Ụzọ Okwukwe Pụrụ Isi Nyere Ndị Ọrịa Aka
IHE ndekọ ndị dị na Bible banyere ịgwọ ọrịa n’ụzọ ọrụ ebube na-emesi anyị obi ike na Chineke na-eche echiche banyere ọdịmma anyị, ha na-egosikwa ike o nwere ịgwọ ọrịa. Ebe ọ bụ na ọrịa ndị a a gwọrọ n’ụzọ ọrụ ebube na-enye Chineke otuto ma na-eweta oké ọṅụ, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ịjụ, Onyinye nke ịgwọ ọrịa site na mmụọ nsọ ọ̀ ka dị irè?
Azịza nye ajụjụ ahụ bụ ee e—ihe kpatara nke ahụ pụkwara iju ụfọdụ anya. Ọrịa ndị ahụ a gwọrọ n’ụzọ ọrụ ebube na narị afọ mbụ emezuwo nzube ha. Akwụkwọ bụ́ The Illustrated Bible Dictionary kwuru n’ụzọ ziri ezi, sị: “Nzube nke ọrụ ebube ịgwọ ọrịa metụtara okpukpe, ọ bụghị ọgwụ na ahụ ike.” Gịnị bụ ụfọdụ n’ime nzube okpukpe nke ọrụ ebube ndị ahụ mezuru?
Na nke mbụ, ọrụ ebube ịgwọ ọrịa nke Jisọs mezuru nzube nke ime ka a mata ya dị ka Mesaịa. Mgbe ọ nwụsịrị, ha nyere aka ime ka e jide n’aka na ngọzi Chineke dị n’ọgbakọ ndị Kraịst ahụ dị ọhụrụ. (Matiu 11:2-6; Ndị Hibru 2:3, 4) Ọzọkwa, ha gosipụtara na a ga-emezu nkwa Chineke nke ịgwọ ihe a kpọrọ mmadụ n’ụwa ọhụrụ. Ha na-emesi okwukwe anyị ike na oge ga-abịa n’ezie mgbe “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa: a ga-ebupụ ajọ omume nke ndị bi n’ime ya.” (Aịsaịa 33:24) Ozugbo e mezuru nzube narị afọ mbụ ndị a, ọrụ ebube adịkwaghị mkpa ọzọ.
Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na ndị na-eso ụzọ Jisọs na narị afọ mbụ rịara ọrịa ndị a gwọtaghị n’ụzọ ọrụ ebube. Nke a bụkwa ihe àmà na-egosi na e mere ka ọrụ ịgwọ ọrịa n’ụzọ ọrụ ebube nke Jisọs nakwa nke ndị ozi ya kụzie eziokwu ndị dị mkpa, ọ bụghị ka e wee nwee ihe e ji agwọ ọrịa. Mgbe ọ na-atụ aro maka usoro ịgwọ ọrịa nye ọrịa ahụ nke na-enyekarị Timoti nsogbu ọtụtụ mgbe, Pọl kwadoro iji mmanya mere ọgwụ, ọ bụghị iji okwukwe agwọ ọrịa. Pọl, bụ́ onye rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube nke ịgwọ ọrịa, enwetaghị ihe ngwọta site ‘n’ogwu ahụ dị n’ahụ ya’ nke nọgidere ‘na-eti ya aka.’—2 Ndị Kọrint 12:7; 1 Timoti 5:23.
Mgbe ndị ozi ahụ nwụsịrị, onyinye nke ịgwọ ọrịa gabigara. Pọl n’onwe ya gosipụtara na nke a ga-ewere ọnọdụ. N’iji ọgbakọ ndị Kraịst tụnyere nwa ọhụrụ, Pọl sịrị: “Mgbe m bụrị nwa ọhụrụ, ana m ekwu dị ka nwa ọhụrụ, ana m atụkwasị uche n’ihe dị ka nwa ọhụrụ, ana m agụ ihe dị ka nwa ọhụrụ: ugbu a mgbe m ghọworo okenye, emewo m ka omume nwa ọhụrụ ghara ịdị irè.” Isi ihe dị n’ihe atụ ya bụ na onyinye mmụọ nsọ nke ọrụ ebube bụ akụkụ nke ịbụ nwa ọhụrụ nke ọgbakọ ndị Kraịst. Ha bụ “omume nwa ọhụrụ.” N’ihi ya, o kwuru, sị: “A ga-eme ka ọ [onyinye ọrụ ebube] ghara ịdị irè.”—1 Ndị Kọrint 13:8-11.
Okwukwe Ọ̀ Pụrụ Inye Aka Mgbe Anyị Na-arịa Ọrịa?
Otú ọ dị, ọbụna ma ọ bụrụ na anyị adịghị adabere n’iji okwukwe agwọ ọrịa, o kwesịrị ekwesị n’ezie ikpegara Chineke ekpere maka enyemaka mgbe anyị na-arịa ọrịa. N’ezie ọ dịghịkwa ihe dị njọ n’ekpere nke ndị ọzọ kpere n’ihi anyị. Ma ekpere ndị ahụ aghaghị ịbụ nke ezi echiche dị na ya na nke kwekọrọ n’uche Chineke. (1 Jọn 5:14, 15) Ọ dịghị ebe ọ bụla Bible nyere anyị iwu ikpe ekpere maka iji okwukwe agwọ ọrịa.a Kama nke ahụ, anyị na-ekpe ekpere maka nkwado ịhụnanya Jehova n’oge ule ndị ọrịa na-akpata.
Bible na-egosi ihe ndị na-ekwesị ntụkwasị obi pụrụ ikpe n’ekpere mgbe ha na-arịa ọrịa mgbe ọ sịrị: “Jehova ga-akwagide ya n’elu ihe o ji dinaa mgbe ahụ na-adịghị ya ike: ihe ndina ya nile ka ị gbanweworo n’ọrịa ya.” (Abụ Ọma 41:3) Ịtụgharị uche n’Okwu Chineke ga-enyere ndị ahụ na-arịa ọrịa mmetụta uche aka. Onye ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Ebere gị na-akwagide m, Jehova. Mgbe nchegbu m na-aba ụba n’ime m, nkasi obi gị nile na-agụgụ mkpụrụ obi m.”—Abụ Ọma 94:18, 19; leekwa 63:6-8.
Tụkwasị na nke ahụ, ọ dị mkpa anyị inwe echiche ziri ezi n’ihe banyere ahụ ike, Bible na-enyekwa anyị ndụmọdụ banyere nke a. Ọ ka mma ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ nile nke Bible karịa itinye aka n’ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ise siga, ịṅụ oké mmanya, ma ọ bụ iribiga nri ókè, mgbe ahụkwa, ọ bụrụ na ọrịa abịa, e chigharịkwuru iji okwukwe agwọ ọrịa n’ihi amaghị ihe a ga-eme. Mmadụ ikpe ekpere maka ọrụ ebube mgbe ọrịa jidere ya abụghị ihe a ga-eji dochie ime omume n’ụzọ amamihe iji gbanahụ ọrịa ndị a pụrụ izere ezere, dị ka site n’iri nri na-edozi ahụ ma ọ bụrụ na ọ dị ma ọ bụ ịchọ enyemaka ahụ ike ruru eru ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee.
Okwu Chineke na-agbakwa anyị ume ịzụlite àgwà nke iche echiche dị mma nke pụrụ ịbara ahụ ike anụ ahụ anyị uru. Akwụkwọ Ilu na-enye ndụmọdụ, sị: “Ndụ nke anụ ahụ ka obi a gwọrọ ọrịa ya bụ: ma ire ure nke ọkpụkpụ nile ka ekworo bụ.” “Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ dị mma: ma mmụọ mmadụ nke e tigburu etigbu na-amịkọ ọkpụkpụ.” (Ilu 14:30; 17:22) Ikpe ekpere ka mmụọ nsọ zụlite n’ime anyị ịnọ jụụ na ọṅụ pụrụ nnọọ inwe mmetụta bara uru n’ahụ ike anụ ahụ anyị.—Ndị Filipaị 4:6, 7.
Gịnị Banyere Iji Okwukwe Agwọ Ọrịa?
Otú ọ dị, ọbụna ma à sị na mmadụ na-ebi ndụ dị mma dị ka ọnọdụ ya nyere ohere ime, ọrịa pụkwara ịbịa. Mgbe ahụ gịnị ka a ga-eme? Ọ̀ dị ihe ọjọọ dị n’ịgakwuru onye ji okwukwe agwọ ọrịa n’olileanya nke ịbụ onye a gwọtara? Ee, ọ dị ihe ọjọọ dị na ya. O siri ike ndị ji okwukwe agwọ ọrịa n’oge a ịrụ ọrụ n’anaghị ihe ọ bụla. Imefuru onye ji okwukwe agwọ ọrịa ego mgbe a pụrụ imefu ego ahụ iji nweta enyemaka ọgwụ na ahụ ike pụrụ ime ka anyị taa oké ahụhụ. E wezụga nke ahụ, n’ihi gịnị ka a ga-eji nye ndị mmadụ ego, bụ́ ndị ji okwukwe ndị mmadụ enweta ihe ha chọrọ?
Ụfọdụ pụrụ ịrụ ụka, sị: ‘N’ezie, iji okwukwe agwọ ọrịa aghaghị inwe uru ụfọdụ ọ bara ma ọ bụrụ na a gwọta ọbụna pasentị dị nta nke ndị na-agakwuru “ndị na-agwọ ọrịa.”’ Ma a na-arụ ụka ma ndị ji okwukwe agwọ ọrịa hà na-agwọta onye ọ bụla n’ezie n’ụzọ na-adịgide adịgide. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica kwetara, sị: “E mewo nnyocha ndị kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị e setịpụrụ esetịpụ n’ọtụtụ isi ihe ndị a maghị ihe banyere ha n’iji okwukwe agwọ ọrịa.”
Ọbụna ma à sị na a gwọta ọnụ ọgụgụ dị nta, nke a abụghị ihe na-egosi na mmụọ nsọ na-arụ ọrụ. N’Ozizi Elu Ugwu, Jisọs sịrị: “Ọtụtụ mmadụ ga-asị m n’ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ànyị ejighị aha gị buo amụma, ànyị ejighịkwa aha gị chụpụ ndị mmụọ ọjọọ, ànyị ejighịkwa aha gị rụọ ọtụtụ ọrụ dị ike? Ma mgbe ahụ ka m ga-ekwupụtara ha, sị, Ọ dịghị mgbe ọ bụla m maara unu: si n’ebe m nọ pụọ, unu ndị na-arụ ọrụ na-emebi iwu.” (Matiu 7:22, 23) Jisọs kwukwara na ndị ụfọdụ, ọ bụ ezie na ha bụ ndị Chineke na-adịghị anakwere, ga-adọrọ mmasị nye onwe ha site n’ime ihe ịrịba ama: “N’ihi na Kraịst ụgha dị iche iche na ndị amụma ụgha ga-ebili, gosikwa ihe ịrịba ama ukwu dị iche iche na ọrụ ebube ukwu dị iche iche; iduhie ọbụna ndị a họpụtara, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee.” (Matiu 24:24) N’ezie, a pụrụ ịgụnye ndị ji okwukwe agwọ ọrịa n’oge a ná mmezu nke okwu ndị ahụ, n’ihi ime ihe ngosi ndị na-akpali akpali, ịnọ na-arịọ ego, na ikwu na ha na-agwọ ọrịa n’ụzọ ọrụ ebube.
Ndị dị otú ahụ adịghị agbaso nzọụkwụ Jisọs. Mgbe ahụ, ọ̀ bụ onye ka ha na-agbaso? Pọl onyeozi mere ka ọ pụta ìhè mgbe ọ sịrị: “Setan onwe ya na-eme onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè. Ya mere ọ bụghị ihe ukwu ma a sị na ndị na-ejere ya ozi na-emekwa onwe ha ka ha yie ndị na-eje ozi ezi omume; ndị ọgwụgwụ ha ga-adị ka ọrụ ha si dị.” (2 Ndị Kọrint 11:14, 15) Ọ bụrụ na ndị ji okwukwe agwọ ọrịa adịghị agwọ ọrịa ha sịrị na ha na-agwọ, mgbe ahụ ha bụ ndị nduhie, na-agbaso ụzọ nke Setan, “onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9) Ma gịnị ma ọ bụrụ na, n’ọnọdụ ole na ole, ha na-agwọta ọrịa? Ọ̀ bụ na anyị aghaghị ikwubi na “ọrụ dị ike” ha na-arụ sitere n’ike Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya? Ee, nke ahụ aghaghị ịbụ ihe mere eme!
Oge Maka Ezi Ịgwọ Ọrịa
Jisọs gwọrọ ọrịa n’ụzọ ọrụ ebube site n’enyemaka mmụọ nsọ nke Chineke. Ha gosipụtara nzube ya ịgwọta nsogbu ahụ ike nile nke mmadụ n’oge ọ kara aka. Jehova na-ekwe nkwa “ime ka ahụ dị mba nile ike.” (Mkpughe 22:2) Ọ bụghị nanị na ọ ga-agwọ ọrịa nile kama ọ ga-akwụsị ọnwụ. Jọn kọwara na Jisọs bịara “ka onye ọ bụla nke kwere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Lee ngwọta dị mma nke ahụ ga-abụ! Jisọs ga-agwọkwa ụdị ọrịa ndị ahụ e dekọrọ na Bible kama n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu karị. Ọbụna na ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ! (Jọn 5:28, 29) Olee mgbe nke a ga-eme?
N’ụwa ọhụrụ Chineke, bụ́ nke, dị ka ihe àmà nile na-egosi, dị nso. Ụwa ọhụrụ ahụ, nke a ga-ewebata mgbe e wepụworo ajọ usoro ihe nke a ruo mgbe ebighị ebi, ga-abụ ezi ngọzi nye ihe a kpọrọ mmadụ obi ha ziri ezi. Ọ ga-abụ ụwa nke nhụjuanya na-agaghị adị. “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.” (Mkpughe 21:4) Lee ka nke ahụ si dị iche n’ihe anyị na-ahụ na gburugburu anyị taa!
Ya mere, mgbe ọ bụla ị na-arịa ọrịa, kpegara Chineke ekpere maka nkwado. Ma ị na-arịa ọrịa ma ọ bụ na ahụ dị gị mma, mụta ụzọ ndụ ebighị ebi n’arịaghị ọrịa ga-esi kwe omume n’ezie. Wulite okwukwe ná nkwa nke a kwesịrị ntụkwasị obi nke Chineke site n’ịtụle ọtụtụ ebe ndị e zoro aka banyere ya na Bible. Mụta ụzọ nzube Chineke banyere nke a si abịaru mmezu dị ka ọgụgụ oge ya si dị. Enwela obi abụọ, n’ihi na Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike, sị: “Ọ [ga-eloda] ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi; Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu nile.”—Aịsaịa 25:8.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ụfọdụ na-eche na okwu ndị ahụ dị na Jemes 5:14, 15 bụ maka iji okwukwe agwọ ọrịa. Ma ihe a na-atụle na-egosi na n’ebe a Jemes na-ekwu banyere ọrịa ime mmụọ. (Jemes 5:15b, 16, 19, 20) O nyere ndị daworo mbà n’okwukwe ndụmọdụ ka ha kpọtụrụ ndị okenye maka enyemaka.
[Foto dị na peeji nke 7]
Jisọs ịgwọ ọrịa n’ụzọ ọrụ ebube mezuru nzube ha
[Foto dị na peeji nke 8]
Jisọs ga-emeghachi ma mụbaa ọrụ ebube nke ịgwọ ọrịa