Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 6/15 p. 8-13
  • Iji Ọbara Azọpụta Ndụ—N’ụzọ Dị Aṅaa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iji Ọbara Azọpụta Ndụ—N’ụzọ Dị Aṅaa?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Echiche Siri Ike nke Chineke n’Ihe Banyere Ọbara
  • Iji Ọbara Eme Ihe n’ime Ọgwụ ma ọ bụ dị ka Ọgwụ
  • Ọ̀ Bụ Ihe E Ji Azọpụta Ndụ n’Ụzọ Nkà Ịgwọ Ọrịa?
  • Ọ̀ Dị Ihe Ndị Ọzọ A Pụrụ Iji Mee Ihe n’Ọnọdụ Ọbara?
  • Ọbara nke Kasị Baa Uru
  • Na-ele Onyinye nke Ndụ E Nyere Gị Anya n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 6/15 p. 8-13

Iji Ọbara Azọpụta Ndụ—N’ụzọ Dị Aṅaa?

‘Gị họrọkwa ndụ site n’ige ntị olu [Chineke] n’ihi na ya onwe ya bụ ndụ gị, na ogologo nke ụbọchị gị.’—DEUTERỌNỌMI 30:19, 20.

1. N’ụzọ dị aṅaa ka ezi ndị Kraịst si bụrụ ndị pụrụ iche n’ùgwù ha na-akwanyere ndụ?

ỌTỤTỤ na-ekwu na ha na-akwanyere ndụ ùgwù, na-enye dị ka ihe àmà ụzọ ha na-esi ele ntaramahụhụ nke ọnwụ, isikwopụ afọ ime, ma ọ bụ ịchụ nta, anya. Otú ọ dị, e nwere ụzọ pụrụ iche ezi ndị Kraịst na-esi akwanyere ndụ ùgwù. Abụ Ọma 36:9 na-asị: “N’ihi na n’ebe [Chineke] nọ ka isi iyi ndụ dị.” Ebe ndụ bụ onyinye sitere n’aka Chineke, ndị Kraịst na-ele ọbara ndụ anya n’ụzọ o si ele ya anya.

2, 3. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji cheta Chineke n’ihe banyere ọbara? (Ọrụ 17:25, 28)

2 Ndụ anyị dabeere n’ọbara, bụ́ nke na-ebugharị ikuku oxygen n’ime ahụ anyị dum, na-ewepụ ikuku carbon dioxide, na-eme ka ahụ anyị nwee ike ikwekọ ná mgbanwe dị iche iche a na-enwe n’ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ, na-enyekwara anyị aka ịlụso ọrịa ọgụ. Onye ahụ nke nyere anyị ndụ bụkwa ya haziri, mepụtakwa ihe ahụ dị mmiri mmiri nke dị ebube nke e ji akwado ndụ, bụ́ nke a na-akpọ ọbara. Nke a na-egosipụta mmasị ọ nọgidere na-enwe n’ichebe ndụ mmadụ.—Jenesis 45:5; Deuterọnọmi 28:66; 30:15, 16.

3 Ma ndị Kraịst ma ụmụ mmadụ n’ozuzu ha kwesịrị ịjụ onwe ha, sị: ‘Ọbara ọ̀ pụrụ ịzọpụta ndụ m nanị site n’ọrụ ndị ọ na-arụ n’ahụ, ka ọbara ọ̀ pụrụ ịzọpụta ndụ n’ụzọ dị mkpa karị?’ Ọ bụ ezie na ọtụtụ mmadụ matara njikọ dị n’etiti ndụ na ọrụ ọbara na-arụ n’ahụ, e nwere n’ezie ihe ka ukwuu o metụtara. Ụkpụrụ omume ndị Kristian, ndị Alakụba, na ndị Juu lekwasịchara anya n’ebe Onye ahụ Na-enye Ndụ nọ, onye kwupụtara echiche ya banyere ndụ, nakwa banyere ọbara. Ee, Onye Okike anyị kwuru ihe dị ukwuu banyere ọbara.

Echiche Siri Ike nke Chineke n’Ihe Banyere Ọbara

4. Ná mmalite akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, gịnị ka Chineke kwuru banyere ọbara?

4 E hotara ọbara ihe karịrị 400 ugbo n’ime Okwu Chineke, bụ́ Bible. Otu n’ime ebe ndị mbụ bụ n’ihe ahụ Jehova nyere n’iwu, bụ: “Ihe nile ọ bụla nke dị ndụ nke na-emegharịkwa ahụ ga-abụrụ unu ihe oriri. . . . Ma unu agaghị eri anụ nke ọbara ndụ ya ka dị n’ime ya.” O kwukwara, sị: “M ghaghị ịjụ ajụjụ banyere ọbara ndụ unu.” (Jenesis 9:3-5, New International Version) Jehova gwara Noa, bụ́ onye mụtara ezinụlọ ụmụ mmadụ, okwu ahụ. Otú a, e mere ka ihe a kpọrọ mmadụ mara na Onye Okike ahụ na-ele ọbara anya dị ka ihe na-anọchi anya ndụ. Onye ọ bụla nke na-ekwu na ya matara Chineke dị ka Onye Na-enye Ndụ kwesịrị isi otú a mata na O nwere echiche siri ike banyere iji ọbara ndụ eme ihe.

5. Gịnị bụ isi ihe mere na ụmụ Israel agaghị eri ọbara?

5 Chineke hotakwara ọbara ọzọ mgbe ọ na-enye Israel Iwu ahụ. Levitikọs 17:10, 11, dị ka nsụgharị Tanakh nke ndị Juu si dee ya, na-agụ, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ụlọ Israel ma ọ bụ ndị ọbịa ndị na-ebi n’etiti ha erie ọbara ọ bụla, m ga-edo ihu M imegide onye ahụ nke na-eri ọbara, m ga-ebipụkwa ya n’etiti ndị ikwu ya. N’ihi na ndụ nke anụ ahụ dị n’ọbara ya.” Iwu ahụ pụrụ iweta abamuru ndị metụtara ahụ ike, ma o metụtara ihe dị ukwuu karị. Site n’ile ọbara anya dị ka ihe pụrụ iche, ndị Israel ga na-egosi ndabere ha dabeere n’ebe Chineke nọ maka ndụ. (Deuterọnọmi 30:19, 20) Ee, isi ihe mere ha ga-eji zere iri ọbara abụghị na ọ pụrụ imebi ahụ ike ha, kama ọ bụ na ọbara bụ ihe pụrụ iche nye Chineke.

6. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Jisọs kwadoro echiche Chineke banyere ọbara?

6 Olee ebe Iso Ụzọ Kraịst guzo n’ihe banyere iji ọbara azọpụta ndụ mmadụ? Jisọs maara ihe Nna ya kwuru banyere iji ọbara eme ihe. Jisọs “emeghị mmehie ọ bụla, a hụghị[kwa] aghụghọ n’ọnụ ya.” Nke ahụ pụtara na o debere Iwu ahụ n’ụzọ zuru okè, gụnyere iwu nke metụtara ọbara. (1 Pita 2:22, Knox) O si otú a setịpụrụ ndị na-eso ụzọ ya ihe nlereanya, tinyere ihe nlereanya nke ịkwanyere ndụ na ọbara ùgwù.

7, 8. Olee ụzọ o si doo anya na iwu Chineke banyere ọbara metụtara ndị Kraịst?

7 Akụkọ ihe mere eme na-egosi anyị ihe mere mgbe oge ụfọdụ gasịrị mgbe nzukọ nke òtù na-achị isi nke ndị Kraịst kpebiri ma ọ̀ bụ na ndị Kraịst aghaghị idebe iwu nile nke Israel. N’okpuru nduzi Chineke, ha kwuru na a gaghị amanye ndị Kraịst idebe ụkpụrụ iwu Mosis ahụ, kama na ọ bụ ihe “dị mkpa” ka ha “hapụ ihe nile a chụrụ n’àjà nye arụsị, na ọbara, na anụ a nyagburu anyagbu [anụ a na-egbupụghị ọbara], na ịkwa iko.” (Ọrụ 15:22-29) Ha si otú a mee ka ọ pụta ìhè na izere ọbara dị mkpa n’ihe banyere omume dị ka izere ikpere arụsị na ịkwa iko jọgburu onwe ya.a

8 Ndị Kraịst oge mbụ kwadoro mmachibido nke a Chineke nyere. Mgbe ọ na-ekwu okwu banyere nke a, onye ọkà mmụta bụ onye Britain, bụ́ Joseph Benson kwuru, sị: “Mmachibido nke a a machibidoro iri ọbara, nke e nyere Noa na ụmụ ya, nke a gwaghachikwara ụmụ Israel . . . adịbeghị mgbe ọ bụla e wepụrụ ya, kama nke ahụ, e mesiri ya ike n’okpuru Agba Ọhụrụ, Ọrụ Ndị Ozi isi iri na ise; wee si otú a mee ka ọ bụrụ iwu nke nọgidere na-adịrị mmadụ.” Ma, ihe Bible kwuru banyere ọbara ọ̀ ga-amachibidokwu ojiji a na-eji ọbara eme ihe n’ọgwụgwọ ọrịa n’oge a, dị ka mmịnye ọbara, bụ́ nke o doro anya na a dịghị eji ya eme ihe n’oge Noa ma ọ bụ n’oge ndị ozi ahụ?

Iji Ọbara Eme Ihe n’ime Ọgwụ ma ọ bụ dị ka Ọgwụ

9. Olee ụzọ a na-esi eji ọbara eme ihe n’ịgwọ ọrịa n’oge ochie, bụ́ nke megidere ọnọdụ dị aṅaa nke ndị Kraịst?

9 Iji ọbara eme ihe n’ịgwọ ọrịa abụghị ihe ọhụrụ ma ọlị. Akwụkwọ ahụ bụ Flesh and Blood, nke Reay Tannahill dere, mere ka ọ pụta ìhè na ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2,000 afọ, n’Ijipt nakwa n’ebe ndị ọzọ, “e lere ọbara anya dị ka ihe kasị mma e ji agwọ ọrịa ekpenta.” Ndị Rom chere na a pụrụ ịgwọ ọrịa akwụkwụ site n’iri ọbara mmadụ. Tertullian dere ihe banyere ojiji nke a e ji ọbara eme ihe “n’ịgwọ ọrịa,” sị: “Tụlee ihe banyere ndị ahụ na-eji oké ọchịchọ, n’oge ihe omume a na-eme n’ámá egwuregwu, na-ewere ọbara ka gbapụtara n’ahụ ajọ ndị omekome . . . wee buru ya laa iji gwọọ ọrịa akwụkwụ ha.” Nke a megidere ihe ndị Kraịst na-eme n’oge ahụ: “Anyị adịghị eri ọbụna ọbara nke ụmụ anụmanụ n’oge nri anyị . . . N’oge a na-ekpe ndị Kraịst ikpe unu na-eche ha nri ndị e ji ọbara sie n’ihu. Otú ọ dị, o doro unu anya na [ọ] bụ ihe na-ezighị ezi n’iwu nye ha.” Tụlee ihe nke ahụ pụtara: Kama ịnara ọbara, bụ́ nke nọchiri anya ndụ, ndị Kraịst oge mbụ dị njikere ịbanye n’ihe ize ndụ nke ịnwụ anwụ.—Tụlee 2 Samuel 23:15-17.

10, 11. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na echiche Chineke banyere ọbara machibidokwara ịnara mmịnye ọbara?

10 Otú ọ dị, laa azụ n’oge ahụ, a dịghị amịnye ọbara amịnye, n’ihi na nnwale ndị e mere banyere mmịnye ọbara malitere nanị n’ihe dị ka narị afọ nke 16. Ma n’ime narị afọ nke 17, otu onye prọfesọ nke nkà mmụta akụkụ ahụ mmadụ dị iche iche na mahadum University of Copenhagen kwuru ihe megidere ya, sị: ‘Ndị ahụ siri ọnwụ na-ewebata iji ọbara mmadụ eme ihe iji gwọọ ọrịa ndị dị n’ime ahụ yiri ka hà ji ya na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, na-emekwa oké mmehie. A na-akatọ ndị na-eri anụ mmadụ. N’ihi gịnị ka anyị na-akpọghị ha asị, bụ́ ndị ji ọbara mmadụ na-emetọ akpịrị ha? Otú ahụ ka ọ dịkwa bụ́ ịnara ọbara na-abụghị nke gị site n’akwara e gbubiri egbubi, site n’ọnụ ma ọ bụ ná ngwá ọrụ ndị e ji amịnye ọbara n’ahụ. Iwu Chineke ga-eyi ndị chepụtara omume nke a egwu.’

11 Ee, ọbụna na narị afọ ndị gaworo aga, ụmụ mmadụ hụrụ na iwu Chineke machibidoro ma ịmịnye ọbara n’ime akwara ma iri ya n’ọnụ. Ịmata nke a pụrụ inyere ụmụ mmadụ aka taa ịghọta ọnọdụ Ndịàmà Jehova na-ewere, bụ́ nke kwekọrọ n’ụzọ Chineke si ele ya anya. Ọ bụ ezie na ha weere ndụ n’ihe dị oké ọnụ ahịa nke ukwuu, marakwa uru nlekọta ahụ ike bara, ezi ndị Kraịst na-akwanyere ndụ ùgwù dị ka onyinye sitere n’aka Onye Okike ahụ, ya mere ha adịghị agbalị ịkwado ndụ site n’iri ọbara.—1 Samuel 25:29.

Ọ̀ Bụ Ihe E Ji Azọpụta Ndụ n’Ụzọ Nkà Ịgwọ Ọrịa?

12. Gịnị ka ndị na-eche echiche pụrụ ịtụgharị uche banyere ya n’ihe metụtara ọbara?

12 Ruo ọtụtụ afọ, ndị ọkachamara anọgidewo na-ekwu na ọbara bụ ihe e ji azọpụta ndụ. Ndị dọkịta pụrụ ịkọ na a mịnyeere onye ọbara dị ukwuu gbapụrụ n’ahụ ọbara, ahụ wee dị ya mma karị. Ya mere ụmụ mmadụ pụrụ iche n’echiche, sị, ‘Ruo ókè hà aṅaa ka ọnọdụ ndị Kraịst bụ ihe amamihe dị na ya ma ọ bụ nke amamihe na-adịghị na ya n’ụzọ nkà mmụta ọgwụ na ahụ ike?’ Tupu a na-atụle usoro ọgwụgwọ ọ bụla siri ike, mmadụ nke na-eche echiche ga-achọ ịmara abamuru ndị a pụrụ inweta na ihe ize ndụ ndị pụrụ isi na ya pụta. Gịnị banyere mmịnye ọbara? Ihe bụ eziokwu bụ na mmịnye ọbara jupụtara n’ọtụtụ ihe ize ndụ. Ha pụrụ ọbụna ịkpata ọnwụ.

13, 14. (a) Olee ụzọ ụfọdụ mmịnye ọbara siworo bụrụ ihe ize ndụ? (b) Olee ụzọ ahụmahụ popu ji mee ihe atụ nke ihe ize ndụ dị n’ọbara?

13 N’oge na-adịghị anya gara aga, ndị dọkịta bụ L. T. Goodnough na J. M. Shuck kwuru, sị: “Eri ogologo oge, ndị ọkà n’ihe banyere ọgwụ na ahụ ike amawo na ọ bụ ezie na a pụrụ ime ka nkwakọba ọbara ndị e nwere dịrị n’enweghị ihe ize ndụ ruo ókè anyị mara otú anyị ga-esi mee ya, mmịnye ọbara anọgidewo mgbe nile bụrụ nke nwere ihe ize ndụ. Nsogbu nke kasị na-adapụta site ná mmịnye ọbara nọgidere na-abụ ọrịa ịba ọchananya nke na-abụghị nke A ma ọ bụ B (NANBH); nsogbu ndị ọzọ pụrụ ịdapụta gụnyere ịba ọchananya bụ hepatitis B, nsogbu na-abịa site n’ịmịnye ụdị ọbara ndị na-ekwekọghị ekwekọ, ahụ mgbakasị na-esite ná mmịnye ọbara, mbibi nke ikike ahụ ji alụso ọrịa ọgụ, na inwebiga mmiri ọgwụ iron ókè n’ime ahụ.” N’ime atụmatụ ‘a kpaara ókè’ nke otu n’ime ihe ize ndụ ndị ahụ siri ike, akụkọ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “A na-eche na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 40,000 mmadụ [n’ime United States nanị] ga-enweta ọrịa NANBH kwa afọ, nakwa n’ihe ruru pasenti 10 n’ime ndị a ga-enwetakwu ọrịa imeju bụ cirrhosis na hepatoma [ọrịa cancer nke na-eme n’imeju] ma ọ bụkwanụ otu n’ime ha.”—The American Journal of Surgery, June 1990.

14 Ka ihe ize ndụ nke ibute ọrịa site n’ọbara a mịnyere amịnye ghọworo ihe a mazuru n’ebe nile, ụmụ mmadụ na-atụleghachi ihe bụ echiche ha banyere mmịnye ọbara. Dị ka ihe atụ, mgbe a gbasịrị popu égbè na 1981, a gwọrọ ya n’otu ụlọ ọgwụ ma hapụ ya ka ọ laa. Mgbe e mesịrị ọ dịrị mkpa na ọ ga-abịaghachi ụlọ ọgwụ ma nọọ ọnwa abụọ, ọnọdụ ya dịkwa njọ nke ukwuu nke na o yiri ka ọ̀ ga-ala ezumike nká dị ka onye na-enweghịkwa ike ịrụ ọrụ. N’ihi gịnị? O butere ọrịa cytomegalovirus site n’ọbara a mịnyere ya. Ụfọdụ pụrụ iche echiche, sị: ‘Ọ bụrụ na ọbara e nyere ọbụna popu dị ize ndụ, gịnị banyere ọbara a na-amịnyere anyị bụ ndị nkịtị?’

15, 16. N’ihi gịnị ka mmịnye ọbara ji bụrụ nke ihe ize ndụ ka dị na ya ọbụna ma a sị na e nyochawo ọbara iji chọpụta ma ọrịa ọ̀ dị n’ime ya?

15 Mmadụ pụrụ ịjụ, sị, ‘Ma, ọ̀ bụ na ha apụghị inyocha ọbara iji chọpụta ma è nwere ọrịa ndị dị n’ime ya?’ Ọ dị mma, tụlee, dị ka ihe atụ, nnyocha a na-eme iji chọpụta ọrịa hepatitis B. Akwụkwọ bụ Patient Care (February 28, 1990) kwuru, sị: “Ọnụ ọgụgụ ọrịa hepatitis a na-enweta mgbe a mịnyesịrị mmadụ ọbara dalatara mgbe a malitere ime nnyocha zuru ụwa ọnụ nke ọbara iji chọpụta [ya], ma 5-10 pasenti nke ọrịa hepatitis a na-enweta mgbe a mịnyesịrị ọbara ka bụkwa site na hepatitis B.”

16 A na-ahụtakwa na a pụghị ịdaberecha kpam kpam ná nnyocha ndị ahụ site n’otu ihe ize ndụ ọzọ a na-ebute site n’ọbara—AIDS. Mgbasa nke ọrịa AIDS ejiriwo oké mmekpaahụ ọ na-akpata mee ka ụmụ mmadụ teta n’ụra ịmata ihe ize ndụ nke ọbara bu ọrịa. Ọ bụ eziokwu na e nwewo nnyocha ndị a na-eme ugbu a n’ọbara iji chọpụta ihe àmà nke njé ọrịa ahụ ịdị na ya. Otú ọ dị, a naghị enyocha ọbara n’ebe nile, o yikwara ka ndị mmadụ pụrụ ibu njé ọrịa AIDS n’ime ọbara ha ruo ọtụtụ afọ n’achọpụtaghị ya site n’ụdị nnyocha ndị e nwere ugbu a. Ya mere, ndị ọrịa pụrụ ibute ọrịa AIDS—ha ebutewokwa ọrịa AIDS—site n’ọbara ndị e nyochara enyocha, ndị a sịkwara na ha dị mma!

17. Olee ụzọ mmịnye ọbara pụrụ isi bibie ihe nke ọ pụrụ ịbụ na a gaghị achọpụta ya ozugbo?

17 Ndị dọkịta bụ Goodnough na Shuck hotakwara “ibibi ike ahụ ji alụso ọrịa ọgụ.” Ee, e nwere ihe àmà hiri nne iji gosi na ọbụna ọbara ndị e nyochara nke ọma wee hụ na ha kwekọrọ ekwekọ pụrụ ibibi usoro ahụ onye ọrịa ji alụso ọrịa ọgụ, na-eme ka onye ahụ nwee ike ịda ọrịa cancer nakwa ịnwụ anwụ. Otú a, otu ihe ọmụmụ e mere na Canada banyere “ndị ọrịa nwere cancer nke isi na nke olu gosiri na ndị naara mmịnye ọbara mgbe a na-ewepụ mkpụrụ gbapụtara n’ime ahụ nwere ndalata dị ukwuu n’ikike ahụ ha nwere ịlụso ọrịa ọgụ mgbe e mesịrị.” (The Medical Post, July 10, 1990) Ndị dọkịta nọ na University of Southern California kọrọ, sị: “Ọ̀tụ̀tụ̀ mbịaghachi nke ọrịa cancer nke na-eme n’akpịrị bụ 14 pasenti maka ndị na-anaraghị ọbara nakwa 65 pasenti maka ndị naaranụ. Maka ọrịa cancer nke ime ọnụ, nkọlọ, na imi ma ọ bụ opi imi, ọ̀tụ̀tụ̀ mbịaghachi ha bụ 31 pasenti ná ndị na-anaraghị mmịnye ọbara nakwa 71 pasenti ná ndị naaranụ.” (Annals of Otology, Rhinology & Laryngology, March 1989) Mbibi nke ike ahụ ji alụso ọrịa ọgụ yikwara ka ọ̀ bụ ya na-akpata eziokwu ahụ nke bụ na ndị e nyere ọbara mgbe a na-awa ha ahụ yikarịrị ka ha ga-ebute ọrịa.—Lee igbe, peji 10.

Ọ̀ Dị Ihe Ndị Ọzọ A Pụrụ Iji Mee Ihe n’Ọnọdụ Ọbara?

18. (a) Ihe ize ndụ ndị dị ná mmịnye ọbara na-eme ka ndị ọkà n’ịgwọ ọrịa na-echigharịkwuru gịnị? (b) Ihe ọmụma dị aṅaa banyere ihe ndị ọzọ a pụrụ iji mee ihe n’ọnọdụ ọbara ka ị pụrụ iso onye dọkịta gị kerịta?

18 Ụfọdụ ndị pụrụ iche, sị, ‘Mmịnye ọbara bụ ihe ize ndụ, ma è nwere ihe ndị ọzọ a pụrụ ime?’ N’ezie, anyị chọrọ ọgwụgwọ ọrịa nke dị irè, dịkwa mma, ya mere, è nwere ụzọ ndị ọzọ dị irè a pụrụ isi lebara ọnọdụ ahụ ike siri ike anya n’ejighị ọbara mee ihe? Ọ bụ ihe obi ụtọ na azịza ya bụ ee. Akwụkwọ bụ The New England Journal of Medicine (June 7, 1990) kọrọ, sị: “Ndị ọkà n’ịgwọ ọrịa, n’ịmatawanye ihe banyere ihe ize ndụ nke [AIDS] na ọrịa ndị ọzọ a na-ebute site ná mmịnye ọbara, na-atụleghachi ihe ize ndụ na abamuru ndị dị ná mmịnye ọbara ma na-echigharịkwuru ihe ndị ọzọ a pụrụ iji mee ihe, gụnyere izere mmịnye ọbara kpam kpam.”b

19. N’ihi gịnị ka ị pụrụ iji nwee obi ike na ị pụrụ ịjụ ịnara ọbara ma nwetakwa nlekọta ahụ ike nke gara nke ọma?

19 Ruo ogologo oge, Ndịàmà Jehova ajụwo ịnara mmịnye ọbara, ọ bụkebeghị n’ihi ihe ize ndụ ahụ ike dị na ya, kama n’ihi nrubeisi nye iwu Chineke metụtara ọbara. (Ọrụ 15:28, 29) Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ndị dọkịta maara ọrụ ha nke ọma enwewo ihe ịga nke ọma n’ilekọta ndị ọrịa bụ Ndịàmà Jehova n’ejighị ọbara mee ihe, n’agbanyeghị ihe ize ndụ nile dị na ya. Dị ka nanị otu n’ime ọtụtụ ihe atụ ndị a kọrọ akụkọ ha n’akwụkwọ ndị metụtara ọgwụ na ahụ ike, akwụkwọ bụ Archives of Surgery (November 1990) kọrọ banyere itinyere mmadụ mkpụrụ obi onye ọzọ nke e meere ndị ọrịa bụ Ndịàmà, bụ́ ndị akọ na uche ha nakweere ihe omume dị otú ahụ n’ejighị ọbara mee ihe. Akụkọ ahụ sịrị: “Ihe karịrị 25 afọ nke inwe ahụmahụ n’ịwa Ndịàmà Jehova ahụ n’obi arụpụtawo inwe ihe ịga nke ọma n’itinyere mmadụ mkpụrụ obi onye ọzọ n’ejighị ihe ndị si n’ọbara mee ihe . . . E nweghị onye ọ bụla nwụrụnụ mgbe ọ nọ n’ụlọ ọgwụ maka ịwa ahụ ahụ, nnyocha ndị e mere mgbe ịwa ahụ ndị ahụ gasịrị egosiwokwa na ndị ọrịa ndị a enwebeghị mmetụta nke akụkụ ahụ ndị ahụ e tinyeere ha ịghara ịnọkwata n’ahụ ha karịa ndị ọzọ.”

Ọbara nke Kasị Baa Uru

20, 21. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst kwesịrị iji lezie anya ka ha ghara iwulite echiche ahụ nke bụ “Ọbara bụ ọgwụ ọjọọ”?

20 Otú ọ dị, e nwere ajụjụ na-enyocha obi nke ọ dị mkpa ka onye ọ bụla n’ime anyị jụọ onwe ya. ‘Ọ bụrụ na ekpebiwo m ịjụ ịnara mmịnye ọbara, ọ̀ bụ n’ihi gịnị? N’eziokwu, gịnị bụ isi ihe kpatara m ji wee jụ?’

21 Anyị ehotawo na e nwere ihe ndị ọzọ dị irè a pụrụ iji mee ihe n’ọnọdụ ọbara, bụ́ ndị na-adịghị etinye mmadụ n’ọtụtụ ihe ize ndụ ndị e jikọrọ ha na mmịnye ọbara. Ọbụna na ihe ize ndụ ndị dị ka ịba ọchananya ma ọ bụ AIDS emewo ka ọtụtụ ndị jụ ịnara ọbara n’ihi ihe ndị na-emetụtaghị okpukpe. Ụfọdụ ndị na-ekwusi okwu ike banyere nke a, n’ụzọ fọrọ ihe nta ka o yie ka hà na-azọ ije n’okpuru ọkọlọtọ nke na-asị, “Ọbara Bụ Ọgwụ Ọjọọ.” O kwere omume na a pụrụ ịdọrọ onye Kraịst banye n’ịzọ ije dị otú ahụ. Ma ọ bụ ịzọ ije nke na-agaghị arụpụta ihe ọ bụla. Ò si aṅaa bụrụ otú ahụ?

22. Ụzọ dị aṅaa nke ziri ezi e si ele ndụ na ọnwụ anya ka anyị kwesịrị iwulite? (Eklisiastis 7:2)

22 Ezi ndị Kraịst na-amata na ọbụna n’ebe e nwere nlekọta ahụ ike kasị mma n’ụlọ ọgwụ ndị kasị mma, oge na-eru mgbe ndị mmadụ na-anwụ. Ma è tinyere ọbara ma ọ bụ na e tinyeghị, ndị mmadụ na-anwụ anwụ. Ikwu otú ahụ abụghị ikwere n’akara aka. Ọ bụ ikwu ihe na-eme eme n’ezie. Ọnwụ bụ ihe na-eme eme ná ndụ taa. Ụmụ mmadụ ndị na-elefuru iwu Chineke banyere ọbara anya na-enwetakarị mmerụahụ ozugbo ahụ ma ọ bụ mgbe oge ụfọdụ gasịrị site n’ọbara ahụ. Ọbụna na ụfọdụ na-anwụ site n’ọbara ahụ a mịnyeere ha. Ma, dị ka anyị nile na-aghaghị ịmata, ndị nọgidere na-adị ndụ n’agbanyeghị mmịnye ọbara ahụ enwetabeghịkwa ndụ ebighị ebi, ya mere, ọbara azọpụtabeghị ndụ ha n’ụzọ na-adịgide adịgide. N’aka nke ọzọ, ihe ka ọtụtụ ná ndị na-ajụ ịnara ọbara, n’ihi ihe metụtara okpukpe na ahụ ike ma ọ bụ nke ọ bụla n’ime ha, ma nakwere usoro ọgwụgwọ ndị ọzọ na-eme nnọọ nke ọma n’ịgbake n’ọrịa ha. Ha pụrụ isi otú a mee ka ndụ ha dịwanye ogologo ruo ọtụtụ afọ—ma ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi.

23. Olee ụzọ iwu Chineke banyere ọbara si metụta ọbụbụ anyị bụ ndị mmehie, ndị nwekwara mkpa nke mgbapụta?

23 Eziokwu ahụ nke bụ na ụmụ mmadụ nile dị ndụ taa bụ ndị na-ezughị okè, bụrụkwa ndị na-anwụ nke nta nke nta na-eduje anyị n’isi ihe dị n’ihe Bible kwuru banyere ọbara. Chineke gwara ihe nile a kpọrọ mmadụ ka ha ghara iri ọbara. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ nọchiri anya ndụ. (Jenesis 9:3-6) N’ime Iwu ahụ, o setịpụrụ iwu ndị lekwasịrị anya n’eziokwu ahụ nke bụ na ụmụ mmadụ nile bụ ndị na-emehie emehie. Chineke gwara ụmụ Israel na site n’ịchụ àjà ụmụ anụmanụ, ha pụrụ ịdị na-egosi na ọ dị mkpa ka e kpuchie mmehie ha. (Levitikọs 4:4-7, 13-18, 22-30) Ọ bụ ezie na nke ahụ abụghị ihe a chọrọ n’aka anyị taa, e nwere isi ihe dị na ya nke bara uru n’oge a. Chineke zubere iweta ihe ịchụ àjà nke ga-ekpuchi mmehie nke ndị nile kwere ekwe n’ụzọ zuru ezu—ihe mgbapụta ahụ. (Matiu 20:28) Ọ bụ n’ihi nke a ka o ji dị mkpa ka anyị lee ọbara anya n’ụzọ Chineke si ele ya anya.

24. (a) N’ihi gịnị ka ọ ga-eji bụrụ imehie ihe ile ihe ize ndụ ahụ ike anya dị ka isi ihe dị n’okwu metụtara ọbara? (b) Gịnị kwesịrị ịbụ isi ihe na-eduzi ụzọ anyị si ele iji ọbara eme ihe anya?

24 Ọ ga-abụ imehie ihe ilekwasị anya n’ụzọ bụ isi n’ihe ize ndụ ahụ ike dị n’ọbara, n’ihi na nke ahụ abụghị ebe Chineke lekwasịrị anya. Ọ pụrụ ịbụ na ụmụ Israel ritere uru ahụ ike ụfọdụ site n’ịhapụ iri ọbara, dịkwa ka ọ pụrụ ịbụ na ha ritere uru site n’ịghara iri anụ ézì ma ọ bụ anụ ndị na-eri ihe ndị rere ure. (Deuterọnọmi 12:15, 16; 14:7, 8, 11, 12) Ma, cheta na mgbe Chineke nyere Noa ikike iri anụ, o gbochighị ya iri anụ nke anụmanụ ndị dị otú ahụ. Ma o nyere iwu na ụmụ mmadụ agaghị eri ọbara. Chineke adịghị elekwasị anya n’ụzọ bụ isi n’ihe ize ndụ ahụ ike ndị ọ pụrụ ịkpata. Nke ahụ abụghị isi ihe dị mkpa n’iwu o nyere banyere ọbara. Ndị na-efe ya ofufe ga-ajụ iji ọbara kwadoo ndụ ha, ọ bụghị n’ụzọ bụ isi n’ihi na ime nke ahụ bụ ihe na-adịghị enye ahụ ike, kama n’ihi na ọ bụ ihe na-adịghị nsọ. Ha jụrụ ịnara ọbara, ọ bụghị n’ihi na ọ bụ ihe e merụrụ emerụ, kama n’ihi na ọ bụ ihe dị oké ọnụ ahịa. Ọ bụ nanị site n’ọbara e jiri chụọ àjà ka ha pụrụ inweta mgbaghara mmehie.

