Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 4/15 p. 14-20
  • Ị̀ Ga-eṅomi Obi Ebere Chineke?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Ga-eṅomi Obi Ebere Chineke?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • E Mezuru Ikpe Ziri Ezi nke Chineke
  • Ikpe Ziri Ezi nke E Ji Ebere Hazie
  • Inwe Nchegbu maka Ihe Furu Efu
  • Ịṅụrị Ọṅụ n’Eluigwe—n’Ihi Gịnị?
  • Nchegharị na Obi Ebere nke Na-arụ Ọrụ
  • Jehova—Isi Iyi nke Ezi Ikpe na Ezi Omume
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ṅomie Jehova—Gosipụta Ikpe Ziri Ezi na Ezi Omume
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ịṅụrị Ọṅụ n’Ihi Onye Mmehie Chegharịrịnụ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • “Ụzọ Ya Nile Bụ Ikpe Ziri Ezi”
    Bịaruo Jehova Nso
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 4/15 p. 14-20

Ị̀ Ga-eṅomi Obi Ebere Chineke?

“Bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.”—NDỊ EFESỌS 5:1.

1. N’ihi gịnị ka anyị nile ga-eji chegbuo onwe anyị n’ihe banyere iṅomi ndị ọzọ?

MA N’IHE ọma ma n’ihe ọjọọ, ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ na-eṅomi ndị ọzọ. Ndị anyị na ha na-anọkọ, ndị anyị pụrụ iṅomi, pụrụ inwe mmetụta n’ahụ anyị ruo n’ókè ụfọdụ. Onye ahụ nwere ike mmụọ nsọ nke dere Ilu 13:20 dọrọ aka ná ntị, sị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” Ya mere, e nwere ezi ihe mere Okwu Chineke ji sị: “Eṅomila ihe ọjọọ, kama na-eṅomi ezi ihe. Onye na-eme ezi ihe bụ onye siri na Chineke pụta.”—3 Jọn 11.

2. Ònye ka anyị kwesịrị iṅomi, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dịgasị aṅaa?

2 Anyị nwere ihe nlereanya Bible ndị magburu onwe ha nke ndị ikom na ndị inyom anyị pụrụ iṅomi. (1 Ndị Kọrint 4:16; 11:1; Ndị Filipaị 3:17) Ma, onye kasị mkpa anyị ga-eṅomi bụ Chineke. Ná Ndị Efesọs 4:31–5:2, mgbe o hotasịrị àgwà na omume ndị anyị kwesịrị izere, Pọl onyeozi gbara ume ka anyị ‘nwerịta obi ọma n’ahụ ibe anyị, nwee obi ọmịiko, werekwa amara gbaghara ibe anyị.’ Nke a dujere n’okwu agbamume ahụ bụ isi nke bụ: “Ya mere bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya; na-ejegharịkwanụ n’ịhụnanya.”

3, 4. Nkọwa dị aṅaa banyere onwe ya ka Chineke nyere, n’ihi gịnịkwa ka anyị kwesịrị iji cheba echiche n’ọbụbụ ọ bụ Chineke nke ikpe ziri ezi?

3 Gịnị bụ ụzọ na àgwà Chineke ndị anyị kwesịrị iṅomi? E nwere akụkụ dị iche iche nke ọdịdị na ihe omume ya, dị ka a pụrụ ịhụta site n’ụzọ o siri kọwaara Mosis onwe ya: “Jehova, Chineke nke nwere obi ebere, onye na-eme amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu; onye na-edebere [ọtụtụ puku] ebere, onye na-agbaghara ajọ omume na njehie na mmehie: ma ọ dịghị ụzọ ọ bụla ọ ga-agụ ndị ikpe mara na ha bụ ndị ikpe na-amaghị; ọ na-ewere ajọ omume nke ndị bụ nna leta ụmụ ha, letakwa ụmụ ụmụ.”—Ọpụpụ 34:6, 7.

4 Ebe Jehova bụ onye “na-ahụ ezi omume na ezi ikpe n’anya,” anyị kwesịrị nnọọ ịmata ma ṅomie akụkụ nke a nke ọdịdị ya. (Abụ Ọma 33:5; 37:28) Ọ bụ Onye Okike, bụrụkwa Onye Ikpe na Onye Na-enye Iwu kasị elu nke ihe a kpọrọ mmadụ, nke mere na ọ na-egosi mmadụ nile ikpe ziri ezi. (Aịsaịa 33:22) Nke a pụtara ìhè nke ọma n’ụzọ o si chọọ ikpe ziri ezi, meekwa ka e mezuo ya n’etiti ndị ya bụ Israel, nakwa mgbe e mesịrị n’etiti ọgbakọ ndị Kraịst.

E Mezuru Ikpe Ziri Ezi nke Chineke

5, 6. È si aṅaa gosipụta ikpe ziri ezi ná mmeso Chineke mesoro Israel?

5 Mgbe ọ na-ahọpụta Israel dị ka ndị nke ya, Chineke jụrụ ma hà ‘ga-ege ntị olu ya n’ezie, debekwa ọgbụgba ndụ ya.’ Mgbe ha zukọtara n’okpuru Ugwu Saịnaị, ha zara, sị: “Ihe nile Jehova kwuru, anyị ga-eme ya.” (Ọpụpụ 19:3-8) Lee nnọọ nnakwere ime ihe siri ike nke a bụ! Site n’aka ndị mmụọ ozi, Chineke nyere ndị Israel ihe dị ka 600 iwu dị iche iche, nke ha nwere ibu ọrụ idebe dị ka ndị raara onwe ha nye ya. Gịnịkwanụ ma a sị na otu onye aghara ime otú ahụ? Otu onye ọkà n’ihe banyere Iwu Chineke kọwara, sị: ‘E mere okwu e kwuru site n’ọnụ ndị mmụọ ozi ka o guzosie ike, njehie nile ọ bụla na aṅaghị ntị nile ọ bụla natakwara nnyeghachi nke ụgwọ ọrụ ziri ezi.’—Ndị Hibru 2:2.

6 Ee, ndị Israel ndị na-erubeghị isi chere ihu ịnata “nnyeghachi nke ụgwọ ọrụ ziri ezi,” ọ bụghị ikpe ziri ezi nwere ntụpọ nke mmadụ, kama ọ bụ ikpe ziri ezi sitere n’aka Onye Okike anyị. Chineke setịpụrụ ntaramahụhụ dị iche iche maka imebi iwu. Ntaramahụhụ kachasị sie ike bụ ‘mbipụ,’ ma ọ bụ ogbugbu. Nke ahụ bụ maka mmebi iwu ndị dị oké njọ, dị ka ikpere arụsị, ịkwa iko ndị lụrụ di na nwunye, idina onye ikwu, iso anụmanụ nwee mmekọahụ, idina ụdị onwe, iji ụmụntakịrị achụ àjà, igbu ọchụ, na iji ọbara eme ihe na-ekwesịghị ekwesị. (Levitikọs 17:14; 18:6-17, 21-29) Ọzọkwa, onye Israel ọ bụla nke leziri anya mebie iwu ọ bụla nke Chineke n’enweghị nchegharị pụrụ ịbụ onye ‘e bipụrụ.’ (Ọnụ Ọgụgụ 4:15, 18; 15:30, 31) Mgbe e mezuru ikpe ziri ezi nke a nke Chineke, ndị sitere n’usoro ọmụmụ nke onye ahụ mebiri iwu pụkwara inweta mmetụta ya.

7. Gịnị bụ ihe ụfọdụ sitere n’imezu ikpe ziri ezi n’etiti ndị Chineke nke oge ochie pụta?

7 Ntaramahụhụ ndị dị otú ahụ na-emesi ya ike otú o si bụrụ ihe dị oké njọ imebi iwu Chineke. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwa mmadụ aghọọ onye na-aṅụbiga mmanya ókè na onye ji anyaukwu na-eribiga nri ókè, a ga-akpọta ya n’ihu ndị ọkà ikpe tozuru okè. Ọ bụrụ na ha achọpụta na ọ bụ onye leziri anya na-emebi iwu n’enweghị nchegharị, ndị mụrụ ya ga-ekere òkè n’imezu ikpe ziri ezi. (Deuterọnọmi 21:18-21) Ndị ahụ n’ime anyị bụ́ ndị mụrụ ụmụ pụrụ iji anya nke uche ha hụ na ọ bụghị ihe dị mfe ime nke ahụ. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, Chineke maara na ọ dị mkpa ka mmebi iwu wee ghara ịgbasa n’etiti ndị na-efe ezi ofufe. (Ezikiel 33:17-19) Onye mere ndokwa nke a bụ Onye ahụ a pụrụ ikwu banyere ya, sị: “Ụzọ ya nile bụ ikpe ziri ezi: Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi, nke na-enweghị ajọ omume, onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ.”—Deuterọnọmi 32:4.

8. Olee ụzọ ikpe ziri ezi si kaa mmeso Chineke na-emeso ọgbakọ ndị Kraịst akara?

8 Mgbe ọtụtụ narị afọ gasịrị, Chineke jụrụ mba Israel ahụ ma họrọ ọgbakọ ndị Kraịst. Ma Jehova agbanweghị. Ọ ka nọgidekwara na-agbaso ikpe ziri ezi, a pụkwara ịkọwa ya dị ka ‘ọkụ na-erechapụ erechapụ.’ (Ndị Hibru 12:29; Luk 18:7, 8) Ya mere, ọ nọgidere na-enwe ndokwa iji tinye egwu Chineke n’ime ọgbakọ ahụ dum site n’ịchụpụ ndị mere ihe ọjọọ. A ga na-achụpụ ndị Kraịst raaraworo onwe ha nye, ndị ghọrọ ndị na-eme ihe ọjọọ n’enweghị nchegharị.

9. Gịnị bụ ịchụpụ mmadụ n’ọgbakọ, gịnịkwa ka ọ na-arụzu?

9 Gịnị ka ịchụpụ mmadụ n’ọgbakọ metụtara? Anyị na-enweta ihe mmụta site n’ụzọ e si lebara otu nsogbu anya n’ime narị afọ mbụ ahụ. Otu onye Kraịst nọ na Kọrint so nwunye nna ya na-enwe mmekọahụ na-adịghị ọcha, o nweghịkwa nchegharị, ya mere Pọl tụziri aka ka a chụpụ ya site n’ọgbakọ ahụ. A ghaghị ime nke a iji chebe ịdị ọcha nke ndị Chineke, n’ihi na “ihe iko achịcha dị nta na-eko ógbè ụtụ ọka a gwọrọ agwọ dum.” Ịchụpụ ya n’ọgbakọ ga-egbochi ajọ omume ya iwetara ma Chineke ma ndị Ya nkọcha. Ahụhụ ahụ siri ike nke ịbụ onye a chụpụrụ n’ọgbakọ pụkwara ime ka o nwetaghachi uche ya wee tinye n’ime ya na n’ime ọgbakọ ahụ egwu Chineke nke kwesịrị ekwesị.—1 Ndị Kọrint 5:1-13; tụlee Deuterọnọmi 17:2, 12, 13.

10. Olee ụzọ ndị ohu Chineke ga-esi meghachi omume ma ọ bụrụ na a chụpụ mmadụ n’ọgbakọ?

10 Iwu Chineke nyere bụ na ọ bụrụ na a chụpụ onye mmebi iwu, ka ndị Kraịst “na [ya] ghara imekọ ihe . . . ; ka [ha] na onye dị otú a ghara ọbụna irikọ ihe.”a A na-esi otú a gbubipụ ya ná mmekọrịta, gụnyere mkpakọrịta efu, nke ya na ndị na-eguzosi ike n’ihe, bụ́ ndị na-asọpụrụ iwu Chineke, na-achọkwa ije ije n’ụzọ kwekọrọ na ya. Ụfọdụ n’ime ha pụrụ ịbụ ndị ikwu ndị na-anọghị kpọmkwem n’ime otu ezinụlọ, ndị na-ebikọghị n’otu ụlọ. Ọ pụrụ isiri ndị ikwu ndị ahụ ike itinye ntụziaka Chineke nke a n’ọrụ, ọbụna dị ka ọ na-adịrịghị ndị mụrụ ụmụ bụ ndị Hibru mfe n’okpuru Iwu Mosis ahụ ikere òkè n’igbu nwa ha nke na-emebi iwu. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ihe Chineke nyere n’iwu doro anya; ya mere anyị pụrụ ijide n’aka na ịchụpụ mmadụ n’ọgbakọ bụ ihe e mere n’ikpe ziri ezi.—1 Ndị Kọrint 5:1, 6-8, 11; Taịtọs 3:10, 11; 2 Jọn 9-11; lee Ụlọ Nche, December 15, 1981, peji 26-31; April 15, 1988, peji 23-26.

11. Olee ụzọ akụkụ dị iche iche nke ọdịdị Chineke pụrụ isi pụta ìhè n’ihe banyere ịchụpụ mmadụ n’ọgbakọ?

11 Ma cheta na ọ bụghị nanị na Chineke anyị bụ onye na-eme ihe n’ikpe ziri ezi; ọ bụkwa onye “na-aba ụba n’ebere, ọ na-agbagharakwa ajọ omume na njehie.” (Ọnụ Ọgụgụ 14:18) Okwu ya mere ka o doo anya na onye a chụpụrụ n’ọgbakọ pụrụ ichegharị, na-achọ mgbaghara nke Chineke. Mgbe ahụ gịnị ga-eme? Ndị nlekọta nweworo ahụmahụ pụrụ iso ya nwee nnọkọ iji jiri ekpere na nlezianya chọpụta ma ọ̀ na-enye ihe àmà nke inwe nchegharị maka ajọ omume nke dujere n’ịchụpụ ya n’ọgbakọ. (Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 26:20.) Ya bụrụ otú ahụ, a pụrụ ịkpọbataghachi ya n’ọgbakọ, dị ka 2 Ndị Kọrint 2:6-11 gosiri na e mere n’ihe banyere nwoke ahụ nọ na Kọrint. Ma, ụfọdụ ndị a chụpụrụ achụpụ ahapụwo ọgbakọ Chineke ruo ọtụtụ afọ, ya mere, ọ̀ dị ihe ọ bụla a pụrụ ime iji nyere ha aka ịhụ ụzọ ha ga-esi lọghachite?

Ikpe Ziri Ezi nke E Ji Ebere Hazie

12, 13. N’ihi gịnị ka anyị iṅomi Chineke kwesịrị iji gụnye ihe karịrị igosipụta ikpe ziri ezi ya?

12 Ihe a tụleworo n’elu elebawo anya karịsịa n’otu akụkụ nke àgwà Chineke, dị ka e hotara ya n’Ọpụpụ 34:6, 7. Otú ọ dị, amaokwu ndị ahụ na-esetịpụ ihe dị ukwuu karịa ikpe ziri ezi nke Chineke, ndị chọkwara iṅomi ya adịghị elekwasị anya nanị n’imezu ikpe ziri ezi. Ọ bụrụ na ị na-achọ iwu ihe yiri ụlọ nsọ ahụ Solomọn wuru, ị̀ ga-amụ ihe banyere nanị otu n’ime ìdé ndị dị na ya? (1 Ndị Eze 7:15-22) Ee e, n’ihi na nke ahụ agaghị eme ka i nwee nghọta zuru ezu nke ọdịdị na ọnọdụ ụlọ nsọ ahụ. N’otu aka ahụkwa, ọ bụrụ na anyị chọrọ iṅomi Chineke, ọ dị mkpa ka anyị ṅomiekwa ụzọ na àgwà ya ndị ọzọ, ndị dị ka ịbụ onye “nwere obi ebere, onye na-eme amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ, onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu; onye na-edebere [ọtụtụ puku] ebere, onye na-agbaghara ajọ omume.”

13 Obi ebere na mgbaghara bụ àgwà Chineke ndị bụ isi, dị ka anyị na-ahụ n’ụzọ o si mesoo Israel ihe. Chineke nke ikpe ziri ezi agụghị ha ná ndị na-agaghị enweta ntaramahụhụ maka ajọ omume ha nọgidere na-eme, ma o gosikwara obi ebere na mgbaghara zuru ezu. “Ọ na-eme ka Mosis mara ụzọ ya nile, ọ na-emekwa ka ụmụ Israel mara omume ya nile. Jehova nwere obi ebere, na-emekwa amara, ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, ọ na-abakwa ụba n’ebere. Ọ bụghị ruo mgbe nile ka ọ ga na-ese okwu; ọ bụghịkwa ruo mgbe ebighị ebi ka ọ ga na-edebe iwe.” (Abụ Ọma 103:7-9; 106:43-46) Ee, ileghachi anya azụ n’ụzọ o siworo mesoo ndị mmadụ ihe ruo ọtụtụ narị afọ na-egosipụta na okwu ndị ahụ bụ eziokwu.—Abụ Ọma 86:15; 145:8, 9; Maịka 7:18, 19.

14. Olee ụzọ Jisọs si gosi na ya ṅomiri obi ebere nke Chineke?

14 Ebe Jisọs Kraịst “bụ nnwupụ nke ebube [Chineke] na onyinyo nke ụdị ya,” anyị kwesịrị ịtụ anya na ọ ga-egosipụta obi ebere na ịdị njikere ịgbaghara mmehie dị otú ahụ. (Ndị Hibru 1:3) O mere otú ahụ, dị ka omume ya n’ebe ndị ọzọ nọ gosiri. (Matiu 20:30-34) O jikwa okwu ya ndị anyị na-agụ na Luk isi 15 mesie ike mkpa ọ dị igosi ebere. Ihe atụ atọ dị n’ebe ahụ na-anwapụta na Jisọs ṅomiri Jehova, ha na-enyekwa anyị ihe mmụta ndị dị mkpa.

Inwe Nchegbu maka Ihe Furu Efu

15, 16. Gịnị kpaliri Jisọs inye ihe atụ ndị ahụ dị na Luk 15?

15 Ihe atụ ndị ahụ na-agba akaebe banyere mmasị Chineke ji obi ebere na-enwe n’ebe ndị mmehie nọ, na-ese ezi ihe onyinyo nke anyị kwesịrị iṅomi. Tụlee ọnọdụ nke ihe atụ ndị ahụ: “Ma ndị ọna ụtụ na ndị mmehie nile na-abịaru [Jisọs] nsọ ịnụ okwu ya. Ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ wee na-atamụ, sị, Nwoke a na-anara ndị mmehie nke ọma, na-esokwa ha eri ihe.”—Luk 15:1, 2.

16 Ndị nile okwu ahụ metụtara bụcha ndị Juu. Ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ na-ebuli onwe ha elu n’ihi ihe ahụ ha chere na ọ bụ iji oké nlezianya na-arapagidesi ike n’Iwu Mosis ahụ, bụ́ ụdị ezi omume nke ịgbaso iwu. Ma, Chineke ekwenyeghị n’ụdị ezi omume nke ahụ mmadụ kpọkwasịrị onwe ya. (Luk 16:15) Ihe àmà gosiri na ndị ọna ụtụ a kpọtụrụ aha n’ebe a bụ ndị Juu, ndị na-anatara ọchịchị ndị Rom ụtụ isi. N’ihi na ọtụtụ n’ime ha na-ana ego dịbigara ukwuu ókè site n’aka ndị Juu ibe ha, ndị ọna ụtụ bụ ndị a kpọrọ asị. (Luk 19:2, 8) A na-agụkọ ha na “ndị mmehie,” bụ́ nke gụnyere ndị na-adị ndụ rụrụ arụ, ọbụna ndị akwụna. (Luk 5:27-32; Matiu 21:32) Ma Jisọs jụrụ ndị ndú okpukpe ahụ na-eme mkpesa, sị:

17. Gịnị bụ ihe atụ mbụ Jisọs mere na Luk 15?

17 “Olee mmadụ dị n’etiti unu, nke nwere [otu narị atụrụ], ma otu n’ime ha funarịrị ya, nke na-ahapụghị [iri itoolu na itoolu] ahụ n’ọhịa, gaa soo nke furu efu, ruo mgbe ọ ga-achọpụta ya? Mgbe ọ chọpụtaworo ya, o wee tụkwasị ya n’ubu ya abụọ, na-aṅụrị. Mgbe ọ bịaworo n’ụlọ, o wee kpọkọta ndị enyi ya na ndị agbata obi ya, sị ha, Soonụ m ṅụrịa ọṅụ, n’ihi na achọpụtawo m atụrụ m furu efu. Asị m unu, na otú a ọṅụ ga-adị n’eluigwe n’isi otu onye mmehie nke na-echegharị, karịa n’isi [iri ndị ezi omume itoolu na itoolu], ndị nchegharị na-adịghị mkpa.” Ndị ndú okpukpe ahụ pụrụ ịghọta ihe e ji mee ihe atụ ahụ, n’ihi na atụrụ na ndị na-azụ atụrụ bụ ihe a na-ahụkarị. N’ihi mmetụta o nwere, onye ahụ na-azụ atụrụ na-ahapụ 99 atụrụ ndị ahụ ka ha na-ata ahịhịa n’akụkụ ebe doro ha anya mgbe ọ na-apụ ije ịchọ otu nke kpafuworonụ. N’ịnọgide na-achọ ruo mgbe ọ chọtara ya, ọ na-eji nwayọọ kuru atụrụ ahụ nke egwu na-atụ laghachi n’ìgwè atụrụ ahụ.—Luk 15:4-7.

18. Dị ka e mere ka ọ pụta ìhè n’ihe atụ nke abụọ Jisọs mere na Luk 15, gịnị kpaliri ịṅụrị ọṅụ?

18 Jisọs mekwara ihe atụ nke abụọ, sị: “Ma ọ bụ olee nwanyị nke nwere shilling iri, ọ bụrụ na otu shilling efunarị ya, na-amụnyeghị oriọna, zaa ụlọ ya, chọsie ike ruo mgbe ọ ga-achọpụta ya? Mgbe ọ chọpụtaworo ya, o wee kpọkọta ndị enyi ya na ndị agbata obi ya, sị, Soonụ m ṅụrịa ọṅụ, n’ihi na achọpụtawo m shilling nke funarịworo m rịị. Asị m unu, na otú a ọṅụ dị n’ihu ndị mmụọ ozi Chineke n’isi otu onye mmehie nke na-echegharị.” (Luk 15:8-10) Ego shilling ahụ fọrọ nke nta ka o ruo ihe a na-akwụ onye ọrụ n’ụbọchị. Ọ pụrụ ịbụworị na mkpụrụ ego nke nwanyị ahụ bụ ihe nketa sitere n’aka nne ya, ma ọ bụkwanụ na ọ pụrụ ịbụ otu n’ime ìgwè mkpụrụ ego ndị a gakọtara agakọta iji mee ihe ịnya n’olu. Mgbe o funarịrị ya, nwanyị ahụ chọsiri ya ike iji chọta mkpụrụ ego ahụ, mgbe ahụ ya na ndị inyom bụ enyi ya ṅụrịrị ọṅụ. Gịnị ka nke a na-agwa anyị banyere Chineke?

Ịṅụrị Ọṅụ n’Eluigwe—n’Ihi Gịnị?

19, 20. Ihe atụ Jisọs abụọ ndị mbụ ahụ dị na Luk 15 bụ banyere ònye n’ụzọ bụ isi, gịnị bụkwa isi ihe ha mere ka ọ pụta ìhè?

19 Ihe atụ abụọ ndị a bụ iji zaghachi nkatọ e mere megide Jisọs, bụ́ onye kọwaworo onwe ya n’ọnwa ole na ole tupu mgbe ahụ dị ka “onye ọzụzụ atụrụ ọma” ahụ onye ga-enye mkpụrụ obi ya n’ọnọdụ ìgwè atụrụ ya. (Jọn 10:11-15) N’agbanyeghị nke ahụ, ihe atụ ndị ahụ abụghị banyere Jisọs n’ụzọ bụ isi. Ihe mmụta nke ọ dị mkpa ka ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ahụ nweta bụ, n’ụzọ bụ isi, banyere àgwà Chineke na ụzọ ya nile. Otú a, Jisọs kwuru na a na-aṅụrị ọṅụ n’eluigwe n’ihi otu onye mmehie nke chegharịrịnụ. Ndị okpukpe ndị ahụ kwuru na ha na-ejere Jehova ozi, ma ha adịghị eṅomi ya. N’aka nke ọzọ, ụzọ obi ebere nile nke Jisọs na-egosi ihe Nna ya chọrọ.—Luk 18:10-14; Jọn 8:28, 29; 12:47-50; 14:7-11.

20 Ọ bụrụ na otu n’ime otu narị bụ ihe na-enye ọṅụ, otu mkpụrụ ego n’ime iri ga-enye ọṅụ karị. Ọbụna taa, anyị pụrụ inweta mmetụta nke ndị inyom ahụ na-aṅụrị ọṅụ mgbe a chọtara mkpụrụ ego ahụ! N’ebe a kwa, ihe mmụta dị na ya metụtara eluigwe, n’ihi na “ndị mmụọ ozi Chineke” na-eso Jehova na-aṅụrị ọṅụ “n’isi otu onye mmehie nke na-echegharị.” Rịba okwu ikpeazụ ahụ ama, bụ́ “na-echegharị.” Ihe atụ ndị a bụ n’ezie banyere ndị mmehie ndị na-echegharị. Ị pụkwara ịhụ na ihe atụ abụọ ahụ mesiri ya ike izi ezi nke inwe ọṅụ n’ihi nchegharị ha.

21. Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta site n’ihe atụ Jisọs ndị ahụ dị na Luk 15?

21 Ndị ndú okpukpe ahụ e duhieworo eduhie, ndị onwe ha juru afọ n’ịgbaso Iwu ahụ n’egbugbere ọnụ nkịtị lefuuru eziokwu ahụ anya nke bụ na Chineke bụ onye “nwere obi ebere, onye na-eme amara, . . . onye na-agbaghara ajọ omume na njehie na mmehie.” (Ọpụpụ 34:6, 7) A sị na ha na-eṅomi akụkụ nke a nke ụzọ ime ihe nke Chineke na ọdịdị ya, ha gaara enweworị mmasị n’obi ebere Jisọs gosiri ndị mmehie ndị chegharịrịnụ. Gịnị banyere anyị? Ànyị na-etinye ihe mmụta ahụ n’ime obi anyị ma na-etinye ya n’ọrụ? Ọ dị mma, rịba ama ihe atụ nke atọ Jisọs mere.

Nchegharị na Obi Ebere nke Na-arụ Ọrụ

22. Ná mkpirikpi, gịnị ka Jisọs nyere dị ka ihe atụ nke atọ na Luk 15?

22 A kpọkarịwo nke a ihe atụ banyere nwa mmefu ahụ. Ma, mgbe ị na-agụ ya, ị pụrụ ịhụ ihe mere ụfọdụ ndị na-eji eche echiche banyere ya dị ka ilu nke ịhụnanya onye bụ nna. Ọ na-akọ banyere nwa nke dị nta karị n’ime otu ezinụlọ, onye naara nna ya ihe nketa ya. (Tụlee Deuterọnọmi 21:17.) Nwa nke a hapụrụ ma jee otu ala dị anya, bụ́ ebe ọ nọ rikpọọ ihe nile ná ndụ ịla n’iyi, malite ịrụ ọrụ dị ka onye na-azụ ézì, ọbụna bụrụkwa onye e wedara n’ala ruo n’ókè nke inwe agụụ maka nri ézì ahụ. O mesịrị ghọta ihe o mere onwe ya ma kpebie ịlaghachi n’ụlọ, ọbụna ma a sị na ọ bụ nanị ịrụrụ nna ya ọrụ dị ka onye ọrụ e goro ego. Mgbe ọ na-abịa nso n’ụlọ, nna ya buru ụzọ mee ihe n’ịnabataghachi ya, ọbụna na-eme oké oriri. Nwanne ya nwoke nke tọrọ ya, onye nọgideworo n’ụlọ ma na-arụ ọrụ, nwere mwute maka obi ebere ahụ e gosiri ya. Ma nna ya gwara ya na ha kwesịrị ịṅụrị ọṅụ n’ihi na nwa ya nke nwụburu anwụ dị ndụ ugbu a.—Luk 15:11-32.

23. Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta site n’ihe atụ banyere nwa mmefu ahụ?

23 Ụfọdụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii pụrụ icheworịị na e ji ha na-atụnyere nwa nke diọkpara ahụ, n’ụzọ dị iche n’ebe ndị mmehie nọ, bụ́ ndị yiri nwa nke nta ahụ. Ma, hà ghọtara isi ihe dị n’ihe atụ ahụ, ànyị ghọtakwara ya? O mere ka otu àgwà bụ isi nke Nna anyị nke eluigwe onye nwere obi ebere pụta ìhè, bụ́ njikere ọ dị ịgbaghara mmehie n’ịdabere ná nchegharị sitere n’ala ala obi na nchigharị nke onye mmehie. O kwesịrị ịkpaliworị ndị na-ege ntị ka ha jiri ọṅụ meghachi omume mgbe a nabatara ndị mmehie na-echegharịnụ. Ọ bụ otú ahụ ka Chineke si ele ihe anya, ọ bụkwa otú ahụ ka o si eme omume, ndị na-eṅomi ya na-emekwa ihe n’otu aka ahụ.—Aịsaịa 1:16, 17; 55:6, 7.

24, 25. Olee ụzọ dị iche iche nke Chineke ndị anyị kwesịrị ịdị na-achọ iṅomi?

24 O doro anya na ikpe ziri ezi kara ụzọ nile nke Chineke akara, ya mere, ndị ahụ chọrọ iṅomi Jehova na-eji ikpe ziri ezi kpọrọ ihe nke ukwuu, na-agbasokwa ya. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụghị ikpe ziri ezi nke na-enweghị mmetụta ọ bụla na-akpali Chineke anyị. Obi ebere na ịhụnanya ya dị ukwuu. Ọ na-egosi nke a site n’ịdị njikere ịgbaghara mmehie n’ịdabere n’ezi nchegharị. Ya mere, o ziri nnọọ ezi na Pọl jikọtara anyị ịdị na-agbaghara ndị ọzọ n’ebe anyị iṅomi Chineke dị: “Werekwanụ amara gbaghara onwe unu, dị ka Chineke werekwara amara gbaghara unu n’ime Kraịst. Ya mere bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya; na-ejegharịkwanụ n’ịhụnanya.”—Ndị Efesọs 4:32–5:2.

25 Ruo ogologo oge, ezi ndị Kraịst agbalịwo iṅomi ikpe ziri ezi nke Jehova nakwa obi ebere na ịdị njikere ya ịgbaghara mmehie. Ka anyị na-amata ya nke ọma karị, otú a ka o kwesịrị ịdịrị anyị mfe karị iṅomi ya n’akụkụ ndị a. Ma, olee ụzọ anyị pụrụ isi tinye nke a n’ọrụ n’ebe mmadụ nọ, bụ́ onye nataworo ntaramahụhụ siri ike n’ụzọ ikpe ziri ezi n’ihi na ọ gbasoro ụzọ nke mmehie? Ka anyị hụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a “N’echiche ya kasị saa mbara, nkewapụ bụ ihe e leziri anya mee, bụ́ mgbe otu ìgwè napụrụ ndị bụbu ndị òtù ya nọ n’ọnọdụ dị mma ihe ùgwù nile nke ịbụ onye òtù. . . . Nkewapụ n’oge ndị Kraịst na-ezo aka n’ihe omume nke ngụpụ, bụ́ mgbe òtù okpukpe na-anapụ ndị mebiri iwu sakramenti ndị ahụ, ohere nke iso ọgbakọ ahụ na-efekọ ofufe, nakwa ma eleghị anya ụdị mkpakọrịta nile ọ bụla.”—The International Standard Bible Encyclopedia.

Gịnị Ka Ị Mụtaworo?

◻ Olee ụzọ e si mee ka ikpe ziri ezi nke Chineke pụta ìhè n’ọgbakọ nke ndị Israel nakwa n’ọgbakọ ndị Kraịst?

◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji ṅomie obi ebere nke Chineke, tụkwasị n’ikpe ziri ezi ya?

◻ Gịnị kpaliri ihe atụ atọ ahụ Jisọs nyere na Luk isi 15, oleekwa ihe ndị anyị kwesịrị ịmụta site na ha?

[Foto dị na peeji nke 16, 17]

Ọzara nke er-Raha n’ihu Ugwu Saịnaị (n’azụ aka ekpe)

[Ebe e si Nweta Foto]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji 15]

Garo Nalbandian

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji 18]

Garo Nalbandian

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya