È Nwere Ụzọ Mgbapụ Dịịrị Ọnọdụ Mmehie Mmadụ?
CHISAKO, ya na ụmụ ya anọ nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu, na-ehichabu ebe mposi ọha n’otu obodo dị 600 kilomita site n’ebe ha bi. Ka ọ na-eme nke ahụ, ọ na-agụ ukwe ndị okpukpe Buddha nke ya onwe ya na-aghọtaghị ihe ọ pụtara. Ọ bụ otu n’ime omume nke otu ìgwè okpukpe na-achọ ịchọpụta isi ihe dị n’okpukpe nile.
“N’agbanyeghị na m nọgidere na-anapụ onwe m ọtụtụ ihe,” ka Chisako chetara, “apụghị m ịgbanwe ọdịdị m. N’ime ime obi m, apụghị m ịgbaghara ndị ọzọ, apụghịkwa m igosi ịhụnanya site n’ebumnobi ziri ezi.”
Ọbụna n’ala Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, bụ́ ebe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ na-enweghị echiche ọ bụla banyere mmehie dị ka e si kụzie ya na Bible, akọ na uche ọtụtụ ndị na-ama ha ikpe n’ihi omume mmehie ha, dị ka o mere Chisako. (Ndị Rom 2:14, 15) Ọ̀ dị onye na-enwebeghị mmetụta nke ahụ erughị ala n’ihi egosighị ebere nye onye nọ n’ọnọdụ imere ebere ma ọ bụ onye na-enwebeghị mwute na-egbu mmụọ n’ihi ikwu okwu ndị a na-ekwesịghị ikwu ma ọlị? (Jemes 4:17) Ọ̀ bụkwa na ekworo jọgburu onwe ya adịghị anọ n’ime obi ndị na-eto eto na ndị mewokwara agadi?
N’ihi gịnị ka obi ndị mmadụ ji enye ha nsogbu n’ụzọ dị otú ahụ? N’ihi na, ma hà maara ya ma ọ bụ na ha amaghị, ha na-enwe mmetụta sitere n’ime obi nke ime ihe ọjọọ, nke mmehie. N’ezie, ma ndị mmadụ hà maara banyere ozizi Bible nke mmehie ma ọ bụ na hà amaghị, omume mmehie na-emetụta ha nile. Otu onye maara nke ọma banyere isiokwu nke a kwubiri n’otu mgbe, sị: “Mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke.”—Ndị Rom 3:23.
À Pụrụ Ikpochapụ Mmehie?
Ọtụtụ ndị taa, karịsịa na Krisendọm, nọ na-agbalị ihichapụ mmetụta nke mmehie na ikpe ọmụma n’akọ na uche ha. “Okwu ahụ bụ́ ‘mmehie’ . . . fọrọ nke nta ka a ghara ịdị na-anụ ya,” ka Dr. Karl Menninger kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ Whatever Became of Sin? Otú ọ dị, izere okwu ahụ bụ́ “mmehie” adịghị enye aka ọ bụla dịkwa ka onye na-eme agadi na-achọ izere okwu ahụ bụ́ “agadi” na-adịghị enye aka. Anyị kwesịrị ịnakwere eziokwu ahụ bụ na anyị pụrụ ime mmehie, na ọ dịkwa mkpa ka a gbapụta anyị n’ọnọdụ ahụ jọgburu onwe ya. Ma ọ̀ bụ site n’aka onye?
Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi jụrụ ajụjụ ahụ mgbe o kwetasịrị na ya onwe ya nwere ike ime mmehie n’agbanyeghị na ya achọghị ime otú ahụ: “Mmadụ nke hụjuru anya ka mụ onwe m bụ! Ònye ga-adọpụta m n’ahụ nke ọnwụ a?” Mgbe ahụ Pọl gara n’ihu ịza, sị: ‘Ekele dịrị Chineke site n’aka Jisọs Kraịst Onyenwe anyị!’ N’ihi gịnị? N’ihi na Chineke mere ndokwa maka mgbaghara nke mmehie site n’àjà mgbapụta Jisọs.—Ndị Rom 7:14-25.
Otú ọ dị, ọtụtụ n’ime 3,500,000,000 ndị na-abụghị ndị Kraịst nke ụwa (okpukpu abụọ nke ọnụ ọgụgụ nke ndị kpọrọ onwe ha ndị Kristian) na-achọpụta na echiche nke ihe mgbapụta siiri ha ike nghọta. Dị ka ihe atụ, ozizi nke ihe mgbapụta ghọrọ oké ihe mkpọbi ụkwụ nye otu onye Alakụba bi na Japan, bụ́ onye mụworo Bible ruo nwa oge. Nye ọtụtụ ndị bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, echiche nke na otu onye pụrụ ịnwụ n’ihi mmadụ nile bụ ihe a na-adịghị anụkarị.
Nke a kwere nghọta, ebe ọbụna ụfọdụ na Krisendọm na-ele ozizi nke a bụ isi anya dị ka ihe siri ike nghọta. “Nkà mmụta okpukpe n’ihe banyere Mgbapụta,” ka akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia kwetara, “bụ nke a na-emezubeghị n’otu akụkụ, ọ nọgidekwara na-abụ ihe isi ike ná nkà mmụta okpukpe.”
A na-eme ihe atụ ókè e nweruru mgbagwoju anya n’ozizi nke a n’okwu nke onye na-ede ihe banyere okpukpe bụ́ N. H. Barbour: “Ọnwụ nke Kraịst apụghị ịkwụ ụgwọ mmehie dịkwa ka nne ma ọ bụ nna nke elu ala na-agaghị ele iji agịga dụnye n’ahụ ijiji wee mee ka ọ taa ahụhụ ma nwụọ anya dị ka ihe zuru ezu iji kwụọ ụgwọ nnupụisi n’ebe nwa ya nọ.” N’oge ahụ onye ya na Barbour na-arụkọ ọrụ bụ́ Charles T. Russell, bụ́ onye hụrụ mkpa ọ dị ime ngwa ịkwado ozizi nke ihe mgbapụta. O kewapụrụ onwe ya n’ebe Barbour nọ, na 1879 ọ malitekwara ibipụta magazin ọhụrụ, nke mesịrị ghọọ akwụkwọ nke a ị na-agụ. Site ná mmalite ya, Ụlọ Nche abụwo ihe kasị na-akpọsa àjà mgbapụta nke Jisọs Kraịst.
Ma ọ̀ dị mgbe ọ bụla ozizi nke a pụrụ ịbụ nke ndị na-abụghị “ndị Kristian” ga-anakwere? Iji chọpụta, ka anyị nyochakwuo ozizi nke a nke otu onye ịnwụ n’ihi mmadụ nile.