Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 1/15 p. 21
  • “Nke A Bụ Ahụ M”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Nke A Bụ Ahụ M”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Na-emenụ Nke A Ka Unu Wee Na-echeta M”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị Nwere Ihe Dị Ukwuu Ọ Pụtara Nye Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị—Ihe Omume nke Na-ewetara Chineke Nsọpụrụ
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Na-eme Ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 1/15 p. 21

“Nke A Bụ Ahụ M”

“WERENỤ ma rie ya; . . . nke a bụ ahụ m.” (Matiu 26:26, The New Jerusalem Bible) Jisọs Kraịst ji okwu ndị a kesaara ndị ozi ya achịcha na-ekoghị eko mgbe ọ na-eguzobe Nri Anyasị Onyenwe Anyị. Ma gịnị ka okwu ya ndị ahụ na-egosi, bụ́, “Nke a bụ ahụ m”?

AZỊZA nye ajụjụ nke a dị mkpa nye ndị Roman Katọlik, ebe okwu Jisọs bụ ihe ndabere maka ozizi nke imepụta ahụ na ọbara Kristi. Dị ka nkwenkwe nke a si dị, mgbe ndị Katọlik na-edo Mas ma na-eri achịcha oriri nsọ ahụ, ọ na-agbanwe ghọọ anụ ahụ nkịtị nke Kraịst. Ya mere, ha ekwenyeghị ma ọlị ná nsụgharị New World Translation of the Holy Scriptures ahụ, nke sụgharịrị okwu Jisọs ịbụ: “Naranụ, rie. Nke a pụtara ahụ m.” Nsụgharị nke a na-ezo aka na achịcha ahụ bụ ihe nnọchianya nke anụ ahụ Jisọs, ọ bụghị anụ ahụ ahụ n’onwe ya. Olee nsụgharị nke na-enye echiche ziri ezi?

Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “bụ” ma ọ bụ “pụtara” bụ e·stinʹ. N’ụzọ bụ isi ọ pụtara “bụ,” ma ọ pụkwara ịpụta “igosi, ịbụ ihe àmà nke.” Olee nsụgharị nke ka mma n’ọnọdụ okwu nke a?

E kwesịrị ịrịba ama otu nkọwa ala ala peji banyere Matiu 26:26 n’akwụkwọ ahụ e biri n’asụsụ Spanish bụ La Sagrada Escritura, Texto y comentario por Profesores de la Compañia de Jesús, Nuevo Testamento I (Akwụkwọ Nsọ, Okwu na Nkọwa Ndị Profesọ nke Òtù Jisọs, Agba Ọhụrụ). O kwuru, sị: ‘Nsụgharị ahụ, ọ bụrụ na e lee ya anya n’ụzọ ụtọ asụsụ, bụ nke a pụrụ ịsụgharị bụ ihe àmà nke ma ọ bụ sere onyinyo dịkwa ka bụ—nke pụtara ihe ọ bụ n’ụzọ nkịtị. Iji mee ihe atụ nke ebe ihe ndị ọ pụtara bụ sere onyinyo, a pụrụ izo aka na Jenesis 41:26; Ezikiel 5:5; Daniel 7:17; Luk 8:11; Matiu 13:38; 16:18; Ndị Galetia 4:24; Mkpughe 1:20. Ihe bụ ([n’echiche nke] ihe ya na ihe yiri) pụtara, bụ nke a na-aghọta, dị ka a pụrụ ịhụ ya site n’akwụkwọ ebe ndị e depụtara ihe ndị a ga-ekwere n’ajụghị ase, n’agụnyeghị na ọ pụrụ ikwe omume iji ya mee ihe dị ka ihe bụ ihe, ma ọ bụ ime ihe atụ ihe, sitekwa n’ụzọ Chọọchị Oge Ochie ahụ si ghọta ahịrịokwu ahụ.’

Dị ka nsụgharị Roman Katọlik nke a gosiri n’ụzọ bụ eziokwu, n’ikwu ya n’ụzọ ụtọ asụsụ, a pụrụ ịghọta okwu Jisọs ahụ na nke ọ bụla n’ime ụzọ abụọ ndị ahụ. N’eziokwu a sụgharịrị okwu Grik ahụ bụ e·stinʹ ịbụ “ihe ọ pụtara” n’ebe ọzọ ná nsụgharị The New Jerusalem Bible nke ndị Katọlik. (Matiu 12:7) Olee okwu nke onye na-eme nsụgharị ga-ahọrọ na Matiu 26:26? Ebe ọ bụ na Jisọs ka dị ndụ n’anụ ahụ zuru okè mgbe o kwuru okwu dị n’ihe odide ahụ, achịcha ahụ o nyere ndị na-eso ụzọ ya apụghị ịbụworị anụ ahụ ya nkịtị. Ọzọkwa, a chụrụ anụ ahụ ya dum dị ka mmadụ zuru okè dị ka àjà mgbapụta. (Ndị Kọlọsi 1:21-23) Ya mere, nsụgharị kasị mma nke amaokwu nke a bụ: “Nke a pụtara ahụ m.” Achịcha ahụ na-ekoghị eko sere onyinyo ahụ Jisọs, nke a gaje ịchụ n’àjà n’ihi ọdịmma nke ihe a kpọrọ mmadụ.

Ọbụna ma a sị na Bible nke gị nwere okwu ahụ bụ “nke a bụ ahụ m,” ọ dịghị mkpa ka i nwee mgbagwoju anya. Ọtụtụ mgbe, Jisọs jiri okwu dị otú a mee ihe. Mgbe ọ sịrị, “Mụ onwe m bụ ọnụ ụzọ” ahụ na, “Mụ onwe m bụ ezi osisi vine,” ọ dịghị onye ghọtara ya na ọ bụ ọnụ ụzọ nkịtị ma ọ bụ osisi vine nkịtị. (Jọn 10:7; 15:1) Ọzọkwa, dị ka The New Jerusalem Bible si dee ya, mgbe ọ gara n’ihu ibunye ndị na-eso ụzọ ya iko mmanya, wee sị: “Iko nke a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ,” ọ dịghị onye chere na iko ahụ bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ n’onwe ya. (Luk 22:20) N’otu aka ahụ kwa, mgbe o kwuru na achịcha ahụ “bụ” ahụ ya, anyị aghaghị ịghọta ya na achịcha ahụ “pụtara,” ma ọ bụ sere onyinyo, ahụ ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya