N’ihi Gịnị Ka Chineke Jiworo Nwee Ndidi Otú A?
LEE anya n’ihu dị mwute nke nwatakịrị agụụ na-agụgbu. Lee otú o si tasịsịa ahụ na afọ ya nke zara aza. Chee echiche banyere oké mkpa o nwere maka ihe oriri, leekwa anya n’efere ihe na-adịghị na ya nke o bu. Eleghị anya nne ya ji anya nke dabaworo ya n’ime isi na-ekiri ihe na-emenụ, ihu ya bụkwa ihe ngosipụta dị mwute nke enweghị olileanya. Mgbe ahụ, gbalịa ịkpachi mwute nke gị—ee, mee mgbalị ka anya mmiri ghara ịgba gị.
E nwere ọtụtụ nde ọnọdụ dị otú a n’ime ógbè ebe ahụ ụkọ nri dakwasịworo, bụ́ ebe dị nde kilomita 6 n’ogologo na uhie, nke a maara dị ka Sahel. Ọ gbatịrị ruo ihe karịrị 4,800 kilomita gabiga etiti Africa nke dị n’ebe ndịda Ọzara Sahara, site na Senegal n’Ụsọ Osimiri Atlantic ruo Etiopia n’akụkụ Osimiri Uhie ahụ. N’eziokwu, ụkọ nri na-eyikwa ọtụtụ ìgwè mmadụ ná mba ndị ọzọ egwu. Òtù World Health Organization kọrọ na ihe dị ka 1.1 puku nde mmadụ gburugburu ụwa nọ n’ajọ ọrịa ma ọ bụ bụrụ ndị na-adịghị eri ihe na-edozi ahụ.
N’ezie, agụụ bụ nanị otu akụkụ nke ahụhụ mmadụ na-ata. Mmadụ na-emetọ elu ala, ọ na-emetụtakwa anyị nile. Usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche na-anakwere ikpe na-ezighị ezi na obubuagha nke na-eweta ihe isi ike na ọnwụ nye ọtụtụ ndị. N’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka ihe ndị dị otú ahụ nọgide na-eme? Ọ̀ na-echegbu onwe ya banyere anyị?
Chineke Na-echegbu Onwe Ya!
N’ezie, Onye Okike anyị na-echegbu onwe ya banyere anyị. E nwere ihe e ji n’aka na-egosipụta nke a nakwa ikike o nwere ime ka ihe nile rụkọọ ọrụ maka ọdịmma anyị, ka e nweekwa nkwekọrịta n’ihe nile o kere eke. Dị ka ihe atụ, lee anya n’ihe osise dị n’ebe a nke na-egosi ebe aṅụ na-efekwasị n’okooko osisi nke osisi na-amị mkpụrụ. Aṅụ ahụ na-adabere n’okooko osisi ahụ iji mịta mmiri ụtọ okooko osisi nke dị ya mkpa iji dozie ahụ ya. N’aka nke ọzọ, osisi ahụ na-adabere ná ntụ okooko osisi nke aṅụ ahụ butere site n’osisi ọzọ yiri nke ahụ. N’ụzọ dị otú a, a na-efesa okooko osisi ahụ ntụ ahụ nke ga-eme ka o nwee ike ịmịpụta mkpụrụ. Ọ bụghị osisi nile na-amị mkpụrụ ka a na-efesa ntụ n’ụzọ dị otú a, ma ọ bụ ihe e ji n’aka na Chineke emewo ndokwa ka e nwee nrụkọ ọrụ dị ịtụnanya n’ọnọdụ nke a. Ịdị mma ya na-arụpụtakwa mkpụrụ nke anyị ga-enwe ike iji obi ụtọ rie nakwa nke ga-abara anyị uru.
Aṅụ ahụ n’onwe ya bụ otu n’ime ìgwè aṅụ a haziri ahazi nke ihe karịrị aṅụ dị 30,000. Ụfọdụ n’ime ha na-eche ebe obibi ha nche, ebe ndị ọzọ na-edebe ya ọcha ma ọ bụ na-eme ka e nwee oghere ebe ikuku ga-esi na-abata na ya. Ndị ọzọkwa na-akwakọba mmiri ụtọ okooko osisi na ntụ okooko osisi, na-azụ ndị ọhụrụ ka na-etolite etolite, ma ọ bụ na-achọta ebe ndị ọzọ a ga-esi na-amịta mmiri ụtọ okooko osisi. Chineke n’onwe ya ahaziwo ihe ka anyị wee na-erite uru mgbe aṅụ ndị ahụ na-arụsi ọrụ ike na-emepụta mmanụ aṅụ dị ụtọ, na-edozikwa ahụ nke na-abụrụ ọnụ anyị ihe ụtọ.
Ọrụ ebube nke nrụkọ ọrụ dị n’etiti aṅụ na ihe ọkụkụ nakwa n’etiti ahụhụ ndị ahụ n’onwe ha bụ nanị otu n’ime ọtụtụ ihe àmà ndị na-egosi na Onye Okike ahụ nwere nnọọ ike ime ka ihe ndị dị ndụ rụkọọ ọrụ n’otu. E kwuwerị, “Chineke abụghị Chineke nke aghara, kama ọ bụ Chineke nke udo.” (1 Ndị Kọrint 14:33) Ya mere, n’ihi gịnị ka o jiworo kwe ka ihe a kpọrọ mmadụ nọgide n’enweghị nkwekọrịta dị otú a, bụ́ nke na-arụpụta ịta ahụhụ nye ọtụtụ ndị? Ọ bụrụ na Chineke na-echegbu onwe ya banyere anyị, n’ihi gịnị ka o jiworo chere ruo ogologo oge otú a iji dozie ọnọdụ nke a? N’eziokwu, n’ihi gịnị ka Chineke jiworo nwee ndidi otú a?
Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-aza ajụjụ ndị dị otú ahụ. Akwụkwọ nke a pụrụ iche na-agwa anyị na Jehova Chineke nwere ezi ihe mere o jiworo nwee ndidi. Gịnị bụ ihe ahụ? Ọ̀ bụkwa ogologo oge hà aṅaa ka Chineke ga-enweru ndidi?
[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 2]
Foto dị n’ihu akwụkwọ: Frilet/Sipa