Ndị Inyom “Ndị Na-adọgbu Onwe Ha n’Ọrụ n’Ime Onyenwe Anyị”
“Keleenụ Traifina na Traifosa ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ime Onyenwe anyị.”—NDỊ ROM 16:12.
1. N’ụzọ dị aṅaa ka ije ozi elu ala nke Jisọs si bụrụ ihe ngọzi nye ndị inyom?
IJE ozi elu ala nke Jisọs bụ n’ezie ihe ngọzi nye ndị inyom bụ ndị Juu. Ọrụ ahụ ọ malitere gaje iwetara ndị inyom si n’agbụrụ nile nkasi obi, olileanya, na ùgwù ọhụrụ. O geghị ntị ọ bụla n’omenala nke okpukpe ndị Juu nke ‘mere ka okwu Chineke bụrụ ihe efu.’ (Matiu 15:6) Ọtụtụ n’ime omenala ndị ahụ megidere ihe ndị bụ isi ndị Chineke debere dị ka ihe ruuru ndị inyom.
Àgwà Jisọs n’Ebe Ndị Inyom Nọ
2. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ụzọ Jisọs si mesoo ndị inyom ihe dị iche nke ukwuu n’oge ahụ?
2 Lee nnọọ ọdịiche pụtara ìhè e nwere n’etiti àgwà Jisọs n’ebe ndị inyom nọ na nke ndị ndú okpukpe ndị Juu! N’ihota okwu site n’akwụkwọ Encyclopaedia Judaica, ndị ndú okpukpe ahụ lere ụmụ nwanyị anya dị ka “ndị anyaukwu, ndị na-ege ntị na nzuzo iji nụta okwu, ndị umengwụ, na ndị na-ekwo ekworo.” A na-ele ya anya dị ka ihe na-ezighị ezi iso nwanyị akparịta ụka, “ọ bụkwa ihe ihere onye mmụta iso nwanyị ekwurịta okwu n’okporo ụzọ.” (Jerusalem in the Time of Jesus, nke Joachim Jeremias dere; tụlee Jọn 4:27.) A pụrụ ikwu ihe dị ukwuu karị banyere àgwà mweda n’ala nke ndị ndú okpukpe ndị Juu n’ebe ndị inyom nọ. Ma ihe e dere n’elu ebe a ga-ezu iji gosi ụzọ mmeso Jisọs na-emeso ndị inyom si bụrụ ihe dị iche nke ukwuu n’oge ahụ.
3. Ihe dịgasị aṅaa ndị mere n’oge ije ozi Jisọs na-egosi na ọ dị njikere ịkụziri ndị inyom eziokwu ime mmụọ dị omimi?
3 Jisọs na-enye ihe nlereanya zuru okè nke ụzọ ndị ikom pụrụ isi nwee ezi mmekọrịta nke dịkwa nnọọ ọcha n’etiti ha na ndị inyom. Ọ bụghị nanị na o sooro ha kparịta ụka, kama ọ kụzikwaara ha eziokwu ime mmụọ ndị dị omimi. N’eziokwu, onye mbụ ọ kọwaara eziokwu ahụ bụ na ya bụ Mesaịa ahụ bụ nwanyị, onye bụkwa nwanyị onye Sameria. (Jọn 4:7, 25, 26) Ọzọkwa, okwu ahụ metụtara Mata na Meri gosipụtara nke ọma na n’adịghị ka ndị ndú okpukpe ndị Juu, Jisọs echeghị na nwanyị enweghị iki ịhapụ ite na efere ya ruo nwa oge iji wee mụbawanye ihe ọmụma ime mmụọ ya. N’oge ahụ, Meri ‘họọrọ ezi òkè ahụ,’ na-edebe ihe ime mmụọ n’ọkwá mbụ. (Luk 10:38-42) Ma mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, mgbe nwanne ha nwoke nwụsịrị, ọ bụ Mata, ọ bụghị Meri, bụ onye gosiri ịnụ ọkụ n’obi ka ukwuu izute Onyenwe anyị. Lee ka ọ na-esi akpali anyị ọbụna taa mgbe anyị na-agụ mkparịta ụka ime mmụọ ahụ dị omimi n’etiti Jisọs na Mata banyere olileanya mbilite n’ọnwụ ahụ! (Jọn 11:20-27) Lee nnọọ ihe ùgwù nke ahụ bụụrụ Mata!
Ndị Inyom Ndị Jeere Jisọs Ozi
4, 5. E wezụga ndị ozi ahụ, olee ndị sooro Jisọs n’oge ije ozi ya na Galili, oleekwa ụzọ ha si jeere ya ozi?
4 Jisọs nakwerekwara ije ozi nke ndị inyom mgbe ọ nọ na-eme njem n’ala ahụ. N’ihe ndekọ Oziọma ya, Mak hotara “ndị inyom . . . ndị na-eso ya [Jisọs] mgbe ọ nọ na Galili.” (Mak 15:40, 41) Òle ndị bụ ndị inyom ndị a, oleekwa ụzọ ha si jeere Jisọs ozi? Anyị amaghị aha ha nile, ma Luk kpọtụrụ ole na ole n’ime ha aha, kọwaakwa ụzọ ha si jeere Jisọs ozi.
5 Luk dere, sị: “Mgbe nwa oge gasịrị, na ya onwe ya na-agagharị n’obodo na obodo nta dị iche iche, na-ekwusa na-ezikwa ozi ọma alaeze Chineke, ya na ndị ozi iri na abụọ ahụ, na ndị inyom ụfọdụ ndị e mererịị ka ahụ ha dị ike site n’ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ na ịgwọ nrịarịa, Meri nke a kpọrọ Magdalini, onye mmụọ ọjọọ asaa siworịị n’ime ya pụta, na Joana nwunye Kuza onye Herọd tinyere ihe ya n’aka, na Susana, na ọtụtụ ndị ọzọ, ndị na-ewepụta ihe ha nwere emezi ha.” (Luk 8:1-3) Jisọs dị njikere ikwe ka ndị inyom ndị a soro ya na-aga, jirikwa ihe onwunwe ha na-elekọta mkpa anụ ahụ ya na nke ndị ozi ya.
6. (a) Olee ndị sooro Jisọs n’oge njem ikpeazụ ọ gara na Jerusalem? (b) Olee ndị guzosiri ike n’akụkụ Jisọs kpọmkwem ruo n’ọnwụ ya, oleekwa ụzọ e si nyeghachi ụfọdụ n’ime ha ụgwọ ọrụ? (ch) Site n’ụzọ omenala okpukpe ndị Juu si ele ihe anya, gịnị bụ ihe kwesịrị ịrịba ama banyere ihe ndekọ ahụ dị na Jọn 20:11-18?
6 Mgbe e gburu Jisọs, “ọtụtụ ndị inyom nọkwa n’ebe ahụ ndị nọ n’ebe dị anya na-ekiri, ndị si na Galili soro Jisọs, na-ejere ya ozi: n’etiti ha ka Meri Magdalini, na Meri nne Jemes na Joses, . . . nọ.” (Matiu 27:55, 56) Otú a, ọtụtụ ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi guzosiri ike n’akụkụ Jisọs n’oge ọnwụ ya. Ọ bụkwa ihe kwesịrị ịrịba ama na ọ bụ ndị inyom bu ụzọ mara maka mbilite n’ọnwụ ya. (Matiu 28:1-10) Nke a n’onwe ya bụ oké ihe otiti nye omenala ndị Juu, n’ihi na n’ime okpukpe ndị Juu, a na-ele ndị inyom anya dị ka ndị na-ekwesịghị ekwesị ịgba akaebe n’okwu ikpe. N’iburu nke a n’uche, gụọ Jọn 20:11-18, gbalịakwa iji anya nke uche gị hụ oké mmetụta Meri Magdalini na-aghaghị inweworị mgbe Onyenwe anyị nke biliteworo n’ọnwụ mere ka ọ hụ ya anya, kpọọ ya n’aha ya, jirikwa ya mee ihe dị ka onye akaebe ya ije kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya na ya dị ndụ n’ezie!
Ndị Inyom Bụ Ndị Kraịst Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi Mgbe Pentikọst Gasịrị
7, 8. (a) Olee ụzọ anyị si mara na ndị inyom nọ ya mgbe a wụpụrụ mmụọ nsọ na Pentikọst? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka ndị inyom bụ ndị Kraịst si kere òkè ná mgbasa oge mbụ ahụ nke Iso Ụzọ Kraịst?
7 Mgbe Jisọs lagosịrị n’eluigwe, ndị inyom na-atụ egwu Chineke so ndị ozi ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nọrọ n’ime ụlọ ahụ dị n’elu na Jerusalem. (Ọrụ 1:12-14) Ọ pụtara ìhè na ndị inyom so ná ndị ahụ a wụkwasịrị mmụọ nsọ na Pentikọst. N’ihi gịnị? N’ihi na mgbe Pita kọwara ihe merenụ, o hotara okwu dị na Joel 2:28-30, nke hotara kpọmkwem ‘ụmụ ndị inyom’ na “ndị inyom na-eje ozi,” ma ọ bụ ‘ohu ndị inyom.’ (Ọrụ 2:1, 4, 14-18) Ya mere, ndị inyom bụ ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị e ji mmụọ nsọ mụta, bụ akụkụ nke ọgbakọ ndị Kraịst site ná mmalite ya.
8 Ndị inyom rụrụ ọrụ dị mkpa, ọ bụ ezie na ọ bụghị nke inye nduzi, ná mgbasa nke Iso Ụzọ Kraịst. Meri, bụ́ nne Mak, onye bụkwa nwanne nne Banabas, nyere ụlọ ya nke ihe àmà gosiri na o buru ibu ka ọgbakọ ahụ nke dị na Jerusalem jiri ya na-eme ihe. (Ọrụ 12:12) Ọ dịkwa njikere ime nke a mgbe e nwere ntiwapụ ọhụrụ nke mkpagbu megide ndị Kraịst. (Ọrụ 12:1-5) Ụmụ ndị inyom anọ nke onye ahụ na-ekwusa ozi ọma bụ Filip nwere ihe ùgwù nke ịbụ ndị amụma bụ ndị Kraịst.—Ọrụ 21:9; 1 Ndị Kọrint 12:4, 10.
Àgwà Pọl n’Ebe Ndị Inyom Dị
9. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Pọl nyere banyere ndị inyom bụ ndị Kraịst n’akwụkwọ ozi mbụ o degaara ndị Kọrint, oleekwa ụkpụrụ nke Chineke nke ọ na-agba ndị inyom ume ka ha kwanyere ùgwù?
9 Mgbe ụfọdụ, a na-ebo Pọl ebubo nke ịkpọ ndị inyom asị na atụkwasịghị ha obi. N’eziokwu, ọ bụ Pọl kwusiri okwu ike na ndị inyom kwesịrị ịnọ n’ọnọdụ kwesịịrị ha n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. N’usoro nkịtị nke otú ihe si aga, ha agaghị ezi ihe ná nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 14:33-35) Ọ bụrụ na, n’ihi na ọ dịghị nwoke onye Kraịst nọ ya ma ọ bụ n’ihi na ọ na-ebu amụma site ná mkpali nke mmụọ nsọ, nwanyị bụ onye Kraịst ekwuo okwu ná nzukọ, a chọrọ ya n’aka iyi ihe mkpuchi isi. Ihe mkpuchi nke a bụ “ihe ịrịba ama nke ike,” bụ́ ihe àmà a na-ahụ anya nke na-egosi na nwanyị ahụ nakweere ndokwa Chineke nke ịbụ isi.—1 Ndị Kọrint 11:3-6, 10.
10. Gịnị ka ụfọdụ ndị boworo Pọl ebubo ya, ma gịnị na-egosi na ebubo nke a abụghị eziokwu?
10 Ihe àmà gosiri na Pọl hụrụ ya dị ka ihe dị mkpa ichetara ndị Kraịst oge gboo ahụ ụkpụrụ ọchịchị Chineke ndị a ka ‘ihe nile wee were ọnọdụ n’ụzọ dị mma n’anya’ ná nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 14:40) Ma, nke a ọ̀ pụtara na Pọl na-emegide ndị inyom, dị ka ụfọdụ ndị na-ekwu? Ee e, ọ pụtaghị nke ahụ. Ọ́ bụghị Pọl zijeere ụmụ nwanyị ndị Kraịst itoolu ozi ekele na-ekpo ọkụ n’isiakwụkwọ ikpeazụ nke akwụkwọ ozi ahụ o degaara ndị Rom? Ó gosighị ekele dị omimi maka Fibi, Priska (Priscila) Traifina, na Traifosa, na-akpọ ndị inyom abụọ ndị nke ikpeazụ ahụ “ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ime Onyenwe anyị”? (Ndị Rom 16:1-4, 6, 12, 13, 15) Ọ bụkwa Pọl dere n’okpuru ike mmụọ nsọ, sị: “Ka unu hà, bụ́ ndị e mere baptism ịba n’ime Kraịst, unu yikwasịrị Kraịst. Onye Juu ma ọ bụ onye Grik apụghị ịdị, ohu ma ọ bụ onye nwe onwe ya apụghị ịdị, nwoke na nwanyị apụghị ịdị: n’ihi na unu onwe unu nile bụ otu onye n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Galetia 3:27, 28) Ọ pụtara ìhè na Pọl hụrụ ụmụnna ya ndị Kraịst bụ ndị inyom n’anya, nweekwa mmasị n’ebe ha nọ, gụnyere Lidia, bụ́ onye gosiri omume kwesịrị nṅomi nke ile ndị ọbịa anya nke ọma n’oge ule.—Ọrụ 16:12-15, 40; Ndị Filipaị 4:2, 3.
Ndị Inyom Ndị Na-arụsi Ọrụ Ike Taa
11, 12. (a) È si aṅaa na-emezu Abụ Ọma 68:11 n’ụzọ nkịtị taa? (b) N’ọnọdụ dị aṅaa ka ọtụtụ ụmụnna anyị ndị nwanyị na-achọta onwe ha, n’ihi gịnịkwa ka ịhụnanya na ekpere anyị ji dị ha mkpa?
11 N’ime ọgbakọ ndị Kraịst taa, e nwere ọtụtụ ndị inyom bụ ndị Kraịst ndị “na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ime Onyenwe anyị.” N’eziokwu, ngụkọ ọnụ ọgụgụ na-egosi na “ndị inyom na-ezisa ozi ahụ bụ usuu bara ụba,” na-emejupụta akụkụ ka ukwuu nke ìgwè Ndịàmà, bụ́ ndị Jehova ji na-eme ihe n’oge ikpeazụ nke a. (Abụ Ọma 68:11) Ndị inyom ndị a bụ ndị Kraịst na-arụsi ọrụ ike enwetaworo onwe ha aha ọma ka ha na-agbalịsi ike ịrụzu ọrụ ha dị ka ndị bụ nwunye, ndị bụ nne, ndị na-elekọta ụlọ, ndị na-achọta ihe a ga-eri, dịkwa ka ndị ozi bụ ndị Kraịst.
12 Ole na ole n’ime ezi ụmụnna nwanyị ndị a nwere di ndị na-ekweghị ekwe. Ha aghaghị ịnagide ọnọdụ nke a hour 24 kwa ụbọchị. Ụfọdụ anọwo na-adọgbu onwe ha n’ọrụ ruo ọtụtụ afọ ịbụ ezi ndị nwunye mgbe ha nọkwa na-emezu ihe a chọrọ ha n’aka dị ka ndị ohu Jehova na-eguzosi ike n’ihe. Ọ bụghị ihe dịwooro ha mfe. Ma ha anọgidewo na-enwe ntachi obi, nọgide na-enwe olileanya na ndị di ha ‘ga-abụ ndị e ritere n’uru n’ebe a na-ekwughị okwu’ site n’ezi àgwà ndị Kraịst ha. Leekwa nnọọ ọṅụ ezinụlọ ahụ dum na-ekerịta mgbe di dị otú ahụ zaghachiri! (1 Pita 3:1, 2) Ka ọ dịgodi ugbu a, ọ dị ụmụnna nwanyị ndị a kwesịrị ntụkwasị obi mkpa ịnata ịhụnanya ụmụnna na ekpere nke ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ. Dịkwa ka “mmụọ dị nwayọọ dịkwa udo,” nke ha na-agbalị igosipụta, bụ ihe “dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke,” otú ahụ ka nguzosi ike n’ezi ihe nke ha nọgideworo na ya bụ ihe oké ọnụ ahịa n’anya anyị.—1 Pita 3:3-6.
13. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ụmụnna anyị ndị nwanyị bụ́ ndị ọsụ ụzọ bụ ndị inyom “ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ime Onyenwe anyị,” oleekwa ụzọ e kwesịrị isi lee ha anya n’ọgbakọ ha dị iche iche?
13 O doro nnọọ anya na a pụrụ ikwu banyere ụmụnna nwanyị ndị ahụ na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ dị ka ndị “na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ime Onyenwe anyị.” Ọtụtụ n’ime ha nwere ebe obibi, nwee di, nweekwa ụmụ ndị ha ga-elekọta, tinyere ọrụ nkwusa ha. Ụfọdụ n’ime ha na-arụ ọrụ nwa oge iji lekọta onwe ha n’ụzọ anụ ahụ. Ihe ndị a nile chọrọ ime ezi nhazi, mkpebi siri ike, ịnọgidesi ike, na ịrụsi ọrụ ike. Ndị inyom ndị a bụ ndị Kraịst kwesịrị inweta ịhụnanya na nkwado nke ndị ahụ ọnọdụ ha na-adịghị enye ha ohere itinye hour dị ka ndị ọsụ ụzọ n’ọrụ ịgba àmà ahụ.
14. (a) Ezi ihe nlereanya dị aṅaa nke ịnọgidesi ike n’ihe ka e hotara? (b) Olee ndị inyom ndị ọzọ bụ ndị Kraịst kwesịrị ịja mma, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? Hota ihe nlereanya ọ bụla e nwere n’ógbè unu.
14 Ụfọdụ ndị inyom bụ ndị Kraịst egosipụtawo nguzosi ike pụrụ iche n’ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ. Na Canada, Grace Lounsbury detụrụ ọrụ ọsụ ụzọ ire nke mbụ na 1914. Ọ dịrị mkpa ka ọ hapụ ọrụ ọsụ ụzọ na 1918 n’ihi ọrịa, ma na 1924, ọ laghachiri n’ije ozi oge nile. N’oge a na-ede ihe odide nke a, ọ ka nọ na-eje ozi dị ka onye ọsụ ụzọ, ọ bụ ezie na ọ gbawo 104 afọ! Ọtụtụ ụmụnna nwanyị ndị na-eje ozi ala ọzọ, ndị a zụrụ na klasị ndị mbụ nke Watchtower Bible School of Gilead n’afọ ndị 1940 ka nọ na-eje ozi n’ikwesị ntụkwasị obi, ma ọ bụ n’ubi dị ka ndị ozi ala ọzọ ma ọ bụ dị ka ndị so n’ezinụlọ Betel nke dị na Brooklyn ma ọ bụ n’otu n’ime alaka ụlọ ọrụ dị iche iche nke Watch Tower Society. Ndị inyom nile ndị a bụ ndị Kraịst, nakwa n’ezie, ụmụnna nwanyị nile ndị na-etinye onwe ha n’ọrụ n’ije ozi Betel, na-egosi mmụọ nke iji onwe onye achụ àjà, ha bụkwa ezi ihe nlereanya. Ọ̀ dị mgbe ọ bụla anyị na-eme ka ha mara na anyị nwere ekele maka ha?
Nwunye Ndị Nlekọta Na-ejegharị Ejegharị
15, 16. Olee ìgwè ndị inyom bụ ndị Kraịst kwesịrị ịnata ezi ịja mma anyị karịsịa, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
15 Nwunye ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị mejupụtara ìgwè ọzọ nke ndị inyom bụ ndị Kraịst ndị kwesịrị ịja mma na inye agbamume. Ụmụnna nwanyị ndị a anyị hụrụ n’anya na-adị njikere iso di ha na-ejegharị ka ha na-aga site n’ọgbakọ ruo n’ọgbakọ, ma ọ bụ site na sekit ruo na sekit, ka ha wee na-ewulite ụmụnna ha elu n’ime mmụọ. Ihe ka ọtụtụ n’etiti ha ekwewo ka ntụsara ahụ nile nke inwe ebe obibi gafenahụ ha; ha na-edina n’àkwà dị iche n’izu ọ bụla, ọ naghị abụkwa àkwà dị mma mgbe nile. Ma ha na-enwe obi ụtọ ịnara ihe ọ bụla ụmụnna pụrụ iche ha n’ihu. Ha bụ ezi ihe nlereanya nye ụmụnna ime mmụọ ha ndị bụ nwanyị.
16 Ndị inyom ndị a bụ ndị Kraịst na-enyekwa ndị bụ di ha nkwado bara uru nke ukwuu, dị nnọọ ka ndị inyom ahụ na-asọpụrụ Chineke ndị sogharịrị Jisọs, ‘iji sonyere ya, na-ejekwara ya ozi.’ (Mak 15:41) Ha adịghị enwe ike ịnọ ogologo oge ha na di ha, bụ́ ndị ‘na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè’ mgbe nile. (1 Ndị Kọrint 15:58) Ụfọdụ n’ime ha, dị ka Rosa Szumiga, onye nọ na France, bụ́ onye banyere n’ije ozi oge nile na 1948, anọwo na-akwakọtara di ha ngwongwo, sorokwa ha na-ejegharị ruo 30 ma ọ bụ 40 afọ. Ha dị njikere iji ihe chụọ àjà maka Jehova nakwa maka ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwanyị. Ha kwesịrị ịnata ekele anyị, ịhụnanya anyị, na ekpere anyị.
Nwunye Ndị Okenye
17, 18. (a) Àgwà dị aṅaa ka a chọrọ n’aka ndị nwunye ụmụnna ndị a họpụtara gaa n’ọnọdụ ije ozi dị iche iche? (b) Àjà dịgasị aṅaa ka nwunye ndị okenye na-ekwere ịchụ maka Jehova na ụmụnna ha, oleekwa ụzọ ndị ọzọ bụ nwunye pụrụ isi nyere ndị di ha aka?
17 Mgbe ọ na-edepụta iru eru maka ụmụnna ndị a pụrụ ịhọpụta dị ka ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi, Pọl onyeozi kpọtụkwara ndị inyom aha, na-ede, sị: “Otú ahụ ndị inyom aghaghị ịbụ ndị kwesịrị nsọpụrụ, ndị na-adịghị ebo mmadụ ebubo ụgha, ndị nwere anya udo, ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe nile.” (1 Timoti 3:11) N’eziokwu, ndụmọdụ nke a metụtara ndị inyom nile bụ ndị Kraịst. Ma n’iburu ọnọdụ ihe odide ahụ n’uche, o doro anya na nwunye nke ụmụnna ndị a họpụtara gaa n’ọnọdụ ije ozi dị iche iche kwesịrị ịgbaso ya n’ụzọ bụ ihe nlereanya.
18 Ọ bụ ihe obi ụtọ ịhụ na nke a bụ otú ọ dị n’ihe banyere ọtụtụ puku nwunye nke ndị nlekọta bụ ndị Kraịst. Ha bụ ndị nwere anya udo n’ihe banyere omume na uwe oyiyi ha, ndị kwesịrị nsọpụrụ n’ihe banyere ibi obi ndị Kraịst ha, na-elezi anya banyere ihe ha na-ekwu, ha na-ejikwa obi eziokwu na-agbalịsi ike ịbụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe nile. Ha na-ekwekwa iji ihe ụfọdụ chụọ àjà, na-ekwere ka di ha tinye oge ha gaara ejiworị nọnyere ha n’ihe metụtara ọgbakọ. Ndị inyom ndị Kraịst ndị a kwesịrị ntụkwasị obi kwesịrị inweta ezi ịhụnanya na agbamume anyị. Ma eleghị anya, ọtụtụ ụmụnna nwoke karị ga-enwe ike iru eru maka ihe ùgwù dị iche iche n’ime ọtụtụ ọgbakọ anyị dị iche iche ma a sị na ndị nwunye ha ejiri obi dị umeala kwere iji ihe ndị dị otú ahụ chụọ àjà maka ọdịmma nke mmadụ nile.
“Agadi Ndị Inyom” Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi
19. N’ihi gịnị ka ọtụtụ “agadi ndị inyom” kwesịrị ntụkwasị obi ji bụrụ ndị e nwere mmasị dị ukwuu n’ebe ha nọ n’ọgbakọ ha dị iche iche, gịnịkwa kwesịrị ịbụ mmetụta anyị n’ebe ha nọ?
19 Ụzọ anyị si ele ndị inyom anya nke e hotara n’ime Bible enyeworo anyị aka ịhụ na afọ ndụ adịghị egbochi ndị inyom nwere okwukwe ijere Jehova ozi. E mere ihe atụ nke eziokwu nke a n’okwu banyere Sera, Elizabet, na Ana. Taa, e nwere ọtụtụ ndị inyom bụ ndị Kraịst ndị metụrụla agadi, ndị bụ ezi ihe nlereanya nke okwukwe na inwe ntachi obi. Tụkwasị na nke ahụ, ha pụrụ iji amamihe kwadoo ndị okenye site n’inyere ụmụnna nwanyị ka bụ ụmụ agbọghọ aka. N’ịdabere n’ahụmahụ dị ogologo ha nweworo, ha pụrụ inye ụmụ agbọghọ ndụmọdụ amamihe dị na ya, ọbụna dị ka Akwụkwọ nsọ nyere ha ikike ime. (Taịtọs 2:3-5) Ọ pụrụ ịbụ na n’oge ụfọdụ, ọ dị mkpa inye nwanna nwanyị meworo agadi ndụmọdụ n’onwe ya. Ya bụrụ otú ahụ, onye okenye nke na-eme nke ahụ kwesịrị ‘imeso ya dị ka onye bụ nne.’ Ndị okenye kwesịrị ‘ịsọpụrụ ndị inyom di ha nwụrụ,’ ọ bụrụkwa na ọ dị mkpa, ime ndokwa maka inyere ha aka n’ụzọ anụ ahụ. (1 Timoti 5:1-3, 5, 9, 10) Ụmụnna nwanyị meworo agadi ndị anyị hụrụ n’anya kwesịrị n’ezie inwe mmetụta nke ịbụ ndị e nwere mmasị n’ahụ ha, ndị a chọkwara ka ha nọrọ.
Ndị Ha Na Kraịst Ga-eso Chịa
20. Olee oké ihe ùgwù nke e nyeworo ọtụtụ ndị inyom bụ ndị Kraịst, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka atụrụ ọzọ ahụ pụrụ iji nwee obi ụtọ n’ihi nke a?
20 O doro nnọọ anya site n’Akwụkwọ nsọ na “ile mmadụ anya n’ihu adịghị n’ebe Chineke nọ” n’ihe banyere agbụrụ ma ọ bụ ma mmadụ ọ̀ bụ nwoke ma ọ̀ bụ nwanyị. (Ndị Rom 2:10, 11; Ndị Galetia 3:28) Nke a bụkwa eziokwu n’ụzọ Jehova si ahọpụta ndị ahụ ga-esonyere Ọkpara ya n’ọchịchị Alaeze ahụ. (Jọn 6:44) Lee nnọọ ka oké ìgwè mmadụ ahụ nke atụrụ ọzọ pụrụ isi nwee ekele na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi, dị ka nne Jisọs, bụ́ Meri, Meri Magdalini, Priscila, Traifina, Traifosa, na ọtụtụ ndị ọzọ so n’ọgbakọ ndị Kraịst oge mbụ ahụ, na-ekere òkè ugbu a n’ọchịchị Alaeze, na-akwalitewanye ọchịchị ahụ site ná nghọta dị omimi ha nwere banyere mmetụta na ahụmahụ nke ndị inyom! Lee nnọọ ka nke a si bụrụ iji ịhụnanya na amamihe lepụ anya n’ọdịnihu n’akụkụ nke Jehova!—Ndị Rom 11:33-36.
21. Gịnị bụ mmetụta anyị taa n’ebe ndị inyom “ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ime Onyenwe anyị” nọ?
21 Anyị onwe anyị taa pụrụ inwe otu ụdị mmetụta ahụ Pọl onyeozi nwere mgbe o ji ịhụnanya na mmasị kwuo okwu banyere ‘ndị inyom ahụ ndị ya na ha gbakọsiri mgba ike n’ozi ọma’ ahụ. (Ndị Filipaị 4:3) Ndịàmà Jehova nile, ndị ikom na ndị inyom, na-agụ ya n’ihe ọṅụ na ihe ùgwù iso ‘usuu ahụ bara ụba nke ndị inyom na-ezisa ozi ọma’ na-arụkọ ọrụ, ee, bụ́ ndị inyom “ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ime Onyenwe anyị.”—Abụ Ọma 68:11; Ndị Rom 16:12.
Ajụjụ maka Ntụleghachi
◻ Olee ụzọ Jisọs si gosi na ya enweghị otu ụdị ịkpọasị ahụ ndị ndú okpukpe ndị Juu nwere megide ndị inyom?
◻ Olee ụzọ ndị inyom na-atụ egwu Chineke si jeere Jisọs ozi, oleekwa oké ihe ùgwù ụfọdụ n’ime ha nwetara?
◻ Ndụmọdụ dị aṅaa ka Pọl nyere banyere ndị inyom ná nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ?
◻ Ìgwè dị iche iche dị aṅaa nke ụmụnna nwanyị kwesịrị ịnata ịhụnanya na nkwado anyị pụrụ iche, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
◻ Mmetụta dị aṅaa ka anyị kwesịrị inwe n’ebe ndị ahụ nile nọ taa, ndị bụ ndị inyom “ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ime Onyenwe anyị”?
[Foto dị na peeji nke 16, 17]
Ndị inyom jeere Jisọs na ndị ozi ya ozi
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Nwunye ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị okenye ndị ọzọ, bụ́ ndị ji onwe ha na-achụ àjà, na-atụnye ụtụ bara uru n’ọrụ Chineke