Lee Nnọọ Ihe Ọṅụ Ọ Bụ Ịnọdụ na Table Jehova!
Dị ka Ernst Wauer si kọọ
Taa, ọ dịịrị m nnọọ mfe ije nzukọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova, ịmụ Bible, na ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ. Otú ọ dị, ọ bụghị otú a ka ọ dịworo eri mgbe na Germany ebe a. Mgbe Adolf Hitler bụ onye ọchịchị aka ike, site na 1933 ruo 1945, ikere òkè n’ọrụ ndị Kraịst dị otú a pụtara mmadụ itinye ndụ ya n’ihe ize ndụ.
N’AFỌ ahụ bu ụzọ tupu Hitler abanye n’ike ọchịchị, adị m 30 afọ, nke mbụ m zutekwara Ndịàmà Jehova bụ na Dresden. Na January 1935, araara m onwe m nye Jehova, gosipụtakwa ọchịchọ m ịbụ onye e mere baptism. A machibidoworị ọrụ anyị iwu na 1933, ya mere a jụrụ m, sị: “Ị̀ ghọtara ihe mkpebi gị pụtara? Ị na-etinye ezinụlọ gị, ahụ ike gị, ọrụ gị, nnwere onwe gị, na ọbụna ndụ gị n’ihe ize ndụ!”
“Agụziwo m ihe ọ ga-ewe, adịkwa m njikere ime uche Chineke na ịnwụ maka ya,” ka m zaghachiri.
Ọbụna tupu m mee baptism, amalitewo m rịị ikwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ. N’otu ọnụ ụzọ, ezutere m otu onye ndú ndị ntorobịa nke òtù ndị agha SS (Ndị Efe Ojii/Ọkpọka Ndị Nche Hitler) nke yi uwe ndị òtù ha, o tiri mkpu, sị “Ị́ maghị na a machibidoro nke a iwu? Agaje m ịkpọ ndị uwe ojii!”
“Ngwanụ, kpọọ ha. Ihe m na-eme bụ nanị ikwu okwu banyere Bible, ọ dịghịkwa iwu megidere nke ahụ,” ka m ji nwayọọ zaghachi. Ozugbo ahụ, atụgharịrị m jee n’ọnụ ụzọ nke ọzọ, otu nwoke nke nwere omume enyi kpọbatakwara m n’ụlọ ya n’egbughị oge. Ọ dịghị ihe mere m.
N’oge na-adịghị anya e nyere m ọrụ nke ilekọta ìgwè ọmụmụ ihe nke ihe mejupụtara ya bụ Ndịàmà Jehova ise ruo asaa, bụ́ ndị na-ezukọta kwa izu. Anyị mụrụ mbipụta dị iche iche nke Ụlọ Nche ndị e webataworo na Germany na nzuzo site ná mba ndị agbata obi. Ya mere, n’agbanyeghị mmachibido iwu ahụ, anyị nọgidere na-anọdụ ‘na table Jehova’ iji wee bụrụ ndị e wusiwanyere ike n’ime mmụọ.—1 Ndị Kọrint 10:21.
Ịgabiga Ọnwụnwa Dị Iche Iche
Na 1936, J. F. Rutherford, bụ́ onye isi oche Watch Tower Society, bịara ileta otu mgbakọ e nwere na Lucerne, Switzerland, kpọọkwa ụmụnna ndị nọ n’ọnọdụ nlekọta ọchịchị Chineke na Germany òkù ka ha bịa. Ebe ọ bụ na ndị uwe ojii anakọrọwo ọtụtụ ụmụnna akwụkwọ njem passport ha, na-enyokwa ụfọdụ n’ime ha enyo, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole pụrụ ije. Nwanna nke na-elekọta ọrụ ahụ na Dresden gwara m ka m nọchite anya ya na Lucerne.
“Ma, ọ̀ bụ na abụghị m nwata nke ukwuu, na onye na-enwebeghịkwa ahụmahụ?” ka m jụrụ.
O mesiri m obi ike sị, “Ihe dị mkpa ugbu a bụ ịbụ onye kwesịrị ntụkwasị obi. Nke ahụ bụ isi ihe dị mkpa.”
Nwa mgbe nta mgbe m si Lucerne lọghachite, e jidere m, kewapụkwa m n’ebe nwunye m, bụ́ Eva, na ụmụntakịrị anyị abụọ nọ. Mgbe m nọ n’ụzọ na-eje isi ụlọ ọrụ ndị uwe ojii dị na Dresden, echesiri m echiche ike iji cheta akụkụ akwụkwọ nsọ nke ga-eduzi m. Ilu 3:5, 6 batara n’uche m: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezi.” Icheta akụkụ ihe odide nke a wusiri m ike maka ịgba ajụjụ ọnụ nke mbụ ahụ. Mgbe nke a gasịrị, akpọchiri m n’ime otu ọnụ ụlọ ngá dị mkpagide, ruokwa nwa mgbe nta, enwere m mmetụta amaghị ihe a ga-eme nke onye a gbahapụworo. Ma ikpekusi Jehova ekpere ike mejupụtara m n’udo.
Ụlọ ikpe ahụ mara m ikpe ịga mkpọrọ ruo 27 ọnwa. E debere m ebe nanị m ga-anọ n’ime ụlọ ngá ruo otu afọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ dị na Bautzen. N’otu mgbe, otu onye ọrụ ụlọ ikpe laworo ezumike nká—ọ na-arụchitere onye ọzọ ọrụ—meghere ọnụ ụzọ ụlọ ngá m wee jiri ọmịiko kwuo, sị: “Amaara m na a naghị ekwe ka ị gụọ ihe ọ bụla, ma echere m na ọ ga-amasị gị inweta ihe ị ga-eji wepụ uche gị n’ọnọdụ gị.” O wee nye m na nzuzo, magazin ochie ole na ole na-ekwu ihe banyere ezinụlọ, wee sị: “M ga-ewereghachi ha n’anyasị taa.”
N’ezie, ọ dịghị m mkpa inweta ihe ọ bụla ‘iji wepụ uche m n’ọnọdụ m.’ Mgbe m nọ n’ebe a kpọchibidoro nanị m, echetara m akụkụ ihe odide Bible dị iche iche wee wulite isiokwu dị iche iche, kwupụtakwa ha n’olu dara ụda. Ma asapesịrị m magazin ndị ahụ ile ma è depụtara akụkụ Akwụkwọ nsọ ọ bụla n’ime ha—achọtakwara m ọtụtụ! Otu n’ime ha bụ Ndị Filipaị 1:6, nke na-agụ n’otu akụkụ, sị: ‘Enwere m ntụkwasị obi na onye ahụ nke malitere ịrụ ezi ọrụ n’ime gị ga-arụzu ya.’ Ekelere m Jehova maka agbamume nke a.
Mgbe e mesịrị, ebufere m n’ogige ọrụ ike. Mgbe ahụ, n’oge opupu ihe ubi nke 1939, mgbe mkpọchibido m kwesịrị ijedebe, onye nlekọta ogige ahụ jụrụ m ma m̀ gbanwewo echiche m. “Ebu m n’uche ịnọgidesi ike n’okwukwe m” bụ nzaghachi m. Mgbe ahụ ọ gwara m na a gaje ibufe m n’ogige ịta ahụhụ nke Sachsenhausen.
Mgbe ahụ, enyefere m ha uwe m nile ndị bụ ndị nke m, saa ahụ, a kpụchasịa ajị́ nile dị m n’ahụ, e nyekwa m uwe ụlọ mkpọrọ. A kpọbaghachikwara m n’ụlọ ịsa ahụ ọzọ, eyizukwa m uwe m nile ugbu a—bụ́ usoro ihe omume ndị SS na-akpọ “baptism.” Mgbe nke ahụ gasịrị, a manyere m iguzo n’èzí ebe mmiri dezuru m ahụ dum, ruo anyasị.
N’ogige ndị ahụ, ndị SS na-emeso Ndịàmà Jehova omume obi ilu pụrụ iche. N’ọtụtụ mgbe, anyị na-eguzo na mbara ebe a na-akwụ n’ahịrị ruo ọtụtụ hour. Mgbe ụfọdụ, otu onye n’ime anyị ga-akwa àrị̀rị̀ kwuo, sị: “Ọ́ gaghị adị nnọọ mma iri nri dị mma?” Onye ọzọ ga-azaghachi, sị: “Atụkwasịla uche gị n’ihe ndị dị otú ahụ. Chee nnọọ echiche ụdị ihe ùgwù ọ bụ iguzo ọtọ iji kwadoo aha Jehova na Alaeze ya.” Onye ọzọ ga-ekwukwa, sị: “Jehova ga-ewusi anyị ike!” N’ụzọ dị otú a, anyị gbarịtara ibe anyị ume. Mgbe ụfọdụ nanị ikwe n’isi dị ka onye bụ enyi ezuwo iji sị: “Achọrọ m iguzosi ike n’ihe; gị onwe gị chọkwara ime otú ahụ!”
Nri Ime Mmụọ n’Ime Ogige ahụ
Ndị ụfọdụ butere ụzọ n’ịzụ ụmụnna ahụ n’ime mmụọ, a họpụtakwara m inyere ha aka. Otu nnukwute nsụgharị Bible Luther bụ nanị ihe anyị nwere. Otú ọ dị, a machibidoro inwe ya iwu. Ya mere, anyị zoro akụ nke a ezo, n’ime ìgwè ụlọ ngá nke ọ bụla, ọ bụkwa nanị otu nwanna a họpụtara ahọpụta ka ọ na-eru aka ruo nwa mgbe nta. Mgbe o ruru aka m, ana m arịba n’okpuru àkwà, na-eji tọọchị ma gụọ ihe ruo ihe dị ka minit 15. Ana m ebu akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche n’isi, bụ́ ndị m pụrụ iso ụmụnna ahụ nọ n’ìgwè ụlọ ngá nke anyị tụlerịta ma e mesịa. Otú a, a haziri nkesa nke nri ime mmụọ ruo n’ókè ụfọdụ.
A gbara ụmụnna nile ume ịrịọ Jehova n’ekpere maka inwetakwu nri ime mmụọ, ọ nụkwara arịrịọ anyị. N’oge oyi nke 1939/40, otu nwanna a tụrụ mkpọrọ ọhụrụ jisiri ike webata mbipụta ọhụrụ ụfọdụ nke Ụlọ Nche n’ime ogige ahụ n’ime ụkwụ ya nke e ji osisi mee. Nke a yiri ọrụ ebube, ebe ọ bụ na a na-eji nlezianya nyochaa ihe mmadụ nile ji.
Iji wee nọrọ ná nchebe, e mere ka magazin ndị a rute ụmụnna ndị ahụ a họpụtara ahọpụta aka nanị otu ụbọchị n’otu oge ọ bụla. N’otu mgbe, mgbe a na-ewu otu ụlọ ebe a na-arụzi moto, ezoro m n’ime otu olulu ma na-agụ ihe mgbe otu nwanna nọ n’èzí na-eche nche. N’otu oge ọzọ, atụkwasịrị m Ụlọ Nche ahụ n’apata ụkwụ m n’oge “hour ịdụ ihe” anyị (n’oge mgbede anyị na-anọdụ n’ebe obibi anyị na-adụchi ihe a na-agba n’aka arụ ọrụ na ihe ndị ọzọ), ebe ụmụnna nọ n’akụkụ m abụọ dị ka ndị na-elepụ anya. Mgbe onye nche SS bịara, ana m ezopụ Ụlọ Nche ahụ ngwa ngwa. A sị na e jidere m, nke ahụ gaara anapụwo m rịị ndụ m!
Jehova nyeere anyị aka n’ụzọ dị ebube ibukọ echiche ndị na-ewusi ike ndị dị n’ihe odide ndị ahụ n’isi. Ike ọgwụgwụ nkịtị na-emekarị ka m hie ụra dị omimi n’anyasị. Ma n’anyasị mgbe m gụsịrị Ụlọ Nche ahụ, ana m eteta ọtụtụ mgbe ma chetaghachi ihe ndị ahụ nile nke ọma. Ụmụnna ndị ahụ a họpụtara ahọpụta ndị nọ n’ìgwè ụlọ ngá ndị ọzọ nwekwara ahụmahụ ndị yiri nke ahụ. Otú a, Jehova mere ka ike ncheta ihe anyị dịwanye nkọ́ ka anyị wee nwee ike ikesa nri ime mmụọ ahụ. Anyị mere nke a site n’ijekwuru nwanna nke ọ bụla n’onwe ya ma wusie ya ike.
Ikwesị Ntụkwasị Obi ruo Ọnwụ
Na September 15, 1939, ìgwè ndị ọrụ nke anyị lọghachiri n’ogige ahụ tupu oge anyị na-eji alọghachibu eruo. Gịnị mere n’oge ahụ? A gaje igbu August Dickmann, bụ́ otu n’ime ụmụnna anyị ndị bụ ụmụ okorobịa, n’ihu ọha. Ndị Nazi nwere obi ike na nke a ga-eme ka ọnụ ọgụgụ Ndịàmà ahụ hiri nne kwere ịgọnarị okwukwe ha. Mgbe ogbugbu ahụ gasịrị, a gwara ndị mkpọrọ ndị ọzọ nile ka ha laghachi n’ebe obibi ha. Ma a chụgharịrị anyị bụ Ndịàmà Jehova ihu na azụ na mbara ala ahụ, na-agba anyị ụkwụ, jirikwa osisi na-akụ anyị ruo mgbe anyị na-enwekwaghị ike ịga ije. E nyere anyị iwu ka anyị bịanye aka n’akwụkwọ nke na-egosi na anyị agọnarịwo okwukwe anyị; ma ọ bụghị otú ahụ, a gaje ịgbagbukwa anyị onwe anyị.
Ruokwa echi ya, ọ dịghị onye ọ bụla bịanyere aka n’akwụkwọ ahụ. N’eziokwu, otu onye mkpọrọ ọhụrụ, onye bịanyewororịị aka mgbe ọ bịarutere, kwuru ugbu a na ya abịanyekwaghị aka ọzọ. Ọ họọrọ iso ụmụnna ya nwụọ kama ịhapụ ogige ahụ dị ka onye nrafu. N’ọnwa ndị sochirinụ, e nyere anyị ahụhụ site n’inye anyị ọrụ ndị siri ike, ịnọgide na-emeso anyị mmeso ọjọọ, ịhapụ inye anyị nri. Ihe karịrị otu narị n’ime ụmụnna anyị nwụrụ n’oge oyi ahụ siri oké ike nke 1939/40. Ha nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi ha n’ezi ihe nye Jehova na Alaeze ya ruo nnọọ ọgwụgwụ.
Mgbe ahụ, Jehova mere ka e nwee ihe inyeaka ụfọdụ. A kpọfere ọtụtụ ụmụnna ije rụọ ọrụ n’ogige ndị e guzobere ọhụrụ, bụ́ ebe ha nwetara nri ka ukwuu. Karịa nke ahụ, mmeso ọjọọ ahụ belatatụrụ. N’oge opupu ihe ubi nke 1940, e bufere m n’ogige ịta ahụhụ nke Neuengamme.
Ndokwa Ime Mmụọ na Neuengamme
Mgbe m bịarutere, e nwere otu ìgwè nke ihe dị ka 20 Ndịàmà, n’enweghị Bible ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla ọzọ. Ekpekuru m Jehova ekpere ka o nyere m aka iji ihe ndị m mụtaworo na Sachsenhausen wusie ụmụnna nọ na Neuengamme ike. Dị ka nzọụkwụ mbụ, echetara m akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche ma họpụta ha dị ka ihe mmụta dịịrị ụbọchị. Mgbe ahụ, e mere ndokwa maka nzukọ dị iche iche ndị m pụrụ ịnọ na ha kọwaa echiche ndị sitere n’ihe odide Ụlọ Nche ndị ahụ m gụrụ na Sachsenhausen. Mgbe ụmụnna ndị ọhụrụ bịarutere, ha na-akọ ihe ndị ha mụtara site n’Ụlọ Nche ndị ọhụrụ.
Na 1943, ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova nọ na Neuengamme eruwo 70. A malitere ịhọrọkarị Ndịàmà Jehova ịrụ ọrụ n’èzí nke ogige ahụ, dị ka ịzachasị ihe mgbe agha ụgbọ elu gasịrị. N’ihi nke a, anyị nwere ike isi na nzuzo webata Bible, ọtụtụ Ụlọ Nche na ụfọdụ akwụkwọ ukwu na akwụkwọ nta Society dị iche iche n’ime ogige ahụ. Anyị sikwa n’ụlọ ọrụ nzipụ ozi nata ngwugwu dị iche iche, ndị akwụkwọ ndị ọzọ e ji amụ ihe dị n’ime ha, tinyekwara mmanya na-acha uhie uhie na achịcha na-ekoghị eko anyị ji mee Ememe Ncheta ahụ a na-eme kwa afọ. Ihe àmà gosiri na Jehova mechiri anya ndị na-enyocha ngwugwu ndị ahụ.
Ebe ọ bụ na e kesasịrị anyị gaa n’ebe obibi dị iche iche, anyị guzobere òtù Ọmụmụ Ụlọ Nche asaa, nke ọ bụla nwere onye nduzi na onye na-enyere ya aka. E bipụtaghachiri Ụlọ Nche ahụ na nzuzo n’ọfịs onye nlekọta ogige ahụ, bụ́ ebe m rụrụ ọrụ ruo nwa oge. N’ihi ya, ìgwè nke ọ bụla nwetara, ma ọ dịghị ihe ọzọ, otu mbipụta zuru ezu maka ọmụmụ ihe ha na-enwe kwa izu. Ọ dịghị nzukọ nke ọ bụla a kagburu. Tụkwasị na nke ahụ, n’ụtụtụ ọ bụla na mbara ala ebe ahụ a na-akwụ n’ahịrị, ìgwè ndị ahụ na-enweta ebe e depụtara ihe mmụta dịịrị ụbọchị, gụnyere nkọwa e wetara site n’Ụlọ Nche.
N’otu mgbe, ndị SS ahụ nwere ezumike, ya mere anyị nwere ike inwe otu mgbakọ ọkara otu ụbọchị nakwa ịtụle otú anyị ga-esi na-eme nkwusa n’ime ogige ahụ. Anyị kewasịrị ogige ahụ gaa n’ókèala dị iche iche, gbalịakwa iji usoro a haziri ahazi wejere ndị mkpọrọ ahụ ‘ozi ọma alaeze ahụ.’ (Matiu 24:14) Ebe ọ bụ na ndị mkpọrọ ahụ si ná mba dị iche iche bịa, anyị mepụtara kaadị ịgba àmà ndị e dere n’asụsụ dị iche iche, ndị na-akọwa ọrụ anyị na Alaeze ahụ. Anyị ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi anyị nke na ndị a tụrụ mkpọrọ n’ihi ihe metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị mere mkpesa, sị: “Ebe ọ bụla ị gara, ihe ị na-anụ bụ nanị banyere Jehova!” Ọbụna na akụkọ ozi nke ọrụ anyị ruru alaka ụlọ ọrụ dị na Bern, Switzerland.
Ihe nile gara nke ọma ruo mgbe ndị uwe ojii nzuzo Gestapo nyochara ogige ịta ahụhụ nile na 1944. A chọpụtaghị ebe anyị na-adọba akwụkwọ nke dị na Neuengamme, ma a chọtara ụfọdụ ihe n’aka mụ na Karl Schwarzer. Ruo ụbọchị atọ, a gbara anyị ajụjụ, tiekwa anyị ihe. Mgbe ntaramahụhụ ahụ gwụsịrị, ọnyá jupụtara anyị abụọ n’ahụ. Otú ọ dị, site n’enyemaka Jehova, anyị lanarịrị.
Ngọzi Ime Mmụọ n’Ụba
Usuu ndị agha Britain na ndị òtù ha tọhapụrụ m na May 1945. N’ụbọchị sochiri ntọhapụ m, esooro m òtù ìgwè nta nke ụmụnna na ndị nwere mmasị malite ịzọ ije. Mgbe ike gwụsịworo anyị, anyị nọdụrụ ala n’akụkụ otu olulu mmiri dị n’obodo nta mbụ anyị bịarutere, wee ṅụrụtụ mmiri. Mgbe m nwetara ume ọhụrụ, akpanyere m Bible na mkpaabụ m wee jee site n’ụlọ ruo n’ụlọ. O metụrụ otu nwa agbọghọ n’ahụ nke ukwuu ịmata na anyị bụ Ndịàmà Jehova anọwo n’ogige ịta ahụhụ ndị ahụ n’ihi okwukwe anyị. Ọ gbabara n’ime kichin ya, ma weta mmiri ara ehi dị ọhụrụ na ọtụtụ achịcha maka ìgwè ndị ahụ anyị na ha so.
Mgbe nke a gasịrị, mgbe anyị ka yikwa uwe anyị ji nọọ n’ogige ahụ, anyị kpọsara ozi Alaeze ahụ n’ime obodo nta ahụ dum. Otu onye ọzọ bi n’obodo nta ahụ kpọrọ anyị òkù maka oké oriri. O nyere anyị ihe ndị anyị na-enwetabeghị ruo ọtụtụ afọ. Lee nnọọ oké ihe na-akpali agụụ ọ bụ! Ma n’agbanyeghị nke ahụ, anyị amakwasịghị n’elu nri ahụ na mberede. Anyị kpere ekpere wee jiri àgwà dị nwayọọ rie nri. Nke a kpaliri mmasị ndị na-ekiri ihe na-emenụ nke ukwuu nke na mgbe anyị malitere inwe nzukọ mgbe nke ahụ gasịrị, ha gere ntị n’okwu dabeere na Bible. Otu nwanyị nakweere ozi ahụ, ọ bụkwa nwanna nwanyị ime mmụọ anyị taa.
Anyị zọọrọ ije gaa n’ihu, na-enwetakwa nlekọta Jehova n’ụzọ ndị dị ịtụnanya. Lee nnọọ mmetụta magburu onwe ya ọ bụworo ịnọgide na-enweta ọṅụ, ugbu a ná nnwere onwe, ná nri ime mmụọ nile nzukọ Jehova na-ebipụta, nakwa iso ndị ọzọ kerịta ya! N’afọ ndị sochiworonụ, e nyeghachiwo ntụkwasị obi zuru ezu anyị nwere n’ebe Jehova nọ ụgwọ ọrụ ọtụtụ ugbo.
Site na 1945 ruo 1950, enwere m ihe ùgwù nke ije ozi na Betel ahụ dị na Magdeburg, e mesịakwa, ruo 1955, n’ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Berlin. Mgbe nke ahụ gasịrị, ejere m ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị ruo 1963, mgbe nwunye m, bụ́ Hilde gwara m na ya adịrịwo ime. (Eva, bụ́ nwunye m mbụ, anwụwo n’oge m nọ n’ụlọ mkpọrọ, alụkwara m nwanyị ọzọ na 1958.) Nwa anyị nwanyị mesịrị ghọọ Onyeàmà na-anụ ọkụ n’obi.
Gịnị banyere ụmụ ndị m mụtara n’alụmdi na nwunye nke mbụ? Ọ bụ ihe mwute na nwa m nwoke egosighị mmasị ọ bụla n’eziokwu ahụ. Ma nwa m nwanyị, bụ́ Gisela, mere otú ahụ, o jekwara ụlọ akwụkwọ ndị ozi ala ọzọ nke Gilead na 1953. Ugbu a, ya na di ya na-eje ozi n’otu n’ime Ụlọ Mgbakọ ndị e nwere na Germany. Site n’enyemaka Jehova, enwewo m ike ịnọgide n’ọrụ ọsụ ụzọ oge nile kemgbe 1963, na-ejekwa ozi ebe e nwere mkpa enyemaka, nke mbụ na Frankfurt, e mesịakwa na Tübingen.
Ruo taa, anọgidewo m na-enweta ọṅụ ná ndokwa nile nzukọ Jehova na-emere ezinụlọ nke okwukwe ya. (1 Timoti 3:15) N’oge ugbu a, ọ dị nnọọ mfe inweta nri ime mmụọ, ma ànyị na-amata uru ya mgbe nile? Enwere m obi ike na Jehova nwere ngọzi bara ụba nke na-echere ndị ahụ na-atụkwasị ya obi, ndị na-anọgide n’iguzosi ike n’ihe, ndị na-erikwa nri na table ya.
[Diagram on peeji 26, 27]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
OGIGE ỊTA AHỤHỤ SACHSENHAUSEN
A. Ebe obibi ndị SS
B. Mbara èzí ebe a na-akpọpụta aha
CH. Ụlọ ngá
D. Ebe a na-akpọchibido otu onye
E. Ebe a na-egbu ígwú
F. Ebe a na-egbu mmadụ
G. Ụlọ ebe e ji gas egbu mmadụ