Chọọchị Nke Oge Gboo Ọ̀ Kụziri Na Chineke Bụ Atọ N’ime Otu?
Akụkụ nke 2—Ndị Nna Chọọchị Hà Kụziri Ozizi Atọ n’Ime Otu?
N’Ụlọ Nche nke November 1, 1991, Akụkụ nke 1 n’usoro isiokwu a tụlere ma Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya hà kụziri ozizi Atọ n’Ime Otu—echiche nke na Nna, Ọkpara, na mmụọ nsọ bụ ndị atọ hà nhata ma bụrụ otu Chineke. Ihe àmà doro anya sitere na Bible, site n’ọnụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme, na ọbụna site n’ọnụ ndị ọkà mmụta okpukpe bụ na ha akụzighị ya. Gịnị banyere ndị ndú chọọchị ndị sochiri ha n’oge na-adịghị anya—hà kụziri Atọ n’Ime Otu?
“NDỊ NNA CHỌỌCHỊ” bụ aha e ji amata ndị chọọchị bụ́ ndị dere ihe banyere Iso Ụzọ Kraịst n’akụkụ ikpeazụ nke narị afọ mbụ na ná mmalite nke narị afọ nke abụọ nke Oge Anyị. Ụfọdụ n’ime ha bụ Clement nke Rom, Ignatius, Polycarp, Hermas na Papias.
A sịrị na ha na ụfọdụ n’ime ndị ozi ahụ biri ndụ n’otu oge. Otú a, ha kwesịrị ịmataworị ozizi ndị ozi ahụ nke ọma. Banyere ihe ndị ikom ndị a dere, akwụkwọ The New Encyclopædia Britannica na-asị:
“N’ozuzu ha, ihe ndị Ndị Nna Chọọchị ahụ dere bara uru n’ụzọ akụkọ ihe mere eme karịa ihe odide ọ bụla ọzọ nke ndị Kristian e wezụga Agba Ọhụrụ.”1
Ọ bụrụ na ndị ozi kụziri ozizi Atọ n’Ime Otu, mgbe ahụ Ndị Nna Chọọchị ndị ahụ kwesịkwara iziworị ya. Ọ gaara abụ ihe pụtara ìhè n’ozizi ha, ebe ọ bụ na ọ dịghị ihe dị mkpa karịa ịgwa ndị mmadụ onye Chineke bụ. Ya mere hà kụziri ozizi Atọ n’Ime Otu?
Okwu Okwukwe E Kwuru n’Oge Mbụ
Otu n’ime ihe mbụ ndị na-adịghị na Bible e kwuru banyere okwukwe ndị Kraịst ka a na-achọta n’otu akwụkwọ nwere isiakwụkwọ 16 nke a maara dị ka The Didache, ma ọ bụ Teaching of the Twelve Apostles. Ụfọdụ ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu na e dere ya tupu ma ọ bụ n’ihe dị ka n’afọ 100 O.A. A maghị onye dere ya.2
The Didache na-ekwu banyere ihe ndị ọ dị mkpa ka ndị mmadụ mara iji bụrụ ndị Kraịst. N’isiakwụkwọ nke 7 ya, ọ na-ekwu na a ga-eme baptism “baa n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke Mmụọ Nsọ,” otu okwu ndị ahụ Jisọs jiri mee ihe na Matiu 28:19.3 Ma o kwughị ihe ọ bụla banyere ha atọ ịha nhata n’ịdị ebighị ebi, ike, ọnọdụ, na amamihe. N’isiakwụkwọ ya nke 10, The Didache na-agụnye nkwupụta okwukwe n’ụdị ekpere nke na-esonụ:
“Anyị na-ekele gị, Nna Dị Nsọ, n’ihi Aha nsọ gị i meworo ka o biri n’ime obi anyị; na maka ihe ọmụma na okwukwe na anwụghị anwụ nke i meworo ka anyị mara site na Jisọs Onye Na-ejere gị Ozi. Otuto dịrị gị ruo mgbe ebighị ebi! Gị, Onyenwenụ Kachasị Ihe Nile Elu, kere ihe nile n’ihi aha gị . . . Ọ bụkwa anyị ka i jiworo amara nye nri na ihe ọṅụṅụ ime mmụọ, na ndụ ebighị ebi site na Jisọs Onye Na-ejere gị Ozi.”4
E nweghị Atọ n’Ime Otu ọ bụla na nke a. N’akwụkwọ bụ The Influence of Greek Ideas on Christianity, Edwin Hatch hotara mpaghara okwu ahụ e depụtara wee sị:
“N’ọnọdụ mbụ nke mmetụta Iso Ụzọ Kraịst, o yighị ka e nwere oké ọganihu ọ bụla ná nchepụta ndị a dị mfe. Ozizi nke a na-emesi ike bụ, na Chineke bụ, na Ọ bụ otu, na Ọ bụ onye kachasị ihe nile elu ma na-adịru ebighị ebi, na O mere ụwa, na ebere Ya na-adịkwasị ọrụ Ya nile. E nweghị ọchịchọ ọ bụla maka mkparịta ụka nkà ihe ọmụma dị mgbagwoju anya.”5
Clement nke Rom
Clement nke Rom, nke e chere na ọ bụwo “bishọp” n’obodo ukwu ahụ, bụ onye ọzọ dere ihe banyere Iso Ụzọ Kraịst na mbụ. E kwenyere na ọ nwụrụ n’ihe dị ka n’afọ 100 O.A. N’akwụkwọ nke a sịrị na ọ bụ ya dere, o kwughị ihe ọ bụla banyere Atọ n’Ime Otu, ma ọ bụ site n’ikwu okwu hoo haa ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ. N’akwụkwọ bụ First Epistle of Clement to the Corinthians, ọ na-asị:
“Amara dịrị unu, na udo, site n’aka Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile site na Jisọs Kraịst, nọgide na-amụba.”
“Ndị ozi ahụ ekwusaworo anyị Oziọma ahụ sitere n’aka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst; Jisọs Kraịst emewo otú ahụ site n’aka Chineke. Ya mere ọ bụ Chineke zitere Kraịst, ndị ozi bụkwa ndị Kraịst zitere.”
“Ka Chineke, onye na-ahụ ihe nile, na onye bụ Onye Ọchịchị nke mmụọ nile na Onyenwenụ nke anụ ahụ nile—onye họọrọ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na anyị site n’aka Ya ịbụ ndị pụrụ iche—nye mkpụrụ obi ọ bụla nke ga-akpọku Aha nsọ Ya dị ebube, okwukwe, egwu, udo, ndidi, ogologo ntachi obi.”6
Clement asịghị na Jisọs ma ọ bụ mmụọ nsọ na Chineke hà nhata. O gosipụtara Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile (ọ bụghị nanị “Nna”) dị ka onye dịpụrụ iche n’ebe Ọkpara ahụ nọ. E kwuru banyere Chineke dị ka onye ka elu, ebe ọ bụ na Chineke “zitere” Kraịst, Chineke ‘họrọkwaara’ Kraịst. Iji gosi na Chineke na Kraịst bụ ndị abụọ dịpụrụ iche, ndị na-ahaghịkwa nhata, Clement sịrị:
“Anyị ga-eji ekpere site n’ezi obi na arịrịọ rịọ na Onye Okike nke eluigwe na ala ga-ejigide ọnụ ọgụgụ zuru ezu nke ndị ọ họpụtara n’ụwa dum, site na Nwa ya ọ hụrụ n’anya bụ Jisọs Kraịst. . . . Anyị matara na nanị gị [Chineke] bụ ‘onye kasị elu n’etiti ndị kasị elu’ . . . Nanị gị bụ onye na-echebe mmụọ nile na Chineke nke anụ ahụ nile.”
“Ka mba nile mata na nanị gị bụ Chineke, na Jisọs Kraịst bụ Nwa gị.”7
Clement kpọrọ Chineke (ọ bụghị nanị “Nna”) “onye kasị elu,” zookwa aka n’ebe Jisọs nọ dị ka “Nwa” Chineke. O kwuru banyere Jisọs, sị: “Ebe ọ bụ na ọ na-egosipụta ịma mma Chineke, ọ dị elu karịa ndị mmụọ ozi ebe ọ bụ na aha ya dị ebube karịa nke ha.”8 Jisọs na-egbukepụ ịma mma Chineke, ma ọ haghị ka ya, dị ka ọnwa na-egbukepụ ìhè anyanwụ ma ọ haghị ka ihe ahụ na-enye ìhè, bụ́ anyanwụ.
A sị na Ọkpara Chineke hà ka Chineke, onye bụ Nna eluigwe, ọ garaghị adị mkpa ka Clement sị na Jisọs dị elu karịa ndị mmụọ ozi, ebe ọ bụ na nke ahụ gaara edoworị anya. Otú o sikwa kwuo okwu na-egosi nghọta ya nke na ọ bụ ezie na Ọkpara ahụ dị elu karịa ndị mmụọ ozi, ọ dị ala karịa Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.
Ihe bụ echiche Clement doro nnọọ anya: Ọkpara ahụ dị ala karịa Nna, ọ nọkwa n’ọkwa nke abụọ. Ọ dịghị mgbe Clement lere Jisọs anya dị ka o so Nna ahụ bụrụ ndị òtù nke Chiatọ ahụ. Ọ na-egosipụta na Ọkpara ahụ na-adabere ná Nna, ya bụ, Chineke, ma na-ekwu kpọmkwem na Nna ahụ bụ ‘nanị Chineke dịnụ,’ ghara iso onye ọ bụla na-ekerịta ọnọdụ ya. Ọ dịghịkwa ebe Clement kwuru na mmụọ nsọ na Chineke hà nhata. Otú a, e nweghị Atọ n’Ime Otu ọ bụla n’ihe ndị Clement dere.
Ignatius
Ignatius, bụ́ bishọp nke Antiọk, biri ndụ site n’ihe dị ka n’etiti nke narị afọ nke mbụ O.A. ruo ná mmalite nke narị afọ nke abụọ. Ka e were na ọ bụ ya dere ihe odide nile a sịrị na ọ bụ ya dere, ọ dịghị nke n’ime ha e nwere ịha nhata nke Nna, Ọkpara na mmụọ nsọ.
Ọbụna ma ọ bụrụ na Ignatius ekwuo na Ọkpara na Nna hà nhata n’ịdị ebighị ebi, ike, ọnọdụ, na amamihe, ọ gaghịkwa abụ Atọ n’Ime Otu, n’ihi na ọ dịghị ebe o kwuru na mmụọ nsọ na Chineke ha n’ụzọ ndị ahụ. Ma Ignatius ekwughị na Ọkpara ahụ na Chineke Nna hà n’ụzọ ndị ahụ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ. Kama nke ahụ, o gosiri na Ọkpara nọ n’okpuru Onye ahụ nke ka elu, bụ́ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.
Ignatius kpọrọ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile “nanị ezi Chineke, onye a na-amụghị amụ na onye a na-apụghị iru nso, Onyenwe ihe nile, Nna na Onye Mụrụ Ọkpara ahụ a mụrụ nanị ya,” na-egosi ọdịiche dị n’etiti Chineke na Ọkpara Ya.9 Ọ na-ekwu banyere “Chineke Nna, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.”10 Ọ na-ekwukwa, sị: “E nwere otu Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, onye gosipụtaworo Onwe Ya site na Jisọs Kraịst bụ́ Ọkpara Ya.”11
Ignatius gosipụtara na Ọkpara ahụ abụghị onye dị kemgbe ebighị ebi dị ka onye kama na e kere ya eke, n’ihi na o kwuru na Ọkpara ahụ sịrị: “Onyenwe anyị [Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile] kere M, mmalite nke ụzọ Ya nile.”12 N’otu aka ahụ, Ignatius sịrị: “E nwere otu Chineke nke eluigwe na ala, Nna nke Kraịst, ‘onye ihe nile sitere n’aka ya;’ na otu Onyenwenụ Jisọs Kraịst, bụ́ Onyenwe anyị, ‘onye ihe nile dịrị site na ya.’”13 Ọ na-edekwa, sị:
“Mmụọ Nsọ adịghị ekwu ihe ndị nke Ya, kama ihe ndị nke Kraịst, . . . ọbụna dị ka Onyenwe anyị gwakwara anyị ihe ndị Ọ natara site n’aka Nna. N’ihi na, O [Ọkpara ahụ] kwuru, ‘okwu nke unu na-anụ abụghị nke M, kama nke Nna M, onye zitere M.’”14
“E nwere otu Chineke onye gosipụtara onwe ya site na Jisọs Kraịst Ọkpara ya, onye bụ Okwu ya nke sitere n’ịgba nkịtị na n’ụzọ nile na-eme ihe na-atọ onye ahụ [Chineke] nke zitere ya ụtọ. . . . Jisọs Kraịst nọ n’okpuru Nna ahụ.”15
N’eziokwu, Ignatius na-akpọ Ọkpara ahụ “Chineke nke bụ Okwu.” Ma iji okwu ahụ bụ “Chineke” mee ihe maka Ọkpara adịchaghị apụta ịha ka Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. Bible na-akpọkwa Ọkpara ahụ “Chineke” n’Aịsaịa 9:6. Jọn 1:18 kpọrọ Ọkpara ahụ ‘chineke a mụrụ nanị ya.’ Ebe e nyere ya ike na ikike sitere n’aka Jehova Chineke, bụ́ Nna, a pụrụ ịkpọ Ọkpara ahụ n’ụzọ ziri ezi “onye dị ike,” nke bụ ihe “chi” pụtara n’ụzọ bụ isi.—Matiu 28:18; 1 Ndị Kọrint 8:6; Ndị Hibru 1:2.
Otú ọ dị, à na-anakweere akwụkwọ ozi 15 a sịrị na Ignatius dere dị ka ihe ziri ezi? N’akwụkwọ The Ante-Nicene Fathers, Mpịakọta nke 1, ndị editọ bụ Alexander Roberts na James Donaldson na-ekwu sị:
“Ọ bụ ugbu a ihe ndị nkatọ nile na-anakwere na asatọ ndị mbụ n’ime akwụkwọ ozi ndị a sị na Ignatius dere ezighị ezi. Ha nwere n’ime onwe ha ihe àmà ndị a na-apụghị ịrụ ụka nke na e dere ha mgbe oge gabigaworo . . . nakwa na a na-edebe ha n’ụsọ ugbu a dị ka ihe adịgboroja.”
“Banyere Akwụkwọ Ozi asaa ndị Eusebius dekọrọ . . . , anyị nwere abụọ nke ndị Grik dezigharịrị, otu dị mkpụmkpụ kara, otu dị ogologo kara. . . . Ọ bụ ezie na a na-anakwerekarị nke mkpụmkpụ . . . karịa nke ogologo, e nwere echiche na-ewu nnọọ ewu n’etiti ndị mmụta, nke na ọbụna na a pụghị ile ya onwe ya anya dị ka nke a na-etinyeghị ihe, ma ọ bụ dị ka ihe ziri ezi nke a na-apụghị ịgbagha agbagha.”16
Ọ bụrụ na anyị anakwere ihe odide ya nke dị mkpụmkpụ karị dị ka nke bụ ezie, ọ hapụrụ ahịrị okwu ụfọdụ (dị na nke ogologo) bụ́ ndị na-egosi na Kraịst nọ n’okpuru Chineke, ma ihe fọrọ na nke nta ahụ adịkwaghịrị egosi Atọ n’Ime Otu. N’agbanyeghịkwa nke ọ bụ n’ime ihe odide ya ndị ahụ nke bụ ezie, nanị ihe ha na-egosi bụ na Ignatius kwenyere n’ịdị abụọ nke Chineke na Ọkpara ya. Nke a n’ezie abụghị ịdị abụọ nke ndị hà nhata, n’ihi na mgbe nile a na-egosipụta Ọkpara ahụ dị ka onye dị ala karịa Chineke nakwa onye nọ n’okpuru ya. Otú a, n’agbanyeghị otú anyị si lee ihe ndị ahụ Ignatius dere anya, a dịghị ahụta ozizi Atọ n’Ime Otu n’ime ha.
Polycarp
A mụrụ Polycarp nke Smụana n’akụkụ nke atọ ikpeazụ nke narị afọ mbụ, ọ nwụkwara n’etiti narị afọ nke abụọ. E kwuru na ya na Jọn onyeozi kpakọrịtara, e kwukwara na o dere akwụkwọ ozi bụ Epistle of Polycarp to the Philippians.
È nwere ihe ọ bụla dị n’ihe Polycarp dere nke ga-egosi Atọ n’Ime Otu? Ee e, a kpọtụghị ya aha. N’ezie, ihe ọ na-ekwu kwekọrọ n’ihe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na ndị ozi kụziri. Dị ka ihe atụ, n’Epistle ya, Polycarp kwuru, sị:
“Ka Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na Jisọs Kraịst n’Onwe Ya, onye bụ Ọkpara Chineke, . . . wulite unu n’okwukwe na n’eziokwu.”17
Rịba ama na dị ka Clement, Polycarp adịghị ekwu banyere mmekọrịta ndị hà nhata nke “Nna” na “Ọkpara” nke Atọ n’Ime Otu n’ime otu Chiatọ. Kama nke ahụ, ọ na-ekwu banyere “Chineke na Nna” nke Jisọs, ọ bụghị nanị ‘Nna Jisọs.’ Ya mere ọ na-edebe Chineke iche pụọ n’ebe Jisọs nọ, dị nnọọ ka ndị so dee Bible mere ugboro ugboro. Pọl na-ekwu ná 2 Ndị Kọrint 1:3, sị: “Onye a gọziri agọzi ka ọ bụ, bụ́ Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.” Ọ dịghị ekwu nanị, ‘Onye a gọziri agọzi ka ọ bụ bụ́ Nna Jisọs’ kama, “Onye a gọziri agọzi ka ọ bụ, bụ́ Chineke na Nna” nke Jisọs.
Ọzọ, Polycarp na-asị: “Udo sitere n’aka Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, na site n’aka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, Onye Nzọpụta anyị.”18 Ọzọkwa n’ebe a, Jisọs dịpụrụ iche n’ebe Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile nọ, ọ bụghị otu onye hà nhata n’ime Chiatọ nke atọ n’ime otu.
Hermas na Papias
Onye Nna Chọọchị ọzọ bụ Hermas, onye dere akwụkwọ na narị afọ nke abụọ. N’akwụkwọ ya bụ Shepherd, ma ọ bụ Pastor, ò kwuru ihe ọ bụla nke ga-eduba mmadụ n’ikwenye na ọ ghọtara Chineke ịbụ Atọ n’Ime Otu? Rịba ihe atụ ụfọdụ nke ihe o kwuru ama:
“Ọ bụghịkwa mgbe mmadụ chọrọ ka mmụọ ahụ kwuo okwu ka Mmụọ Nsọ na-ekwu, kama ọ na-ekwu okwu nanị mgbe Chineke chọrọ ka o kwuo. . . . Chineke kụrụ ubi vine, ya bụ na, O kere ụmụ mmadụ, nyekwa ha Ọkpara Ya; Ọkpara ahụ họpụtakwara ndị mmụọ ozi Ya n’isi ha ichebe ha.”19
“Ọkpara Chineke tọrọ ndị nile o kere.”20
N’ebe a Hermas na-ekwu na mgbe Chineke (ọ bụghị nanị Nna) chọrọ ka mmụọ ahụ kwuo okwu, ọ na-ekwu, na-egosipụta ịdị elu Chineke karịa mmụọ ahụ. Ọ na-ekwukwa na Chineke nyere Ọkpara ya ubi vine ahụ, na-egosi ịdị elu Chineke karịa Ọkpara ahụ. O kwukwara na Ọkpara Chineke tọrọ ihe nile ya bụ Ọkpara ahụ, kere, ya bụ ndị Ọkpara Chineke kere dị ka Onyeọkà nke Chineke, “n’ihi na n’ime ya ka e kere ihe nile, nke dị n’ime eluigwe na nke dị n’elu ụwa.” (Ndị Kọlọsi 1:15, 16) Ihe mere eme bụ na Ọkpara ahụ adịghị kemgbe ebighị ebi. E kere ya dị ka onye bụ mmụọ e kere eke nke nọ n’ọkwa dị elu, tupu ndị mmụọ ndị ọzọ e kere eke, dị ka ndị mmụọ ozi, bụ́ ndị e kere site na ya.
J. N. D. Kelly, n’akwụkwọ ya bụ Early Christian Doctrines, dere banyere echiche Hermas metụta Ọkpara Chineke, sị:
“N’ọtụtụ akụkụ okwu anyị na-agụ banyere otu mmụọ ozi onye dị elu karịa ndị mmụọ ozi isii na-anọ n’ime nzukọ Chineke, ndị a na-akọwa mgbe nile dị ka ndị ‘kasị kwesị ife ofufe’, ‘dị nsọ’, na ‘dị ebube’. E nyere mmụọ ozi nke a aha bụ Maịkael, o sikwara ike ịgbanahụ nkwubi okwu ahụ nke bụ na Hermas lere ya anya dị ka Ọkpara Chineke ma mee ka ya na onyeisi ndị mmụọ ozi bụ Maịkael kwekọọ.”
“E nwekwara ihe àmà . . . nke mgbalị ndị e mere ịkọwa Kraịst dị ka mmụọ ozi kasị elu . . . Banyere ozizi Atọ n’Ime Otu n’ụzọ ya kasị sie ike e nweghị ihe àmà ọ bụla.”21
A sịkwa na Papias maara Jọn onyeozi. O yiri ka o dere akwụkwọ n’ime narị afọ nke abụọ, ma nanị iberibe dị iche iche nke ihe o dere ka dị taa. N’ime ha o kwughị ihe ọ bụla banyere ozizi Atọ n’Ime Otu.
Ozizi Na-ekwekọ Ekwekọ
N’ihe banyere ịka elu nke Chineke na mmekọrịta ya na Jisọs, nkụzi Ndị Nna Chọọchị kwekọtụrụ n’ozizi Jisọs, ndị na-eso ụzọ, na ndị ozi ahụ, dị ka e dekọrọ n’ime Bible. Ha nile kwuru banyere Chineke, ọ bụghị dị ka Atọ n’Ime Otu, kama dị ka Onye dịpụrụ iche, nke dị ebighị ebi, onye kasịnụ nke pụrụ ime ihe nile, onye maara ihe nile. Ha kwukwara banyere Ọkpara Chineke dị ka onye dị iche, nke dị ala karị, onye bụ mmụọ e kere eke nke nọ n’okpuru bụ́ onye Chineke kere ijere Ya ozi n’imezu uche Ya. Ọ dịghịkwa ebe a gụnyere mmụọ nsọ dị ka ihe ya na Chineke ha.
Otú a, n’ihe ndị ahụ Ndị Nna Chọọchị dere ná ngwụsị narị afọ nke mbụ na ná mmalite narị afọ nke abụọ, e nweghị nkwado ọ bụla maka Atọ n’Ime Otu nke Krisendọm. Ha kwuru banyere Chineke, Jisọs, na mmụọ nsọ dị nnọọ ka Bible na-ekwu. Dị ka ihe atụ, lee Ọrụ Ndị Ozi 7:55, 56:
“Stifen, mgbe o jupụtara ná Mmụọ Nsọ, legidere anya n’eluigwe wee hụ ebube Chineke, na Jisọs ka ọ na-eguzo n’aka nri Chineke. ‘Apụrụ m ịhụ ka e meghepụrụ eluigwe,’ ka ọ sịrị, ‘na Nwa nke Mmadụ ka ọ na-eguzo n’aka nri Chineke.’”—Jerusalem Bible nke ndị Katọlik.
Stifen hụrụ ọhụụ nke Chineke n’eluigwe na Jisọs ka ọ na-eguzo n’akụkụ Ya. Ọkpara ahụ na-eguzo n’akụkụ Onye ahụ nke a kpọrọ ọ bụghị nanị “Nna,” kama “Chineke,” onye nke dịpụrụ nnọọ iche site na Jisọs. E nweghịkwa onye nke atọ dị n’ihe Stifen hụrụ. A hụghị mmụọ nsọ n’eluigwe ya na Jisọs na Nna ya.
Nke ahụ yiri ihe a hụrụ ná Mkpughe 1:1, nke na-asị: “Nke a bụ Mkpughe nke Chineke nyere Jisọs Kraịst.” (The Jerusalem Bible) Ọzọ, e gosiri Kraịst ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie dị ka onye dịpụrụ nnọọ iche site na Chineke, e hotaghịkwa mmụọ nsọ. À sị na Jisọs bụ onye nke abụọ n’Atọ n’Ime Otu, na-amata ihe nile, olee otú ọ pụrụ isi bụrụ na e “nyere” ya mkpughe?
Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị otú a na-egosi n’ụzọ doro anya na e nweghị Atọ n’Ime Otu. Ọ dịghịkwa akụkụ akwụkwọ nsọ n’ime Bible dum nke na-ekwu banyere Chineke ịbụ Atọ n’Ime Otu. Ihe ndị Ndị Nna Chọọchị dere gosipụtara nke a. Ha ezighị Atọ n’Ime Otu ndị Krisendọm ma ọlị.
Ihe ndị ọzọ dị mkpa e dere banyere Iso Ụzọ Kraịst bụ ná ngwụsị nke narị afọ nke abụọ. Ndị a bụ ọrụ nke ndị chọọchị bụ́ ndị a na-akpọ ndị nzọrọ okwukwe. Hà kụziri Atọ n’Ime Otu? Ná mbipụta na-abịa n’ihu, Akụkụ nke 3 n’usoro isiokwu a ga-ekwu okwu banyere ozizi ha.
Ntụaka:
1. The New Encyclopædia Britannica, Mbipụta nke 15, 1985, Micropædia, Mpịakọta nke 1, peji 488.
2. A Dictionary of Christian Theology, nke Alan Richardson bụ editọ ya, 1969, peji 95; The New Encyclopædia Britannica, Mbipụta nke 15, 1985, Micropædia, Mpịakọta nke 4, peji 79.
3. The Apostolic Fathers, Mpịakọta nke 3, nke Robert A. Kraft dere, 1965, peji 163.
4. Ibid., peji 166-167.
5. The Influence of Greek Ideas on Christianity, nke Edwin Hatch dere, 1957, peji 252.
6. The Ante-Nicene Fathers, Alexander Roberts na James Donaldson, ndị editọ ya, Mbipụtaghachi America nke Mbipụta Edinburgh, 1885, Mpịakọta nke 1, peji 5, 16, 21.
7. The Library of Christian Classics, Mpịakọta nke 1, Ndị Nna Ndị Kristian Oge Gboo, nke Cyril C. Richardson sụgharịrị, bụrụkwa editọ ya, 1953, peji 70-71.
8. Ibid., peji 60.
9. The Ante-Nicene Fathers, Mpịakọta nke 1, peji 52.
10. Ibid., peji 58.
11. Ibid., peji 62.
12. Ibid., peji 108.
13. Ibid., peji 116.
14. Ibid., peji 53.
15. The Apostolic Fathers, Mpịakọta nke 4, nke Robert M. Grant dere, 1966, peji 63.
16. The Ante-Nicene Fathers, Mpịakọta nke 1, peji 46-47; Cyclopedia of Biblical, Theological, and Ecclesiastical Literature, nke John McClintock na James Strong dere, nke Baker Book House Co., 1981 bipụtaghachiri, Mpịakọta nke 4, peji 490-493; The Catholic Encyclopedia, 1910, Mpịakọta nke 7, peji 644-647.
17. The Ante-Nicene Fathers, Mpịakọta nke 1, peji 35.
18. Ibid., peji 33.
19. The Ante-Nicene Fathers, Mpịakọta nke 2, peji 27, 35.
20. The Apostolic Fathers (Loeb’s Classical Library) nke nwere Nsụgharị Bekee site n’aka Kirsopp Lake, 1976, peji 249.
21. Early Christian Doctrines, by J. N. D. Kelly, Mbipụta nke Abụọ, 1960, peji 94-95.