Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 11/15 p. 31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Eze Abụọ ahụ Agbanwee
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Ị̀ Maara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ị̀ Maara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 11/15 p. 31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

◼ N’ihi gịnị ka e ji na-ele afọ 29 O.A. anya dị ka afọ dị oké mkpa n’akụkọ ihe mere eme Bible nke ọha mmadụ nakweere kama ịbụ 14 O.A., bụ́ mmalite nke ọchịchị Taịbiriọs Siza, onye a kpọtụrụ aha na Luk 3:1?

E kwughị ihe banyere mmalite nke ọchịchị Taịbiriọs n’ime Bible, kama e kwuru otu ihe mere n’akụkụ ikpeazụ nke afọ nke 15 ya. Nke a na-enyere ndị mmụta Bible aka ịchọpụta na ihe ahụ mere n’afọ 29 O.A., bụ́ nke a pụrụ ile anya dị ka afọ dị oké mkpa n’akụkọ ihe mere eme nke ọha mmadụ nakweere dị ka Bible si ele ihe anya.

Ọchịchị nke onye ọchịchị alaeze ukwu nke abụọ nke Rom, bụ́ Taịbiriọs Siza bụ nke a nakweere nke ọma n’akụkọ ihe mere eme. Akwụkwọ bụ The New Encyclopædia Britannica na-asị: “N’afọ AD 14, n’August 19, Augustus [bụ́ onye ọchịchị alaeze ukwu nke mbụ] nwụrụ. Taịbiriọs, bụ́ ọkaaka ugbu a, ghọgburu nzukọ ndị ome iwu, wee ghara ikwe ka ha kpọpụta ya dị ka onye ọchịchị alaeze ukwu ahụ ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ọnwa, ma na September 17, ọ nọchiri ọkwa ọchịchị ahụ.”a

Oge nke a a kara aka maka mmalite nke ọchịchị Taịbiriọs dị mkpa n’ụzọ Bible si ele ihe anya n’ihi na Luk 3:1-3 na-ekwu banyere ije ozi nke Jọn Onye Na-eme Baptism, sị: “Ma n’afọ nke iri na ise n’ọchịchị nke Taịbiriọs Siza, mgbe Pọntiọs Paịlet bụ onye na-achị Judia, . . . okwu Chineke bịakwutere Jọn nwa Zakaraịa n’ọhịa. O wee bịa n’ala nile dị Jọdan gburugburu, na-ekwusa baptism nke nchegharị ka e wee gbaghara mmehie.”

Jọn amaliteghị nkwusa na ime baptism mgbe Taịbiriọs ghọrọ onye ọchịchị alaeze ukwu ahụ, kama o mere nke a “n’afọ nke iri na ise n’ọchịchị Taịbiriọs Siza.” Afọ nke 15 ahụ malitere n’oge mgbụsị akwụkwọ osisi nke afọ 28 O.A. ruo n’oge mgbụsị akwụkwọ osisi nke 29 O.A. Otú ọ dị, ịmara nke a adịghị eme ka mmadụ nwee ike ịchọpụta kpọmkwem mgbe ije ozi Jọn malitere n’ime afọ ahụ ma ọ bụ ụzọ a pụrụ isi gụkọọ oge banyere ihe ndị ọzọ metụtara ya.

Ma Bible nyere anyị nkọwa ndị ọzọ dị mkpa. Dị ka ihe atụ, amụma Daniel banyere ‘iri izu asaa’ zoro aka n’afọ 29 O.A. maka mpụta nke Mesaịa. O gosikwara na ije ozi Jisọs ga-adịru afọ atọ na ọkara. (Daniel 9:24-27) Tụkwasị na nke a nkọwa Bible ndị a: A mụrụ Jisọs ọnwa isii mgbe a mụsịrị Jọn; mgbe e mere Jisọs baptism, ọ ‘dị ihe dị ka iri afọ atọ’; Jisọs nwụkwara n’oge opupu ihe ubi nke 33 O.A. (oge Ememe Ngabiga), bụ́ mgbe ọ dị 33 1/2 afọ.—Luk 1:24-38; 3:23; 22:14-16, 54.b

N’ịdabere ná nkọwa doro anya otú a dị na Bible, tinyere oge ọkà ihe ọmụma ụwa kwuru maka mmalite ọchịchị Taịbirịọs, ndị mmụta Bible pụrụ ịgụkọ na ije ozi Jọn malitere n’oge opupu ihe ubi nke 29 O.A., na mgbe ọnwa isii gasịkwara, bụ́ n’oge mgbụsị akwụkwọ osisi nke afọ 29 O.A., Jọn mere Jisọs baptism. N’ihi ya, ọ bụghị 14 O.A., kama ọ bụ 29 O.A. ka a na-ele anya dị ka afọ dị oké mkpa n’akụkọ ihe mere eme nke ọha mmadụ nakweere dị ka Bible si ele ihe anya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a September 17 na kalenda nke Julius bụ otu ihe ahụ ya na September 15 na kalenda nke Gregory, bụ́ kalenda nke a na-ejikarị eme ihe taa.

b Tụlee Insight on the Scriptures, Mpịakọta 1, peji 458, 463, 467; Mpịakọta 2, peji 87, 899-902, 1099, 1100, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya