Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 9/15 p. 3
  • Chineke Ọ̀ Na-aza Ekpere Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Ọ̀ Na-aza Ekpere Gị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka Ụfọdụ Ndị Na-ekpe Ekpere Maka Ya?
  • Okwu mmalite
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2021
  • Ekpere Òle Ndị Ka A Na-aza?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Bịaruo Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ikpe Ekpere Ọ̀ Na-arụpụta Ezi Ihe Ọ Bụla?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 9/15 p. 3

Chineke Ọ̀ Na-aza Ekpere Gị?

“ỌDỊBEGHỊ mgbe ọ bụla m nwere mmetụta nke ịbụ onye a zara ekpere ya,” ka otu nwanyị bi na Hokkaido, Japan, kwuru. Ọ bụghị nanị ya nwere echiche dị otú ahụ n’ihe banyere nke a. Ọtụtụ ndị na-eche na ọ dịghị mgbe ọ bụla a na-aza ekpere ha. N’eziokwu, ị pụrụ ịnọ na-eche ma Chineke ọ̀ na-aza ekpere gị.

Ọtụtụ nde mmadụ na-ekpegara ọtụtụ chi dị iche iche a na-apụghị ịgụta ọnụ ekpere. N’ihi gịnị ka o ji yie ka a naghị aza ọtụtụ ekpere? Iji chọpụta ihe kpatara nke a, ka anyị buru ụzọ nyochaa ụdị ekpere ndị a na-ekpe.

Gịnị Ka Ụfọdụ Ndị Na-ekpe Ekpere Maka Ya?

N’oge Afọ Ọhụrụ, ụzọ abụọ n’ụzọ atọ nke ndị bi na Japan, ma ọ bụ ihe dị ka 80 nde mmadụ, na-ekpe ekpere n’ụlọ chi Shinto ma ọ bụ n’ụlọ nsọ ndị okpukpe Buddha dị iche iche. Ha na-eji mkpụrụ ego enye onyinye, na-ekpekwa ekpere maka ihe ndabara ọma na ịnọ ná nchebe nke ezinụlọ.

N’ọnwa January na February—nwa mgbe nta tupu ule ahụ tara akpụ e ji abanye na kọleji—ụmụ akwụkwọ na-ejupụta n’ụlọ chi dị iche iche dị ka nke ahụ dị na Tokyo nke a maara maka chi mmụta akwụkwọ dị na ya. Ha na-edepụta ihe bụ ọchịchọ ha n’ibe osisi ndị e ji ekpe ekpere wee kokwasị ha n’okporo osisi ndị dị gburugburu mbara ezi ụlọ chi ahụ. Ya dịkarịa ala, e jiri 100,000 ibe osisi ndị a chọọ gburugburu mbara ezi nke otu ụlọ chi a ma ama na Tokyo mma n’oge nlele akwụkwọ nke 1990.

Ọtụtụ ekpere metụtara ahụ ike. N’otu ụlọ chi dị na Kawasaki, Japan, ndị mmadụ na-ekpe ekpere maka nchebe megide ọrịa AIDS. “Ihe dị mkpa n’ekpere ahụ a na-ekpe megide ọrịa AIDS,” ka onye na-elekọta ụlọ chi ahụ kwuru, “bụ na ọ ga-eme ka ndị mmadụ na-elezi anya banyere àgwà ha.” Ma nke ahụ ọ̀ gwụla ihe ekpere metụtara?

N’otu ụlọ nsọ ọzọ, otu nwanyị meworo agadi kpere ekpere maka “ọnwụ mberede.” N’ihi gịnị? N’ihi na ọ chọrọ izere ịta ahụhụ ịrịa ọrịa ruo ogologo oge, ọ chọghịkwa ka ya ghọọrọ ndị ezinụlọ ya ibu arọ.

N’otu mba a sị na ọ bụ nke ndị Kristian, otu onye isi òtù egwuregwu bọọlụ kpere ekpere ka ndị òtù ya nwee mmeri, ka e chebekwa ha pụọ ná mmerụahụ. Ndị Katọlik bi na Poland kpere ekpere maka ọdịmma nke onwe ha, jirikwa ọla dị iche iche chọọ Madonna ha mma mgbe ha chere na a nụwo ekpere ha. Ọtụtụ ndị na-eje na chọọchị dị iche iche dị ka Guadalupe ahụ a ma ama nke dị na Mexico City, na Lourdes, nke dị na France, na-arịọ maka ọgwụgwọ ọrụ ebube.

Ma n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa ma n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, ndị mmadụ na-ekpe ekpere maka ọtụtụ ihe dị iche iche dịịrị onwe ha. N’eziokwu, ha chọrọ ka a nụ ekpere ha, zaakwa ha. Otú ọ dị, ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya iche na a ga-azacha ekpere nile? Gịnị banyere ekpere ndị nke gị? À na-aza ha? N’eziokwu, Chineke ọ̀ na-aza ekpere ma ọlị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya