Ibinye Ndị Kraịst Ibe Anyị Ego
PEDRO na Carlos bụ ezi ndị enyi.a Ha bụcha ndị Kraịst, mgbe mgbe kwa, ezinụlọ ha dị iche iche na-enwerịta ezi mkpakọrịta. Ya mere, mgbe Carlos nwere mkpa ego maka azụmahịa ya, Pedro egbughị oge iwepụta onwe ya ibinye ya ego ahụ. “Ebe anyị bụ ezi ndị enyi,” ka Pedro kọwara, “echegbughị m onwe m banyere ya.”
Otú ọ dị, nanị ọnwa abụọ mgbe nke a gasịrị, azụmahịa Carlos dakpọrọ, o nweghịkwa ike ịkwụghachi ụgwọ ahụ. O juru Pedro anya mgbe ọ matara na Carlos ejiwo akụkụ ka ukwuu nke ego ahụ ọ gbazitere mee ihe ịkwụghachi ụgwọ ndị o ji, bụ́ ndị na-emetụtaghị azụmahịa ya nakwa iji kwadoo ụzọ ndụ nke oké mmefu. E kpezighị okwu ahụ n’ụzọ juru Pedro afọ ọbụna mgbe otu afọ nke ije eje na ide akwụkwọ ozi gasịrị. N’ihi iwe, Pedro jekwuuru ndị ọchịchị ma mee ka a kpụrụ Carlos—enyi ya na nwanna ya onye Kraịst—kpọchie.b Nke a ọ̀ bụ ụzọ kwesịrị ekwesị ịgbaso? Anyị ga-ahụ mgbe e mesịrị.
Enweghị nkwekọrịta na inwe nghọtahie n’ihe banyere ego e biiri ebiri na-arụpụtakarị mmebi nke ọbụbụenyi n’etiti ndị mmadụ gburugburu ụwa. Mgbe ụfọdụ ọ pụrụ ọbụna ịbụ ihe na-akpata ọgba aghara n’etiti ndị Kraịst. N’ala ụfọdụ, o siri ike ịgbazite ego n’ụlọ akụ, ya mere, ọ bụ ihe a na-emekarị, bụ́ ndị nwere mkpa nke ego ijekwuru ndị enyi na ndị ikwu. Otú ọ dị, ahụmahụ dị mwute nke Pedro na Carlos na-egosi na ọ gwụla ma mmadụ abụọ ahụ, bụ́ onye na-ebiri ego na onye na-ebinye ebinye hà leziri anya gbasoo ụkpụrụ nile nke Bible, oké nsogbu dị iche iche pụrụ ibilite. Ya mere, gịnị bụ ụzọ kwesịrị ekwesị isi mee ihe banyere ibinye onye Kraịst ọzọ ego?
Ịgụzi Ihe Nile Ibiri Ego Ga-ewe
Bible adịghị agba ume ibiri ego na-adịghị mkpa. “Unu ejila onye ọ bụla ụgwọ ọ bụla, ma ọ bụghị ịhụrịta onwe unu n’anya,” ka Pọl onyeozi nyere na ndụmọdụ. (Ndị Rom 13:8) Ya mere, tupu ị na-abanye n’ụgwọ, gụkọọ ihe ọ ga-ewe ime otú ahụ. (Tụlee Luk 14:28) È nwere n’ezie mkpa nke ịgbaziri ego? Ọ̀ bụ ihe metụtara inweta ihe e ji adị ndụ iji wee lekọta ezinụlọ gị? (1 Timoti 5:8) Ka ò metụtara anya ukwu ruo n’ókè ụfọdụ—ma eleghị anya ọchịchọ ibikwu ndụ okomoko?—1 Timoti 6:9, 10.
Ihe ọzọ dị mkpa bụ ịtụle ma iji ụgwọ ọ̀ ga-amanye gị ịrụ ọrụ ogologo oge karị, ma eleghị anya na-ahapụ nzukọ na ozi ubi. Ọzọkwa, ị̀ pụrụ n’ezie ịnakwere itinye ego onye ọzọ n’ihe ize ndụ? Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na azụmahịa ma ọ bụ ihe omume ahụ adakpọọ? Cheta na “onye na-emebi iwu na-ebiri ihe, ma ọ dịghị akwụghachi.”—Abụ Ọma 37:21.
‘Ikwu Eziokwu’ gwa Ndị Na-ebinye Ego
Mgbe ị tụlesịrị ihe ndị ahụ, ị ka pụrụ iche na ịgbaziri ego maka azụmahịa bụ ihe dị mkpa. Ọ bụrụ na a pụghị inweta ya site n’ụzọ ndị ọzọ, ọ dịghị ihe dị oké njọ n’ịgakwuru onye Kraịst ibe gị, n’ihi na ọ bụ ihe a na-ahụkarị ijekwuru ndị enyi n’oge mkpa, dị ka Jisọs kwuru na Luk 11:5. Ma mmadụ kwesịrị ijisi ike ‘kwuo eziokwu.’ (Ndị Efesọs 4:25) Jiri obi eziokwu kọwaa ihe nile dị na ya—na-agụnyere ihe ize ndụ nile dị na ya, ọbụna ndị nke pụru iyi ihe ndị na-agaghị eme eme. Ya ewutela gị ma ọ bụrụ na onye ahụ gaje ibinye gị ego ajụọ ọtụtụ ajụjụ ndị a na-eji achọ ịmata ihe kpọmkwem, ka o wee jide n’aka na ya ghọtara ihe na-aganụ nke ọma.c
Ọ̀ ga-abụ ikwu eziokwu ibiri ego n’ihi otu ihe ma jiri ego ahụ mee ihe ọzọ? Ọ bụghị ma ọlị. Otu onye na-arụ ọrụ n’ụlọ akụ na Latin America na-akọwa, sị: “Ụlọ akụ ahụ ga-akagbu ikike ahụ i nwere ịzụrụ ihe n’aka, ọ bụrụkwa na ị kwụghachighị ụgwọ ahụ ngwa ngwa, ha ga-anata ikike ụlọ ikpe ijichi ihe onwunwe gị nile.” Ọ bụrụ na i biiri ego n’echiche nke na ọ ga-eme ka uru nke azụmahịa ahụ rịa elu, iji ya mee ihe maka nzube ọzọ na-eme nnọọ ka onye ahụ binyere gị ego ghara ijide n’aka na ego ahụ o binyere gị bụ ihe a pụrụ ịkwụghachi akwụghachi. N’ezie, ọ pụrụ ịbụ na ị gaghị atụ egwu na a ga-agba gị akwụkwọ mgbe ị na-ebiri ego n’aka onye Kraịst ibe gị. Otú o sina dị, “ohu ka onye na-ebiri ego bụụrụ onye mbinye,” i nwekwara ibu ọrụ nke imeso ya ihe n’eziokwu.—Ilu 22:7.
Itinye Ụkpụrụ Ọma ahụ n’Azụmahịa
Jisọs sịrị: “Ya mere ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke unu na-achọ ka mmadụ na-eme unu, na-emekwanụ mmadụ otú a.” (Matiu 7:12) Lee ka o si dị mkpa ka e jiri iwu nke a na-eme ihe mgbe anyị na onye kwere ekwe ibe anyị na-emekọrịta ihe metụtara azụmahịa! Dị ka ihe atụ, ị̀ ga-esi aṅaa meghachi omume ma ọ bụrụ na nwanna ajụ arịrịọ ị rịọrọ ya maka mbinye ego? Ị̀ ga-eche na o mebiwo ọbụbụenyi unu? Ka ị̀ ga-akwanyere ikike o nwere ịjụ arịrịọ gị ùgwù, na-aghọta na ọ pụrụ inwe mkpa ndị ọ chọrọ iji ego ahụ gboo, ma ọ bụ na ọ pụrụ ile ihe ize ndụ dị na ya anya dị ka ihe siri ike karịa otú gị onwe gị si ele ha anya? Ọ pụrụ izi ezi n’ịjụ ma ị̀ ga-enwekwa ike iji ego ahụ mee ihe nke ọma. N’ọnọdụ dị otú ahụ, ọjụjụ ya pụrụ ịbụ ma ihe kwesịrị ekwesị ma nke na-egosi ịhụnanya.—Ilu 27:6.
Ọ bụrụ na otu enyi gị ekweta ibinye gị ego ụfọdụ, e kwesịrị ịkọwapụta ihe nile nke ọma n’akwụkwọ e dere ede, na-agụnye ego ole e biiri, ihe a gaje iji ego ahụ mee, ihe onwunwe ndị a ga-eji mee ihe dị ka ihe ibé maka ego ahụ e biiri, na ụzọ a ga-esi kwụghachi ya na mgbe ọ ga-abụ. N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe inwe onye ọkà iwu ga-edepụta ma leba anya n’akwụkwọ nkwekọrịta ahụ, tinyekwa ya n’aka ndị ọchịchị. Otú o sina dị, ozugbo a bịanyesịrị aka n’akwụkwọ, “ka okwu unu bụrụ, Ee, ee; Ee e, ee e.” (Matiu 5:37) Ejila obi ọma nke enyi gị mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi site n’ịghara iji ibu ọrụ gị n’ebe ọ nọ kpọrọ ihe dị ka ị ga-eji ya kpọrọ ihe ma a sị na ọ bụ ụlọ akụ ka i ji ụgwọ.
Ndị Mbinye Ego Ndị Na-elezi Anya
Gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ abịakwute gị maka ịgbazinye ya ego? Ọtụtụ ihe ga-adabere n’ọnọdụ ndị o metụtara. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịbụ na nwanna bụ onye Kraịst dabara n’ihe isi ike nke ego nke ọ na-abụghị ya kpatara. Ọ bụrụ na i nwere ụzọ isi mee ya, ịhụnanya ndị Kraịst ga-akpali gị ‘inye ya ihe na-akpa ahụ ya.’—Jemes 2:15, 16.
Lee ka o si bụrụ ihe na-egosighị ịhụnanya inweta uru site n’ihe isi ike nke nwanna gị site n’ịna ya ego ọmụrụnwa n’ọnọdụ dị otú ahụ! Jisọs gbara ume, sị: “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-emekwanụ ezi ihe nye ha, na-ebinyekwa ihe, ghara iwepụ ịtụkwasị obi [“n’anaghị ego ọmụrụnwa, gharakwa ịdị na-atụ anya ịnataghachi ihe,” NW].”—Luk 6:35; tụlee Levitikọs 25:35-38.
Ma, gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ihe a na-agwa gị bụ nanị ka i weta ego a ga-etinye n’otu azụmahịa ma ọ bụ ka ị nọrọ n’aka ebé maka ego a na-achọ ịgbazite? Ná nchịkọta, ọ kachasị mma ile okwu ndị dị otú ahụ anya dị ka itinye ego n’ihe iji mepụta ihe. Bible kwuru okwu doro anya n’ịgba ume ka e jiri nlezianya na-eme ihe, na-adụ ọdụ, sị: “Abụla otu n’ime ndị ga-anara mmadụ n’aka, abụkwala otu n’ime ndị nọ ná mbé banyere ụgwọ dị iche iche.”—Ilu 22:26.
Ebe ọ dị otú ahụ, ị ghaghị ibu ụzọ kpebie ma ị̀ ga-ewepụtali ego ha otú ahụ maka atụmatụ ahụ n’ezie. Ọ̀ ga-etinye gị n’ihe isi ike nke ego ma ọ bụrụ na azụmahịa ahụ adaa ma ọ bụ onye ahụ biiri gị ego enweghị ike ịkwụghachi ya n’oge? Ọ bụrụ na ị ga-ewepụtali ego ahụ, ọ bụrụkwa na ọ dị uru a gaje irite site n’iji ya mee ihe, o zikwara ezi ka i soro kere òkè na ya site n’ịna ego ọmụrụnwa ezi uche dị na ya maka ego i binyere. (Tụlee Luk 19:22, 23.) Ilu 14:15 na-adọ aka ná ntị, sị: “Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ije ụkwụ ya.” Mgbe ụfọdụ, ndị oji ego achụ ego ụfọdụ, bụ́ ndị maara ihe nke ọma, emewo ihe n’ejighị nlezianya mgbe ha na ndị Kraịst ibe ha na-eme ihe metụtara azụmahịa. Ọchịchọ nke inweta ego ọmụrụnwa dị elu adọrọwo ụfọdụ gaa n’ime ihe n’echeghị ezi echiche, bụ́ ebe ha tụfuworo ma ego ha ma ọbụbụenyi nke ha na ndị Kraịst ibe ha.
Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịhụ na ndị ọrụ ụlọ akụ na-atụlekarị ụzọ ihe atọ n’ịchọpụta ihe ize ndụ ndị pụrụ ịdị n’ibinye mmadụ ego: (1) akparamagwa nke onye ahụ na-arịọ ka e binye ya ego, (2) ikike o nwere ịkwụghachi, na (3) ọnọdụ ndị dị n’usoro azụmahịa ya. Ọ́ gaghị egosi “ezi amamihe” ịchọpụta okwu n’otu aka ahụ mgbe ị na-atụle ihe banyere ibinye onye ọzọ ego ị tara ahụhụ kpata?—Ilu 3:21, NW.
Dị ka ihe atụ, gịnị bụ àgwà e ji mara nwanna ahụ nke na-arịọ ka e binye ya ego? À maara ya dị ka onye a pụrụ ịtụkwasị obi na onye a pụrụ ịdabere na ya ka ọ bụ onye na-adịghị elezi anya na onye na-adịghị eguzosi ike? (Tụlee 1 Timoti 3:7.) Ọ bụrụ na ọ na-achọ ịgbasawanye azụmahịa ya, ò lekọtawo ya nke ọma ka ọ dị ugbu a? (Luk 16:10) Ma ọ bụghị otú ahụ, ezi enyemaka n’ilekọta ego ya nke ọma pụrụ imesị bụrụ ihe enyemaka dị mma karịa ibinye ya ego nke ọ na-agaghị elekọta nke ọma.
Ihe ọzọ ga-abụ ikike nwanna ahụ ịkwụghachi. Ego ole ka ọ na-enweta? Ụgwọ ndị dị aṅaa ka o ji? Ọ bụ n’ezie ihe ezi uche dị na ya na ọ ga-agwa gị eziokwu. N’agbanyeghị nke a, ịhụnanya ndị Kraịst kwesịrị ịdịgide. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ijide ihe onwunwe nwanna ahụ, bụ́ ndị a pụrụ ire ere dị ka ihe akaebe maka ego ahụ ị ga-ebinye ya. Iwu Mosis megidere ijide ụzọ mmadụ si enweta ihe o ji adị ndụ ma ọ bụ ihe onwunwe ya ndị bụ isi dị ka ihe ibé maka ego e binyere ebinye. (Deuterọnọmi 24:6, 10-12) Otú a, otu nwanna nwoke onye South America, onye bụ oji ego achụ ego kwuru na ya ga-ebinye ihe ruru nanị ọkara nke ego a pụrụ ireta site n’ihe onwunwe nke nwanna, bụ́ ndị a pụru ire ere. “Anaghị m elekwa ngwá ọrụ o ji arụ ọrụ ma ọ bụ ụlọ ya anya dị ka ihe a pụrụ ire ere,” ka ọ kọwara. “N’ezie agaghị m achọ ịchụpụ nwanna m n’ụlọ ya ma jide ụlọ ya iji nwetaghachi ego m.”
N’ikpeazụ, i kwesịrị ime ezi ntụle nke ọnọdụ ndị dị n’azụmahịa n’ebe i bi. Anyị na-ebi n’ime “mgbe ikpeazụ,” bụ́ mgbe ụmụ mmadụ bụ “ndị na-ahụ ego n’anya, . . . ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha.” (2 Timoti 3:1-4) Ọ bụ ezie na enyi gị na nwanna gị pụrụ ịbụ ndị na-eme ihe n’eziokwu, ma ọ pụrụ ịbụ na ndị òtù azụmahịa ya, ndị na-arụrụ ya ọrụ, ndị na-azụ ya ahịa abụghị. Dị ka onye Kraịst, ọ pụghị ichigharịkwuru iri ngó na ikwu okwu ụgha—ụzọ ndị ọ pụrụ ịbụ na ndị azụmahịa ibe ya ji na-eme ihe maka abamuru onwe ha. Ihe ọzọ nke kwesịrị ka a tụlee bụ mbibi nile nke “mgbe na ihe ndapụta” na-akpata. (Eklisiastis 9:11) Ọnụ ahịa nke ngwa ahịa pụrụ ịda na mberede. Ịrị oké elu nke ọnụ ahịa ihe pụrụ imebi azụmahịa ma ọ bụ kpochapụ uru nke ego i binyere. Izu ohi, ihe ọghọm, mwakwasị ndị omekome, na mmerụahụ bụkwa ọnọdụ ndị na-adịghị enye obi ụtọ ndị a na-ezute n’azụmahịa. I kwesịrị ịtụle akụkụ ndị a nile n’ime mkpebi gị.
Ọdịda
Mgbe ụfọdụ, n’agbanyeghị nlezianya nile, ọ bụ nnọọ na onye Kraịst apụghị ịkwụghachi ego o biiri. Ụkpụrụ Ọma ahụ kwesịrị ịkpali ya ịnọgide na-eme ka onye ahụ o ji ụgwọ mara otú ihe si na-aga. Ma eleghị anya ọ ga-ekwe omume ịdị na-akwụta ego nke nta nke nta ruo oge ụfọdụ. N’agbanyeghị nke a, onye Kraịst ekwesịghị iche na ịkwụta obere ego site n’oge ruo n’oge na-eme ka ọ ghara ịdị ya mkpa iji ihe ụfọdụ chụọ àjà iji mezuo ibu ọrụ dịịrị ya. (Abụ Ọma 15:4) Onye e ji ụgwọ, bụ́ onye Kraịst nwekwara ibu ọrụ nke igosi ịhụnanya. Ọ bụrụ na o chere na e rigbuwo ya, ọ pụrụ itinye n’ọrụ ndụmọdụ ahụ dị na Matiu 18:15-17.
Iwebata ndị ọchịchị nkịtị, dị ka Pedro mere n’okwu ahụ e hotara ná mmalite, agaghị abụ nnọọ ihe kwesịrị ekwesị. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ọ̀ dị onye ọ bụla n’etiti unu, ma a sị na o nwere okwu megide ibe ya, nwere anya ike ije ikpe n’ihu ndị ajọ omume, ma ọ bụghị n’ihu ndị nsọ? . . . Ọ̀ dị otú a, na ọ dịghị otu onye maara ihe nọ n’etiti unu, onye ga-apụ ikpe ikpe n’etiti nwanna ya na ibe ya, kama nwanna na-ewere nwanna ya jee ikpe, nke a bụkwa n’ihu ndị na-ekweghị ekwe? Ezie ọ bụ nnọọ ịla ala n’ebe unu nọ ọbụna ugbu a, na unu nwere okwu ikpe n’etiti onwe unu. Karị nke ahụ, n’ihi gịnị unu adịghị ekwe ka e megide unu ajọ omume? Karị nke ahụ, n’ihi gịnị unu adịghị ekwe ka e megbuo unu?”—1 Ndị Kọrint 6:1-7.
A pụrụ inwe ọnọdụ ụfọdụ—dị ka nke metụtara ndị òtù azụmahịa bụ ndị na-ekweghị ekwe, ndị ụwa ndị na-ebute ngwá ahịa, ma ọ bụ okwu metụtara ọrụ ndị inshọransị—ndị yiri ihe a ga-elebara anya n’ụlọ ikpe ndị ọchịchị ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ ndị gọọmenti. Ma n’ihe ka ọtụtụ n’ọnọdụ ndị e nwere, onye Kraịst ga-ahọrọ ịta ahụhụ nke mfu ego kama itinye ọgbakọ n’ọnọdụ mmechuihu site n’ịkpụpụ nwanna ya n’ụlọ ikpe n’ihi ụgwọ ọ na-akwụghị akwụ.
N’ihe ka ọtụtụ n’ọnọdụ ndị e nwere, a pụrụ izere ihe ọjọọ ndị ahụ na-esi na ya apụta. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Tupu ị na-ebinye ego ma ọ bụ na-agbaziri nwanna ego, mata ihe ize ndụ ndị pụrụ ịdị na ya. Jiri nlezianya na amamihe mee ihe. Karịsịa ihe nile, “ka e mee ihe unu nile,” gụnyere ihe omume nile nke azụmahịa, “n’ịhụnanya.”—1 Ndị Kọrint 16:14.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A gbanwere aha ndị ahụ agbanwe.
b N’ala ụfọdụ, ndakpọ ụlọ ọrụ na enweghị ike ịkwụghachi ego e bitere ebite na-arụpụtakarị ịtụ mkpọrọ.
c Ụfọdụ ndị agbaziriwo ego dị nta site n’aka ọtụtụ mmadụ dị iche iche. Onye nke ọ bụla, n’amaghị eziokwu zuru ezu banyere ọnọdụ ahụ dum, pụrụ iche na ọ gaghị esiri onye ahụ na-ebiri ego ike ịkwụghachi ya.