Gịnị Ka Ido Onwe Onye n’Okpuru n’Alụmdi na Nwunye Pụtara?
MGBE nwanyị bụ onye Kraịst lụrụ di, ọ ghaghị ime ọtụtụ nhazigharị ihe. Ma eleghị anya, nke kasị ukwuu n’ime ndị a metụtara nnwere onwe ya. Dị ka onye toworo eto nke na-alụbeghị di, ọ pụrụ inwereworịị onwe ya ime ọtụtụ n’ime mkpebi ndị ọ na-eme n’ajụtaghị onye ọ bụla ọzọ ihe. Ma ugbu a o nweworo di, o nwere ibu ọrụ nke ịjụta ya ihe na ịrịọ ka o nye ya ohere ime ọtụtụ ihe ndị ọ na-ekpebiburu onwe ya ime. N’ihi gịnị ka nke a ji dị otú a.
N’ihi na mgbe Onye Kere ihe a kpọrọ mmadụ nyere nwanyị mbụ ahụ n’ọlụlụ di nye nwoke mbụ ahụ, Ọ họpụtara nwoke ahụ ịbụ isi nke nwunye ya na ụmụ ndị ha gaje ịmụta n’ọdịnihu. Nke a bụ nnọọ ihe ezi uche dị na ya. N’ìgwè ụmụ mmadụ ọ bụla a haziri ahazi, ọ dị mkpa ka e nwee onye ga na-edu ndú, na-emekwa mkpebi ikpeazụ nile. N’ihe banyere alụmdi na nwunye, Onye Okike ahụ nyere iwu na “di bụ isi nke nwunye.”—Ndị Efesọs 5:23.
N’ịkwado nke a, ntụziaka ahụ Chineke nyere kwuru, sị: “Ndị bụ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu.” (Ndị Efesọs 5:22) Ụzọ ndokwa nke a si metụta onye bụ nwunye dabeere n’ihe abụọ: Nke mbụ, n’ókè dị aṅaa ka ọ dịruru njikere ido onwe ya n’okpuru ndokwa ahụ? nke abụọ, olee ụzọ di ya ga-esi jiri ikike ya mee ihe? N’ikwu eziokwu, mgbe mmadụ abụọ ahụ nọ n’alụmdi na nwunye lere ndokwa ahụ anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ha na-ahụ ya dị ka ihe ngọzi nye onye bụ nwunye, onye bụ di, na ụmụ ha.
Ọ Bụghị Onye Ọchịchị Aka Ike
Olee ụzọ onye bụ di kwesịrị isi jiri ikike ya mee ihe? Site n’ịgbaso ezi ihe nlereanya nke Ọkpara Chineke. Bịble na-asị: “Di bụ isi nke nwunye, dị ka Kraịst anyị bụkwa isi nzụkọ ya, ebe ya onwe ya bụ onye nzọpụta nke ahụ. Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu n’anya, dị ka Kraịst anyị hụkwara nzụkọ ya n’anya, rarakwa onwe ya nye n’ihi ya.” (Ndị Efesọs 5:23, 25) Ụzọ Jisọs Kraịst si eji ọbụbụisi ya eme ihe bụụrụ ọgbakọ ahụ ihe ngọzi. Ọ bụghị onye ọchịchị aka ike. O meghị ka ndị na-eso ụzọ ya nwee mmetụta nke ịbụ ndị a kpachigidere akpachigide na ndị a na-emegbu emegbu. Kama nke ahụ, o nwetara nkwanye ùgwù nke mmadụ nile site n’ụzọ ịhụnanya na ọmịiko o si mesoo ha ihe. Lee nnọọ ezi ihe nlereanya nke a bụụrụ ndị bụ di ịgbaso ná mmeso ha na-emeso ndị nwunye ha!
Ma, e nwere ndị bụ di ndị na-adịghị agbaso ezi ihe nlereanya nke a. Ha na-eji ọbụbụisi ahụ Chineke nyere ha eme ihe n’ụzọ ịchọ ọdịmma nke nanị onwe ha, kama ịbụ maka ọdịmma nke ndị nwunye ha. Ha na-achị ndị nwunye ha n’ụzọ ọchịchị aka ike, na-achọ ka ndị nwunye ha doo onwe ha n’okpuru ha n’akpaghị ókè ọ bụla, na-ajụkwa ọtụtụ mgbe ikwe ka ha meere onwe ha mkpebi ọ bụla. N’ụzọ kwere nghọta, ndị nwunye nke ndị di dị otú ahụ na-ebikarị ndụ na-enweghị obi ụtọ. Onye bụ di dị otú ahụ na-atakwa ahụhụ n’ihi na ọ dịghị enweta nkwanye ùgwù ịhụnanya nke nwunye ya.
N’eziokwu, Chineke chọrọ ka onye bụ nwunye sọpụrụ ọnọdụ nke di ya dị ka isi ezinụlọ ahụ. Ma ọ bụrụ na onye ahụ bụ di achọọ inweta nkwanye ùgwù ya nke sitere n’ala ala obi n’ebe ọ nọ dị ka mmadụ, ọ ghaghị ime ihe iji nweta ya, ụzọ kachasị mma isikwa mee nke ahụ bụ site n’iji ezi uche mee ihe na ịzụlite ezi àgwà dị iche iche nke nsọpụrụ Chineke dị ka onye isi ezinụlọ ahụ.
Ido Onwe Onye n’Okpuru Bụ nke A Kpaara Ókè
Ikike onye bụ di nwere n’ahụ nwunye ya abụghị nke a na-akparaghị ókè. N’ụzọ ụfọdụ, a pụrụ iji ido onwe onye n’okpuru nke onye bụ nwunye tụnyere ido onwe onye n’okpuru nke onye Kraịst n’ebe onye ọchịchị ụwa nọ. Chineke nyere iwu na onye Kraịst aghaghị ‘ido onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi.’ (Ndị Rom 13:1) Ma ido onwe onye n’okpuru nke a aghaghị ịbụ nke a haziri mgbe nile site n’ihe e ji ụgwọ ya n’ebe Chineke nọ. Jisọs kwuru, sị: “Nyeghachinụ Siza ihe nke Siza, nyeghachikwanụ Chineke ihe nke Chineke.” (Mak 12:17) Ọ bụrụ na Siza (ndị ọchịchị ụwa) achọọ ka e nye ya ihe bụ nke Chineke, anyị na-echeta ihe Pita onyeozi kwuru, sị: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke [“dị ka onye ọchịchị,” NW] karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29.
N’ụzọ yitụrụ nke ahụ, ọ bụrụ na nwanyị onye Kraịst nwere di onye na-adịghị aghọta ma ọ bụ onye na-adịghị akwanyere ụkpụrụ ndị Kraịst ùgwù, ọ ka nwekwara ibu ọrụ nke ido onwe ya n’okpuru nwoke ahụ. Kama inupụ isi megide ndokwa ahụ Chineke meworo, ọ ga-eme nke ọma iji ịhụnanya na nchebara echiche mesoo nwoke ahụ, wee si otú a gbalịa ime ka o nwee obi ike n’ebe ọ nọ. Ma eleghị anya ezi àgwà dị otú ahụ ga-eme ka di ya gbanwee, ọ pụrụ ọbụna ịdọrọ mmasị ya bịa n’eziokwu ahụ. (1 Pita 3:1, 2) Ọ bụrụ na di ya enye ya iwu ime ihe Chineke machibidoro iwu, ọ ghaghị icheta na Chineke bụ Onye Ọchịchị ya bụ isi. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwoke ahụ ekwuo ka o kere òkè n’omume mmekọahụ rụrụ arụ, dị ka mgbanwerịta nwunye, o nwere ibu ọrụ nke ịjụ ikwenyere ya. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Ọ bụ akọ na uche ya na ido onwe onye n’okpuru bụ isi o nwere n’ebe Chineke nọ ga-eduzi odudo ọ na-edo onwe ya n’okpuru di ya.
N’oge Eze Devid, Abigail bụ nwunye nke Nebal, bụ́ nwoke onye na-adịghị akwanyere ụkpụrụ nsọpụrụ Chineke nile ùgwù, onye mesokwara Devid na ndị ikom ha na Devid so omume aka ike na nke enweghị ịhụnanya. Ndị ikom ndị a chebeere Nebal ọtụtụ puku atụrụ na ewu, ma mgbe Devid rịọrọ ka e nye ya onyinye ihe oriri, Nebal jụrụ inye ya ihe ọ bụla.
Mgbe ọ matara na omume aka ntagide nke di ya gaje iwetara ezinụlọ ahụ ọdachi, Abigail kpebiiri onwe ya iwejere Devid ihe oriri. “Abigail wee mee ngwa, chịrị [narị ógbè achịcha abụọ], na karama akpụkpọ abụọ nke mmanya vine juru n’ime ha, na atụrụ ise e doziri edozi, na mgbé ọka a ṅara aṅa ise, na [otu narị] ụyọkọ mkpụrụ fig a mịrị amị, na [narị mbadamba fig abụọ], wee bo ha ịnyịnya ibu. O wee sị ụmụ okorobịa ya, Gabiganụ n’ihu m; lee, m na-abịa n’azụ unu. Ma o gosighị di ya, bụ́ Nebal.”—1 Samuel 25:18, 19.
Abigail ò mere ihe ọjọọ n’ime ihe megidere ọchịchọ nke di ya? Ọ bụghị otú ahụ n’ọnọdụ nke a. Ido onwe onye n’okpuru nke Abigail achọghị ya n’aka igosi enweghị ịhụnanya dị ka di ya, karịsịa ebe ọ bụ na ụzọ amamihe na-adịghị ya nke Nebal gbasoro tinyere ezinụlọ ya dum n’ihe ize ndụ. N’ihi ya, Devid gwara ya, sị: “Onye a gọziri agọzi ka Jehova, bụ́ Chineke Israel, bụ, onye zitere gị taa izute m: ihe a gọziri agọzi ka ezi uche gị bụkwa.” (1 Samuel 25:32, 33) N’otu aka ahụ, ndị Kraịst bụ nwunye taa ekwesịghị ime isi ike ma na-enupụ isi megide ọbụbụisi nke ndị di ha, ma ọ bụrụ na ndị di ha agbasoo ụzọ megidere nke ndị Kraịst, ọ bụghị iwu na ndị nwunye ha ga-agbaso ha na nke a.
N’eziokwu, Pọl, n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Efesọs, kwuru, sị: “Dị ka a na-edo nzukọ ahụ n’okpuru Kraịst anyị, otú a ka ndị bụ nwunye dookwa onwe ha n’okpuru di ha n’ihe nile ọ bụla.” (Ndị Efesọs 5:24) Ojiji onyeozi ahụ jiri okwu ahụ bụ ‘ihe nile ọ bụla’ mee ihe n’ebe a apụtaghị na e nweghị ịkpa ókè ọ bụla dị n’odudo onye bụ nwunye na-edo onwe ya n’okpuru di ya. Okwu Pọl bụ, “dị ka a na-edo nzukọ ahụ n’okpuru Kraịst anyị,” na-egosi ihe o bu n’uche. Ihe nile Kraịst chọrọ n’aka ọgbakọ ya bụ ihe ziri ezi, ihe kwekọrọ n’uche Chineke. N’ihi ya, ọ pụrụ ịdịrị ọgbakọ ahụ mfe, bụrụkwa ihe na-enye ọṅụ ido onwe ya n’okpuru ya n’ihe nile. N’otu aka ahụ, nwunye nke onye Kraịst bụ di, onye na-agbalịsi ike ịgbaso ihe nlereanya Jisọs ga-enwe obi ụtọ ido onwe ya n’okpuru di ya n’ihe nile. Nwanyị ahụ maara na ọ na-echegbu nnọọ onwe ya maka ọdịmma ya, na ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla ọ ga-elezi anya gwa ya ka o mee ihe na-ekwekọghị n’uche Chineke.
Onye bụ di ga-enweta ịhụnanya na nkwanye ùgwù nke nwunye ya mgbe ọ na-egosipụta àgwà nsọpụrụ Chineke nke onye bụ isi ya, Jisọs Kraịst, onye nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha hụrịta ibe ha n’anya. (Jọn 13:34) Ọ bụ ezie na onye bụ di bụ onye pụrụ imehie ihe na onye na-ezughị okè, ọ bụrụ na o jiri ikike ya mee ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ọbụbụisi ka elu nke Kraịst, ọ na-eme ka ọ dịrị nwunye ya mfe karị inwe obi ụtọ inwe ya dị ka onye bụ isi. (1 Ndị Kọrint 11:3) Ọ bụrụ na onye bụ nwunye azụlite àgwà ndị Kraịst nke imeru ihe n’ókè na ịhụnanya obi ebere, ọ gaghị abụrụ ya ihe siri ike ido onwe ya n’okpuru di ya.
Obi Dị Umeala na Ezi Uche
Ndị bụ di na ndị nwunye nọ n’ọgbakọ bụ ụmụnna nwoke na nwanyị ime mmụọ ndị guzo n’ọnọdụ ha nhata n’ihu Jehova. (Tụlee Ndị Galetia 3:28.) Otú ọ dị, Chineke enyewo ndị bụ nwoke ọrụ nke nlekọta n’ime ọgbakọ. Ndị inyom nwere obi dị mma na-eji ido onwe onye n’okpuru nile na obi ụtọ na-anakwere nke a. Ndị ikom tozuru okè ndị nọ n’ọgbakọ na-ejikwa obi dị umeala nakwere ibu ahụ dị arọ nke dịkwasịrị ndị ikom ịghara ịchị ìgwè atụrụ ahụ ọchịchị aka ike.—1 Pita 5:2, 3.
Ọ bụrụ na ọ bụ otú ahụ ka mmekọrịta dị n’etiti ndị ikom na ndị inyom dị n’ime ọgbakọ, olee otú onye Kraịst bụ di ga-esi gosi na mmeso ọ na-emeso nwunye ya, onye bụ nwanna ya n’ime mmụọ, omume n’ụzọ ọchịchị aka ike, bụ ihe na-adịghị njọ? Oleekwa ụzọ onye bụ nwanyị ga-esi gosi na iso di ya na-amarịta aka maka ọbụbụisi abụghị ihe ọjọọ? Kama nke ahụ, ha kwesịrị imesorịta ibe ha dị ka Pita nyere ndị nile nọ n’ọgbakọ ndụmọdụ ime: “Nwekọọnụ otu uche, unu nile, werenụ obi sorịta onwe unu hụkọọ ahụhụ, bụrụnụ ndị na-ahụ ụmụnna unu n’anya, ndị nwere obi ọmịiko, ndị nwere uche dị umeala.” (1 Pita 3:8) Pọl nyekwara ndụmọdụ, sị: “Yikwasịnụ obi ebere, obi ọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi; na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, a sị na onye ọ bụla nwere ihe ịta onye ọ bụla ụta; ọbụna dị ka Onyenwe anyị [“Jehova, NW] weere amara gbaghara unu, unu onwe unu meekwa otú a.”—Ndị Kọlọsi 3:12, 13.
E kwesịrị ịzụlite àgwà ndị dị otú ahụ n’ime ọgbakọ. E kwesịkwara ịzụlite ha karịsịa n’etiti di na nwunye n’ime ezinụlọ ndị Kraịst. Onye bụ di pụrụ igosi mmetụta ịhụnanya na ịdị nwayọọ ya site n’ige ntị n’aro ndị nwunye ya tụrụ. O kwesịrị ịtụle ụzọ nwunye ya si ele ihe anya tupu o mee mkpebi ndị metụtara ezinụlọ ahụ. Ndị Kraịst bụ nwunye abụghị ndị bụ okpokoro isi efu. Ọtụtụ mgbe, ha pụrụ ịtụrụ ndị di ha aro ndị bara uru, dị ka Sera meere di ya, bụ́ Abraham. (Jenesis 21:12) N’aka nke ọzọ, onye Kraịst bụ nwunye agaghị na-achọ ihe n’aka di ya n’ụzọ ezi uche na-adịghị ya. Ọ ga-egosipụta obi ọma na obi dị umeala ya site n’ịgbaso idu ndú ya, na-akwadokwa mkpebi ya nile, ọ bụ ezie na ha pụrụ ịdị iche n’ihe ndị na-amasị ya mgbe ụfọdụ.
Onye bụ di nke nwere ezi uche, dị ka okenye ọgbakọ nke nwere ezi uche, bụ onye a pụrụ ịbịakwute abịakwute na onye nwere obi ọma. Onye bụ nwunye nke na-ahụ n’anya na-emeghachi omume site n’inwe ọmịiko na ogologo ntachi obi, na-amata mgbalị nile nwoke ahụ na-eme iji buzuo ibu ọrụ ya nile n’agbanyeghị ezughị okè na ihe nrụgide nile nke ndụ. Mgbe di na nwunye zụlitere àgwà ndị dị otú ahụ, ido onwe onye n’okpuru n’alụmdi na nwunye agajeghị ịbụ ihe isi ike. Kama nke ahụ, ọ na-abụ ihe na-enye ọṅụ, ịnọ ná ntụkwasị obi, na afọ ojuju na-adịgide adịgide.