Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 10/1 p. 29-31
  • “Akpasukwala Ụmụ Unu Iwe”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Akpasukwala Ụmụ Unu Iwe”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe ‘Ịkpasu Ha Iwe’ Pụtara
  • Ịzụlite Ụmụaka n’Ọzụzụ Chineke
  • Ilebara Ụmụaka Anya Otú Ahụ́ Ha Chọrọ
    Teta!—2005
  • Zụlite Nwa Gị Site na Nwa Ọhụrụ
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Ndị Nne na Nna—Jirinụ Ịhụnanya Na-azụ Ụmụ Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Bible Ọ̀ Pụrụ Inyere Gị Aka Ịzụ Ụmụ Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 10/1 p. 29-31

“Akpasukwala Ụmụ Unu Iwe”

“NDỊ bụ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe.” Otú ahụ ka Pọl onyeozi si kwuo ya. (Ndị Efesọs 6:4) Ná mba ndị Ọdịda Anyanwụ, ebe ndị nne na nna nọ n’okpuru ọtụtụ nrụgide na ihe isi ike nke ụwa ndị mepere anya, ọ dịghị adịkarịrị ha mfe imeso ụmụ ha ihe n’ụzọ obi ọma. Ịzụlite nwata abụghịkwa ihe ịma aka dị ala karị ná mba ndị na-emepe emepe. N’eziokwu, ụzọ ndụ pụrụ ịdịtụ nwayọọ karịa ka ọ dị n’ebe Ọdịda Anyanwụ. Ma omenala na ọdịnala ndị dịworo eri ogologo oge pụrụ ime ka ndị nne na nna mesoo ụmụ ha ihe n’ụzọ ndị o yikarịrị ka hà ga-akụda ha mmụọ, kpasuokwa ha iwe.

A na-edebe ụmụaka nọ ná mba ụfọdụ ndị na-emepe emepe n’ọ̀tụ̀tụ̀ dịkarịsịrị ala nke nsọpụrụ na nkwanye ùgwù. N’omenala ụfọdụ a na-enyekarị ụmụaka ọda n’olu iyi egwu na nke inye iwu, na-etikwasị ha mkpu ma na-akparị ha. Ọ pụrụ ịbụ ihe a na-adịghị ahụkarị ịnụ ka onye okenye na-agwa nwatakịrị okwu n’ụzọ dị nro, ka a hapụgodi ikwu banyere iji àgwà ọma ndị dị ka “biko” na “ndewo” mee ihe. Ndị bụ nna na-eche na ha aghaghị iguzobe ịbụ isi ha site n’aka ike; a na-eji oké iti aka mee ka okwu ndị dị ike siwanye ike.

N’omenala ụfọdụ ndị e nwere n’Africa, ọ bụ ihe a na-ele anya ọbụna dị ka enweghị nkwanye ùgwù na nwatakịrị ga-ekele onye tọrọ ya n’echeghị ka a gwa ya agwa. Ọ bụghị ihe a na-adịghị ahụkarị ka ndị ntorobịa, bụ́ ndị ibu dị arọ dịkwasị n’isi ha, ji ndidi na-echere ka e nye ha ikike ikele ìgwè ndị okenye. Ndị okenye ahụ ga-anọgide na-akpa nkata ha, leghara ndị ntorobịa ahụ na-echere anya ruo mgbe ọ masịrị ha inye ha ohere maka ekele. Ọ gwụla mgbe e kelesịrị ekele ndị ahụ ka a na-enye ụmụntakịrị ahụ ohere ịgafe.

Ogbenye ọnụ ntụ bụ ihe ọzọ pụrụ ịrụ ọrụ megide ọdịmma nke ụmụntakịrị. Site n’iji ahụ ike ha na agụmakwụkwọ ha chụọ àjà, a na-erigbu ndị na-eto eto n’ụzọ na-ezighị ezi dị ka ụmụaka e ji arụ ọrụ. N’ụzọ ezi uche na-adịghị ya a pụrụ ịtụkwasị ọrụ ndị dị ike n’ubu ụmụaka ọbụna n’ebe obibi. Mgbe ezinụlọ ndị bi n’ime ime obodo zigakwara ụmụ ha n’obodo ukwu dị iche iche ka ndị ikwu lekọta ha mgbe ha na-aga akwụkwọ, ọtụtụ mgbe a na-emeso ha omume dị nnọọ ka ndị ohu. N’ezie, mmeso ndị a na-adịghị mma na-akpasu ụmụaka iwe!

Ihe ‘Ịkpasu Ha Iwe’ Pụtara

Ụfọdụ ndị nne na nna na-ekwere ka omenala ndị na-ewunụ banyere ịzụlite ụmụaka na-akwagharị ha, n’echeghị echiche dị ukwuu banyere ihe ndị ọ ga-arụpụta. Otú ọ dị, ọ bụ ezi ihe kpatara Okwu Chineke ji gwa ndị nne na nna okwu agbamume ka ha ghara ịkpasu ụmụ ha iwe. Okwu Grik mbụ nke a sụgharịrị “akpasukwala ụmụ unu iwe” pụtara n’ụzọ nkịtị “unu emela ka ha nwee ọnụma.” (Kingdom Interlinear) Ná Ndị Rom 10:19, a sụgharịrị otu ngwaa ahụ ịbụ ‘ịkpasu iwe dị ọkụ.’

N’ihi ya, Today’s English Version na-ekwu, sị: “Emesola ụmụ unu omume iji wee kpasuo ha iwe.” The Jerusalem Bible na-ekwukwa n’otu aka ahụ, sị: “Edubala ụmụ unu mgbe ọ bụla n’ọnụma.” Ya mere Bible adịghị ekwu banyere ahụ mgbakasị ndị dị nta nke ndị nne na nna pụrụ ịkpatara nwa ha n’amaghị ama n’ihi ezughị okè, ọ dịghịkwa akatọ ahụhụ e nyere n’ụzọ ezi omume. Dị ka Lange’s Commentary on the Holy Scriptures si kwuo, amaokwu Bible nke a na-ekwu banyere “imeso ụmụaka n’ụzọ enweghị ndidi, nke enweghị obi ebere, nke na-akpata mwute, nke na . . . a na-eme ka ha na-anọrọ onwe ha ma ọ bụ bụrụ ndị a dọọrọ gaa ná nnupụisi, nguzogide na obi ilu.”

Dị ka onye na-enye ọzụzụ bụ́ J. S. Farrant chọpụtara: “Eziokwu dị ya bụ na ụmụaka bụ mmadụ. Ha adịghị azaghachi nanị n’ụzọ ịgba nkịtị dị ka ihe ọkụkụ na-eme banyere gburugburu ebe ha nọ. Ha na-emeghachi omume.” Ọtụtụ mgbekwa mmeghachi omume nye mmeso na-ezighị ezi na-akpata mbibi n’ụzọ ime mmụọ na mmetụta uche. Eklisiastis 7:7 na-asị: “Mmegbu na-eme ka onye maara ihe ghọọ onye nzuzu.”

Ịzụlite Ụmụaka n’Ọzụzụ Chineke

Ndị nne na nna chọrọ ka ụmụ ha nọgide na-aga ije n’eziokwu ga-ahụ na ihe ndị bụ omenala na ọdịnala abụghị nanị ihe ndị na-ekpebi otú ha ga-esi zụlite ụmụ ha. (Tụlee 3 Jọn 4.) Mgbe ọ dọsịrị ndị nne na nna aka ná ntị banyere ịkpasu ụmụ ha iwe, Pọl kwukwara, sị: “Na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị [“Jehova,” NW].” (Ndị Efesọs 6:4) Ya mere ụkpụrụ nile nke Jehova karịrị omenala na echiche nile nke obodo.

Ebe ọ pụrụ ịbụ ihe a na-emekarị ná mba ụfọdụ imeso ụmụaka omume dị ka ndị dị ala karị na dị ka ndị ohu e ji arụ ọrụ, Bible na-ekwupụta n’Abụ Ọma 127:3, sị: “Lee, ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa ka ụmụ bụ: ụgwọ ọrụ ọ na-akwụ ka mkpụrụ nke afọ bụ.” Onye bụ nne ma ọ bụ nna ọ̀ pụrụ ịnọgide na-enwe ezi mmekọrịta ya na Chineke ma ọ bụrụ na o mesoo ihe nketa ya n’ụzọ mkparị? Ọ ga-esi ike. E nweghịkwa ohere maka echiche nke bụ na ụmụaka dị adị nanị iji gboo mkpa nke ndị mụrụ ha. Ná 2 Ndị Kọrint 12:14, Bible na-echetara anyị, sị: “Ọ bụghị ọrụ ụmụ ịkpadoro ndị mụrụ ha ihe, kama ọ bụ ọrụ ndị mụrụ ụmụ ịkpadoro ụmụ ha.”

Ọ bụghị na a ga-eme ka ndị bụ ụmụ nwere onwe ha pụọ n’ime òkè ha nke ọrụ na ihe omume ndị e nwere n’ụlọ. Ma ọ̀ bụ na o kwesịghị ekwesị ichebara ọdịmma kasị mma nke nwatakịrị echiche? Dị ka ihe atụ, mgbe a jụrụ Yaa, bụ́ otu nwa agbọghọ onye Kraịst n’Africa, ihe ọ ga-achọ karịsịa ka ndị mụrụ ya meere ya, ọ zara, sị: “Ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ na e belata ọrụ ndị m nwere n’ụlọ n’ụbọchị ndị ahụ m mere ndokwa ije ozi ubi.” Ya mere ọ bụrụ na ọ na-esiri nwata ike ịga akwụkwọ ma ọ bụ nzukọ dị iche iche n’oge n’ihi oké ibu ọrụ ụlọ, ọ̀ bụ na ọ gaghị akasị mma ime mgbanwe ụfọdụ?

Ọ bụ eziokwu na ọ pụrụ isi ike imeso ndị na-eto eto ihe. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi mesoo ha n’ụzọ na-adịghị enye mkparị ma ọ bụ na-akpasu iwe? Ilu 19:11 na-asị: “Ezi uche mmadụ na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ.” Ee, nke mbụ ị pụrụ ịgbalị ịghọta nwa gị dị ka onye. Nwatakịrị nke ọ bụla dị iche, na-enwe ihe ndị na-amasị ya, ikike ime ihe dị iche iche, na ihe ndị na-akpa ya. Gịnị bụ ihe ndị a? Ì wepụtawo oge iji mata nwa gị na inweta azịza nye ajụjụ nke a? Ịrụkọ ọrụ ọnụ na ifekọ ofufe, ikere òkè n’egwuregwu ezinụlọ—ihe ndị a na-enye ohere maka ndị nne na nna ịdọta ụmụ ha nso.

Na 2 Timoti 2:22, Pọl mere nchọpụta ọzọ na-adọrọ mmasị mgbe ọ gwara Timoti, sị: “Na-agbanarị agụụ ihe ọjọọ na-agụ nwa okorobịa.” Ee, Pọl ghọtara na oge ntorobịa pụrụ ịbụ oge ịkpa aghara. Oké mgbanwe dị iche iche n’anụ ahụ na ná mmetụta uche na-ewere ọnọdụ. Mmasị n’ebe ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha na-arị elu. N’oge nke a, ndị ntorobịa nwere mkpa nke nduzi onye tozuru okè na nke ịhụnanya iji zere ndahie ndị siri ike. Ma e kwesịghị imeso ha dị ka ndị na-eme omume rụrụ arụ. Otu nwa nwanyị a kpasuru iwe nke otu nwoke bụ onye Kraịst kwara arịrị, sị: “Akwabeghị m iko, ma nna m na-ebo m ebubo ya, ọ ka mma na m mere ya eme.” Kama ịdị na-ekwu na e mere ihe ọjọọ, gosipụta obi ike n’ebe nwa gị nọ. (Tụlee 2 Ndị Tesalọnaịka 3:4.) Kama ịdị na-eme nkatọ, nwee ọmịiko na nghọta n’ụzọ ịhụnanya, na nke iguzosi ike n’ihe.

Otú ọ dị, a pụrụ izere ọtụtụ nsogbu ma ọ bụrụ na ndị nne na nna eburu ụzọ tụlee ihe ize ndụ omume ọma nke nwatakịrị na-eche ihu. Cheta, Chineke nyere ndị nne na nna ọrụ ịzụ na ịdụ ụmụ ha ọdụ n’Okwu Chineke. (Deuterọnọmi 6:6, 7) Nke ahụ pụrụ ịchọ oge na mgbalị dị ukwuu. Ọ bụ ihe mwute na ụfọdụ ndị nne na nna na-ada ada n’ịrụzu ọrụ nkụzi e kenyere ha n’ihi enweghị ndidi. Amaghị akwụkwọ, bụ́ nsogbu dị ukwuu ná mba ndị na-emepe emepe, na-egbochikwa ndị nne na nna ndị ọzọ.

N’ọnọdụ ụfọdụ a pụrụ ịkpọ onye Kraịst tozuru okè ka o nye aka. Ọ pụrụ ịbụ nanị ihe metụtara ịtụ aro ụfọdụ nye nne ma ọ bụ nna ahụ na-enwekebeghị ahụmahụ. (Ilu 27:17) Ma ọ bụ ọ pụrụ ịgụnye inye aka n’iduzi ọmụmụ Bible ezinụlọ n’onwe ya. Ma nke a adịghị anapụ nne ma ọ bụ nna ahụ ibu ọrụ ya nke ịkụziri nwa ya Okwu Chineke. (1 Timoti 5:8) Ọ pụrụ itinye mgbalị iji soro ụmụ ya rụkọọ ọrụ n’ozi ubi na ịtụle ihe ime mmụọ dị iche iche n’oge nri ma ọ bụ n’ọnọdụ ndị ọzọ kwesịrị ekwesị.

Onye ntorobịa nke na-eru ntozu okè pụrụ inwe ọchịchọ ebumpụta ụwa maka nnwere onwe karị. Ọtụtụ mgbe a na-aghọtahie nke a ịbụ ịgba isi akwara ma ọ bụ ikwesi olu ike. Lee ka ọ ga-esi bụrụ ihe mkpasu iwe ma ọ bụrụ na ndị nne na nna emeghachi omume site n’imeso ya dị ka nwa dị nnọọ ntakịrị ma jụ ịhapụtụ ya n’ihe ndị ọ na-eme! Ọ bụkwa ihe mkpasu iwe n’otu aka ahụ ma ọ bụrụ na ha na-ekpebi ihe nile ọ bụla banyere ndụ ya—agụmakwụkwọ, ọrụ, alụmdi na nwunye—n’ebughị ụzọ soro ya kwurịta okwu banyere ha n’ụzọ dị nwayọọ na n’ụzọ nkwanye ùgwù. (Ilu 15:22) Pọl onyeozi gwara ndị Kraịst ibe ya okwu agbamume ka ha ‘bụrụ ndị tozuru okè ná nghọta.’ (1 Ndị Kọrint 14:20) Ọ̀ bụ na ndị nne na nna ekwesịghị ịchọ ka ụmụ ha tolite—n’ụzọ mmetụta uche na n’ụzọ ime mmụọ? Ma, a pụrụ ịzụlite “nghọta” nke onye ntorobịa nanị site ‘n’iji ha eme ihe.’ (Ndị Hibru 5:14) Ka o wee jiri ha mee ihe a ghaghị inye ha òkè ụfọdụ nke nnwere onwe ime nhọrọ.

Ịzụlite ụmụ n’oge ndị a siri ike adịghị mfe. Ma ndị nne na nna na-agbaso Okwu Chineke adịghị akpasu ụmụ ha iwe ma ọ bụ na-ewetara mgbakasị ahụ “ka obi ghara ifu ha.” (Ndị Kọlọsi 3:21) Kama ha na-agbalịsi ike imeso ha n’ụzọ na-ekpo ọkụ, n’inwe nghọta, na n’ịdị ùgwù. Ha na-eduru ụmụ ha, ọ bụghị na-amanye ha amanye; na-elekọta ha, ọ bụghị na-elefuru ha anya; na-akpali ha gaa n’ịhụnanya, ọ bụghị na-akpasu ha iwe ma ọ bụ mee ka ha nwee nkụda mmụọ.

[Foto dị na peeji nke 31]

Ịtụ “oware,” bụ́ otu egwuregwu a na-anọ n’ime ụlọ egwu na Ghana, na-enye ndị nne na nna nke a ohere isoro ụmụ ha mekọọ ihe

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya