“Mụ na Gị Ga-anọ na Paradaịs”
KA Ọ kwụ n’elu osisi ahụ e ji kpọgbuo ya, na-anwụ n’ihe mgbu, onye omekome ahụ rịọrọ nwoke ahụ nke nọ n’akụkụ ya, sị: “Jisọs, cheta m mgbe ị banyere n’alaeze gị.” Jisọs, ọ bụ ezie na ya onwe ya na-anwụkwa n’oké ihe mgbu, zaghachiri, sị: “N’ezie asị m gị taa, Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:42, 43, NW) Lee nnọọ olileanya na-akasi obi nke a bụ inye onye nọ n’ọnụ ọnwụ!
Ma, ị̀ rịbara ama na nsụgharị New World Translation—bụ́ nsụgharị nke e hotara na paragraf bu ụzọ—kanyere akara nkurutụ ume mgbe okwu ahụ bụ “taa” gasịrị mgbe ọ na-edepụta okwu Jisọs ahụ? Nke a na-egosi echiche ahụ nke bụ na ọbụna n’ụbọchị nke ọnwụ ya onwe ya, Jisọs nwere ike ikwe onye omekome ahụ nkwa nke ịdị ndụ n’ime Paradaịs. N’aka nke ọzọ, nsụgharị The New English Bible kanyere akara nkurutụ ume n’okwu Jisọs ahụ n’ụzọ dị otú a: “Ana m agwa gị nke a: taa mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” Ọtụtụ nsụgharị ndị ọzọ kwekọrọ na nke The New English Bible, na-enye echiche nke bụ na Jisọs na onye omekome ahụ nọ n’ọnụ ọnwụ na-eje na Paradaịs kpọmkwem n’ụbọchị ahụ. N’ihi gịnị ka e ji nwee ọdịiche ahụ? Olee usoro nkanye akara nkurutụ ume nke ziri ezi?
N’eziokwu, e nweghị usoro nkanye akara nkurutụ ume n’ihe odide Bible ndị kasị mee ochie nke asụsụ Grik. Ya mere, mgbe a malitere ime nkanye akara nkurutụ ume, ndị depụtagharịrị Bible na ndị na-eme nsụgharị tinyere akara ndị ahụ dị ka nghọta ha nke eziokwu Bible si dị. N’ihi nke a, otú ahụ a na-esikarị ede ya ò ziri ezi? Jisọs na onye mmebi iwu ahụ hà jere Paradaịs kpọmkwem n’ụbọchị ahụ ha nwụrụ?
Ee e, dị ka Bible si kwuo, ha jere n’ebe a na-akpọ n’asụsụ Grik Haʹdes nakwa n’asụsụ Hibru Sheʹol, bụ́ ndị ha abụọ na-ezo aka n’ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Luk 18:31-33; 24:46; Ọrụ 2:31) Banyere ndị nọ n’ebe ahụ, Bible na-asị: “Ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla, . . . Ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ ichepụta echiche ma ọ bụ ihe ọmụma ma ọ bụ amamihe dị na Sheʹol [Grik, Haʹdes], bụ́ ebe ị na-ala.” Ọ bụghị Paradaịs ma ọlị!—Eklisiastis 9:5, 10, NW.
Ọ bụ nanị mgbe ụbọchị nke atọ ruru ka a kpọlitere Jisọs site na Hedis. Mgbe ahụ, n’ime ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ izu isii, ọ pụtara ọtụtụ ugbo nye ndị na-eso ụzọ ya na gburugburu Palestine. N’otu n’ime oge ndị ahụ, Jisọs gwara Meri, sị: “Akarịgoghị m lakwuru Nna m.” (Jọn 20:17) Ya mere, ọbụna mgbe ahụ, o rubeghị ebe ọ bụla nke a pụrụ ịkpọ paradaịs.—Mkpughe 2:7.
N’ime narị afọ nke atọ O.A.—mgbe njikọta nke ozizi ndị Kraịst na nkà ihe ọmụma ndị Grik na-aga n’ihu n’ike n’ike—Origen hotara na Jisọs sịrị: “Taa mụ na gị ga-anọ na Paradaịs nke Chineke.” N’ime narị afọ nke anọ O.A., ndị edemede bụ ndị chọọchị rụrụ ụka megide ịkanye akara nkurutụ ume mgbe okwu ahụ bụ “taa” gasịrị. Nke a na-egosi na ọ dịwo ogologo oge a nọworo na-agụ okwu Jisọs otú ahụ. Ma o gosikwara na ọbụna na narị afọ nke anọ O.A., ụfọdụ ndị na-agụ okwu Jisọs n’ụzọ ahụ e si dee ya ná nsụgharị New World Translation.
Taakwa, ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị nsụgharị na-akanye akara na Luk 23:43 dị ka omenala chọọchị si dị, ụfọdụ na-eme nke ahụ dị ka ọ dị na New World Translation. Dị ka ihe atụ, ná nsụgharị asụsụ German ahụ nke Professor Wilhelm Michaelis mere, okwu Jisọs ahụ na-agụ, sị: “N’ezie ana m emesi gị obi ike ọbụna taa: Mụ na gị (ga-emesịa) nọkọọ na Paradaịs.”
Ya mere, gịnị ka okwu Jisọs pụtaara onye ahụ na-emebi iwu? Ọ pụrụ ịnụworị ihe ahụ a na-ekwu na Jisọs bụ Eze ahụ e kwere ná nkwa. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ maara utu aha ahụ bụ “EZE NDỊ JUU” nke Paịlet mere ka e dee ma kokwasị n’elu isi Jisọs. (Luk 23:35-38) Ọ bụ ezie na ndị ndú okpukpe ahụ gbara isi akwara wee jụ Jisọs, onye omekome nke a nwere nchegharị gosipụtara okwukwe ya, na-asị: “Jisọs, cheta m mgbe ị ga-abịa n’alaeze gị.” Ọ tụghị anya iso Jisọs chịa achị, kama ọ chọrọ irite uru site n’ọchịchị Jisọs. Ya mere, Jisọs, ọbụna n’ụbọchị ahụ nke oké ihe isi ike, kwere nkwa na onye mmehie ahụ ga-eso ya nọkọọ na Paradaịs.
Ọ̀ bụ na paradaịs nke ole? N’ime Bible, Paradaịs mbụ ahụ bụ ubi Iden ahụ yiri ubi a gbara ogige nke nne na nna mbụ ahụ tụfuru. Bible kwere nkwa na a ga-eweghachi Paradaịs elu ala ahụ n’okpuru Alaeze Chineke, nke Jisọs bụ Eze ya. (Abụ Ọma 37:9-11; Maịka 4:3, 4) Ya mere, Jisọs ga-eso onye mmebi iwu ahụ na ọtụtụ ndị ọzọ nwụrụ anwụ a na-apụghị ịgụta ọnụ nọkọọ mgbe ọ kpọlitere ha n’ọnwụ site n’ili bịa ná ndụ n’elu ala nke bụ paradaịs, nweekwa ohere nke ịmụta ime uche Chineke na ịdị ndụ ebighị ebi.—Jọn 5:28, 29; Mkpughe 20:11-13; 21:3, 4.