Ọgụ A Lụrụ Maka Nlanarị nke Bible n’Asụsụ Spanish
N’OTU ụbọchị n’October n’afọ 1559, ihe dị ka 200,000 ndị Spain bụ́ ndị Katọlik nugara n’obodo ebe ugwu nke Valladolid. Ihe kpọtara ha n’ebe ahụ bụ ememe igbu ndị a mara ikpe, bụ́ ebe “a gbara mmadụ abụọ ọkụ ná ndụ, nyagbuo mmadụ iri.” Ha bụ “ndị jụrụ okwukwe.”
Eze ahụ na-eto eto a ma ama bụ́ Philip nke Abụọ bụ onye isi oche nke ihe omume ahụ n’onwe ya. Mgbe otu nwoke a mara ikpe rịọrọ ka e meere ya ebere, eze ahụ ji iwe kwuo, sị: “Ọ bụrụ na nwa m dị nzuzu otú a dị ka gị, m ga-eji aka m bute úkwù nkụ a ga-eji kpọọ ya ọkụ.” Gịnị bụ mpụ nke onye ahụ ihe ọjọọ dabaara? Nanị na ọ nọwo na-agụ Bible.
N’otu oge ahụkwa, nzukọ nke Njụta Okwukwe Katọlik ji ọrụ n’aka n’obodo Andalusia nke Seville. N’ebe ahụ, otu ìgwè ndị mọnk nọ n’ebe obibi ndị mọnk dị na San Isidro del Campo ka nwetasịrị Bible e bubatara na nzuzo n’asụsụ Spanish. Ndị mgbaama hà ga-arapụta ha? Ụfọdụ ndị matara na ndụ ha nọ n’ihe ize ndụ gbapụrụ ná mba ahụ. Ma ihe agaraghị 40 n’ime ndị na-agbapụghị nke ọma, a gbakwara ha ọkụ n’elu osisi, n’ime ha e nwere nwoke ahụ nke bubatara Bible ndị ahụ iwu na-akwadoghị ná mba ahụ. Spain nke narị afọ 16 bụ ebe dị oké egwu nye ndị na-agụ Bible—ole na ole gbanahụrụ ikike nke Njụta Okwukwe.
N’ime ole na ole ndị ahụ, e nwere onye bụbu onye mọnk, bụ́ Casiodoro de Reina (ihe dị ka 1520-1594). Ọ gbagara London, ma ọbụna n’ebe ahụ ọ nọghị ná nchebe. Njụta Okwukwe ahụ kwere nkwa ịkwụ onye ọ bụla jidere ya ụgwọ, onye nnọchianya mba Spain n’ụlọikpe England mere atụmatụ ime ka ọ laghachi n’ókèala nke dị n’okpuru Spain n’ụzọ ọ bụla, ma ọ̀ dị mma ma ọ̀ dị njọ. Ná mkpirikpi oge, ebubo ụgha nke ịkwa iko na idina ụdị onwe onye manyere ya ịhapụ England.
N’ihi ụkọ nke ihe ndị e ji ebi ndụ nakwa ezinụlọ na-amụba amụba nke ọ ga-elekọta, o bu ụzọ nweta ebe mgbaba na Frankfurt. E mesịa, ọchịchọ ọ na-achọ nchebe nke okpukpe dugara ya France, Holland, na n’ikpeazụ Switzerland. Ma n’oge ndị a nile, ọ nọgidere n’ọrụ. ‘E wezụga mgbe m rịara ọrịa ma ọ bụ mgbe m nọ na njem, . . . ọ dịghị mgbe mkpịsị akwụkwọ dapụrụ m n’aka,’ ka ọ kọwara. O tinyere ọtụtụ afọ n’ịsụgharị Bible gaa n’asụsụ Spanish. Obibi nke Bible Reina mesịrị malite na 1568 na Switzerland, gwụsịakwa na 1569. Otu ihe pụrụ iche ná nsụgharị Reina bụ na o jiri Iehoua (Jehová) kama Señor (Onyenwe anyị) mee ihe maka Tetragrammaton, nke bụ mkpụrụ okwu Hibru anọ maka aha onwe onye nke Chineke.
