisọs n’onwe ya kpọrọ “Nna m” na “Chineke m.”—Jọn 20:17.

Dị ka ihe ahụ nke a na-akpọ Agba Ochie, akụkụ Bible ahụ nke a na-akpọ Akwụkwọ Nsọ Grik nke ndị Kraịst, ma ọ bụ “Agba Ọhụrụ,” na-ekwu na mmụọ nsọ pụrụ ‘ijupụta n’ime’ mmadụ ma ọ bụ ịdị “n’ahụ” ya. (Ọrụ 2:4; Luk 2:25-27) ‘E nyere,’ ‘wụkwasị,’ ‘kesaakwa,’ mmụọ nsọ. (Luk 11:13; Ọrụ 10:45; Ndị Hibru 2:4) Na Pentikọst nke 33 O.A., ndị ahụ na-eso ụzọ natara “ụfọdụ n’ime” mmụọ Chineke. (Ọrụ 2:17) Akwụkwọ nsọ na-ekwukwa okwu banyere iji mmụọ nsọ mee baptism na ijikwa ya tee mmadụ mmanụ.—Matiu 3:11; Ọrụ 1:5; 10:38.

Okwu ndị dị otú ahụ dị na Bible na-egosipụta na mmụọ nsọ ahụ abụghị onye. A na-akwado nkwubi okwu nke a mgbe anyị hụrụ na e depụtakọrọ mmụọ nsọ ahụ na ihe ndị ọzọ na-enweghị ọdịdị nke ịbụ onye. Dị ka ihe atụ, Bible na-ekwu na Stifen “jupụtara n’okwukwe na mmụọ nsọ.” (Ọrụ 6:5) Pọl onyeozi kọwapụtakwara onwe ya dị ka onye ozi nke Chineke “n’ime ịdị ọcha, n’ime ihe ọmụma, n’ime ogologo ntachi obi, n’ime obi ọma, n’ime mmụọ nsọ, n’ime ịhụnanya nke ihu abụọ na-adịghị ya.”—2 Ndị Kọrint 6:4-6.

N’ezie, mgbe ụfọdụ Bible na-ekwu okwu banyere mmụọ nsọ dị ka à ga-asị na ọ bụ onye. Dị ka ihe atụ, Aịsaịa kwuru na ụfọdụ ndị nnupụisi ‘mere ka mmụọ nsọ Chineke nwee mwute.’ (Aịsaịa 63:10) Pọl kwuru na a pụrụ ‘imejọ ya.’ (Ndị Efesọs 4:30) Akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche kwukwara na mmụọ nsọ na-ezi ihe, na-eduzi, na-ekwu okwu, na-agbakwa àmà. (Jọn 14:26; 16:13, 14; 1 Jọn 5:7, 8) Ma Bible kwukwara okwu banyere ihe ndị ọzọ na-adịghị ndụ dị ka à ga-asị na ha bụ onye, dị ka amamihe, ọnwụ, na mmehie. (Ilu 1:20; Ndị Rom 5:17, 21) Nke a bụ n’ezie ụzọ pụtara ìhè nke Akwụkwọ nsọ na-eji eme ihe mgbe ụfọdụ ikwupụta ihe dị iche iche.

Taa, anyị na-ekwu okwu banyere Bible n’ụzọ yiri nke ahụ mgbe anyị na-ekwu na ọ na-ekwu otu ihe ma ọ bụ na-ezi otu ozizi. N’iji okwu ndị dị otú ahụ eme ihe, anyị adịghị ekwu na Bible bụ onye, ànyị na-ekwu otú ahụ? Bible adịghị ekwukwa na mmụọ nsọ bụ onye mgbe o jiri okwu ndị yiri nke ahụ mee ihe.

Ya mere, gịnị bụ mmụọ nsọ ahụ? Ọ bụghị onye. Kama nke ahụ, ọ bụ ike ọrụ Chineke, nke ọ na-eji eme ihe imezu uche ya. (Jenesis 1:2) Ma olee ụzọ mmụọ nsọ ahụ na-esi emetụta ndụ anyị? Oleekwa ụzọ anyị pụrụ isi rite uru n’onwe anyị karị site n’ịrụ ọrụ ya?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya