Mee Ógwè Aka Jehova nke Na-adịru Ebighị Ebi Ihe Nkwado Gị
“Ebe obibi gị ka Chineke nke dị site na mgbe ochie bụ, n’okpuru ka ógwè aka mgbe ebighị ebi dịkwa.”—DEUTERỌNỌMI 33:27, American Standard Version.
1, 2. N’ihi gịnị ka ndị Jehova pụrụ iji nwee obi ike ná nkwado ya?
JEHOVA na-elekọta ndị ya anya. Dị ka ihe atụ, n’oge nile nke mkpagbu ndị Israel, “ya ka a na-akpagbu”! N’ịhụnanya na n’ọmịiko, ọ “wee palie ha, kuru ha.” (Aịsaịa 63:7-9) Ya mere ọ bụrụ na anyị ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke, obi pụrụ isi anyị ike na anyị ga-enwe nkwado ya.
2 Onye amụma bụ Mosis sịrị: “Ebe nzobe ka Chineke nke dị site n’oge ochie bụ, n’okpuru ka ógwè aka ya ndị na-adịru mgbe ebighị ebi dịkwa.” (Deuterọnọmi 33:27, NW] Nsụgharị ọzọ sịrị: “Ebe obibi gị ka Chineke nke dị site na mgbe ochie bụ, n’okpuru ka ógwè aka mgbe ebighị ebi dịkwa.” (American Standard Version) Ma olee otú ógwè aka Chineke si enye ndị na-ejere ya ozi nkwado?
N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee Ọtụtụ Ihe Isi Ike Otú a?
3. Olee mgbe ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ga-enwe n’ụzọ zuru ezu ‘inwe onwe nke ebube nke ụmụ Chineke’?
3 Ijere Jehova ozi adịghị ekpuchi anyị pụọ n’ihe isi ike ndị na-adabara ụmụ mmadụ na-ezughị okè n’ozuzu ha. Job onye na-ejere Chineke ozi sịrị: “Mmadụ nke nwanyị mụrụ, ụbọchị ndụ ya dị mkpụmkpụ, afọ ejuwokwa ya n’ahụhụ.” (Job 14:1) Banyere “ụbọchị afọ nile anyị,” onye ọbụ abụ ahụ sịrị: “Nganga ha bụ nanị ịdọgbu onwe ha n’ọrụ na ajọ ihe.” (Abụ Ọma 90:10) Ndụ ga-adị otú ahụ ruo mgbe ‘e mere ka ihe e kere eke onwe ya pụọkwa n’ịbụ ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke.’ (Ndị Rom 8:19-22) Nke ahụ ga-eme n’oge Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst. N’ihe ndabere nke àjà mgbapụta Jisọs, ụmụ mmadụ ndị nọ n’okpuru Alaeze ahụ ga-enwe mgbapụta mgbe ahụ pụọ ná mmehie na ọnwụ. Ná ngwụsị nke Narị Afọ Iri ahụ, Kraịst na ndị eze ibe ya bụkwa ndị nchụàjà ga-enyewororị ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi aka iru izu okè, ndị na-eguzosikwa ike n’ihe n’ebe Chineke nọ n’oge ule ikpeazụ ahụ ga-esite n’aka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ga-abụ ndị e debara aha ha n’ụzọ na-adịgide adịgide n’ime “akwụkwọ nke ndụ.” (Mkpughe 20:12-15) Mgbe ahụ ha ga-enwe n’ụzọ zuru ezu nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.
4. Kama ịdị na-eme mkpesa banyere ọnọdụ anyị ná ndụ, gịnị ka anyị kwesịrị ịdị na-eme?
4 Ka ọ dị ugbu a, kama ịdị na-eme mkpesa banyere ọnọdụ anyị ná ndụ, ka anyị tụkwasị Jehova obi. (1 Samuel 12:22; Jud 16) Ka anyị gosikwa ekele maka Onye Isi Nchụàjà anyị, bụ́ Jisọs, bụ́ onye anyị pụrụ isite na ya gakwuru Chineke “ka e wee meere anyị ebere, ka anyị wee hụkwa amara inyere anyị aka n’oge mkpa.” (Ndị Hibru 4:14-16) Anyị ekwesịghị ịdị ka Adam mgbe ọ bụla. N’ikwu ya kpọmkwem, o boro Jehova ebubo na-ezighị ezi nke na o nyere ya ajọ nwunye, na-asị: “Nwanyị ahụ nke i nyere m ka mụ na ya biri, ya onwe ya nyere m mkpụrụ sitere n’osisi ahụ, m wee rie.” (Jenesis 3:12) Chineke na-enye ihe ndị dị mma, ọ dịghịkwa ewetara anyị ihe isi ike. (Matiu 5:45; Jemes 1:17) Ọtụtụ mgbe ihe nhụjuanya dị iche iche na-esite n’enweghị amamihe nke onwe anyị ma ọ bụ ná ngahie nke onye ọzọ. Ọ pụkwara ịbịakwasị anyị n’ihi na anyị bụ ndị mmehie, anyị bikwa n’ụwa nke na-atọgbọ n’ike Setan. (Ilu 19:3; 1 Jọn 5:19) Ma, ógwè aka ebighị ebi Jehova na-akwado ndị na-ejere ya ozi na-eguzosi ike n’ihe mgbe nile, bụ́ ndị na-adabere n’ebe ọ nọ site n’ekpere ma na-etinye ndụmọdụ nke Okwu ya n’ọrụ n’onwe ha.—Abụ Ọma 37:5; 119:105.
Nkwado n’Oge Ọrịa
5. Agbamume dị aṅaa ka ndị ahụ na-esighị ike pụrụ ịchọta n’Abụ Ọma 41:1-3?
5 Ọrịa na-akpatara ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị mkpagbu site n’oge ruo n’oge. Ma, Devid sịrị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ, bụ́ onye nwere uche n’imeso onye na-enweghị ike: n’ụbọchị ihe ọjọọ Jehova ga-eme ka o wepụga onwe ya. Jehova ga-edebe ya, mee ka ọ dị ndụ, a ga-eme ka ihe gaara ya nke ọma n’ụwa; enyekwala ya n’aka ọchịchọ mkpụrụ obi nke ndị iro ya. Jehova ga-akwagide ya n’elu ihe o ji dinaa mgbe ahụ na-adịghị ya ike: ihe ndina ya nile ka ị gbanweworo n’ọrịa ya.”—Abụ Ọma 41:1-3.
6, 7. Olee otú Chineke si nyere Devid aka mgbe ọ nọ n’àkwà ọrịa, oleekwa otú nke a pụrụ isi gbaa ndị na-ejere Jehova ozi n’oge a ume?
6 Onye na-echebara ndị ọzọ echiche na-enyere ndị nọ ná mkpa aka. ‘Ụbọchị ihe ọjọọ’ pụrụ ịbụ oge ọ bụla nke ọdachi ma ọ bụ ogologo oge nke ihe isi ike nke na-eme ka ike gwụ mmadụ. Ọ na-atụkwasị Chineke obi ichebe ya n’oge adịghị ike, ndị ọzọ ‘na-asịkwa na ọ bụ onye obi ụtọ n’ụwa’ site n’ịkpọsa akụkọ nke mmeso obi ebere Jehova mesoro ya. Chineke kwagidere Devid “n’elu ihe o ji dinaa mgbe ahụ na-adịghị ya ike,” ma eleghị anya n’oge nrụgide mgbe nwa Devid bụ Absalọm chọrọ ịpụnara ocheeze Israel.—2 Samuel 15:1-6.
7 Ebe Devid gosiworo nchegbu maka ndị e wedara n’ala, o nwere mmetụta nke na Chineke ga-akwagide ya mgbe ọ na-apụghị inyere onwe ya aka n’elu àkwà ọrịa. (Abụ Ọma 18:24-26) Ọ bụ ezie na ọ nọ n’oké ọrịa, obi siri ya ike na Chineke ‘ga-agbanwe àkwà ya’ ọ bụghị site n’iji ọrụ ebube wepụ nrịanrịa ahụ, kama site n’inye ya ume site n’iji echiche ndị na-akasi obi. Ọ ga-adị ka à ga-asị na Jehova na-agbanwe àkwà ya site na nke ọrịa gaa na nke ahụ ịdị mma. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị na-arịa ọrịa dị ka ndị na-ejere Chineke ozi, ógwè aka ebighị ebi nke Jehova ga-akwado anyị.
Nkasi Obi Maka Ndị Nọ ná Nkụda Mmụọ
8. Olee otú otu onye Kraịst ahụ na-esighị ike siworo gosipụta ndabere ọ dabeere na Chineke?
8 Ọrịa pụrụ ịkpata nkụda mmụọ nke uche. Otu onye Kraịst nke nọ n’oké ọrịa, bụ́ adịghị enwe ume zuru ezu mgbe ụfọdụ ọbụna ịgụ ihe, kọrọ, sị: “Nke a na-eme ka m nwee ọtụtụ mmetụta nke nkụda mmụọ, mmetụta nke abaghị uru, ọbụna na-agba m anya mmiri.” Ebe ọ matara na Setan na-achọ iji nkụda aka gwepịa ya, ọ na-alụghachi ọgụ, na-amata na site n’enyemaka Jehova, ọ pụghị ịda ada. (Jemes 4:7) Nwoke nke a bụ ihe agbamume nye ndị ọzọ bụ́ ndị maara na ọ na-atụkwasị Chineke obi. (Abụ Ọma 29:11) Ọbụna mgbe o dina n’ụlọ ọgwụ, ọ na-akpọ ndị ọrịa na ndị ọzọ na telifonu iji wulie ha elu n’ụzọ ime mmụọ. A na-ewuli ya onwe ya elu site n’ige ntị na kaseti ndị na-agụ abụ olu ụtọ nke Alaeze na isiokwu dị iche iche dị n’akwụkwọ nke a na magazin ya na ya na-agakọ bụ Teta!, na site n’isonyere ndị Kraịst ibe ya. Nwanna nwoke nke a sịrị: “Ana m agwa Chineke okwu mgbe mgbe n’ekpere, na-arịọ ya ka o nye m ume, nduzi, nkasi obi, na enyemaka iji tachie obi.” Ọ bụrụ na ị bụ onye Kraịst nke na-enwe nsogbu ndị siri ike nke ahụ ike, tụkwasị Jehova obi mgbe nile, meekwa ógwè aka ya na-adịru ebighị ebi ihe nkwado gị.
9. Ihe atụ dịgasị aṅaa na-egosi na nkụda mmụọ nke uche na-enye ndị na-atụ egwu Chineke nsogbu mgbe ụfọdụ?
9 Nkụda mmụọ bụ nsogbu meworo ochie. Mgbe ọ nọ n’ule, Job kwuru okwu dị ka nwoke na-eche na Chineke agbahapụwo ya aka. (Job 29:2-5) Nchegbu banyere ọnọdụ mbibi nke Jerusalem na mgbidi ya nile mere ka Nehemaịa nwee mgbaru ihu, Pita nwekwara nkụda mmụọ n’ihi ịgọnarị Kraịst nke na o bere ákwá nke ukwuu. (Nehemaịa 2:1-8; Luk 22:62) Epafrọdaịtọs nwere nkụda mmụọ n’ihi na ndị Kraịst nọ na Filipaị nụrụ na ọ dawo n’ọrịa. (Ndị Filipaị 2:25, 26) Nkụda mmụọ metụtara ụfọdụ ndị Kraịst na Tesalọnaịka, n’ihi na Pọl gbara ụmụnna nọ n’ebe ahụ ume ka ha ‘na-agụgụ ndị dara mbà n’obi.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Ya mere, olee otú Chineke si enyere ndị dị otú ahụ aka?
10. Gịnị pụrụ inye aka n’ịgbalị ịnagide nsogbu ọrịa uche?
10 A ghaghị ime mkpebi onwe onye banyere usoro ịgwọ ọrịa maka nkụda mmmụọ.a (Ndị Galetia 6:5) Ozuzu ike zuru ezu na ihe omume ndị a haziri nke ọma pụrụ inye aka. Kama ịdị na-ele ọtụtụ nsogbu dị iche iche anya dị ka otu ọnọdụ ọjọọ bụ isi, ọ pụrụ ịbụ ihe enyemaka nye onye nwere nkụda mmụọ ịrụ ọrụ n’idozi ha n’otu n’otu. Enyemaka nkasi obi site n’aka ndị okenye ọgbakọ pụrụ ịba oké uru, karịsịa ma ọ bụrụ na nsogbu nke a nke uche na-akpata nchekasị ime mmụọ. (Jemes 5:13-15) Karịsịa ihe nile, ọ dị oké mkpa ịdabere na Jehova, ‘na-atụkwasị ya nchegbu anyị nile na-echegbu onwe anyị, n’ihi na ihe nile banyere anyị na-emetụ ya n’obi.’ Ịnọgide na-ekpe ekpere site n’ala ala obi pụrụ iwetara mmadụ ‘udo nke Chineke, nke ga-echekwa obi ya na echiche uche ya nche n’ime Kraịst Jisọs.’—1 Pita 5:6-11; Ndị Filipaị 4:6, 7.
Jehova Na-enyere Anyị Aka Ịnagide Mwute
11-13. Gịnị pụrụ inye aka ibelata iru újú n’ihi ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya?
11 Ahụmahụ ọzọ nke na-akpata mwute bụ ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya. Abraham kwara ákwá n’ihi ọnwụ nwunye ya, bụ́ Sera. (Jenesis 23:2) Mgbe nwa ya nwoke bụ Absalọm nwụrụ, Devid nwere oké mwute. (2 Samuel 18:33) “Anya mmiri pụrụ” ọbụna nwoke nke zuru okè bụ́ Jisọs n’anya n’ihi ọnwụ nke enyi ya bụ Lazarọs. (Jọn 11:35) Ya mere, a na-enwe obi ilu mgbe onye a hụrụ n’anya nwụrụ. Ma gịnị pụrụ inye aka ibelata obi ilu dị otú ahụ?
12 Chineke na-enyere ndị ya aka ịnagide oké mwute nke ọnwụ mmadụ. Okwu ya na-ekwu na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ. Ya mere, anyị adịghị ‘enwe mwute, ọbụna dị ka ọ na-ewute ndị fọdụrụnụ, bụ́ ndị na-enweghị olileanya.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 4:13; Ọrụ 24:15) Mmụọ Jehova na-enyere anyị aka inwe udo na okwukwe na ịtụgharị uche n’ọdịnihu dị ebube nke e kwere nkwa ya n’Okwu ya, ka anyị ghara ịbụ ndị echiche obi ilu banyere onye a hụrụ n’anya nwụrụ anwụ rikpuru kpam kpam. Nkasi obi na-abịakwa site n’ịgụ Akwụkwọ nsọ na ikpe ekpere nye “Chineke nke nkasi obi nile.”—2 Ndị Kọrint 1:3, 4; Abụ Ọma 68:4-6.
13 Anyị pụrụ inweta nkasi obi site n’olileanya mbilite n’ọnwụ dị ka Job onye na-asọpụrụ Chineke mere, bụ́ onye tiri mkpu, sị: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na i [Jehova] zobe m n’ala mmụọ [“sheol,” NW], ma a sị na i debe m ná nzuzo, ruo mgbe iwe gị laghachiri, ma a sị na ị kpaara m ókè, wee cheta m! Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ? Ụbọchị nile nke obubuagha m ka m ga-eche, ruo mgbe mgbanwe m ga-abịa. Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa gị: agụụ ọrụ aka gị ga-agụ gị.” (Job 14:13-15) A naghị enwekarị oké obi ilu mgbe ezi enyi gara njem, n’ihi na anyị na-ele anya ịhụ ya ọzọ. A pụrụ ime ka oké mwute belata ma ọ bụrụ na anyị elee ọnwụ nke onye Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi anya n’otu ụzọ ahụ. Ọ bụrụ na o nwere olileanya elu ala, a ga-akpọte ya site n’ụra ọnwụ bịa n’ebe a n’elu ala n’okpuru Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst. (Jọn 5:28, 29; Mkpughe 20:11-13) Ọ bụrụkwa na anyị nwere olileanya ibi n’elu ụwa ruo mgbe ebighị ebi, anyị pụrụ ịnọ n’ebe a ịnabata ndị anyị hụrụ n’anya a kpọlitere.
14. Olee otú ndị Kraịst abụọ bụ́ ndị di ha nwụrụ si nagide ọnwụ di ha?
14 Mgbe di ya nwụsịrị, otu nwanna nwanyị matara na ya aghaghị ịnọgide n’ihe omume ya dị iche iche n’ije ozi Chineke. E wezụga ịnọgide ‘na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè,’ ọ kpara ákwà ndị e ji ekpuchi àkwà ndina, bụ́ nke nwere 800 ibe ákwà dị iche iche. (1 Ndị Kọrint 15:58) “Nke a bụ ọrụ dị mma,” ka ọ na-ekwu, “n’ihi na oge nile m na-arụ ọrụ m pụrụ ịdị na-egere abụ olu ụtọ Alaeze na tepu dị iche iche nke Bible, bụ́ nke na-emejupụta uche m.” Ọ na-eji obi ụtọ echeta nleta nke otu onye okenye nweworo ahụmahụ na nwunye ya letara ya. Site na Bible, onye okenye ahụ kọwapụtara na Chineke na-elekọta ndị inyom di ha nwụrụ n’ezie. (Jemes 1:27) Nwanyị ọzọ bụ onye Kraịst ekweghị ka imere onwe onye ebere rikpuo ya mgbe di ya nwụrụ. Ọ nabatara nkwado nke ndị enyi ma nwee mmasị dị ukwuu n’ebe ndị ọzọ nọ. “Ekpere m ekpere ọtụtụ mgbe karị, zụlitekwa mmekọrịta chiri anya karị n’ebe Jehova nọ,” ka o kwuru. Lee aha ngọzi ọ bụ inwe nkwado nke ógwè aka ebighị ebi nke Chineke!
Enyemaka Mgbe Anyị Gahiere
15. Gịnị bụ isi ihe dị n’okwu ndị Devid kwuru n’Abụ Ọma 19:7-13?
15 Ọ bụ ezie na anyị hụrụ iwu Jehova n’anya, anyị na-agahie mgbe ụfọdụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a na-ewute anyị, dị ka o mere Devid, bụ́ onye iwu, ihe ncheta, ụkpụrụ, na ikpe nile nke Chineke bụụrụ ihe ndị a ga-achọsi ike karịa ọlaedo. O dere: “E ji ha dọọ ohu gị aka ná ntị: n’idebe ha ka ọkpụkpụ ọrụ [“ụgwọ ọrụ,” NW] hiri nne na-apụta. Mmehie e mehieworo n’amaghị ama, ònye ga-aghọta ha? Gụọ m n’onye ikpe ihe nzuzo nile na-amaghị. Gbochiekwa ohu gị ná mmehie nganga; ekwela ka ha na-achị m: mgbe ahụ ka m ga-ezu okè, a ga-agụkwa m n’onye ikpe njehie hiri nne na-amaghị.” (Abụ Ọma 19:7-13) Ka anyị nyochaa okwu ndị a.
16. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji zere nganga?
16 Omume nganga bụ mmehie ndị siri oké ike karịa ngahie. A jụrụ Sọl ịbụ eze n’ihi iji nganga chụọ àjà na n’ihi ịhapụ eze Amalek bụ́ Egag ndụ na ịhapụ ibibi ihe nlụta n’agha ndị kasị mma, ọ bụ ezie na Chineke enyewo iwu na a ga-ebibisị ndị Amalek. (1 Samuel 13:8-14; 15:8-19) E ji ekpenta tie Eze Uzaịa ihe otiti n’ihi iji nganga weghara ọrụ ndị nchụàjà na-arụ. (2 Ihe Emere 26:16-21) Mgbe a na-ebuga igbe ọgbụgba ndụ ahụ na Jerusalem, ehi nke na-adọkpụkwa ụgbọ e ji buru ya wee fọ nke nta ka ọ kpaghasịa ihe, Chineke tigburu Uza n’ihi ijide Igbe ahụ aka ka o wee ghara ịda, nke nke asọpụrụghị Chineke. (2 Samuel 6:6, 7) Ya mere, ọ bụrụ na anyị amaghị ihe anyị ga-eme ma ọ bụ na e nyeghị anyị ike ime ihe, anyị kwesịrị igosipụta obi dị umeala ma gakwuru ndị nwere nghọta. (Ilu 11:2; 13:10) Otú ọ dị, ọ bụrụ na ọ dịwo mgbe anyị dịrị nganga, anyị kwesịrị ikpe ekpere maka mgbaghara ma rịọ Chineke ka o nyere anyị aka ịnọ na nche megide ịdị nganga n’ọdịnihu.
17. Olee otú mmehie ndị e kpuchiri ekpuchi pụrụ isi nwee mmetụta n’ahụ mmadụ, ma olee otú a pụrụ isi nweta mgbaghara na nnwere onwe site na ya?
17 Mmehie ndị e kpuchiri ekpuchi pụrụ ịkpata mkpagbu. Dị ka Abụ Ọma 32:1-5 na-ekwu, Devid nwara ikpuchi mmehie ya, ma ọ sịrị: “Mgbe m gbara nkịtị, ọkpụkpụ m nile kara nká site n’ọgbụgbọ ụja m ogologo ụbọchị nile. N’ihi na ehihie na abalị aka gị dị arọ n’ahụ m: ume m gbanwere n’ihe ịkpọ nkụ nke ụgụrụ.” Ịnwa ịbịada akọ na uche nọ n’ikpe ọmụma mere ka ọkpụkpụ Devid nile kaa nká, obi ịlọ mmiri belatakwara ume ya dị ka osisi na-atụfu mmiri na-enye ndụ n’oge ụkọ mmiri ozuzo ma ọ bụ n’oge okpomọkụ ọkọchị. Ọ ghaghị ịbụ na ọ tara ahụhụ ahụ esighị ike n’uche na n’elu ahụ ma gharakwa inwe ọṅụ n’ihi ekwupụtaghị mmehie ya. Nanị ikwupụta mmehie nye Chineke pụrụ iweta mgbaghara na nnwere onwe. Devid sịrị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ, bụ́ onye e bupụworo njehie ya, onye e kpuchiworo mmehie ya. . . . Ana m emerịị ka ị mara mmehie m, ekpuchighịkwa m ajọ omume m: m sịrị, M ga-ekwupụtara Jehova njehie m nile; gị onwe gị bupụkwara ajọ omume nke mmehie m.” Enyemaka ịhụnanya site n’aka ndị okenye ndị Kraịst pụrụ inye aka n’ịkwalite inweghachi ahụ ike n’ụzọ ime mmụọ.—Ilu 28:13; Jemes 5:13-20.
18. Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere na mmehie pụrụ inwe mmetụta ndị na-adịte anya, ma gịnị pụrụ ịbụ isi iyi nke nkasi obi n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ?
18 Mmehie pụrụ inwe mmetụta ndị na-adịte anya. Ọ dị otú ahụ nye Devid, bụ́ onye kwasoro Bat-sheba iko, kpaa nkata ọnwụ di ya, wee lụọ nwanyị ahụ di ya nwụrụ nke dị ime. (2 Samuel 11:1-27) Ọ bụ ezie na Chineke gosiri ebere n’ihi ọgbụgba ndụ Alaeze ahụ, nchegharị Devid, na mmeso obi ebere o mesoro ndị ọzọ, Devid nwetara ‘ihe ọjọọ site n’ụlọ ya.’ (2 Samuel 12:1-12) Nwa ahụ a kwatara n’iko nwụrụ. Nwa Devid bụ́ Amnọn dinara nwanne ya nwanyị nna ji ha abụọ bụ́ Tema n’ike, e wee gbuo ya site n’iwu nke nwanne Tema bụ́ Absalọm nyere. (2 Samuel 12:15-23; 13:1-33) Absalọm mere Devid ihe ihere site n’idina ndị iko Devid. Ọ nwara ịnaghara ocheeze ahụ n’ike ma e gburu ya. (2 Samuel 15:1–18:33) Mmehie anaghị ahapụ iweta ahụhụ. Dị ka ihe atụ, onye mmehie a chụpụrụ n’ọgbakọ pụrụ ichegharị e wee nabataghachi ya n’ime ọgbakọ, ma ọ pụrụ iwe ọtụtụ afọ iji nwetaghachi aha ọma nke e tetọworo ma merie nsogbu uche na-esite ná mmehie. Ka ọ dị ugbu a, lee ka o si bụrụ ihe nkasi obi inwe mgbaghara Jehova na nkwado nke ógwè aka ya ndị na-adịru ebighị ebi!
Nnapụta Site ná Nrụgide Ndị Na-adịkwasị Anyị
19. Olee otú mmụọ Chineke pụrụ isi nye aka mgbe a nwara anyị ọnwụnwa siri ike?
19 Mgbe a nwara anyị ọnwụnwa siri ike, anyị pụrụ inwe amamihe na ume na-ezughị ezu iji mee mkpebi ma mee ihe anyị kpebiri. N’ọnọdụ dị otú ahụ, mmụọ Chineke “na-enyekwara adịghị ike anyị aka: n’ihi na anyị amataghị ihe anyị ga-ekpe n’ekpere dị ka anyị na-aghaghị ikpe; kama ọ bụ mmụọ nsọ onwe ya weere ịsụ ude a na-apụghị ikwu na-arịọrọ anyị arịrịọ.” (Ndị Rom 8:26) Ọ bụrụ na Jehova emee ka ọnọdụ gbanwee, anyị kwesịrị inwe ekele. Ma, ógwè aka ya pụrụ ịzọpụta anyị n’ụzọ ọzọ. Ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere maka amamihe, Jehova pụrụ iji mmụọ ya gosipụta ihe anyị kwesịrị ime ma nye ume dị mkpa iji mee ya. (Jemes 1:5-8) Site n’enyemaka ya, anyị pụrụ inwe ntachi obi mgbe ‘anyị na-enwe mwute n’ihi ọnwụnwa dị iche iche’ ma gabiga ha na-enwe okwukwe nke a nwapụtaworo na nke e meworo ka o siwanye ike.—1 Pita 1:6-8.
20. Gịnị ka anyị ga-anụ ụtọ ya ma ọ bụrụ na anyị emee ógwè aka ebighị ebi nke Jehova ihe nkwado anyị n’ezie?
20 Ka ike ghara ịgwụ anyị mgbe ọ bụla ichigharịkwuru Chineke n’ekpere. “Anya m abụọ dị n’ebe Jehova nọ mgbe nile; n’ihi na ya onwe ya ga-eme ka ụkwụ m abụọ si n’ụgbụ pụta,” ka Devid kwuru. “Chee m ihu, mekwaara m amara; n’ihi na onye nanị ya nọ na onye e wedara n’ala ka m bụ. Ahụhụ nile nke obi m sara mbara: mee ka m si ná mkpa m nile pụta. Hụ mweda n’ala m na ọnọdụ ọjọọ m; bupụkwa mmehie m nile.” (Abụ Ọma 25:15-18) Dị ka Devid, anyị ga-enwe mgbapụta Chineke, ihu ọma ya, na mgbaghara ya ma ọ bụrụ na anyị emee ógwè aka ebighị ebi Jehova ihe nkwado anyị n’ezie.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee isiokwu ndị metụtara ịda mbà n’obi n’ime Teta! nke March 8, 1989, peji 11-24, na nke November 8, 1987, peji 12-16 [Bekee].
Olee Otú Ị Ga-esi Zaghachi?
◻ Olee otú Jehova si enyere ndị na-ejere ya ozi, bụ́ ndị na-arịa ọrịa, aka?
◻ Gịnị pụrụ inyere anyị aka mgbe anyị na-anwa ịnagide nkụda mmụọ nke uche?
◻ Gịnị pụrụ inye aka ibelata mwute n’ihi ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya?
◻ Olee otú ndị na-ekpuchi mmehie ha pụrụ isi nwere onwe ha?
◻ Enyemaka dị aṅaa ka e nwere mgbe a nwara ndị Jehova ọnwụnwa siri ike?
[Foto dị na peeji nke 16, 17]
Anyị pụrụ inweta nkasi obi site n’olileanya mbilite n’ọnwụ, dị ka Job onye na-atụ egwu Chineke mere