Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Ị Maara Bible?
‘Olee banyere akwụkwọ nke Tọmas? Eenụnụ, ọ dị n’ime Bible. Ma akwụkwọ nke Jona adịghị ya. Olee ebe a mụrụ Kraịst? Oo, ọ bụ na Jerusalem—ka ọ̀ bụdị na Nazaret? Ejighị m n’aka ma akwụkwọ nke Aịsaịa ọ̀ dị n’akụkụ nke mbụ ma ọ bụ na nke abụọ nke Bible. Ndị ozi ahụ hà dị ole? O dochaghị m anya.’
MAGAZIN bụ Christianity Today kwuru, sị, “Nchọpụta ndị ahụ agaraghị abụ ihe ijuanya ma a sị na e nwetara azịza ndị ahụ nanị n’etiti ndị na-abụghị ndị Kristian. Ihe bụ ihe ijuanya—nke na-enyekwa nsogbu—bụ ọ̀tụ̀tụ̀ amaghị ihe dị n’Akwụkwọ nsọ nke a na-ahụ n’etiti ndị Kristian a mụworo ọzọ.”
Dị ka ihe atụ, 22 pasenti nke ndị na-aza ndị Kristian n’ọnụ e nyochara chere na n’ezie e nweghị akwụkwọ Tọmas n’ime Bible, ebe 13 pasenti na-ejighị n’aka. N’ihe banyere Jona, 27 pasenti kwuru na ọ dịghị na Bible, 12 pasenti amaghịkwa ma ọ dị ma ọ̀ bụ na ọ dịghị. Pasenti 6 enweghịdị ike ịkọ nkọ banyere ebe a mụrụ Kraịst, ebe 16 pasenti kwuru na ọ bụ na Jerusalem, 8 pasenti ekwuokwa na ọ bụ na Nazaret. Pasenti 13 zuru ezu amaghị ihe ọ bụla banyere ebe a pụrụ ịchọta akwụkwọ Aịsaịa n’ime Bible, ebe 11 pasenti kwuru na ọ dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke ndị Kraịst (“Agba Ọhụrụ”). Ọ bụkwa ezie na ihe ka ọtụtụ maara na e nwere ndị ozi 12, 12 pasenti nyere ọnụ ọgụgụ ọzọ malite na 2 ruo ihe karịrị 20, 10 pasenti amaghịkwa ihe ọ bụla banyere ole ha dị.
Ajụjụ nke kasị nyee nsogbu bụ ma okwu ahụ bụ “Chineke na-enyere ndị ahụ na-enyere onwe ha aka aka” ọ̀ dị n’ime Bible ma ọ bụ na ọ dịghị. Nanị 38 pasenti nke ndị “Kristian” ndị ahụ e nyochara maara na a gaghị achọta ya n’ebe ọ bụla n’ime Bible, ebe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ, 42 pasenti, chere na ọ bụ okwu e hotara site na Bible. Ndị fọdụrụnụ amaghị ma ọ dị ya ma ọ bụ na ọ dịghị ya.
Magazin Christianity Today na-ajụ, sị, “N’ihi gịnị ka e ji nwee amaghị ihe dị ukwuu otú a banyere Bible? O yikarịsịrị ka ihe kpatara ya ọ bụ agụghị Bible. Ọkara ndị America nile adịghị agụ Bible. Ihe ka ọtụtụ ná ndị Kristian nile a mụworo ọzọ na-agụ Bible nanị otu ugbo ma ọ bụ ugbo abụọ n’izu, ma ọ bụ ha adịghị agụ ya ma ọlị. Ka a sịkwa ihe mere na ọtụtụ ndị Kristian maara ihe dị nta otú a banyere Akwụkwọ nsọ!”