25. Olee ụzọ a pụrụ isi jiri ọbara zọpụta ndụ n’ụzọ na-adịgide adịgide?

25 Nke ahụ bụkwa eziokwu n’ihe banyere anyị. Ná Ndị Efesọs 1:7, Pọl onyeozi kọwara, sị: “Anyị sitere n’ọbara ya [Kraịst] nwee mgbapụta anyị n’ime ya, bụ́ mgbaghara nke ndahie nile anyị, dị ka akụ nke amara ya si dị.” Ọ bụrụ na Chineke na-agbaghara mmehie mmadụ ma na-ele onye ahụ anya dị ka onye ezi omume, onye ahụ nwere olileanya nke inweta ndụ ebighị ebi. Ya mere, ọbara mgbapụta Jisọs nwere ike ịzọpụta ndụ—n’ụzọ na-adịgide adịgide, n’eziokwu, ruo mgbe ebighị ebi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Iwu ahụ jiri okwu ndị a mechie: “Ọ bụrụ na unu edebe onwe unu ghara imetụ ihe ndị a aka, ọ ga-adịrị unu mma. Jisienụ ike [“Ahụ ike dịkwara unu!” NW].” (Ọrụ 15:29) Okwu ahụ bụ ‘Ahụ ike dịkwara unu’ abụghị nkwa nke pụtara, ‘Ọ bụrụ na unu ezere ọbara na ịkwa iko, ahụ ga-adị unu mma karị.’ Ọ bụ okwu mmechi efu dịịrị akwụkwọ ozi ahụ, dị ka, ‘Nọdụnụ nke ọma.’

b A tụleghachiri ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị irè a pụrụ iji mee ihe n’ọnọdụ mmịnye ọbara n’ime akwụkwọ nta ahụ bụ How Can Blood Save Your Life?, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na 1990.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

◻ Gịnị bụ isi ihe mere Ndịàmà Jehova ji na-ajụ ịnara mmịnye ọbara?

◻ Ihe àmà dị aṅaa na-emesi ya ike na echiche Bible banyere ọbara abụghị nke ezi echiche na-adịghị na ya n’ihe banyere nkà mmụta ọgwụ na ahụ ike?

◻ Olee ụzọ e si jikọọ ihe mgbapụta ahụ na iwu Bible banyere ọbara?

◻ Gịnị bụ nanị ụzọ ọbara pụrụ isi zọpuṭa ndụ n’ụzọ na-adịgide adịgide?

[Igbe dị na peeji nke 10]

MMỊNYE ỌBARA NA IBUTE ỌRỊA

Mgbe e mesịrị nnyocha sara mbara banyere ma mmịnye ọbara ọ̀ pụrụ ime ka onye ọrịa nọrọ n’ihe ize ndụ karị ibute ọrịa, Dr. Neil Blumberg kwubiri, sị: “Ná nnyocha 12 e mere n’ụlọ ọgwụ [banyere okwu ahụ], 10 chọpụtara na mmịnye ọbara tinyere aka n’ịmụba nke ukwuu ihe ize ndụ rịworo elu nke ibute ọrịa site na njé ọrịa bacteria . . . Ọzọkwa, mmịnye ọbara ndị e nwere ogologo oge tupu ịwa ahụ pụrụ imetụta ike onye ọrịa ahụ nwere iguzogide ọrịa ma ọ bụrụ na mmetụta mmịnye ọbara na-enwe n’ike ahụ nwere ịlụso ọrịa ọgụ na-adịru ogologo oge dị ka ihe ọmụmụ ụfọdụ na-egosi . . . Ọ bụrụ na a pụrụ iji ihe ndị a a chọpụtara mee ihe gaa n’ihu, mesiekwa ha ike, o yiri ka oké ọrịa ndị a na-ebute mgbe a wasịrị ahụ ọ̀ pụrụ ịbụ otu nsogbu a kasị na-enwe site ná mmịnye ọbara.”—Transfusion Medicine Reviews, October 1990.

[Foto dị na peeji nke 8]

Mkpụrụ ndụ ọbara ndị na-acha uhie uhie. “Maịkrolita (0.00003 ounce) ọ bụla nke ọbara nwere site na nde 4 ruo nde 6 mkpụrụ ndụ ọbara ndị na-acha uhie uhie n’ime ya.”—“The World Book Encyclopedia”

[Ebe E Si Nweta Foto]

Kunkel-CNRI/PHOTOTAKE NYC

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya