Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 4/1 p. 14-15
  • Mpụta Ndị Ọzọ Jisọs Pụtara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mpụta Ndị Ọzọ Jisọs Pụtara
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mpụta Ndị Ọzọ Jisọs Pụtara
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Jizọs Apụta n’Ihu Ọtụtụ Ndị Mgbe A Kpọlitechara Ya n’Ọnwụ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • N’ime Ụlọ A Kpọchiri Akpọchi
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • A Kpọlitere Jizọs n’Ọnwụ!
    Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 4/1 p. 14-15

Ndụ na Ije Ozi Jisọs

Mpụta Ndị Ọzọ Jisọs Pụtara

OBI ndị ahụ na-eso ụzọ ka dara mbà. Ha aghọtaghị ihe ili ahụ nke tọgbọrọ n’efu pụtara, ha ekweghịkwa ihe ndị inyom ahụ kọrọ. Ya mere n’uhuruchi Sunday, Kleopas na otu onye ọzọ na-eso ụzọ hapụrụ Jerusalem na-eje Emeus, nke dị ihe dị ka kilomita 11 site n’ebe ahụ.

Mgbe ha nọ n’ụzọ, mgbe ha nọ na-akparịta ụka banyere ihe ndị mere n’ụbọchị ahụ, otu onye ha na-amaghị sonyeere ha. Ọ jụrụ, sị, “Gịnị bụ okwu ndị a unu na-agwarịta onwe unu, ka unu na-aga ije?”

Ndị ahụ na-eso ụzọ wee kwụsị, nwee ihu mgbarụ, Kleopas wee zaghachi, sị: “Ọ̀ bụ nanị gị onwe gị nọ dị ka ọbịa na Jerusalem n’amaghị ihe mere n’ime ya n’ụbọchị ndị a?”

Ọ jụrụ, sị, “Ihe gịnị?”

Ha zaghachiri, sị, “Ihe banyere Jisọs onye Nazaret.” ‘Ndị isi nchụaja na ndị isi anyị raara ya nye ka a maa ya ikpe ọnwụ, wee kpọgbuo ya. Ma anyị onwe anyị lere anya na ya onwe ya bụ onye gaje ịgbapụta Israel.’

Kleopas na onye ahụ ya na ya so kọwara ihe dị ịtụnanya ndị mere n’ụbọchị ahụ—akụkọ banyere ọhụhụ a hụrụ ndị mmụọ ozi na ili ahụ nke tọgbọrọ n’efu—mgbe ahụ ha wee kwupụta otú ihe ihe ndị a pụtara si ju ha anya. Onye ahụ ha na-amaghị bara mba, sị: “Unu ndị na-enweghị uche, ndị dịkwa ure n’obi ikwere n’ihe nile ndị amụma kwuru! Ọ́ bụghị na Kraịst aghaghị ịhụ ahụhụ ndị a, na ịba n’ebube ya?” O wee kọwaara ha akụkụ dị iche iche sitere n’ihe odide ahụ dị nsọ ndị metụtara Kraịst.

N’ikpeazụ, ha rutere n’ebe dị nso Emeus, onye ahụ ha na-amaghị wee mee dị ka à ga-asị na ọ na-anọgide na njem ya. N’ịchọ ịnụkwu ihe ndị ọzọ, ndị ahụ na-eso ụzọ gbara ya ume, sị: “Nọnyere anyị: n’ihi na o rubewo anyasị, ụbọchị agamiwokwa ugbu a.” O wee nọrọ iso ha rie nri. Mgbe o kpere ekpere ma nyawaa achịcha ma nye ha ya, ha ghọtara na ọ bụ Jisọs n’ezie n’anụ ahụ mmadụ nke e nwoghatara enwoghata. Ma ozugbo ahụ, ọ pụrụ n’anya ha.

Ugbu a, ha ghọtara otú o si bụrụ na onye ahụ ha na-amaghị maara ihe dị ukwuu! Ha jụrụ, sị, “[Ọ̀ bụ na] obi anyị ekpoghị ọkụ n’ime anyị, mgbe ọ na-agwa anyị okwu n’ụzọ, mgbe ọ na-emeghere anyị ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ?” N’egbughị oge ọ bụla, ha biliri ma laghachi ngwa ngwa na Jerusalem, ebe ha zutere ndị ozi na ndị ahụ ha na ha zukọtara. Tupu Kleopas na onye ahụ ya na ya so enwee ike ikwu ihe ọ bụla, ndị ọzọ ahụ ji oké mkpali kọọ, sị: “N’eziokwu Onyenwe anyị esiwo n’ọnwụ bilie, werekwa onwe ya gosi Saịmọn.” Mgbe ahụ, mmadụ abụọ ahụ kọrọ ụzọ Jisọs sikwa gosi ha onwe ya. Nke a mezuru ya ugbo anọ n’ụbọchị ahụ mgbe o gosiworo ndị dị iche iche n’ime ndị na-eso ụzọ ya onwe ya.

Ọ bụ ezie na a kpọchisịrị ụzọ ndị ahụ akpọchisi n’ihi na ndị ahụ na-eso ụzọ na-atụ egwu ndị Juu, na mberede, Jisọs pụtara nke ugbo ise. O guzoro kpọmkwem n’etiti ha wee sị: “Udo dịrị unu.” Ha tụrụ egwu nke ukwuu, na-eche na ọ bụ mmụọ ka ha na-ahụ. Ya mere, n’ịkọwa na ya abụghị onyinyo ụgha, Jisọs kwuru, sị: “Gịnị mere obi na-alọ unu mmiri? N’ihi gịnị ka ịrụ ụka na-ebilikwa n’obi unu? Leenụ aka m na ụkwụ m, na ọ bụ mụ onwe m: datụnụ m aka, leekwanụ; n’ihi na mmụọ enweghị anụ ahụ na ọkpụkpụ, otú unu hụrụ na mụ onwe m nwere.” Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ọ ka na-esiri ha ike ikwere n’ihi na ọdịdị ọ dị ndụ yiri ihe na-apụghị ime eme.

Iji nyere ha aka ịghọta na ya bụ Jisọs n’ezie, ọ jụrụ, sị: “Ùnu nwere ihe oriri ọ bụla n’ebe a?” Mgbe ọ narasịrị otu iberibe azụ a hụrụ n’ọkụ ma rie ya, ọ malitere izi ha ihe, na-asị: “Ndị a bụ okwu m nke m gwara unu, mgbe mụ na unu nọkwara [tupu ọnwụ m], na ihe nile aghaghị imezu, bụ́ nke e deworo n’akwụkwọ iwu Mosis, na ndị amụma, na abụ ọma banyere m.”

N’ịga n’ihu n’ihe yiri iduziri ha ọmụmụ Bible, Jisọs ziri ihe, sị: “Otú a ka e deworo ya n’akwụkwọ nsọ, na Kraịst ahụ ga-ahụ ahụhụ, sikwa ná ndị nwụrụ anwụ bilie n’ụbọchị nke atọ; na a ga-ekwusakwa nchegharị na mgbaghara mmehie n’aha ya gwa mba nile, na-amalite site na Jerusalem. Unu onwe unu bụ ndị àmà nke ihe ndị a.”

Ọ dịghị onye maara ihe mere na Tọmas anọghị mgbe a na-enwe nzukọ uhuruchi Sunday nke a dị oké mkpa. Ya mere, n’ụbọchị ndị na-esochi, ndị ọzọ ji ọṅụ gwa ya, sị: “Anyị ahụwo Onyenwe anyị!”

Tọmas siri ọnwụ, sị, “Ọ bụrụ na ahụghị m n’aka ya abụọ àpà ntú, tinyekwa mkpịsị aka m n’àpà ntú ahụ, tinyekwa aka m n’akụkụ ya, m gaghị ekwe ma ọlị.”

Otú ọ dị, mgbe ụbọchị asatọ gasịrị, ndị na-eso ụzọ na-enwekwa nzukọ n’ime ụlọ. N’oge nke a, ha na Tọmas nọ. Ọ bụ ezie na a kpọchisịrị ụzọ akpọchisị, Jisọs guzokwara ọzọ n’etiti ha wee sị: “Udo dịrị unu.” Mgbe ahụ, n’ichigharịkwuru Tọmas, ọ kpọrọ ya òkù, sị: “Setịpụ mkpịsị aka gị n’ebe a, lee aka m abụọ; setịpụkwa aka gị, tinye n’ime akụkụ m: aghọkwala onye na-ekweghị, kama ghọọ onye na-ekwere.”

Tọmas tiri mkpu, sị, “Onyenwe m na Chineke m.”

Jisọs jụrụ, sị, “N’ihi na ị hụwo m, ì kwerewo? Ngọzi [“obi ụtọ,” NW] na-adịrị ndị akahụghị, ma ha kwere.” Luk 24:11, 13-48; Jọn 20:19-29.

◆ Ajụjụ dịgasị aṅaa ka otu onye a na-amaghị ama jụrụ ndị na-eso ụzọ abụọ ndị na-eje Emeus?

◆ Gịnị ka onye ahụ a na-amaghị ama kwuru nke mere ka obi ndị ahụ na-eso ụzọ kpoo ọkụ n’ime ha?

◆ Olee ụzọ ndị ahụ na-eso ụzọ si ghọta na onye ahụ ha na-amaghị ama bụ Jisọs?

◆ Mgbe Kleopas na onye ahụ ya na ya so lọghachiri Jerusalem, akụkọ dị aṅaa nke na-akpali akpali ka ha nụrụ?

◆ Mpụta ọzọ dị aṅaa, bụ́ nke ise, ka Jisọs pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya, gịnị mekwara mgbe nke a na-ewere ọnọdụ?

◆ Gịnị mere ụbọchị asatọ mgbe mpụta nke ise nke Jisọs gasịrị, oleekwa ụzọ e si mesịa mee ka Tọmas kwere na Jisọs dị ndụ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya