Site ná Nne Ala Gaa na Chi Nwanyị nke Ike Ọmụmụ Nwa
Ị̀ MATARA chi nwanyị nke e sere n’ihu magazin nke a? Ọ bụ Isis, bụ́ chi nne oge ochie nke Ijipt. Ọ bụrụ na i jetụwo n’ebe ndebe ihe mgbe ochie ma ọ bụkwanụ kirie akwụkwọ nke metụtara akụkọ ihe mere eme oge ochie, ma eleghị anya ị hụtụwo ihe ọkpụkpụ yiri nke a. Ma tụlee nke a: Ị̀ ga-akpọ isiala nye ma ọ bụ fee chi nwanyị bụ Isis ofufe?
Ọ bụrụ na ị nọ n’otu n’ime chọọchị dị iche iche nke Krisendọm, nke ahụ pụrụ iyi ajụjụ ezi uche na-adịghị na ya. Ị pụrụ ịnọgidesi ike na-ekwu na ọ bụ Onye Okike ahụ ka ị na-efe, bụ́ Onye a na-agwa okwu ahụ bụ, “Nna anyị nke bi n’eluigwe.” (Matiu 6:9) Echiche nke ịkpọ isiala nye chi nne pụrụ iyi ihe na-atụ mmadụ n’anya, ọbụna ihe na-asọ oyi. Otú o sina dị, ofufe dị otú ahụ abụwo ihe gbasazuru ebe nile n’akụkọ ihe mere eme dum, ọ pụkwara ịbụrụ gị oké ihe ijuanya ịmata ndị na-efe oké chi nne ahụ ofufe taa.
Otú ọ dị, tupu anyị atụlee nke ahụ, ka anyị nwetatụ ihe ọmụma site n’ịtụle ókè ofufe chi nne gbasaruru n’oge ochie. O yiri ka ụdị ofufe nke a bụ otu ụdị okpukpe ụgha nke malitere n’oge gboo. Ndị ọkà mmụta ihe mgbe ochie e gwupụtara n’ala egwupụtawo ihe ọkpụkpụ nta na ihe oyiyi dị iche iche nke chi nne ndị gba ọtọ n’ebe dị iche iche e nwere ihe mgbe ochie gburugburu Europe, sitekwa n’ala ndị dị n’ógbè Mediterranean ruo India.
E lere Nne Ala anya dị ka isi iyi nke nọgidere na-emepụta ụdị ihe dị iche iche dị ndụ, na-enye ndụ, na-ewereghachikwa ya nye onwe ya mgbe ha nwụrụ. N’ihi nke ahụ, a na-efe ya ofufe, na-atụkwa ya egwu. Ná mmalite, e chere na ike o ji amụpụta ụmụ emetụtaghị mmekọahụ. E mesịa, akụkọ ifo akọọ na ọ mụtara Nna Mbara Igwe nke bụ nwa nwoke, ghọọkwa nwunye ya. Di na nwunye nke a mụpụtara ọtụtụ chi nwoke na chi nwanyị ndị ọzọ a na-apụghị ịgụta ọnụ.
Ihe Oyiyi Mbụ nke Si Babilọn
Ná nchịkọta chi dị iche iche nke ndị Babilọn, Ishtar bụ chi nwanyị nke bụ isi, bụ́ nke ya na chi nwanyị ike ọmụmụ nwa nke ndị Sumeria, bụ́ Innanna, yiri. N’ụzọ dị mgbagwoju anya, ọ bụ chi nwanyị nke obubu agha, bụrụkwa chi nwanyị nke ịhụnanya na ihe ụtọ. N’akwụkwọ ya bụ Les Religions de Babylonie et d’Assyrie (Okpukpe Dị Iche Iche nke Babylonia na Asiria), ọkà mmụta bụ onye France, bụ́ Édouard Dhorme kwuru banyere Ishtar, sị: “Ọ bụ ya bụ chi nwanyị, nne ukwu, nne nwere obi ebere nke na-anụ ekpere, na-ekwuchitekwa ọnụ ụmụ mmadụ n’ihu chi ndị iwe ji, na-emekwa ka obi dajụọ ha. . . . E buliri ya elu karịa ndị nile ọzọ, ọ ghọrọ chi nwanyị kasị chi nwanyị nile ọzọ, eze nwanyị nke chi nile, na ọkaaka nke chi nile nke eluigwe na ala.”
Ndị na-efe Ishtar na-akpọ ya “Nwa Agbọghọ ahụ Na-amaghị Nwoke,” “Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke nke Dị Nsọ,” na “Nne nke bụ Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke.” Ihe odide oge ochie ahụ nke ndị Sumeria na Akkad bụ “Ekpere nke Abụ Ákwá nye Ishtar,” na-asị: “Ana m ekpeku gị ekpere, Oo Nne Nwanyị nke kasị nne nwanyị nile, chi nwanyị nke kasị chi nwanyị nile ọzọ. Oo Ishtar, eze nwanyị nke ndị nile. . . . Oo onye ji ike nile nke ndị bụ chi, onye na-ekpu okpueze nke ịchị isi. . . . Ụlọ ekpere nile, ebe nsọ nile, ebe nile e doro nsọ, na ihu arụsị nile na-ege gị ntị. . . . Olee ebe a na-emepụtaghị ihe ndị yiri gị? . . . Lee m, Oo nne m ukwu; nụrụ ekpere m.”a
Ofufe nke Chi Nne Agbasaa
Onye ọkà mmụta ihe banyere ndị Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, bụ́ Édouard Dhorme na-ekwu banyere “mgbasapụ nke ofufe Ishtar.” Ọ gbasara gazuo Mesopotamia dum, e fekwara Ishtar n’onwe ya ma ọ bụ chi nwanyị ndị nwere aha dị iche iche ma nwee àgwà ndị yiri nke ya, n’Ijipt, Finisia, Kenean, tinyekwara n’Anatolia (Asia Minor), Gris, na Itali.
Chi nne bụ isi a na-efe n’Ijipt bụ Isis. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ H. G. Wells dere, sị: “Isis nwetara ọtụtụ ndị na-efe ya ofufe, ndị ji ịṅụ iyi rara ndụ ha nye ya. Ihe oyiyi ya guzo n’ebe dị iche iche n’ụlọ nsọ ahụ, e kpubere ya okpueze dị ka Eze Nwanyị nke Eluigwe, o kukwa nwa ọhụrụ ahụ bụ Horus n’aka ya. Kandụl ndị ahụ na-enwu, na-asọdakwa mmiri ha n’ihu ya, a na-ekokwasịkwa wax ndị e ji nye onyinye gburugburu ụlọ nsọ ahụ.” (The Outline of History) Ofufe nke Isis wuru ewu n’ụzọ dị ukwuu n’Ijipt. Ọ gbasazukwara n’ógbè Mediterranean dum, karịsịa gaa na Gris na Rom, ọbụna na-eru n’ebe ọdịda anyanwụ na ebe ugwu Europe.
Na Finisia na Kenean, ofufe chi nne lekwasịrị anya n’Ashtọret, ma ọ bụ Astarte, nke e kwuru na ọ bụ nwunye Beal. Dị ka nke ahụ yiri ya na Babilọn, bụ́ Ishtar, ọ bụ ma chi nwanyị nke ike ọmụmụ nwa, bụrụkwa nke agha. N’Ijipt, a hụwo ihe odide oge ochie dị iche iche ndị a kpọrọ Astarte nne nwanyị nke eluigwe na eze nwanyị nke eluigwe n’ime ha. Ọ dịrị mkpa ka ụmụ Israel nọgide na-ebu agha megide mmetụta na-emerụ emerụ nke ofufe chi nwanyị nke a nke ike ọmụmụ nwa.
N’ebe ugwu nke ọdịda anyanwụ nke Anatolia, ihe ya na Ishtar nọ n’otu ọkwá bụ Cybele, nke a maara dị ka Nne Ukwu nke chi nile. A na-akpọkwa ya Onye Mụrụ Ihe Nile, Onye Na-azụ Ihe Nile, Nne nke ndị nile A Gọziri Agọzi. Site n’Anatolia, ofufe nke Cybele gbasara, buru ụzọ gbasaruo Gris, mesịakwa rute Rom, bụ́ ebe ọ nọgidere nnọọ ruo n’Oge Anyị a. Ofufe nke chi nwanyị ike ọmụmụ nwa nke a gụnyere ite egwú nke e ji oké mmegharị ahụ ete, ndị nchụaja ibekasị onwe ha ahụ, ndị na-achọ ịghọ ndị nchụaja ịnapụ onwe ha ikike ịmụ nwa, na ịkwụ n’ahịrị nke a na-ebu ihe ọkpụkpụ nke chi nwanyị ahụ na ya n’ụzọ dị oké ebube.b
Ndị Grik oge ochie fere chi nwanyị nke Nne Ala a na-akpọ Gaea. Ma nchịkọta chi ha mesịrị gụnye chi nwanyị ndị yiri Ishtar, ndị dị ka Aphrodite, bụ́ chi nwanyị nke ike ọmụmụ nwa na ịhụnanya; Athena, bụ́ chi nwanyị nke agha; na Demeter, bụ́ chi nwanyị nke ọrụ ubi.
Na Rom, Venus bụ chi nwanyị nke ịhụnanya, n’ihi nke a kwa, o kwekọrọ n’Aphrodite nke ndị Gris na Ishtar nke ndị Babilọn. Otú ọ dị, ndị Rom fekwara chi nwanyị Isis, Cybele, na Minerva (Athena nke ndị Grik), ndị ha nile sicha n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ yie nke ndị Babilọn ahụ bụ isi, bụ́ Ishtar.
N’ụzọ doro anya, ruo ọtụtụ puku afọ, ofufe nke chi nne bụ ihe mmegide dị ike nke na-ama ofufe nke Onye Okike ahụ dị ukwuu, bụ́ Jehova, aka. Ofufe nke chi nne ahụ dị ukwuu ọ̀ kwụsịrị kpam kpam? Ka ọ̀ nọgidewo ruo oge anyị a? Biko gụrụ gaa n’ihu.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ancient Near Eastern Texts, nke James B. Pritchard chịkọtara, Princeton University Press, peji 383-384.
b Chi nwanyị ike ọmụmụ nwa ọzọ e fere n’Asia Minor bụ Artemis nke ndị Efesọs, bụ́ nke a ga-atụle n’isiokwu na-eso nke a.
[Foto dị na peeji nke 3]
ISHTAR nke Babilọn nke e mere ka ọ bụrụ kpakpando
[Ebe e si Nweta Foto]
Courtesy of The British Museum
[Foto dị na peeji nke 4]
ISIS nke Ijipt ebe o ku nwa ọhụrụ bụ Horus n’aka
[Ebe e si Nweta Foto]
Musée du Louvre, Paris