“Ike Agwụla Unu n’Obi n’Ime Ihe Ọma”
Isi Ihe Ndị Sitere Ná Ndị Tesalọnaịka nke Abụọ
NCHEGBU Pọl onyeozi nwere maka ndị Kraịst ahụ bi n’obodo ahụ dị na Masedonia, bụ́ Tesalọnaịka, kpaliri ya ide akwụkwọ ozi nke abụọ o zijeere ha, n’ihe dị ka afọ 51 O.A. Ụfọdụ ndị nọ n’ime ọgbakọ ahụ na-ekwu ihe na-ezighị ezi, na-asị na ọnụnọ Jisọs Kraịst dị oké nso. Ma eleghị anya ọbụna na a kọwara otu akwụkwọ ozi nke e kwuru n’ụzọ na-ezighị ezi na ọ bụ Pọl detara ya dị ka ọ̀ na-egosi na “ụbọchị Jehova” abịawo.—2 Ndị Tesalọnaịka 2:1, 2, NW.
Ya mere, ọ dị mkpa ịgbazigharị echiche nke ụfọdụ ndị Tesalọnaịka. N’ime akwụkwọ ozi ya nke abụọ, Pọl jara ha mma maka okwukwe ha nke na-amụbawanye, ịhụnanya ha nke na-adịwanye ukwuu, nakwa ntachi obi ha ji ikwesị ntụkwasị obi na-enwe. Ma o gosikwara na ndapụ n’ezi ofufe gaje ịbịa tupu oge ọnụnọ Jisọs. Ya mere, a gaje inwe oge ihe isi ike n’ọdịnihu, akwụkwọ ozi nke onyeozi ahụ ga-enyekwara ha aka ịgbaso ndụmọdụ ya ahụ bụ: “Ike agwụla unu n’obi n’ime ihe ọma.” (2 Ndị Tesalọnaịka 3:13) Okwu Pọl ndị ahụ pụkwara inyere anyị aka n’otu ụzọ ahụ.
Mkpughe na Ọnụnọ nke Kraịst
Pọl bu ụzọ kwuo okwu banyere nnapụta site ná mkpagbu. (1:1-12) Nke a gaje ịbịa “n’ime mkpughe nke Onyenwe anyị Jisọs site n’eluigwe, ya na ndị mmụọ ozi nke ike ya.” Mgbe ahụ, a ga-eweta mbibi ebighị ebi n’isi ndị na-adịghị ekwere n’ozi ọma ahụ. Ọ bụ ihe nkasi obi icheta nke a mgbe anyị na-ata ahụhụ mkpagbu n’aka ndị na-akpagbu anyị.
Ọzọ, Pọl mere ka ọ pụta ìhè na a ga-ekpughe “onye ahụ na-emebi iwu” tupu oge ọnụnọ Kraịst. (2:1-17) Ndị Tesalọnaịka ahụ ekwesịghị ịbụ ndị a kpaliri gabiga ókè site n’ozi ọ bụla nke na-atụ aro na ‘ụbọchị Jehova’ abịakwasịwo ha rịị. Ndapụ n’ezi ofufe ahụ ga-ebu ụzọ mee, e wee kpughee onye ahụ na-emebi iwu. Mgbe nke ahụ gasịrị, Jisọs ga-eme ya ka ọ ghara ịdị irè, na-eme nke ahụ ná ngosipụta nke ọnụnọ Ya. Tupu mgbe ahụ, Pọl kpere ekpere ka Chineke na Kraịst gbaa obi ndị Tesalọnaịka ahụ ume, meekwa ka ha “guzosie ike n’ezi ọrụ na eziokwu nile ọ bụla.”
Imeso Ndị Na-adịghị Agazi Ije Ihe
Ntuziaka banyere imeso ndị na-adịghị agazi ije ihe so n’ihe ndị ọzọ Pọl gara n’ihu ikwu. (3:1-18) O gosipụtara obi ike o nwere na Onyenwe anyị ga-ewusi ndị Tesalọnaịka ahụ ike, meekwa ka ha ghara ịdaba n’aka ajọ onye ahụ, Setan bụ́ Ekwensu. Ma ọ dị mkpa ka ha mee ihe ụfọdụ maka abamuru ime mmụọ nke onwe ha. Ha ga-ekewapụ onwe ha n’ebe ndị ọ bụla na-adịghị agazi ije nke ọma nọ, bụ́ ndị na-etinye anya n’okwu ndị na-emetụtaghị ha, na-ajụkwa ịrụ ọrụ. Pọl sịrị, “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọghị ịrụ ọrụ, ya gharakwa iri ihe.” A ga-aka ndị dị otú ahụ akara, a gaghị esokwa ha na-akpakọrịta, ọ bụ ezie na a ga na-adụ ha ọdụ dị ka ụmụnna. Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi na Tesalọnaịka agaghị ekwe ka ike gwụ ha n’obi n’ime ezi ihe, Pọl chọkwara ka amara nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịkwasị ha nile.
Akwụkwọ ozi nke abụọ Pọl degaara ndị Tesalọnaịka na-emesi Ndịàmà Jehova obi ike na nnapụta site ná mkpagbu ha ga-abịa mgbe Kraịst na ndị mmụọ ozi ya wetara ịbọ ọ́bọ̀ n’isi ndị na-adịghị anakwere ozi ọma ahụ. Ọ bụkwa ihe na-ewusi okwukwe ike ịmara na n’oge na-adịghị anya, a gaje ime ka “onye ahụ na-emebi iwu” (òtù ndị ndú okpukpe nke Krisendọm) bịaruo ọgwụgwụ ya. Tupu mgbe ahụ, ka anyị gbasoo agbamume Pọl wee ghara ikwe ka ike gwụ anyị n’obi n’ime ihe ọma.
Igbe/Foto dị na peeji nke 23]
Okwu Jehova Na-aga Ọsọ Ọsọ: Pọl dere, sị, “Na-ekpenụ ekpere n’ihi anyị, ka okwu Jehova wee nwee ike na-aga ọsọ ọsọ [ma ọ bụ, “na-agba ọsọ”] na-enwetakwa otuto dị nnọọ ka ọ dị n’ezie n’etiti unu.” (2 Ndị Tesalọnaịka 3:1, NW; Kingdom Interlinear) Ụfọdụ ndị ọkà mmụta atụwo aro na onyeozi ahụ na-ezo aka n’ebe ndị na-agba ọsọ nọ, bụ́ ndị na-agbasi ọsọ ike n’ịsọ mpì. Ọ bụ ezie na nke ahụ edochaghị anya, Pọl rịọrọ arịrịọ maka ekpere ndị Kraịst ahụ nọ na Tesalọnaịka ka ya na ndị ọrụ ibe ya nwee ike ịgbasa okwu nke eziokwu ahụ n’ụzọ dị ngwa, n’enweghịkwa ihe mgbochi. N’ihi na Chineke na-aza ekpere ndị dị otú ahụ, okwu ya ‘na-aga ọsọ ọsọ’ ka a na-eji ụzọ dị ngwa na-ekwusa ozi ọma ahụ n’ime mgbe ikpeazụ ndị a. Okwu Jehova ‘na-enwetakwa otuto,’ bụrụ nke ndị kwere ekwe na-akwanyere ùgwù nke ukwuu dị ka “ike nke Chineke ruo nzọpụta,” dị ka ọ dịrị n’etiti ndị Tesalọnaịka bụ́ ndị nakweere ya. (Ndị Rom 1:16; 1 Ndị Tesalọnaịka 2:13) Lee ka anyị si nwee obi ụtọ na Chineke na-agọzi ndị nkwusa Alaeze, na-emekwa ka ìgwè ndị na-efe ya ofufe jiri oké ọsọ na-amụba!—Aịsaịa 60:22.