Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 11/1 p. 3-5
  • Ịbọ Ọ́bọ̀ Ọ̀ Dị Njọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịbọ Ọ́bọ̀ Ọ̀ Dị Njọ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Àgwà nke Ịbọ Ọ́bọ̀ Na-emerụ Ahụ
  • Inye Ahụhụ—Site n’Aka Ònye?
  • Ịbọ Ọ́bọ̀—Site n’Aka Ònye?
  • Ụbọchị Ịbọ Ọ́bọ̀ nke Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Gịnị Ka I Kwesịrị Ime Mgbe E Mejọrọ Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • “Unu na Mmadụ Niile Dịrị n’Udo”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 11/1 p. 3-5

Ịbọ Ọ́bọ̀ Ọ̀ Dị Njọ?

N’otu okporo ụzọ awara awara dị na United States, otu ụgbọ ala emeghị ngwa ịchara otu ụgbọ ala ọzọ n’ụzọ. Onye na-akwọ ụgbọ ala nke abụọ ahụ megwaara ihe site n’ịgba égbè n’ụgbọ ala ahụ nke kpasuru ya iwe, wee gbagbuo otu onye nọ n’ime ya nke na-adịghị ihe ọjọọ ọ bụla o mere.

Otu nwa agbọghọ ka na-eto eto enwetaghị ohere iso n’otu ihe nkiri egwuregwu a na-eme n’ụlọ akwụkwọ ebe nwa agbọghọ nke nwetara ya. O megwatara nwa agbọghọ ahụ ihe site n’ịkọrọ nwa okoro ya na nwa agbọghọ ahụ bụ enyi na nwa agbọghọ ahụ na-agbaso otu nwa okoro n’ụlọ akwụkwọ ọzọ. O si otú a mebie mmekọrịta nwa agbọghọ ahụ na enyi ya nwoke.

ỌTỤTỤ mmadụ na-eche na ha ziri ezi n’imegwara ihe mgbe ha chere na e mejọwo ha. N’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ, ha na-agbaso ụkpụrụ echiche ahụ bụ: “Ewela iwe, megwara.” Taa, ịhụnanya onye agbata obi nọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị nnọọ ala, mmụọ nke ịbọ ọ́bọ̀ na-amụbakwa.—Matiu 24:12.

Ma, olee ụzọ i si ele ịbọ ọ́bọ̀ anya? Ọ bụrụ na i kwere ihe Bible kwuru, ma eleghị anya i kwenyere n’ụkpụrụ ahụ nke bụ na ịbọ ọ́bọ̀ bụ ihe na-ezighị ezi. Ma, ebe ọ bụ na anyị na-ebi n’ime ụwa nke na-adịghị asọpụrụ Chineke, ị pụrụ iche na mgbaghara, nke bụ omume megidere inwe mmụọ nke ịbọ ọ́bọ̀, anaghị abụcha ihe ezi uche dị n’ime ya mgbe nile. Olee ụzọ ị ga-esi meghachi omume ma ọ bụrụ na a ghọgbuo gị ma ọ bụ na ndị omekome awakwasị gị? Ị̀ na-amalite inwe mmụọ nke imegwara ihe ma ọ bụrụ na mmadụ elelịa gị anya ma ọ bụ kwuo okwu nleda anya banyere gị gwa ndị ọzọ? Ị̀ na-enwe mmụọ nke ịbọ ọ́bọ̀ ka ị na-eme mgbaghara?

Àgwà nke Ịbọ Ọ́bọ̀ Na-emerụ Ahụ

N’ezie, e nwere ọ̀tụ̀tụ̀ dịgasị iche iche nke mmejọ. Ma ihe ka ọtụtụ ná ndị na-achọ imegwara mmadụ ihe abụghị ndị ndị omekome wakwasịworo ma ọ bụ ndị e mesoworo oké ihe ọjọọ. “Mmejọ” ndị e hotara ná mmalite nke ihe odide a bụ nnọọ ndị dị nta, ọ bụ ezie na ha yiri ihe buru ibu n’uche ndị ahụ kpebiri imegwara ihe.

Bible kwuru na anyị ekwesịghị ịzụlite mmụọ nke ịbọ ọ́bọ̀. Ilu 24:29 na-enye ndụmọdụ, sị: “Asịla, Dị ka o siri mee m, otú a ka m ga-eme ya.” N’ihi gịnị ka a na-agaghị eme otú ahụ? Otu ihe bụ na mmụọ dị otú ahụ na-emerụ ahụ n’uche na n’anụ ahụ. Echiche nke ịbọ ọ́bọ̀ na-anapụ mmadụ udo nke uche, gbochiekwa ezi iche echiche. Chee echiche banyere akụkọ nke a: “Ndị ọrụ ubi abụọ ndị si n’ụgbọ ala pickup ha na-agbarịta ibe ha égbè gbagburịtara onwe ha n’ebe a na-adọba ụgbọ ala, wee si otú a na-eweta esemokwu nke dịworo 40 afọ ná njedebe, bụ́ nke malitere mgbe ha bụ ụmụntakịrị.” Cheedị nnọọ echiche, n’oge ndụ ha nile, a gwagbuwo echiche nke ndị ikom abụọ ndị a site n’inwe mmụọ nke ịbọ ọ́bọ̀ nke nọgideworo na-akawanye njọ!—Ilu 14:29, 30.

Ihe ọzọ mere na e kwesịghị ịzụlite mmụọ nke ịbọ ọ́bọ̀ bụ na ndị mejọworo mmadụ—ọbụna ndị meworo mmejọ dị ukwuu—pụrụ ịgbanwe. Dị ka ihe atụ, n’otu oge, Pọl onyeozi ‘kwadoro ogbugbu’ nke onye ahụ na-eso ụzọ, bụ́ Stifen, ‘werekwa ịba mbá na ogbugbu na-eku ume megide ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị.’ Ma o mere mgbanwe. Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, Pita onyeozi—onye ndụ ya nọworo n’ihe ize ndụ site n’aka Pọl n’oge mbụ ahụ—kpọrọ ya “Nwanna anyị anyị hụrụ n’anya, bụ́ Pọl.” (Ọrụ 8:1; 9:1; 2 Pita 3:15) Ndị Kraịst pụrụ ịnwaworịị ịbọ ọ́bọ̀ na-ahụ Pọl, karịsịa mgbe ọ nọ na-echere dị ka onye ìsì na Damaskọs. (Ọrụ 9:3-15) Lee nnọọ ajọ mmehie ihe nke ahụ gaara abụworị!

N’ihi ya, Pọl pụrụ inye ndụmọdụ ziri ezi ná Ndị Rom 12:20, sị: “Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, na-azụ ya; ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ ya nkụ, gị mee ka ọ ṅụọ mmiri.” N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụrụ na anyị abọọrọ onwe anyị ọ́bọ̀ n’ahụ onye iro, anyị na-eme ka ọ nọgidesie ike n’omume ya, na-emekwa ka ibuiro ahụ dị n’etiti anyị na ya siwanye ike. Ọ bụrụ na anyị emesoo onye na-emejọ anyị ma ọ bụ na-emerụ anyị ahụ ezi ihe, anyị pụrụ ime ka àgwà ya dajụlata, meekwa ka onye bụbu onye iro ghọọ enyi.

Ịmara adịghị ike nile nke onwe anyị na-enyekwa aka imeri obi ilu nke na-eduje n’ọchịchọ ịbọ ọ́bọ̀. Onye ọbụ abụ ahụ jụrụ, sị: “Ọ bụrụ na ị rịba ajọ omume nile ama, Jaa, Onyenwe anyị [“Jehova,” NW], ònye ga-eguzo?” (Abụ Ọma 130:3) Anyị nile emewo ihe wutere ndị ọzọ ma ọ bụ mejọọ ha. Ọ̀ bụ na anyị enweghị obi ụtọ ma ọ bụrụ na ha achọghị imegwara? N’ihi ya, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iji njide onwe onye dị otú ahụ na-eme ihe? Jisọs nyere ndụmọdụ, sị: “Ya mere ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke unu na-achọ ka mmadụ na-eme unu, na-emekwanụ mmadụ otú a.”—Matiu 7:12.

N’eziokwu, Bible na-ekwu, sị: “Kpọọnụ ihe ọjọọ asị.” (Abụ Oma 97:10; Emọs 5:15) Ma ọ dịghị agwa anyị ka anyị kpọọ onye ahụ na-eme ihe ọjọọ ahụ asị. N’eziokwu, Jisọs nyere anyị iwu, sị: “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwa ekpere nye ndị na-esogbu unu.” (Matiu 5:44) Ọ bụrụ na anyị ejiri mmejọ kwụghachi mmejọ, anyị na-eṅomi mmụọ nke onye ahụ na-eme ihe ọjọọ. Ilu mgbe ochie ahụ na-ekwu, sị: “Asịla, m ga-akwụghachi ụgwọ ihe ọjọọ: lee anya Jehova, ọ ga-azọpụtakwa gị.” (Ilu 20:22) Lee nnọọ àgwà amamihe dị na ya nke ahụ bụ! Lee nnọọ ka o si dị mma karị igosipụta onwe anyị ịbụ ndị mmeri site n’iguzogide ọnwụnwa nke iṅomi onye ahụ na-eme ihe ọjọọ.—Jọn 16:33; Ndị Rom 12:17, 21.

Inye Ahụhụ—Site n’Aka Ònye?

N’eziokwu, ihe omume ụfọdụ na-esi ike karịa mmejọ ma ọ bụ mmerụahụ onwe onye dị iche iche. Gịnị ma a sị na imempụ emetụtawo anyị? Dị ka ọ na-adịkarị, anyị na-eche na ka e wee nweta ikpe ziri ezi, e kwesịrị ime ihe. Ma ọ bụ gịnị ka a ga-eme? N’obodo ụfọdụ, ọ bụghị ihe a na-adịghị ahụkebe bụ́ ndị mmadụ ime ihe n’onwe ha iji bọọ ọ́bọ̀. Ma mba ndị dị otú ahụ abụwo ndị esemokwu mwụfu ọbara jupụtara na ha. Taa, iwu nke Chineke, nakwa n’ihe ka ọtụtụ n’ọnọdụ ndị e nwere, iwu nke ụmụ mmadụ, adịghị nke ọ bụla na-ekwe ka ụmụ mmadụ bọọ ọ́bọ̀ n’onwe ha maka imempụ, e nwekwara ezi ihe kpatara nke a. Ime ihe ike onwe onye dị otú ahụ na-amụpụta nanị ime ihe ike ka ukwuu.

Ya bụrụ otú ahụ, onye imempụ metụtara ọ̀ ga-agbachi nnọọ nkịtị nọrọ na-anara mkparị ahụ? Ọ bụchaghị otú ahụ. Mgbe e merụrụ anyị ahụ ma ọ bụ mebie ihe onwunwe anyị, e nwere ndị na-achị achị anyị ga-echigharịkwuru. Ị pụrụ ịchọ ịkpọ ndị uwe ojii. N’ụlọ ọrụ, jekwuru onye nlekọta ọrụ. N’ụlọ akwụkwọ, ị pụrụ ịchọ ijekwuru onye isi ụlọ akwụkwọ. Nke ahụ bụ otu n’ime ihe mere ha ji nọrọ n’ebe ahụ—ịkwalite ikpe ziri ezi. Bible na-agwa anyị na ndị na-achị achị bụ “onye na-ejere Chineke ozi, onye ọ́bọ̀ iwetara onye na-eme ihe ọjọọ iwe.” (Ndị Rom 13:4) Ikpe ziri ezi chọrọ ka ndị ọchịchị jiri ikike ha mee ihe, kwụsị omume ọjọọ, nyekwa ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ.

N’eziokwu, mgbe ụfọdụ ikpe ziri ezi adịghị abịa ngwa ngwa. Otu onye edemede ike ụwa gwụworo kwuru, sị: “Ikpe ziri ezi yiri ụgbọ okporo ígwè nke na-abịa n’azụ oge ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mgbe nile.” N’ezie, mgbe ụfọdụ ụgbọ okporo ígwè ahụ adịghị abịaru ma ọlị. Ndị na-eme ihe n’ikpe na-ezighị ezi pụrụ ịbụ ndị dị ike nke ukwuu nke na ndị ọchịchị apụghị ịchịkwata ha. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ụzọ amamihe dị na ya bụ ijide onwe onye. “Mmụọ nile nke onwe ya ka onye nzuzu na-eme ka ọ pụta ìhè: ma onye maara ihe na-egbochi mmụọ ya, na-emekwa ka ọ dajụọ,” ka Bible na-asị.—Ilu 29:11.

Ịbọ Ọ́bọ̀—Site n’Aka Ònye?

Ijide onwe anyị n’okpuru mmejọ ga-esi otú a wetara anyị abamuru, anyị pụkwara iji obi dị nwayọọ chere, na-amara na ọ bụrụ na a ga-eme ihe n’ikpe ziri ezi, Chineke ga-eme ya n’oge kwesịrị ekwesị. Jehova maara na ihe ọjọọ nke a na-akparaghị ókè na-eduje n’oké ajọ ihe. (Eklisiastis 8:11) Ọ gaghị ekwe ka ndị mmebi iwu obi kpọworo nkụ nọgide na-akpagbu ihe a kpọrọ mmadụ ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji nye anyị ndụmọdụ, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, unu abọlara onwe unu ọ́bọ̀, kama chaaranụ iwe ahụ ụzọ: n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Mụ nwe ọ́bọ̀; mụ onwe m ga-enyeghachi, ka Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] kwuru.” (Ndị Rom 12:19) N’eziokwu, Bible na-ekwu okwu banyere ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ nke Onye Okike ahụ nwere. Gịnị ka ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ nke a ga-abụ? Òle ndị ga-enweta ịbọ ọ́bọ̀ Chineke? Anyị ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.

Igbe dị na peeji nke 4]

Iji chịkwaa mkpali nke ịbọ ọ́bọ̀, cheta na

□ ihe banyere ikpe ziri ezi na-emetụ Chineke n’obi

□ ibu mmụọ nke imegwara ihe n’obi na-emerụ ahụ

□ inwe obi ọma na-ebelatakarị nsogbu e nwere n’ebe ndị ọzọ nọ

□ e lefuruwo ọtụtụ n’ime njehie ndị nke anyị anya

□ ndị na-emejọ emejọ pụrụ ịgbanwe

□ anyị na-emeri ụwa site n’iguzogide ụzọ ya nile

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya