Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 11/15 p. 8-13
  • Njide Onwe Onye—n’Ihi Gịnị Ka O Ji Dị Oké Mkpa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Njide Onwe Onye—n’Ihi Gịnị Ka O Ji Dị Oké Mkpa?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mere Njide Onwe Onye Ji Dị Oké Mkpa
  • Ihe Nlereanya Ndị Bụ Ihe Ịdọ Aka ná Ntị
  • Ihe Ọ Dị Mkpa Ka Anyị Chịkwaa
  • Ihe Mere Njide Onwe Onye Ji Bụrụ Nnọọ Ihe Ịma Aka
  • Ịzụlite Mkpụrụ nke Njide Onwe Onye
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Iji Nweta Ihe Nrite ahụ, Na-egosipụta Njide Onwe Onye!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Tụkwasịnụ Njide Onwe Onye n’Ihe Ọmụma Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Mụta Ịna-ejide Onwe Gị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 11/15 p. 8-13

Njide Onwe Onye—n’Ihi Gịnị Ka O Ji Dị Oké Mkpa?

“N’akụkụ unu tụkwasịnụ ịnụ ọkụ n’obi nile, nyezuokwanụ ịdị mma n’okwukwe unu; nyezuokwa ihe ọmụma n’ịdị mma unu; nyezuokwa ijisi onwe unu ike n’ihe ọmụma unu.”—2 PITA 1:5, 6.

1. Ngosipụta dị aṅaa nke kwesịrị ịrịba ama nke njide onwe onye n’ụzọ anụ ahụ weere ọnọdụ n’ime narị afọ nke 19?

N’ENWEGHỊ ihe ịrụ ụka ọ bụla, otu n’ime ngosipụta kasị dịrị ịtụnanya nke ijisi onwe onye ike n’ụzọ anụ ahụ bụ nke Charles Blondin gosipụtara n’ọkara nke ikpeazụ nke narị afọ nke 19. Dị ka otu akụkọ si kwuo, ọ gafere ebe ahụ mmiri na-esi n’elu asọda, bụ́ Niagara Falls, ọtụtụ ugbo, nke mbụ na 1859, n’eriri e kegidere n’elu nke dị 340 mita n’ogologo, dịrịkwa 50 mita n’elu mmiri ahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, o meghachiri ihe ahụ n’oge nke ọ bụla na-eme ngosipụta dị iche nke ikike o nwere: mgbe e kechiri ya anya, n’ime akpa, na-akpọre wheelbarrow, na-eji osisi o kegidere n’ụkwụ ya na-eje ije, na mgbe ọ kwọ mmadụ n’azụ ya. N’otu ọnọdụ ọzọ, o guzo n’elu osisi ndị o kegidere n’ụkwụ ya malie elu ma tụgharịa n’ime ikuku n’elu eriri nke e kegidere n’ebe dị 52 mita n’ịdị elu site n’ala. Iji guzoo nke ọma n’ọnọdụ dị otú ahụ chọrọ oké njide onwe onye n’ụzọ anụ ahụ. Maka mgbalị nile o mere, e ji ma otuto ma ihe onwunwe nyeghachi Blondin ụgwọ ọrụ.

2. Ụdị ihe omume ndị ọzọ dị aṅaa ka e nwere, bụ́ ndị chọrọ njide onwe onye n’ụzọ anụ ahụ?

2 Ọ bụ ezie na ọtụtụ mmadụ agaghị enwe ike ime ụdị ihe ngosi ndị ahụ, ma ịdị mkpa nke njide onwe onye n’ụzọ anụ ahụ ná ngosipụta nke nkà a mụrụ amụ ma ọ bụ n’egwuregwu doro anyị nile anya. Dị ka ihe atụ, n’ịkọwa nkà nke onye ahụ a ma ama n’ịkpọ ngwá egwú piano, bụ́ Vladimir Horowitz nke nwụworo anwụ, otu onye ọkà n’iti egwú kwuru, si: “Ihe na-akpali mmasị m bụ mmetụta nke ịbụ onye na-ejide onwe ya nke ọma . . . , mmetụta nke na-egosi na e ji ike hiri nne nke ukwuu na-eme ihe.” Otu akụkọ ọzọ banyere Horowitz kwuru banyere “iri afọ asatọ nke mkpịsị aka ndị na-efegharị n’ụzọ a haziri nnọọ nke ọma.”

3. (a) Gịnị bụ ụdị njide onwe onye nke kasị chọọ ihe n’aka mmadụ, oleekwa ụzọ e si kọwaa ya? (b) Gịnị ka okwu Grik ahụ a sụgharịrị ịbụ ‘njide onwe onye’ n’ime Bible pụtara?

3 Ọ na-ewe mgbalị dị ukwuu iji zụlite nkà ndị dị otú ahụ. Otú ọ dị, ihe dị mkpa karị, bụrụkwa ihe ịma aka karị, bụ njide onwe onye. A kọwawo ya dị ka “ike nchịkwa mmadụ nwere n’ebe mkpali, mmetụta uche ma ọ bụ ọchịchọ ndị ọ na-enwe dị.” N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, a kọwawo okwu ahụ a sụgharịrị ịbụ ‘njide onwe onye’ na 2 Pita 1:6 na n’ebe ndị ọzọ, dị ka “àgwà nke mmadụ onye nwere ike nchịkwa n’ebe ọchịchọ na mkpali ya nile dị, karịsịa n’ebe agụụ nke anụ ahụ ya dị.” A kpọwo njide onwe onye nke mmadụ n’otu n’otu “ihe kasị elu nke mmadụ pụrụ imezu.”

Ihe Mere Njide Onwe Onye Ji Dị Oké Mkpa

4. Ihe ọjọọ dị aṅaa ka enweghị njide onwe onye rụpụtaworo?

4 Lee nnọọ oké ajọ ihe enweghị njide onwe onye nọworo na-arụpụta! N’ụzọ bụ isi, ọtụtụ nsogbu dị n’ụwa taa bụ n’ihi enweghị njide onwe onye. N’eziokwu, anyị na-ebi n’ime “mgbe ikpeazụ,” mgbe e nwere “oge dị oké egwu.” Ụmụ mmadụ bụ “ndị na-adịghị ejide onwe ha” nke na-abụkarị n’ihi inwe anyaukwu, nke otu ụdị ya bụ ịbụ “ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya.” (2 Timoti 3:1-5) E mewo ka eziokwu nke a dị mwute pụta ìhè nye anyị n’ụzọ siri ike site ná nkewapụ nke ihe karịrị 40,000 ndị jehiere ejehie site ná mkpakọrịta nke ọgbakọ ndị Kraịst n’ime afọ ije ozi gara aga, nke akụkụ ka ukwuu n’ime ha bụ n’ihi omume ndị jọbigara njọ ókè. A ghaghị ịtụkwasị ná ndị a ọtụtụ ndị a tụworo mmehie ha n’anya, nke ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ n’ihi adịghị ọcha nke mmekọahụ ma ha nile bụ n’ihi enweghị njide onwe onye. Eziokwu ahụ dịkwa mwute bụ na ụfọdụ ndị nọworo ogologo oge dị ka ndị okenye tụfusịrị ihe ùgwù ije ozi ha nile dị ka ndị nlekọta n’ihi otu ihe ahụ.

5. Olee ụzọ a pụrụ isi mee ihe atụ ịdị mkpa nke njide onwe onye?

5 A pụrụ iji ụgbọ ala mee ihe atụ nke ịdị mkpa nke njide onwe onye. O nwere ụkwụ anọ nke na-eme ka o nwee ike ịgagharị agagharị, nwee injin nke siri ike nke pụrụ ime ka ụkwụ ya ndị ahụ na-agbagharị n’ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ dị ukwuu, nweekwa breeki ndị pụrụ ịkwụsị ha. Otú ọ dị, ọdachi pụrụ ịbịa, ọ gwụlakwa ma e nwere onye nọ n’oche onye draịva ikpebi ebe ụkwụ ya ndị ahụ ga-echela ihu, ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ ha ga-agbaru, na mgbe ha ga-akwụsị, site n’iji ihe e ji anyagharị ya, ebe a na-azọ ụkwụ iji nye moto ọkụ, na breeki, mee ihe n’ụzọ a haziri nke ọma.

6. (a) Okwu dị aṅaa banyere ịhụnanya ka a pụkwara ikwu banyere njide onwe onye? (b) Ndụmọdụ ọzọ dị aṅaa ka anyị na-aghaghị iburu n’uche?

6 Ọ ga-abụ ihe siri ike ịsị na e kwubigawo okwu ókè banyere ịdị mkpa nke njide onwe onye. A pụkwara ikwu ihe ahụ Pọl onyeozi kwuru ná 1 Ndị Kọrint 13:1-3 banyere ịdị mkpa nke ịhụnanya, banyere njide onwe onye. N’agbanyeghị otú anyị si bụrụ ndị ọkà okwu ihu ọha okwu na-aga were were n’ọnụ, n’agbanyeghị ókè anyị nweruworo n’ihe ọmụma na okwukwe site n’àgwà ọmụmụ ihe dị mma, n’agbanyeghị ọrụ anyị pụrụ ịdị na-arụ maka abamuru ndị ọzọ, ọ gwụlakwa ma ànyị gosipụtara njide onwe onye, ihe ndị ahụ nile bụ n’efu. Anyị kwesịrị iburu n’uche okwu Pọl, bụ́: “Ùnu amataghị na ndị na-agba ọsọ n’ebe ọsọ, ha nile na-agba ọsọ, ma ọ bụ otu onye na-agbata ihe ọsọ? Na-agbanụ otú a, ka unu wee gbata. Mmadụ ọ bụla nke na-agbasi mgba ike ịka ibe ya n’egwú unu na-ejidekwa onwe ya n’ihe nile.” (1 Ndị Kọrint 9:24, 25) Ịdọ aka ná ntị Pọl nke dị ná 1 Ndị Kọrint 10:12 na-enyere anyị aka ijide onwe anyị n’ihe nile: “Onye na-eche na ọ na-eguzo, ya lezie anya ka ọ ghara ịda.”

Ihe Nlereanya Ndị Bụ Ihe Ịdọ Aka ná Ntị

7. (a) Olee ụzọ enweghị njide onwe onye si mee ka agbụrụ mmadụ banye n’ụzọ ịla n’iyi ya? (b) Ihe nlereanya ndị ọzọ dịgasị aṅaa nke enweghị njide onwe onye n’ogologo oge gara aga ka Akwụkwọ nsọ na-enye anyị?

7 Site n’ikwe ka mmetụta ndị ọ na-enwe duzie ihe omume ya kama ịbụ ichezi echiche nke ọma, Adam egosipụtaghị njide onwe onye. N’ihi nke a, ‘mmehie batara n’ime ụwa, ọnwụ esikwa n’aka mmehie bata.’ (Ndị Rom 5:12) Ogbugbu ọchụ mbụ e gburu bụ n’ihi enweghị njide onwe onye, n’ihi na Jehova Chineke adọworị Ken aka ná ntị, sị: ‘N’ihi gịnị ka ị na-ewe iwe dị ọkụ? Ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ihu gị gbarụrụ? N’ọnụ ụzọ ka mmehie na-amakpu, o kwesịkwara ka gị onwe gị chịa ya.’ N’ihi na Ken enweghị ike ịchị mmehie ahụ, o gburu nwanne ya nwoke bụ Ebel. (Jenesis 4:6-12) Nwunye Lọt egosipụtaghịkwa njide onwe onye. O nweghị nnọọ ike iguzogide ọnwụnwa ahụ nke ileghachi anya azụ. Gịnị ka enweghị njide onwe onye ya mere ka ọ tụfuo? Ee, ndụ ya onwe ya!—Jenesis 19:17, 26.

8. Ahụmahụ nke ndị ikom atọ dị aṅaa n’oge ochie na-enye anyị ịdọ aka ná ntị banyere mkpa nke njide onwe onye?

8 Diọkpara Jekọb, bụ Reuben, tụfuru ọnọdụ ya dị ka diọkpara n’ihi enweghị njide onwe onye. O merụrụ ihe ndina nna ya site n’iso otu n’ime ndị iko nwanyị Jekọb nwee mmekọahụ. (Jenesis 35:22; 49:3, 4; 1 Ihe Emere 5:1) N’ihi na oké iwe were Mosis n’ihi ụzọ ụmụ Israel si jiri ntamu, ime mkpesa, na nnupụisi ha nwaa ya ọnwụnwa, a napụrụ ya ihe ùgwù ahụ a na-achọsi ike nke ịbanye n’ime Ala Nkwa ahụ. (Ọnụ Ọgụgụ 20:1-13; Deuterọnọmi 32:50-52) Ọbụna Eze Devid onye kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ‘onye dị ka obi Chineke si chọọ,’ banyere n’oké nsogbu n’ihi enweghị njide onwe onye n’otu mgbe. (1 Samuel 13:14; 2 Samuel 12:7-14) Ihe nlereanya nile dị otú a na-enye anyị ezi ịdọ aka ná ntị na ọ dị mkpa ka anyị gosipụta njide onwe onye.

Ihe Ọ Dị Mkpa Ka Anyị Chịkwaa

9. Olee akụkụ akwụkwọ nsọ ụfọdụ na-eme ka ọ pụta ìhè, bụ́ mkpa nke ịchịkwa echiche na mkpali anyị nile?

9 Nke mbụ, njide onwe onye metụtara echiche na mmetụta nile anyị. A na-ezokarị aka n’ebe ndị a dị n’ime Akwụkwọ nsọ site n’iji okwu ihe atụ ndị dị ka “obi” na “akụrụ” na-eme ihe. Ihe anyị na-ekwe ka uche anyị dịkwasị na ya na-enyere anyị aka ma ọ̀ bụkwanụ gbochie anyị ná mgbalị anyị na-eme ime ihe na-atọ Jehova ụtọ. Njide onwe onye dị mkpa ka anyị wee gbasoo ndụmọdụ Akwụkwọ nsọ ahụ dị ná Ndị Filipaị 4:8, ịnọgide na-atụgharị uche n’ihe ndị bụ eziokwu, ndị dị ọcha, ndị dị mma. Onye ọbụ abụ bụ Devid kwupụtara echiche ndị dị otú ahụ n’ekpere, na-asị: “Ka . . . ntụgharị nke obi m bụrụ ihe na-atọ ụtọ n’ihu gị, Jehova, bụ́ oké nkume m, na onye mgbapụta m.” (Abụ Ọma 19:14) Iwu nke iri—ịghara inwe ọchịchọ maka ihe ọ bụla bụ nke mmadụ ọzọ—chọrọ ka mmadụ chịkwaa echiche ya. (Ọpụpụ 20:17) Jisọs mere ka ịdị mkpa nke ịchịkwa echiche na mmetụta anyị nile pụta ìhè mgbe o kwuru, sị: “Nwoke ọ bụla nke na-ele nwanyị anya ka agụụ ya wee gụọ ya, ọ kwasịwo ya iko n’obi ya ugbu a.”—Matiu 5:28.

10. Akụkụ ihe odide Bible dịgasị aṅaa na-emesi ya ike mkpa ọ dị ịchịkwa okwu ọnụ anyị?

10 Njide onwe onye metụtakwara okwu ọnụ anyị. N’ezie, e nwere ọtụtụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-enye anyị ndụmọdụ ka anyị jide ire anyị nke ọma. Dị ka ihe atụ: “Chineke nọ n’eluigwe, ma gị onwe gị nọ n’elu ụwa: n’ihi nke a mee ka okwu gị dị ole na ole.” (Eklisiastis 5:2) “N’ọtụtụ okwu njehie adịghị akwụsị: ma onye na-egbochi egbugbere ọnụ ya abụọ bụ onye nwere uche.” (Ilu 10:19) “Ka okwu ọ bụla nke na-ere ure ghara isi n’ọnụ unu pụta, kama ihe bụ ezi ihe, iwuli mmadụ elu dị ka ụlọ, dị ka mkpa si dị . . . ka e wepụ . . . iti mkpu na nkwulu nile, ha na obi ọjọọ nile, n’etiti unu.” Pọl gakwara n’ihu inye ndụmọdụ ka e wepụsịa n’etiti anyị okwu nzuzu na okwu na-abaghị n’ihe.—Ndị Efesọs 4:29, 31; 5:3, 4.

11. Olee ụzọ Jemes si leba anya ná nsogbu nke ijide ire nke ọma?

11 Jemes, bụ́ onye otu nne ji ya na Jisọs, katọrọ okwu a na-akparaghị ókè, gosikwa ụzọ o si bụrụ ihe siri ike ịchịkwa ire, na-asị: “Otú ahụkwa, ire bụ akụkụ ahụ dị nta ma ọ na-anya isi nke ukwuu. Lee! Otú ọ na-ewe ọkụ dị nta iji sunye ọkụ n’oké ọhịa buru ibu! Ee, ire bụ ọkụ, e mere ka ire jupụta n’ajọ omume n’etiti ihe ndị dị anyị n’ahụ, n’ihi na ọ na-enye ahụ anyị dum ntụpọ, na-amụnyekwa ọkụ n’ihe nke na-aga dị ka e si kee ya, Gehena na-amụnyekwa ya ọkụ. N’ihi na ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ ịzụ̀ta, ha azụ̀tawokwa ụdị anụ ọhịa nile na nnụnụ na ihe na-akpụ akpụ na anụ mmiri. Ma ire, ọ dịghị mmadụ ọ bụla nke pụrụ ịzụ̀ta ya. Ọ bụ ihe dị aghara nke na-akpata mmerụahụ, o jupụtakwara ná nsí na-egbu egbu. Anyị na-eji ya agọzi Jehova, ọbụna Nna ahụ, ma anyị na-ejikwa ya akọcha ụmụ mmadụ ndị e meworo ka ha dịrị ‘n’oyiyi Chineke.’ Site n’otu ọnụ ahụ ka ngọzi na nkọcha na-esi apụta. O kwesịghị ekwesị, ụmụnna m, ka ihe ndị a nọgide na-adị otú a.”—Jemes 3:5-10, NW.

12, 13. Akụkụ akwụkwọ nsọ dịgasị aṅaa na-egosi ịdị mkpa nke ịchịkwa ihe omume na akparamagwa anyị?

12 N’ezie, njide onwe onye metụtara ihe ndị anyị na-eme. Otu akụkụ ebe ọ dị mkpa inwe njide onwe onye dị ukwuu metụtara mmekọrịta anyị na ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe anyị. E nyere ndị Kraịst iwu, sị: “Gbanarịnụ mmekọahụ na-adịghị ọcha.” (1 Ndị Kọrint 6:18, New International Version) A gbara ndị bụ di ume ka ha kpaara mmasị mmekọahụ ha ókè n’ebe nanị nwunye nke aka ha nọ, na-abụ ndị a gwara n’otu akụkụ, sị: “Ṅụọ mmiri sitere n’olulu nke aka gị, na mmiri na-eru eru site n’ime olulu mmiri nke aka gị.” (Ilu 5:15-20) A gwara anyị n’ụzọ doro anya na “Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko ikpe, ha na ndị na-akwa iko, bụ́ ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di.” (Ndị Hibru 13:4) Njide onwe onye dị mkpa karịsịa n’ebe ndị ahụ na-achọ ịzụlite onyinye nke ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye nọ.—Matiu 19:11, 12; 1 Ndị Kọrint 7:37.

13 Jisọs chịkọtara okwu nile metụtara omume anyị n’ebe mmadụ ibe anyị nọ mgbe o nyere ihe ahụ a mazuru ebe nile dị ka “Ụkpụrụ Ọma” ahụ, na-asị: “Ya mere ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke unu na-achọ ka mmadụ na-eme unu, na-emekwanụ mmadụ otú a, unu onwe unu: n’ihi na nke a bụ [“ihe,” NW] iwu na ndị amụma Chineke [“pụtara,” NW].” (Matiu 7:12) N’ezie, ọ na-ewe njide onwe onye ịghara ikwe ka mkpali nke ịchọ ọdịmma onwe onye ma ọ bụ nrụgide ma ọ bụ ọnwụnwa ndị si n’èzí mee ka anyị mesoo ndị ọzọ n’ụzọ dị iche n’otú anyị ga-achọ ka ha si mesoo anyị.

14. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Okwu Chineke na-enye banyere ihe oriri na ihe ọṅụṅụ?

14 E nwekwara okwu banyere njide onwe onye n’ihe metụtara ihe oriri na ihe ọṅụṅụ. Okwu Chineke nyere anyị ndụmọdụ amamihe dị na ya, sị: “Anọla n’etiti ndị na-aṅụbiga mmanya vine ókè: n’etiti ndị na-eribiga anụ ókè.” (Ilu 23:20) Karịsịa n’ihe banyere oge anyị a, Jisọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Ma na-ezenụ onwe unu, ka a ghara iwere imebiga ajọ ihe ókè, na ịṅụbiga mmanya ókè, na nchegbu nke ndụ a, bogbuo obi unu ma eleghị anya, ụbọchị ahụ wee bịakwasị unu na mberede dị ka ọnyà.” (Luk 21:34, 35) Ee, njide onwe onye metụtara echiche anyị, mmetụta anyị, tinyekwara okwu ọnụ anyị na ihe ndị anyị na-eme.

Ihe Mere Njide Onwe Onye Ji Bụrụ Nnọọ Ihe Ịma Aka

15. Olee ụzọ Akwụkwọ nsọ si gosi na mmegide Setan na-emegide ndị Kraịst igosipụta njide onwe onye bụ ihe dị adị n’ezie?

15 Njide onwe onye abụghị ihe dị mfe ịzụlite n’ihi na, dị ka ndị Kraịst nile maara, anyị nwere ndị iro atọ siri ike ndị na-eguzo megide anyị igosipụta njide onwe onye. Iji malite, anyị nwere Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. Akwụkwọ nsọ ahapụrụghị anyị ihe ịrụ ụka ọ bụla banyere eziokwu ahụ nke bụ na ha dị adị n’ezie. Otú a, anyị na-agụ na “Setan batara n’ime” Judas nwa mgbe nta tupu ọ pụọ jee ịrara Jisọs nye n’aka ndị iro. (Jọn 13:27) Pita onyeozi jụrụ Ananaịas, sị: “N’ihi gịnị ka Setan mejuru obi gị ịgwa mmụọ nsọ okwu ụgha.” (Ọrụ 5:3) N’ụzọ kwesịrị nnọọ ekwesị, Pita dọkwara aka ná ntị, sị: “Nweenụ anya udo, na-echenụ nche: onye ahụ nke na-ekuru unu gaa ikpe, bụ́ Ekwensu, dị ka ọdụm na-agbọ ụja, ọ na-ejegharị, na-achọ onye ọ ga-elomi.”—1 Pita 5:8.

16. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst na-aghaghị igosipụta njide onwe onye n’ihe banyere ụwa nke a?

16 Ná mgbalị ha igosipụta njide onwe onye, ndị Kraịst aghaghịkwa ịgba mgba megide ụwa nke a nke na-atọgbọ “n’aka ajọ onye ahụ,” Setan bụ Ekwensu. Banyere ya, Jọn onyeozi dere, sị: “Unu ahụla ụwa, ma ọ bụ ihe nke dị n’ụwa, n’anya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ ụwa n’anya, ịhụnanya nke Nna anyị adịghị n’ime ya. N’ihi na ihe nile nke dị n’ụwa, bụ́ agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ, na agụụ ihe ọjọọ nke anya, na oké okwu nke ibi obi [“oké ngosi nke ihe mmadụ nwere,” NW], esiteghị ná Nna anyị, kama o sitere n’ụwa. Ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” Ọ gwụlakwa ma ànyị gosipụtara njide onwe onye, guzosiekwa ike megide mkpali ọ bụla nke ịhụ ụwa n’anya, anyị ga-adara mmetụta ya n’ala, dị ka onye ahụ ya na Pọl na-arụkọbu ọrụ, bụ́ Demas, mere.—1 Jọn 2:15-17; 5:19; 2 Timoti 4:10.

17. Ihe isi ike dị aṅaa banyere njide onwe onye ka anyị bu pụta ụwa?

17 Dị ka ndị Kraịst, njide onwe onye dịkwa anyị mkpa ka anyị wee nwee ihe ịga nke ọma n’ịgba mgba anyị megide adịghị ike na ịda mba anụ ahụ ndị anyị ketara eketa. Anyị apụghị ịgbanarị eziokwu ahụ nke bụ na “nchepụta nke obi mmadụ dị njọ site na nwata.” (Jenesis 8:21) Dị ka Eze Devid, ‘n’ajọ omume ka a mụpụtara anyị, ọ bụkwa ná mmehie ka nne anyị tụụrụ ime anyị.’ (Abụ Ọma 51:5) Nwata a mụrụ ọhụrụ amaghị ihe ọ bụla banyere njide onwe onye. Mgbe ọ chọrọ otu ihe, ọ na-anọgide na-akwa ákwá ruo mgbe o nwetara ya. Otu akụkọ e nwere banyere ịzụ ụmụntakịrị kwuru, sị: ‘Ụmụntakịrị na-atụgharị uche n’ụzọ dị nnọọ iche n’ụzọ ndị toworo eto si eme. Ụmụntakịrị na-abụ ndị na-achọ ọdịmma onwe ha nanị, ha adịghị anakwerekwa nrụgide ọ bụla n’agbanyeghị otú ezi uche si dịrị n’ime ya n’ihi na ha enweghị ike “itinye onwe ha n’ọnọdụ onye ọzọ.”’ N’eziokwu, “uche gbagọrọ agbagọ bụ ihe e kekọtaworo n’obi nwata.” Otú ọ dị, site n’iji “mkpanaka nke ịdọ aka ná ntị” mee ihe, ọ ga-eji nwayọọ nwayọọ mụta na e nwere ụkpụrụ ndị ọ na-aghaghị irubere isi, na ọ ghaghịkwa ibelata ịchọ ọdịmma onwe onye nanị.—Ilu 22:15.

18. (a) Dị ka Jisọs si kwuo, ọchịchọ dịgasị aṅaa dị n’ime obi ihe atụ? (b) Okwu dị aṅaa nke Pọl na-egosi na ọ maara banyere nsogbu nke dị n’ihe metụtara igosipụta njide onwe onye?

18 Ee, ọchịchọ ọdịmma onwe onye nanị ndị anyị bu pụta ụwa na-eche ihe ịma aka n’ihu anyị mgbe a bịara n’ihe banyere igosipụta njide onwe onye. Ọchịchọ ndị ahụ na-adị n’ime obi ihe atụ, bụ́ nke Jisọs kwuru banyere ya, sị: “N’obi ka ajọ echiche nile, igbu mmadụ nile, ịkwa iko nile nke ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di, ịkwa iko nile, ohi nile, àmà ụgha nile, nkwulu nile, si apụta.” (Matiu 15:19) Ọ bụ ya mere Pọl ji dee, sị: “Ezi ihe nke m na-achọ ka m na-emeghị: kama ihe ọjọọ nke m na-achọghị, ihe ahụ ka m na-eme. Ma ọ bụrụ na ihe m na-achọghị, ihe ahụ ka m na-eme, ọ bụghị mụ onwe m na-arụtakwa ya ọzọ, kama ọ bụ ihe ahụ nke na-ebi n’ime m, bụ mmehie.” (Ndị Rom 7:19, 20) Otú ọ dị, nke a abụghị ọnọdụ a na-enweghị olileanya isi na ya apụta, n’ihi na Pọl dekwara, sị: “Ana m etipụta ahụ m ọnyá, meekwa ya ka ọ bụrụ ohu m: ka mụ onwe m ghara ịghọ onye a jụrụ ajụ n’ụzọ ọ bụla, mgbe m kwusasịrị okwu Chineke nye ndị ọzọ.” Itipụta ahụ ya ọnyá chọrọ ya n’aka igosipụta njide onwe onye.—1 Ndị Kọrint 9:27.

19. N’ihi gịnị ka Pọl pụrụ iji kwuo n’ụzọ ziri ezi na ya tipụtara ahụ ya ọnyá?

19 Pọl pụrụ ikwu n’ụzọ ziri ezi na ya tipụtara ahụ ya ọnyá, n’ihi na igosipụta njide onwe onye na-abụ ihe siri ike n’ihi ọtụtụ ihe ndị na-emetụta anụ ahụ, dị ka ọbara mgbali elu, ahụ erughị ala, ehighị ụra nke ọma, isi ọwụwa, nri agbarighị n’afọ nke ọma, na ihe ndị ọzọ. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle àgwà na ihe enyemaka ndị ga-enyere anyị aka igosipụta njide onwe onye.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Gịnị bụ ihe nlereanya ụfọdụ nke ndị ihe funahụrụ n’ihi enweghị njide onwe onye?

◻ N’akụkụ dịgasị aṅaa ka anyị na-aghaghị inwe njide onwe onye?

◻ Ndị iro atọ dị aṅaa na-eme ka o siere anyị ike igosipụta njide onwe onye?

[Foto dị na peeji nke 10]

Ọ dị mkpa ka ndị Kraịst gosipụta njide onwe onye n’ihe banyere ihe oriri na ihe ọṅụṅụ

[Foto dị na peeji nke 11]

Njide onwe onye ga-enyere anyị aka izere ịgba àsị̀rị̀ nke na-emerụ ahụ

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 8]

Historical Pictures Service

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya