Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 5/15 p. 10-15
  • Tụlee Ndị Bụ Ihe Nlereanya nke Ogologo Ntachi Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Tụlee Ndị Bụ Ihe Nlereanya nke Ogologo Ntachi Obi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ogologo Ntachi Obi n’Ihi Aha Ya
  • Ogologo Ntachi Obi n’Ihi Ụmụ Mmadụ
  • Ihe Nlereanya Jisọs nke Ogologo Ntachi Obi
  • Ihe Nlereanya Ndị Ọzọ nke Ogologo Ntachi Obi
  • Tụlee Ihe Nlereanya Pọl
  • Jehova Bụ Chineke Nke Ogologo Ntachi Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • ‘Yikwasịnụ Ogologo Ntachi Obi’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Nweenụ Ogologo Ntachi Obi n’Ebe Mmadụ Nile Nọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ogologo Ntachi Obi
    Bụkuo Jehova Abụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 5/15 p. 10-15

Tụlee Ndị Bụ Ihe Nlereanya nke Ogologo Ntachi Obi

“Chineke, . . . weere ogologo ntachi obi [hiri] nne nagide ihe iwe e doziworo ka ha baa n’ịla n’iyi.”—NDỊ ROM 9:22.

1. (a) Olee ụzọ Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ si abara anyị uru? (b) N’ihi nke a, gịnị mere e ji na-atụle àgwà nke inwe ogologo ntachi obi n’ebe a?

JEHOVA Chineke, bụ́ Onye Okike anyị, nyere anyị Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible Nsọ. Ọ ga-abụ ‘oriọna dịịrị ụkwụ anyị na ìhè dịịrị okporo ụzọ anyị.’ (Abụ Ọma 119:105) Okwu Chineke na-enyekwara anyị aka ịbụ ndị ‘zuru okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.’ (2 Timoti 3:16, 17) Otu ụzọ ọ na-esi eme ka anyị zuo okè bụ site n’inye anyị ndị bụ ezi ihe nlereanya nke inwe ogologo ntachi obi. Àgwà nke a bụ otu n’ime mkpụrụ nke mmụọ Chineke, ọ dịkwa mkpa maka anyị inweta nnwapụta ya na isoro ndị mmadụ ibe anyị na-emekọ ihe n’ịdị n’otu.—Ndị Galetia 5:22, 23.

2. Gịnị ka okwu Grik ahụ a sụgharịrị “ogologo ntachi obi” pụtara, ònyekwa kasị pụta ìhè n’igosipụta àgwà nke a?

2 Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “ogologo ntachi obi” pụtara n’ụzọ nkịtị “ịdị ogologo nke mmụọ.” A kọwawo ogologo ntachi obi dị ka “àgwà nke mgbochi onwe onye n’ọnọdụ mkpasu iwe bụ nke na-adịghị emegwara ngwa ngwa ma ọ bụ na-enye ịta ahụhụ ozugbo.” (Vine’s Expository Dictionary of Old and New Testament Words, nke W. E. Vine dere, Mpịakọta 3, peji 12) Inwe ogologo ntachi obi pụtara inwe njide onwe onye na eweghị iwe ọsọ ọsọ. Ònyekwa kasị pụta ìhè n’etiti ndị na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, na-egosipụta ogologo ntachi obi? Ọ bụghị onye ọzọ ma e wezụga Jehova Chineke. Otú a, n’Ọpụpụ 34:6, anyị na-agụ na Jehova bụ “Chineke nke nwere obi ebere, onye na-eme amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu.” N’ezie, ugbo asatọ ọzọ n’ime Akwụkwọ nsọ, e kwuru okwu banyere Jehova dị ka onye “na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ.”—Ọnụ Ọgụgụ 14:18; Nehemaịa 9:17; Abụ Ọma 86:15; 103:8; 145:8; Joel 2:13; Jona 4:2; Nehum 1:3.

3. Àgwà ndị dị aṅaa mere ka Jehova bụrụ onye na-enwe ogologo ntachi obi?

3 Inwe ogologo ntachi obi, ma ọ bụ eweghị iwe ọsọ ọsọ, bụ nnọọ ihe anyị ga-atụ anya ya n’ebe Jehova Chineke nọ, n’ihi na ọ bụ onye ike na amamihe ya na-enweghị nsọtụ, onye zuru okè n’ikpe ziri ezi, onye jupụtara n’ịhụnanya. (Deuterọnọmi 32:4; Job 12:13; Aịsaịa 40:26; 1 Jọn 4:8) Ọ na-achịkwa àgwà ya nile, na-eji ha na-eme ihe n’ụzọ hà nhata n’oge nile. Gịnị ka Okwu ya kpughere banyere ihe mere na ụzọ o siworo gosipụta ogologo ntachi obi n’ebe ndị mmadụ na-ezughị okè nọ?

Ogologo Ntachi Obi n’Ihi Aha Ya

4. N’ihi ezi ihe ndị dị aṅaa ka Chineke ji gosipụta ogologo ntachi obi n’ebe ndị mmehie nọ?

4 Gịnị mere Jehova ji na-enwe ogologo ntachi obi? Gịnị mere na ọ naghị ata ndị mmehie ahụhụ ozugbo? Ọ bụghị n’ihi enweghị mmasị ma ọ bụ enweghị ịnụ ọkụ n’obi maka ezi omume. Ee e, kama n’ihi ihe ndị ziri ezi Jehova adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, ọ dịghị atakwa ndị mmadụ ahụhụ ozugbo. Otu ihe kpatara ya bụ ka e wee mee ka a mara aha ya. Ihe ọzọ kpatara ya bụ na a chọrọ oge iji dozie ihe iseokwu nile nke ọkaaka Chineke na iguzosi ike n’ezi ihe nke ihe a kpọrọ mmadụ, bụ́ nke e welitere site ná nnupụisi ahụ e nupụrụ n’Iden. Ihe ọzọkwa kpatara Chineke ji na-enwe ogologo ntachi obi bụ na ọ na-enye ndị na-eme mmehie ohere idozi ụzọ ha.

5, 6. Gịnị mere Jehova ji gosipụta ogologo ntachi obi n’ihe banyere nnupụisi nke mmadụ?

5 Jehova nwere ogologo ntachi obi n’imeso mmadụ mbụ ahụ ihe n’ogige Iden. Mgbe ha mebiri iwu ya megide iri mkpụrụ sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ, ọ gaara egbuworị ha na mmụọ ozi ahụ dapụrụ adapụ nke duhieworo Iv ozugbo ahụ. Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya na e mebiwo ụkpụrụ Jehova nke ezi omume na ikpe ziri ezi, na o wesoro ndị nnupụisi atọ ahụ iwe. Ọ gaara abụworị ime ihe ruuru ya n’ụzọ zuru okè ma ọ bụrụ na o gburu ha ozugbo ahụ. Chineke adọwo nwoke mbụ ahụ, bụ́ Adam, aka ná ntị, sị: “Ma mkpụrụ nke sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ, gị erila mkpụrụ sitere na ya: n’ihi na n’ụbọchị ị ga-eri mkpụrụ sitere na ya ị ghaghị ịnwụ anwụ.” (Jenesis 2:17) Kpọmkwem n’ụbọchị ahụ Adam mehiere, Chineke kpere ndị njehie ahụ ikpe ma maa ha ikpe ọnwụ. N’ụzọ ikpe ikpe, Adam na Iv nwụrụ n’ụbọchị ahụ. Ma, Onye Okike anyị nke na-enwe ogologo ntachi obi hapụrụ ka Adam dịrị ndụ ruo 930 afọ.—Jenesis 5:5.

6 Chineke nwere ezi ihe ndị mere o ji nwee ogologo ntachi obi, ma ọ bụ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ, n’ọnọdụ nke a. Ọ bụrụ na o gbururị ndị nnupụisi ahụ ozugbo ahụ, nke a agaraghị eweta azịza nye ịta ụta Ekwensu na-apụtachaghị ìhè nke bụ na Jehova Chineke ekwesịghị ịbụ onye a na-efe ofufe, na ọ pụghịkwa inwe ndị ohu bụ́ mmadụ bụ́ ndị ga-ejigide iguzosi ike n’ezi ihe ha nye ya n’agbanyeghị ọnọdụ dị iche iche. Ọzọkwa, ajụjụ ndị dị ka ndị a gaara abụ ndị a na-azaghị aza: Ọ̀ bụ n’ihi mmejọ onye ka Adam na Iv mehiere? Jehova ò bu ụzọ kee ha ka ha ghara ịdị ike n’omume nke na ha apụghị iguzogide ọnwụnwa ma taa ha ahụhụ n’ihi ọdịda ha dara ime otú ahụ? Azịza nye ihe a nile pụtara ìhè site n’ihe ndekọ ahụ dị n’akwụkwọ Job, isi 1 na 2. Site n’ikwere ka agbụrụ mmadụ mụbaa, Jehova hapụrụ ụmụ mmadụ ka ha nwee ohere igosipụta na ebubo nile nke Ekwensu bụ ụgha.

7. Gịnị mere na Jehova egbughị Fero ozugbo ahụ?

7 Mgbe ọ fọrọ nke nta ka Jehova gbapụta ndị ya, bụ́ ndị Israel, site n’agbụ ndị Ijipt, o gosipụtakwara ọzọ na ọ na-enwe ogologo ntachi obi. Jehova pụrụ ibibiworị Fero na usuu ndị agha ya nile ozugbo ahụ. Otú ọ dị, kama ime nke a, Chineke hapụrụ ha ruo nwa mgbe. Ọ̀ bụ n’ihi ezi ihe ndị dị aṅaa? Ee, mgbe oge ụfọdụ gasịrị, Fero gbara isi akwara n’ọjụjụ ọ jụrụ ikwe ka ndị Israel si n’Ijipt pụọ dị ka ndị Jehova nweere onwe ha. O si otú a gosipụta na ọ bụ “ihe iwe” kwesịrị mbibi n’ihi ilelị Jehova anya. (Ndị Rom 9:14-24) Ma, e nwere ihe ka nke ahụ mere Jehova ji nwee ogologo ntachi obi n’ọnọdụ nke a. Site n’ọnụ Mosis, ọ gwara Fero, sị: “N’ihi na ugbu a m ga-esetịpụworị aka m, were ajọ ọrịa na-efe efe tigbuo gị na ndị gị, e wee zopụ gị n’ụwa: ma otú ọ dị ọ bụ n’ihi nke a ka m guzoworo gị, ka m wee mee ka ị hụ ike m, ka e wee kọọkwa akụkọ aha m n’ụwa nile.”—Ọpụpụ 9:15, 16.

8. N’ihi gịnị ka Chineke ji ghara igbu ndị Israel na-enupụ isi n’ọzara?

8 E gosipụtakwara ogologo ntachi obi Jehova n’ihi ihe ndị ziri ezi mgbe ndị Israel nọ n’ọzara. Lee nnọọ otú ha si tinye inwe ndidi Chineke n’ule site n’ife nwa ehi ahụ e ji ọlaedo mee na site n’enweghị okwukwe mgbe ndị nledo iri ahụ ji akụkọ na-adịghị mma lọghachite! Chineke ekpochapụghị ha dị ka ndị ya ebe ọ bụ na o metụtara aha ya na ụdị onye ọ bụ. Ee, Jehova gosipụtara ogologo ntachi obi n’ihi aha ya.—Ọpụpụ 13:10-14; Ọnụ Ọgụgụ 14:11-20.

Ogologo Ntachi Obi n’Ihi Ụmụ Mmadụ

9. N’ihi gịnị ka Jehova ji gosi ogologo ntachi obi n’ụbọchị Noa?

9 Jehova enwewo ogologo ntachi obi n’ihi ihe a kpọrọ mmadụ kemgbe Adam mejọrọ ụmụ nile ọ pụrụ ịmụta, na-akpatara ha oké ikpe na-ezighị ezi site n’ime mmehie. Ogologo ntachi obi nke Chineke mere ka o kwe omume imezi ihe ahụ e mejọrọ n’ihi na o nyere oge ka ụmụ mmadụ ndị chegharịrị echegharị bụrụ ndị e mere ka ha na ya dịghachi ná mma. (Ndị Rom 5:8-10) Jehova Chineke gosipụtara ogologo ntachi obi n’ebe ụmụ mmadụ nọ n’oge Noa. N’oge ahụ, “Jehova [hụrụ] na ihe ọjọọ nke mmadụ hiri nne n’ụwa, ọ hụkwa na nchepụta nile ọ bụla nke echiche obi ya bụ nanị ihe ọjọọ ogologo ụbọchị nile.” (Jenesis 6:5) Ọ bụ ezie na Chineke pụrụ ikpochapụworị agbụrụ mmadụ ozugbo ọ hụrụ ọnọdụ nke a, o nyere iwu na n’ime 120 afọ, ọ gaje iweta ọnọdụ nke a ná njedebe. (Jenesis 6:3) Ngosipụta nke a nke ogologo ntachi obi nyere ohere ka Noa mụta ụmụ, ka ha tolite ma lụọ nwunye, a ka ezinụlọ ahụ rụọkwa ụgbọ maka ịzọpụta mkpụrụ obi ha na ichebe anụmanụ ndị e kere eke. N’ụzọ dị otú a o kwere omume nzube mbụ nke Chineke maka elu ala ịbụ ihe weere ọnọdụ.

10, 11. N’ihi gịnị ka Jehova ji nwee ogologo ntachi obi dị otú ahụ n’ebe mba Israel dị?

10 Nkọwa ọzọ a na-enye ogologo ntachi obi bụ karịsịa ná mmeso nile Chineke na-emeso ndị ya. Ọ bụ “iji ndidi nagide mmejọ ma ọ bụ mkpasu iwe, tinyere ọjụjụ a jụrụ ịkwụsị inwe olileanya na ọnọdụ ga-adịwanye mma ná mmekọrịta nke nwere nsogbu.” (Insight on the Scriptures, Mpịakọta 2, peji 262; nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.) Nke a na-ezo aka n’ihe ọzọ mere Chineke ji nwee ogologo ntachi obi n’ebe ndị Israel nọ. Ha gbakụtara Jehova azụ mgbe mgbe, banyekwa n’agbụ nke mba ndị Jentaịl. Ma, o gosipụtara ogologo ntachi obi site n’ịgbapụta ndị Israel na inye ha ohere ichegharị.—Ndị Ikpe 2:16-20.

11 Ihe ka ọtụtụ ná ndị eze Israel dubara ndị ha na-achị n’ofufe ụgha. Chineke ọ̀ gbahapụrụ mba ahụ ozugbo ahụ? Ee e, o meghị ngwa ngwa ịkwụsị inwe olileanya na ihe ga-adị mma ná mmekọrịta ahụ nke nwere nsogbu. Kama nke ahụ, Jehova eweghị iwe ọsọ ọsọ. Site n’igosipụta ogologo ntachi obi, ọtụtụ mgbe Chineke nyere ha ohere ichegharị. Anyị na-agụ na 2 Ihe Emere 36:15, 16, sị: “Jehova, bụ́ Chineke nke ndị bụ nna ha, wee zigara ha ozi n’aka ndị ozi ya, na-ebili n’isi ụtụtụ, na-ezikwa; n’ihi na o nwere ọmịiko n’ahụ ndị ya na n’ebe obibi ya dị: ha wee na-eme ndị ozi Chineke ka ha bụrụ ihe ọchị, ha na-elelịkwa okwu ya anya, na-emekwa onwe ha ndị aghụghọ n’ebe ndị amụma ya nọ, ruo mgbe ọnụma Jehova lara elu imegide ndị ya, ruo mgbe ngwọta na-adịghị.”

12. Ihe àmà dị aṅaa ka akụkụ Akwụkwọ nsọ Grik nke ndị Kraịst na-enye banyere ihe mere Jehova ji na-enwe ogologo ntachi obi?

12 Akụkụ Akwụkwọ Nsọ Grik nke ndị Kraịst na-enyekwa ihe àmà ndị na-egosi na Jehova na-egosipụta ogologo ntachi obi iji nyere ndị ya na-agahie agahie aka. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi jụrụ ndị Kraịst na-eme mmehie, sị: “Ị̀ na-elelị akụ nke obi ọma ya na nke nnagide ya na nke ogologo ntachi obi ya, ebe ị na-amaghị na ọrụ obi ọma Chineke na-eduba gị ná nchegharị?” (Ndị Rom 2:4) Ọ bụkwa n’otu ụzọ ahụ ka Pita na-ekwu, sị: “Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] anọghị ọdụ n’ime nkwa ya, dị ka ụfọdụ na-agụ ya na ọ bụ ịnọ ọdụ; kama ọ na-atachiri unu ogologo ntachi obi, n’ihi na o zubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.” (2 Pita 3:9) N’ụzọ kasị kwesị ekwesị, a gwara anyị ka anyị ‘na-agụ ogologo ntachi obi Onyenwe anyị na ọ bụ nzọpụta.’ (2 Pita 3:15) Otú a, anyị na-ahụ na Jehova na-enwe ogologo ntachi obi, ọ bụghị n’ihi inwe oké mmetụta ma ọ bụ eguzosighị ike, kama n’ihi na o metụtara aha na nzube ya nile, ọ bụkwa onye obi ebere na onye na-ahụ n’anya.

Ihe Nlereanya Jisọs nke Ogologo Ntachi Obi

13. Ihe àmà Akwụkwọ nsọ dị aṅaa ka e nwere na Jisọs Kraịst nwere ogologo ntachi obi?

13 Onye nke abụọ n’ihe nlereanya nke ogologo ntachi obi nke Chineke setịpụrụ bụ nke Ọkpara ya, bụ́ Mesaịa ahụ, Jisọs Kraịst. Ọ bụ ihe nlereanya mara mma nke mgbochi onwe onye n’emegwaraghị ihe ngwa ngwa n’agbanyeghị mkpasu iwe.a Na Mesaịa ahụ ga-abụ onye na-enwe ogologo ntachi obi bụ ihe onye amụma bụ Aịsaịa buru n’amụma n’okwu ndị a: “A chịrị ya n’ike, ma ya onwe ya wedara onwe ya n’ala, wee ghara ịsaghe ọnụ ya; dị ka atụrụ nke a na-akpụrụ ije n’ogbugbu ya, na dị ka nne atụrụ nke dara ogbi n’ihu ndị na-akpacha ya ajị; ee, ọ dịghị asaghe ọnụ.” (Aịsaịa 53:7) Okwu Pita na-emesiwanye otu eziokwu ahụ ike, sị: “Mgbe a na-ekwutọ ya, ọ dịghị ekwutọghachi ọzọ; mgbe ọ na-ahụ ahụhụ, ọ dịghị aba mba; kama ọ raara onwe ya nye n’aka onye ahụ nke na-ekpe ikpe ziri ezi.” (1 Pita 2:23) Lee otú ndị na-eso ụzọ Jisọs na-aghaghị isiworị tinye ya n’ule site n’esemokwu ha nọgidere na-ese banyere onye kasị elu n’etiti onwe ha! Lee aha ogologo ntachi obi na ndidi o nwere n’ebe ha nọ!—Mak 9:34; Luk 9:46; 22:24.

14. Gịnị ka ihe nlereanya Jisọs nke inwe ogologo ntachi obi kwesịrị ịkpali anyị ime?

14 Anyị kwesịrị ịgbaso ihe nlereanya Jisọs setịpụrụ n’ịbụ onye na-enwe ogologo ntachi obi. Pọl dere, sị: “Ka anyị jiri ntachi obi na-agba ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu, ka anyị na-elekwasị anya n’ebe Onye Isi na Onye Mmezu nke okwukwe anyị, bụ́ Jisọs nọ. N’ihi ọṅụ ahụ e debere ya n’ihu, ọ tachiri obi n’elu osisi ịta ahụhụ, na-elelị ihere anya, ọ nọdụwokwa ala n’aka nri nke ocheeze Chineke. N’ezie, tụleenụ n’ụzọ chiri anya onye ahụ nke tachiworo obi n’okwu nkwugide dị otú ahụ ndị mmehie kwuru megide ọdịmma onwe ha, ka ike wee ghara ịgwụ unu, unu wee daa mbà ná mkpụrụ obi unu.”—Ndị Hibru 12:1-3, NW.

15. Olee otú anyị si mara na Jisọs nwere ogologo ntachi obi ma jiri ọchịchọ obi ya tachie obi n’ọnwụnwa nile?

15 Na Jisọs nwere ogologo ntachi obi ma bụrụ onye ji ọchịchọ obi ya tachie obi n’ọnwụnwa nile pụrụ ịbụ nke a na-ahụta site n’àgwà o gosipụtara n’oge e jidere ya. Mgbe ọ basịịrị Pita mba maka iwere mma agha iji chebe Nna ya Ukwu, Jisọs sịrị: “Ị̀ na-eche na apụghị m ịrịọ Nna m, ọ ga-ezitekwara m ọbụna ugbu a karị legion iri na abụọ n’ime ndị mmụọ ozi? Ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ ọ̀ ga-esikwa aṅaa mezuo, na ọ ghaghị ime otú a?”—Matiu 26:51-54; Jọn 18:10, 11.

Ihe Nlereanya Ndị Ọzọ nke Ogologo Ntachi Obi

16. Olee otú Akwụkwọ nsọ si gosi na nwa Jekọb bụ́ Josef nwere ogologo ntachi obi?

16 Ọbụna ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ndị na-emekwa mmehie pụrụ igosipụta ogologo ntachi obi. Akụkụ Akwụkwọ nsọ Hibru nwere ihe nlereanya dị iche iche nke iji ndidi tachie obi ná mmejọ dị iche iche n’akụkụ nke ndị mmadụ na-ezughị okè. Dị ka ihe atụ, e nwere Josef, bụ́ nwa nke nna ochie ahụ bụ Jekọb onye Hibru. Lee ka o si jiri ndidi tachie obi n’ikpe na-ezighị ezi nile ụmụnne ya ndị ikom nakwa nwunye Pọtịfa wetaara ya! (Jenesis 37:18-28; 39:1-20) Josef ekweghị ka ọnwụnwa ndị a mee ka o nwee obi ilu. Nke a pụtara ìhè mgbe ọ gwara ụmụnne ya, sị: “Ya ewutela unu, ya abụkwala ihe iwe iwe dị ọkụ n’anya unu, na unu rere m bịa n’ebe a: n’ihi na ọ bụ idebe ndụ ka Chineke ziri m gaa n’ihu unu.” (Jenesis 45:4, 5) Lee aha ezi ihe nlereanya nke ogologo ntachi obi Josef setịpụrụ!

17, 18. Ihe àmà dị aṅaa nke inwe ogologo ntachi obi ka anyị nwere n’ọnọdụ Devid?

17 Devid bụ ihe nlereanya ọzọ nke onye ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi onye ji ndidi tachie obi ná mmejọ dị iche iche, na-egosipụta ogologo ntachi obi. N’ịbụ onye Eze Sọl nke na-ekwo ekworo chụgharịrị dị ka nkịta, n’oge abụọ Devid gaara emegwara site n’igbu ya. (1 Samuel 24:1-22; 26:1-25) Ma Devid cheere ruo mgbe oge Chineke ruru, dị ka a pụrụ ịhụta site n’okwu ndị ọ gwara Abishaị: “Jehova aghaghị itigbu [Sọl]; ma ọ bụ ụbọchị ya ga-abịaru, o wee nwụọ; ma ọ bụ na ọ ga-arịda n’agha, e wee kpochapụ ya. Ya bụrụ m ihe arụ sitere na Jehova, bụ́ isetị aka m megide onye Jehova e tere mmanụ.” (1 Samuel 26:10, 11) Ee, Devid nwere ike nke ịkwụsị ịbụ onye Sọl na-achụgharị. Kama nke ahụ, Devid họọrọ inwe ogologo ntachi obi.

18 Tụleekwa ihe mere mgbe Eze Devid na-agba ọsọ ndụ pụọ n’aka nwa ya bụ Absalọm, onye na-agba ọchịchị ya mgba okpuru. Shimaị, bụ́ onye sitere n’agbụrụ Benjamin nke ụlọ Sọl, tụrụ Devid nkume ma kọchaa ya, na-eti mkpu, sị: “Pụọ, pụọ, gị nwoke ọbara na nwoke jọgburu onwe ya.” Abishaị chọrọ ka e gbuo Shimaị, ma Devid jụrụ imegwara. Otú ọ dị, kama ime nke ahụ, o gosipụtara àgwà ahụ nke inwe ogologo ntachi obi ọzọ.—2 Samuel 16:5-13.

Tụlee Ihe Nlereanya Pọl

19, 20. Olee otú Pọl onyeozi si gosi onwe ya ịbụ onye na-enwe ogologo ntachi obi?

19 N’akụkụ Akwụkwọ nsọ Grik nke Ndị Kraịst, anyị nwere ezi ihe nlereanya ọzọ nke ogologo ntachi obi n’akụkụ nke mmadụ na-ezughị okè—Pọl onyeozi. O gosipụtara iji ndidi na-atachi obi, na-enwe ogologo ntachi obi, n’ihe banyere ma ndị okpukpe bụ ndị iro ya ma ndị mmadụ n’otu n’otu bụ́ ndị na-asị na ha bụ ndị Kraịst. Ee, Pọl gosipụtara ogologo ntachi obi ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ dị na Kọrint kwuru, sị: “Akwụkwọ ozi ya dị arọ, dịkwa ike; ma ọnụnọ nke ahụ ya n’etiti anyị adịghị ike, okwu ya bụkwa ihe a kpọrọ ihe efu.”—2 Ndị Kọrint 10:10; 11:5, 6, 22-33.

20 Ya mere, n’ihi ihe ziri ezi, Pọl gwara ndị Kọrint, sị: “N’ihe nile anyị na-eme ka mmadụ mara anyị, dị ka ndị na-ejere Chineke ozi, n’ime oké ntachi obi, n’ime mkpagbu, n’ime mkpa, n’ime oké mkpa, n’ime ihe otiti, n’ime ụlọ mkpọrọ, n’ime aghara, n’ime ịdọgbu onwe anyị n’ọrụ, n’ime ịmụrụ anya, n’ime obubu ọnụ; n’ime ịdị ọcha, n’ime ihe ọmụma, n’ime ogologo ntachi obi, n’ime obi ọma, n’ime mmụọ nsọ, n’ime ịhụnanya nke ihu abụọ na-adịghị ya.” (2 Ndị Kọrint 6:4-6) N’otu aka ahụ, onyeozi ahụ pụrụ idegara onye ọrụ ibe ya bụ Timoti akwụkwọ, sị: “Ma gị onwe gị sooro ozizi m, omume m, ihe m zubere, okwukwe m, ogologo ntachi obi m, ịhụnanya m, ntachi obi m, nsogbu m nile, ahụhụ m nile; . . . Onyenwe anyị dọpụtakwara m n’ime ha nile.” (2 Timoti 3:10, 11) Lee aha ezi ihe nlereanya nke Pọl onyeozi setịpụụrụ anyị n’inwe ogologo ntachi obi!

21. Olee otú isiokwu na-esonụ pụrụ isi nyere anyị aka?

21 Ọ bụ ihe doro anya na Akwụkwọ nsọ jupụtara n’ihe nlereanya nke inwe ogologo ntachi obi. Jehova na Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya bụ ihe nlereanya kasị pụta ìhè. Ma lee otú o si bụrụ ihe na-agba ume ịmata na ụmụ mmadụ ndị na-ezughị okè, ndị dị ka Josef, Devid, na Pọl onyeozi egosipụtawo àgwà nke a! A haziri isiokwu na-esonụ inyere anyị aka iṅomi ezi ihe nlereanya ndị dị otú ahụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Inwe ogologo ntachi obi apụtaghị nnọọ ịta ahụhụ ruo ogologo oge. Ọ bụrụ na onye na-ata ahụhụ ruo ogologo oge nwere nkụda mmụọ ma ọ bụ obi ilu n’ihi enweghị ike imegwara, ọ gaghị abụ onye na-enwe ogologo ntachi obi.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

◻ Gịnị ka inwe ogologo ntachi obi pụtara?

◻ Jehova anọwo na-enwe ogologo ntachi obi n’ụzọ bụ isi n’ihi ihe ndị dị aṅaa?

◻ Olee ụzọ Jisọs si gosipụta onwe ya ịbụ onye na-enwe ogologo ntachi obi?

◻ Ihe àmà Akwụkwọ nsọ dị aṅaa ka e nwere na ụmụ mmadụ ndị na-ezughị okè pụrụ igosipụta ogologo ntachi obi?

[Foto ndị dị na peeji nke 11]

Josef, Jisọs, Devid, Pọl na Job bụ ihe nlereanya nke ogologo ntachi obi

[Foto dị na peeji nke 13]

Jisọs gosipụtara ogologo ntachi obi n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya