Ọgbọ nke 1914—N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Mkpa?
“Ndị na-agụ akwụkwọ anyị maara na ruo ihe dị ka afọ ole na ole anyị anọwo na-atụ anya ka Ọgbọ nke a jiri oge dị oké njọ nke nsogbu mechie, anyị na-atụkwa anya na ọ ga-etiwapụ na mberede na n’ike n’oge na-adịghị anya mgbe October, 1914 gasịrị.”—Site n’akwụkwọ bụ́ The Watch Tower and Herald of Christ’s Presence, May 15, 1911.
KEMGBE 1879 magazin ahụ a maara mgbe ahụ dị ka The Watch Tower and Herald of Christ’s Presence (bụ́ nke a maara ugbu a dị ka Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova) rụtụrụ aka mgbe nile gaa na 1914 dị ka afọ a rịbara ama n’amụma Bible. Ka afọ ahụ na-eru nso, e chetaara ndị na-agụ akwụkwọ a na a pụrụ ịtụ anya “oge dị oké njọ nke nsogbu.”
A kpọsara ihe ọmụma nke a n’ebe nile site n’aka ndị Kraịst, bụ́ ndị nwetara ya site ná nghọta ha ghọtara “oge asaa” na “oge ndị Jentaịl” ahụ e kwuru okwu ya na Bible.a Ha ghọtara na oge nke a dị 2,520 afọ—na-amalite ná nkwatu a kwaturu alaeze oge ochie ahụ dị n’usoro Devid na Jerusalem ma na-agwụsị n’October 1914.b—Daniel 4:16, 17; Luk 21:24, King James Version.
N’October 2, 1914, Charles Taze Russell, bụ́ onye isi oche nke Watch Tower Bible and Tract Society n’oge ahụ, ji obi ike maa ọkwa, sị: “Oge ndị Jentaịl agwụsịwo; ụbọchị nile nke ndị eze ha agabigawo.” Lee ka okwu ya ndị ahụ si bụrụ eziokwu! N’ịbụ nke ndị mmadụ na-ahụghị, n’October 1914 otu ihe omume mere ka ụwa mee mkpatụ weere ọnọdụ n’eluigwe. Jisọs Kraịst, bụ́ Onye Nketa na-adịgide adịgide nke ‘ocheeze Devid,’ malitere ọchịchị ya dị ka Eze nke ihe nile a kpọrọ mmadụ.—Luk 1:32, 33; Mkpughe 11:15.
‘Ma,’ ka ị pụrụ ịjụ, ‘ọ bụrụ na Kraịst malitere ịchị achị na 1914, n’ihi gịnị ka ọnọdụ ndị dị n’ụwa ji kawanye njọ?’ Ọ bụ n’ihi na onye iro a na-adịghị ahụ anya nke ihe a kpọrọ mmadụ, bụ́ Setan, ka nọ ndụ. Ruo 1914, Setan nwere ohere ịga n’eluigwe. Ọnọdụ ahụ gbanwere mgbe e guzobere Alaeze Chineke na 1914. “Agha wee pụta n’eluigwe.” (Mkpughe 12:7) E meriri Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ma chụda ha n’elu ụwa, bụ́ nke kpatawooro ihe a kpọrọ mmadụ ọtụtụ ọdachi. Bible buru amụma, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.”—Mkpughe 12:12.
Na narị afọ mbụ O.A., Jisọs kwuru na ihe ịrịba ama a na-ahụ anya ga-aka ọnụnọ ya a na-adịghị ahụ anya dị ka Eze ọhụrụ nke ụwa akara. A jụrụ ya, sị: “Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọbịbịa [“ọnụnọ,” New World Translation] gị, na nke ọgwụgwụ oge a?” Gịnị bụ azịza ya? “Mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ: oké ụnwụ na ala ọma jijiji ga-adịkwa n’ebe dị iche iche. Ma ihe ndị a nile bụ mmalite ihe mgbu.”—Matiu 24:3, 7, 8.
N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, agha ahụ tiwapụrụ na 1914 bụ nke ajọ ụkọ nri sochiri, ebe ọ bụ na a kwụsịrị imepụta ihe oriri n’ụzọ e kwesịrị ruo ihe karịrị afọ anọ. Gịnị banyere ‘ala ọma jijiji ịdị n’ebe dị iche iche’? N’ime afọ iri sochiri 1914, ihe ruru ala ọma jijiji iri ndị na-eweta mbibi gburu ihe karịrị 350,000 ndị mmadụ. (Lee igbe.) N’ezie, ọgbọ 1914 nwere ahụmahụ nke “mmalite ihe mgbu.” Eri mgbe ahụkwa, ihe mgbu anọgidewo na-eme n’ụdị nke ọdachi ndị mmadụ na-akpataghị, ụnwụ nri, na ọtụtụ agha.
Otú o sina dị, ozi banyere nguzobe e guzobere Alaeze Chineke na 1914 bụ ozi ọma n’ihi na Alaeze ahụ ga-azọpụta ụwa nke a pụọ ná mbibi. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ ga-ewepụ okpukpe ụgha, nke na-eme omume ihu abụọ, ọchịchị rụrụ arụ, na ajọ mmetụta nke Setan na-enwe. (Daniel 2:44; Ndị Rom 16:20; Mkpughe 11:18; 18:4-8, 24) Ọzọkwa, ọ ga-ewebata ụwa ọhụrụ nke “ezi omume bi n’ime ha.”—2 Pita 3:13.
N’oge na-adịghị anya mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, Ndị Mmụta Bible nwere obi eziokwu, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, malitere ịghọta ihe ùgwù ha nwere n’ihe banyere akụkụ ọzọ nke ihe ịrịba ama nke ọnụnọ Jisọs dị ka Eze. Jisọs Kraịst buru amụma, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”—Matiu 24:14.
Site n’ọnụ ọgụgụ dị ala na 1919, Ndịàmà Jehova anọgidewo na-agbasa “ozi ọma nke a” n’esepụghị aka. Dị ka ihe si na nke ahụ pụta, a na-achịkọta ọtụtụ nde ndị sitere n’ihe karịrị 200 ala ugbu a dị ka ndị Alaeze Chineke ga-achị. Leekwa ụdị ngọzi ndị na-echere ndị a a ga-achị achị! Alaeze ahụ ga-akwụsị agha, ụnwụ nri, imempụ, na mmegbu. Ọ ga-emeri ọbụna ọrịa na ọnwụ!—Abụ Ọma 46:9; 72:7, 12-14, 16; Ilu 2:21, 22; Mkpughe 21:3, 4.
Tupu ọgbọ 1914 agabiga, ọrụ nke ikwusa banyere Alaeze ahụ ga-emezuworị ihe bụ nzube ya. “Mgbe ahụ,” ka Jisọs buru n’amụma, “mkpagbu ukwu ga-adị, nke ihe dị ka ya akadịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị. Ọ bụrụkwa na e meghị ụbọchị ahụ ka ha dị mkpirikpi, a gaghị azọpụta mmadụ ọ bụla: ma n’ihi ndị a họpụtara a ga-eme ka ụbọchị ahụ dị mkpirikpi.”—Matiu 24:21, 22.
Enwela echiche ahụ hiere ụzọ nke ọgbọ ahụ dị tupu 1914 nwere. Ihe agaghị anọgide na-adị otú ha dị ugbu a. A ga-enwe mgbanwe ndị na-eju anya n’ọdịnihu. Ma nye ndị ahụ mere omume n’ụzọ amamihe, e nwere olileanya ndị dị ebube.
Mgbe ahụ, gee ntị n’okwu ahụ onye amụma oge ochie kwuru: “Chọọnụ Jehova, unu nile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa . . . Chọọnụ ezi omume, chọọnụ umeala n’obi: eleghị anya a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.” (Zefanaịa 2:3) Olee ụzọ anyị pụrụ isi tinye ndụmọdụ nke a n’omume? Isiokwu ndị na-esonụ ga-enye aka ịza ajụjụ ahụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Aha peji nke akwụkwọ bụ́ Scenario of the Photo-Drama of Creation, 1914.
b Maka inwetakwu ihe ọmụma banyere nke a, lee isi 16 nke akwụkwọ ahụ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., na-ebipụta.
[Chaatị dị na peeji nke 7]
Ala Ọma Jijiji Ndị Mere n’Afọ Iri Sochiri 1914
Ụbọchị: Ebe O Mere: Ọnwụ:
January 13, 1915 Avezzano, Italy 32,600
January 21, 1917 Bali, Indonesia 15,000
February 13, 1918 Kwangtung Province, China 10,000
October 11, 1918 Puerto Rico (western) 116
January 3, 1920 Veracruz, Mexico 648
September 7, 1920 Reggio di Calabria, Italy 1,400
December 16, 1920 Ningsia Province, China 200,000
March 24, 1923 Szechwan Province, China 5,000
May 26, 1923 Iran (northeastern) 2,200
September 1, 1923 Tokyo-Yokohama, Japan 99,300
Site n’ihe ndepụta ahụ bụ́ “Oké Ala Ọma Jijiji Ndị Mere n’Ụwa” n’akwụkwọ bụ Terra Non Firma, nke James M. Gere na Haresh C. Shah dere.