Bible n’Asụsụ Spanish Amalite Ịpụta
N’ụzọ na-emegide onwe ha, n’oge mgbe, n’ihi mmepụta nke ígwè obibi akwụkwọ, Bible na-amụba na Europe, na Spain ha na-adị ụkọ. Ọ bụghị otú a ka ọ nọworo na-adị mgbe nile. Ruo ọtụtụ narị afọ Bible bụ akwụkwọ Spain kasị ekesa n’ebe nile. E nwere ndị e ji aka dee n’asụsụ Latin, ruokwa narị afọ ole na ole, ọbụna n’asụsụ Gothic. Otu onye ọkọ akụkọ ihe mere eme kọwara na n’oge Ụwa Na-emepebeghị Anya, “Bible—dị ka isi iyi nke nkwali na ikike, dị ka ụkpụrụ nke okwukwe na omume—pụtara ìhè na Spain karịa na Germany ma ọ bụ England.” Akụkọ Bible dị iche iche, Abụ Ọma, akwụkwọ nkọwa, akụkọ omume dị iche iche, na akwụkwọ ndị yiri ha ghọrọ ndị a kasị ere n’oge ahụ.
Ndị ndegharị a zụrụ azụ ji oké nlezianya depụtaghachi ihe odide Bible ndị mara oké mma. Ọ bụ ezie na o were 20 ndị odeakwụkwọ otu afọ zuru ezu iji depụta nanị otu ihe odide na-enweghị atụ, ọtụtụ Bible dị n’asụsụ Latin na ọtụtụ puku akwụkwọ ndị na-akọwa Bible dị n’asụsụ Latin jupụtara na Spain na narị afọ nke 15.
Ọzọkwa, mgbe asụsụ Spanish malitere itolite, a malitere inwe mmasị n’inwe Bible n’asụsụ Spanish. N’ihe dị ka narị afọ nke 12, a sụgharịrị Bible gaa n’asụsụ Romance, ma ọ bụ asụsụ Spanish oge gboo, bụ́ asụsụ nke ndị nkịtị sụrụ.
Iteta n’Ụra Dị Nwa Oge
Ma iteta n’ụra ahụ adịrughị ogologo oge. Mgbe ndị òtù Calvin, ndị òtù Wycliffe, na Huss ji Akwụkwọ nsọ kwadoo ihe ha kwere na ha, mmeghachi omume nke ahụ kpatara dị oké ngwa ma dị ike. Ndị isi Katọlik nyowere ịgụ Bible enyo, a jụrụ kpam kpam nsụgharị ndị ọhụrụ dị n’asụsụ ndị nkịtị.
Nzukọ Catholic Council of Toulouse (France), nke zukọtara na 1229, kwupụtara, sị: “Anyị na-amachibido onye nkịtị ọ bụla inwe akwụkwọ nke Agba Ochie ma ọ bụ nke Ọhụrụ nke a sụgharịrị gaa n’asụsụ ndị nkịtị. Ọ bụrụ na onye ọ bụla nke ji okpukpe kpọrọ ihe chọrọ, ọ pụrụ inwe Abụ Ọma ma ọ bụ Breviary [akwụkwọ abụ na ekpere] . . . ma ka a ghara inwe ihe ọ bụla ga-eme ka o nwee akwụkwọ ndị ahụ a kpọtụrụ aha n’elu nke a sụgharịrị n’asụsụ Romance.” Mgbe afọ anọ gasịrị, James nke Mbụ nke Aragon (eze nke na-achị otu ógbè buru ibu nke fọrọ nke nta ka mmiri gbaa ya gburugburu) nyere ndị nile nwere Bible n’asụsụ ndị nkịtị nanị ụbọchị asatọ iji nyefee ha n’aka ndị bishọp maka ịkpọ ha ọkụ. Ọjụjụ a jụrụ ime otú ahụ, ma ọ̀ bụ site n’aka onye ụkọchukwu ma ọ̀ bụ site n’aka onye nkịtị, ga-eme ka onye nwe ya bụrụ onye a na-enyo enyo ịjụ okwukwe.
N’agbanyeghị mmachibido ndị a—bụ́ nke a na-edeberughị n’isi mgbe nile—ndị Spain ụfọdụ pụrụ ịnya isi inweworị Bible n’asụsụ Romance n’akụkụ ikpeazụ nke Oge Ụwa Na-emepebeghị Anya. Nke a kwụsịrị na mberede site ná nguzobe nke Njụta Okwukwe Spain n’okpuru Eze Nwanyị Isabella na Eze Ferdinand na 1478. Na 1492, na nanị obodo Salamanca, a kpọrọ 20 Bible ndị dị oké ọnụ ahịa e ji aka dee ọkụ. Nanị ihe odide Bible n’asụsụ Romance lanarịrị bụ ndị e debere n’ebe ndebe akwụkwọ onwe onye nke eze ma ọ bụ mmadụ ole na ole dị ike a maara aha ha, bụ́ ndị karịrị ndị a na-enyo enyo.
Ruo narị afọ abụọ na-abịanụ, nanị Bible ndị Katọlik iwu kwadoro e bipụtara na Spain—e wezụga Latin Vulgate—bụ Complutensian Polyglott, bụ́ Bible mbụ dị n’ọtụtụ asụsụ, nke Cardinal Cisneros hụrụ maka ya. Ọ bụ n’ezie akwụkwọ nke ndị gụrụ akwụkwọ, nke o doro anya na ọ bụghị maka ndị nkịtị. Nanị 600 ka e mepụtara, mmadụ ole na ole pụkwara ịghọta ya n’ihi na o nwere ihe odide nke Bible n’asụsụ Hibru, Aramaic, Grik, na Latin—ọ bụghị n’asụsụ Spanish. Ọzọkwa, ọnụ ahịa ya dị elu. Ọ na-ada ọlaedo ducat atọ (nke hà ka ụgwọ ọnwa isii a na-akwụ onye ọrụ e goro ego).
Nsụgharị Bible n’Asụsụ Spanish Na-aga na Nzuzo
Ná mmalite narị afọ nke 16, onye Spain yiri “Tyndale” dịrị ndụ, aha ya bụkwa Francisco de Enzinas. Dị ka nwa nke onye Spain nwere ala nke bara ọgaranya, ọ malitere ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst gaa n’asụsụ Spanish mgbe ọ ka bụ nwata akwụkwọ na-eto eto. E mesịa, o bipụtara nsụgharị ya na Netherlands, na 1544 ọ gbalịsiri ike inweta ikike eze ikesa ya na Spain. Onye ọchịchị alaeze ukwu nke Spain, bụ́ Charles nke Mbụ, nọ na Brussels n’oge ahụ, Enzinas jikwa ohere ahụ mee ihe ịrịọ ka eze mara banyere ọrụ ya.
A kọwo akụkọ na mkparịta ụka ahụ pụrụ iche n’etiti ndị ikom abụọ ahụ si otú a gaa: “Ụdị akwụkwọ dị aṅaa ka nke a bụ?” ka onye ọchịchị alaeze ukwu ahụ jụrụ. Enzinas zaghachiri, sị: “Nke a bụ akụkụ nke Akwụkwọ Nsọ a na-akpọ Agba Ọhụrụ.” “Ònye dere akwụkwọ ahụ?” ka ọ jụrụ. “Mmụọ nsọ,” ka ọ zaghachiri.
Onye ọchịchị alaeze ukwu ahụ nabatara akwụkwọ ahụ kama n’otu ọnọdụ—na onye ụkọchukwu ọ na-ekwupụtara mmehie ya, onye Spain bụ onye mọnk, ga-enyekwa nkwado nke ya. Ọ bụ ihe mwute nye Enzinas na ọ dịghị mgbe nkwado dị otú ahụ bịara, n’oge na-adịghịkwa anya, Njụta Okwukwe ahụ tụrụ ya mkpọrọ. Mgbe afọ abụọ gasịrị o jisiri ike gbapụ.
Mgbe afọ ole na ole gasịrị, e bipụtara nsụgharị nke a nke a tụleghachiri atụleghachi na Venice, Itali, ọ bụkwa mbipụtaghachi nke a nke Akwụkwọ nsọ ka Julián Hernández ji n’ụzọ nzuzo buga na Seville, Spain. Ma e jidere ya, mgbe afọ abụọ nke mmekpa ahụ na ịtụ mkpọrọ gasịkwara, e gburu ya na ndị mmụta Bible ibe ya ndị ọzọ.a
Ná nzukọ Council of Trent (1545-1563), Chọọchị Katọlik kwupụtaghachiri mmegide ọ na-emegide nsụgharị Bible ndị dị n’asụsụ obodo dị iche iche. O bipụtara otu ihe ndepụta nke akwụkwọ ndị a machibidoro iwu, nke gụnyere nsụgharị Bible ndị ahụ nile e mepụtaworo n’enwetaghị nkwado chọọchị. N’omume, nke a pụtara na Bible nile dị n’asụsụ Spanish megidere iwu, na mmadụ inwekwa nke ọ bụla pụrụ iduga n’inye ikike ka e gbuo onye ahụ.
Mgbe afọ ole na ole e bipụtasịrị nsụgharị Reina gasịrị, Cipriano de Valera, onye ọzọ bụbu onye mọnk nke gbanahụrụ ọnụma nke Njụta Okwukwe na Seville, tụleghachiri ya. E bipụtara nsụgharị nke a n’Amsterdam n’afọ 1602 O.A., e bugakwara ụfọdụ na Spain. Ná nsụgharị nke mbụ na nke a tụleghachiri atụleghachi, Bible nke Reina na Valera ka bụkwa nsụgharị e ji eme ihe karịsịa n’etiti ndị Protestant na-asụ asụsụ Spanish.
E Meghee Window Nile
N’ikpeazụ, n’afọ 1782 òtù nnọkọ ikpe nke Njụta Okwukwe nyere iwu na a pụrụ ibipụta Bible ma ọ bụrụhaala na a ga-etinye ihe nkọwa banyere akụkọ ihe mere eme na nkwenkwe. N’afọ 1790 onye bishọp Katọlik nke Segovia, bụ́ Felipe Scio de San Miguel, n’iji nsụgharị Latin Vulgate mee ihe, sụgharịrị Bible gaa n’asụsụ Spanish. Ọ bụ ihe mwute na ọ dị oké ọnụ—1,300 real, bụ́ ọnụ ahịa dị oké elu n’oge ahụ—mkpụrụ okwu e ji dee ya sikwara ike ọgụgụ, nke ahụ siri oké ike nke na otu onye Spain na-akọ akụkọ ihe mere eme kọwara ya dị ka “oké ihe mwute.”
Mgbe afọ ụfọdụ gasịrị, eze ndị Spain bụ́ Fernando nke Asaa nyere bishọp nke Astorga, bụ́ Félix Torres Amat, iwu ime nsụgharị ka mma, nke dabekwaara ná nsụgharị Latin Vulgate. Nsụgharị nke a pụtara n’afọ 1823, e kesakwara ya nke ukwuu karịa nsụgharị nke Scio. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na ọ dabereghị n’ihe odide Hibru na Grik nke mbụ, o nwere nsogbu ndị ahụ a na-enwekarị nke iji nsụgharị mee nsụgharị.
N’agbanyeghị ọganihu nke a, chọọchị ahụ na ndị ọchịchị nke mba ahụ ekwetabeghị na ndị nkịtị kwesịrị ịgụ Akwụkwọ nsọ. Mgbe George Borrow, bụ́ onye nnọchianya nke òtù British and Foreign Bible Society, rịọrọ ka e nye ya ikike n’afọ ndị 1830 ibipụta Bible na Spain, onye minista ndị gọọmenti bụ́ Mendizábal gwara ya, sị: “Ezi nna m ukwu, ọ bụghị Bible ka anyị chọrọ, kama anyị chọrọ égbè na ntụ égbè, iji merie ndị nnupụisi, karịsịakwa, anyị chọrọ ego, ka anyị wee nwee ike ịkwụ usuu ndị agha anyị ụgwọ.” Borrow gara n’ihu ịsụgharị Oziọma nke Luk gaa n’asụsụ nke ndị Spanish Gypsy, na 1837 a tụkwara ya mkpọrọ maka mgbalị nile o mere!
N’ikpeazụ, a pụghị igbochi usoro ihe omume ahụ ọzọ. Na 1944 chọọchị ndị Spain bipụtara nsụgharị ya mbụ nke Akwụkwọ Nsọ na-adabere n’asụsụ ndị mbụ—ihe dị ka 375 afọ mgbe nsụgharị Casiodoro de Reina pụtasịrị. Nke a bụ nsụgharị nke ndị mmụta Katọlik bụ́ Nácar na Colunga. Nsụgharị nke Bover na Cantera sochiri nke a na 1947. Kemgbe ahụ, e nwewo ọtụtụ nsụgharị nke Bible n’asụsụ Spanish.
Mmeri E Ji n’Aka
Ọ bụ ezie na ruo ọtụtụ narị afọ, a lụrụ ọgụ maka nlanarị nke Bible n’asụsụ Spanish, e mesịrị merie n’agha ahụ. Oké àjà nke ndị nsụgharị nwere obi ike dị ka Reina chụrụ abụghị ihe efu n’ezie. Mmadụ òle ná ndị na-azụ Bible taa na-akwụsịtụ iche echiche banyere oge mgbe a machibidoro inwe Bible?
Taa, Bible bụ akwụkwọ a kasị ere na Spain nakwa ná mba ndị na-asụ asụsụ Spanish, e nwekwara ọtụtụ nsụgharị. N’ime ndị a e nwere Versión Moderna (Nsụgharị Ọgbara Ọhụrụ, 1893), nke ji aha Chineke, bụ́ Jehová mee ihe n’ebe nile ọ pụtara; Mbipụta Pauline nke Bible (1964), nke ji aha ahụ bụ Yavé mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ Hibru; nsụgharị Nueva Biblia Española (Bible Ọhụrụ n’Asụsụ Spanish, 1975), nke ọ bụ ihe mwute ikwu na o jighị ma Jehová ma Yavé mee ihe; na Traducción del Nuevo Mundo (Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, 1967) nke Watch Tower Society bipụtara, bụ́ nke ji Jehová mee ihe.
Ndịàmà Jehova na-aga n’ebe obibi nke ọtụtụ nde ndị na-asụ asụsụ Spanish kwa izu iji nyere ha aka ịghọta uru nke Bible Nsọ—akwụkwọ nke e kwesịrị iji maka ya nwụọ, akwụkwọ nke e kwesịrị ịdị ndụ site na ya. N’ezie, akụkọ nke ọgụ a lụrụ maka nlanarị Bible n’asụsụ Spanish bụ ihe àmà ọzọ na-egosi na “okwu Chineke anyị ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Aịsaịa 40:8.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’oge ahụ ọ dịghị akwụkwọ ọ bụla a pụrụ ibubata n’ejighị laịsensị pụrụ iche, ọ dịghịkwa onye ọ bụla nwere ebe ndebe akwụkwọ nke pụrụ imeghe ihe ọ bụla e ji bubata akwụkwọ n’enwetaghị ikike site n’aka ndị isi nke Ụlọ Ọrụ Dị Nsọ (Njụta Okwukwe).
[Foto dị na peeji nke 10]
E mepụtawo nsụgharị nke Complutensian Polyglott, ya mere a pụkwara inyocha ya n’egbughị oge. (Lee peji nke 8)
[Ebe E Si Nweta Foto]
Site n’ikike nke Biblioteca Nacional, Madrid, Spain