Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 2/15 p. 31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbe Ndị Agadi Ga-abụghachi Ụmụ Okoro na Agbọghọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ụgwọ Ọrụ Job—Isi Iyi nke Olileanya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Nwoke Kwesịrị Nṅomi nke Nakweere Mgbazi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ihe Mmụta n’Ụzọ E Si Edozi Nsogbu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 2/15 p. 31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

◼Job 33:24 na-ekwu na a chọtara “ihe mgbapụta” maka Job, na-enye ya ohere ka ọ ghara ịnwụ. Ònye gaje ịbụ ihe mgbapụta ahụ?

Ọ dịghị àjà mgbapụta ọ bụla bụ mmadụ a chụụrụ Job laa azụ n’oge ahụ, ma Chineke kpuchiri, ma ọ bụ gbaghara, mmehie Job.

Setan wetaara Job ọtụtụ nsogbu, gụnyere “ihe ohihi ọjọọ . . . site n’ọbụ ụkwụ ya ruo opunisi ya.” Ọnọdụ Job dị njọ nke ukwuu nke na nwunye ya gbara ya ume ka ọ “gbakụta Chineke azụ, nwụọ.” Ọbụna Job n’onwe ya tụgharịrị uche ma ọ̀ ga-aka mma ịnwụ anwụ karịa ịta ụdị ahụhụ ahụ.—Job 2:7-9; 3:11.

Mgbe o yiri ka Job ọ̀ ga-anwụ, Elaịhu tụlere ọnọdụ ọjọọ Job nọ na ya wee tọọ ntọala maka inwe olileanya, na-asị: “Anụ ahụ ya na-agwụsị, e wee ghara ịhụ ya anya; . . . Mkpụrụ obi ya wee na-abịaru nso olulu, ndụ ya na-abịarukwa nso ndị na-eme ka a nwụọ. Ọ bụrụ na mmụọ ozi anọọ n’akụkụ ya, bụ́ onye nsụgharị, otu onye n’etiti [otu puku ndị mmụọ ozi], igosi mmadụ izi ezi ya; ọ ga-emekwara ya amara, sị, Dọpụta ya n’ịrịda n’olulu, achọtawo m ihe mgbapụta. Anụ ahụ ya ga-adị ọhụrụ karị nke nwata.”—Job 33:21-25.

Anyị maara na Jisọs Kraịst nyere ndụ mmadụ ya zuru okè dị ka ihe mgbapụta ruru eru maka ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Ihe ọ chụrụ n’àjà kwekọrọ n’ihe ahụ Adam tụfuworo, na-akwụ ụgwọ ahụ dị mkpa iji nweta ntọhapụ site ná mmehie. (Ndị Rom 5:12-19; 1 Timoti 2:5, 6) Otú ọ dị, ọ bụghị nanị ebe ahụ ka e jiri okwu ahụ bụ “ihe mgbapụta” mee ihe n’ime Bible. Okwu Hibru nke dị na Job 33:24 pụtara n’ụzọ bụ isi “ihe mkpuchi.” (Ọpụpụ 25:17) Mgbe Chineke na-emeso Israel oge ochie ihe, o nwere ndokwa nke ikpuchi, ma ọ bụ ịkachapụ, mmehie—àjà nke na-ekpuchi mmehie, na-eme ka e dozie okwu n’etiti ụmụ mmadụ na Chineke.—Ọpụpụ 29:36; Levitikọs 16:11, 15, 16; 17:11.

Ma tupu mgbe ahụ, Chineke adịwo njikere ịnara àjà dị iche iche dị ka ụzọ igosi ekele ma ọ bụ ịrịọ arịrịọ mgbaghara na nkwado. (Jenesis 4:3, 4; 8:20, 21; 12:7; 31:54) Job maara uru àjà ndị dị otú ahụ bara. Anyị na-agụ, sị: “O wee bilie n’isi ụtụtụ, suree àjà nsure ọkụ, dị ka ọnụ ọgụgụ [ụmụ ya ndị ikom] nile si dị: n’ihi na Job sịrị, Eleghị anya ụmụ m ndị ikom emehiewo, gbakụtakwa Chineke azụ n’obi ha. Otú a ka Job na-eme ụbọchị nile.” (Job 1:5) Ebe ọ bụ na ọ na-agbalị ime ihe na-atọ Chineke ụtọ, o dokwara anya na o nwere mmụọ nke na-enwe mwute n’ihi mmehie, àjà ya ndị ahụ bara uru n’anya Chineke.—Abụ Ọma 32:1, 2; 51:17.

Ma Job mesịrị rịa ọrịa nke yiri ka ọ̀ ga-egbu ya egbu. O lekwara ezi omume ya anya n’ụzọ na-ezighị ezi, ya mere ọ dị mkpa ka a gbazie ya, bụ́ nke Elaịhu mere. (Job 32:6; 33:8-12; 35:2-4) Elaịhu kwuru na ọ dịghị mkpa ka Job nọgide n’ọnọdụ mwute ya ruo ọnwụ, ruokwa n’olulu (Sheol, ma ọ bụ ili nkịtị). Ọ bụrụ na Job echegharịa, a pụrụ ịchọta “ihe mgbapụta.”—Job 33:24-28.

Ọ dịghị mkpa ka anyị chee na site n’okwu ahụ bụ “ihe mgbapụta,” na Elaịhu na-ekwu banyere mmadụ nke ga-anwụchitere Job ọnwụ n’oge ahụ. N’iburu ụdị àjà nke ndị na-efe ezi ofufe na-achụkarị, ụdị ihe mgbapụta Elaịhu na-ezo aka na ya n’ihe banyere Job pụrụ ịbụworị àjà anụmanụ. Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịmara na Chineke mesịrị gwa ndị enyi atọ ahụ na-akatọ Job, sị: “Sureere onwe unu àjà nsure ọkụ; Job, bụ́ ohu m, ga-ekpekwa ekpere banyere unu.” (Job 42:8) N’agbanyeghị ihe bụ ụdị ihe mgbapụta ahụ, isi ihe dị n’okwu Elaịhu bụ na a pụrụ ikpuchi mmehie Job, nke pụkwara ịrụpụtara ya abamuru.

Nke ahụ bụ ihe merenụ. Job ‘chegharịrị n’elu ájá na ntụ́.’ Mgbe ahụ, gịnị meziri? “Jehova mekwara ka ndọta n’agha Job lata . . . Ọzọ, Jehova gọziri ikpeazụ Job karị mmalite ya . . . Job wee dị ndụ mgbe ihe ndị a gasịrị [otu narị na iri afọ anọ] o wee hụ ụmụ ya, na ụmụ ụmụ ya, bụ́ ọgbọ anọ.” N’eziokwu, ihe mgbapụta ahụ emeghị ka Job nwere onwe ya pụọ ná mmehie, ya mere, mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ọ nwụrụ. Ma, ime ka ndụ ya dịwanye ogologo nwapụtara na, n’ụzọ dị irè, ‘anụ ahụ ya dịrị ọhụrụ karịa nke nwata, ọ laghachikwukwaara ụbọchị okorobịa ya.’—Job 33:25; 42:6, 10-17.

Ngọzi ndị ahụ ndị bịaara Job site n’itinye ihe mgbapụta a kpaara ókè n’ọrụ nọ dị ka ngosi bu ụzọ nke ngọzi bara ụba nke ga-abịara ihe a kpọrọ mmadụ kwere ekwe n’ime ụwa ọhụrụ ahụ. Mgbe ahụ, a ga-enweta abamuru zuru ezu nke àjà mbgapụta Jisọs, na-ewepụ ruo mgbe ebighị ebi ajọ mmetụta nile nke mmehie na ezughị okè. Lee nnọọ oké ihe mere anyị ga-eji ‘tie mkpu ọṅụ,’ dị ka Elaịhu hotara!—Job 33:26.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya