‘Mee Ka Ọganihu Gị Pụta Ìhè’
“Ugbu a mgbe m ghọworo okenye, emewo m ka omume nwa ọhụrụ ghara ịdị irè.”—1 NDỊ KỌRINT 13:11.
1. Olee ụzọ uto si agba àmà banyere ịdị ebube nke okike?
SITE n’otu àkwá dị nta nke ukwuu nke na a pụrụ ịhụ ya nanị n’okpuru ígwè e ji ahụ ihe anya nkịtị na-apụghị ịhụ, azụ whale pụrụ ito ghọọ ihe e kere eke karịrị 30 mita n’ogologo ma dị arọ ihe karịrị 80 tọn. N’otu aka ahụ, site n’otu mkpụrụ kasị dị nta, oké osisi sequoia pụrụ ito ịdị ihe karịrị 90 mita n’ịdị elu. N’ezie, uto bụ otu n’ime ihe ndị dị ebube nke ndụ. Dị ka Pọl onyeozi si kwuo ya, anyị pụrụ ịkụ mkpụrụ ma kwọsa ya mmiri, ma ọ bụ ‘Chineke na-eme ka ọ na-aba ụba.’—1 Ndị Kọrint 3:7.
2. Ụdị uto dị aṅaa ka e buru amụma ya na Bible?
2 Otú ọ dị, e nwere ụdị uto ọzọ nke na-ejukwa anya n’otu aka ahụ. Ọ bụ nke e buru n’amụma site n’ọnụ onye amụma bụ́ Aịsaịa: “Onye nta n’etiti ha ga-aghọ [otu puku], onye dịkarịsịrị nta ga-aghọkwa mba nwere ume: mụ onwe m, Jehova, ga-eme ka ọ bịa ọsọ ọsọ na mgbe ya.” (Aịsaịa 60:22) Amụma nke a metụtara uto nke ndị Chineke, ọ na-enwekwa mmezu ka ukwuu n’oge anyị a.
3. Olee otú akụkọ afọ ije ozi nke 1991 si egosi na Jehova na-eme ka ọrụ nke ndị ya na-amụba?
3 Akụkọ ije ozi afọ 1991 nke ihe omume ụwa nile nke Ndịàmà Jehova na-egosi na ọnụ ọgụgụ nke ndị nkwusa Alaeze ruru ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu nke 4,278,820, e mekwara ngụkọta nke 300,945 ndị mmadụ baptism n’afọ ahụ. Site ná nnubata nke ọtụtụ ndị ọhụrụ, e guzobere 3,191 ọgbakọ ndị ọhụrụ, ya na ọnụ ọgụgụ sekit na distrikti ọhụrụ ndị dị mkpa. Nke ahụ bụ ihe karịrị ọgbakọ asatọ ọhụrụ kwa ụbọchị, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu sekit ọhụrụ kwa ụbọchị abụọ ọ bụla. Lee uto dị ịtụnanya nke ahụ bụ! N’ụzọ doro anya, Jehova na-eme ka ọ bịa ọsọ ọsọ, ngọzi ya na-adịkwasị ná mgbalị nile nke ndị ya.—Abụ Ọma 127:1.
Oge Maka Ime Nnyocha Onwe Onye
4. Ajụjụ ndị dị aṅaa ka a na-aghaghị ịtụle ka anyị na-elepụ anya n’ọdịnihu?
4 Ọ bụ ezie na ọ bụ ihe na-akpali obi ụtọ ịhụ, ngọzi nke a na-ewetakwa ibu ọrụ ụfọdụ. À ga-enwe ndị ikom zuru ezu bụ́ ndị ruru eru na ndị dị njikere ilekọta mkpa ime mmụọ nke ndị ọhụrụ a nile? Ka anyị na-elepụ anya gaa n’ọdịnihu, ọ bụ ihe na-eju anya iche echiche banyere ọnụ ọgụgụ nke ndị ọsụ ụzọ, ndị ohu na-eje ozi, ndị okenye, na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị a chọrọ iji lekọta uto na mmụba ahụ, tinyekwara ọnụ ọgụgụ nke ndị ọrụ afọ ofufo dị mkpa n’alaka ụlọ ọrụ na Ebe Obibi Betel dị iche iche gbaa ụwa gburugburu iji kwadoo ọrụ ahụ. Olee ebe ọnụ ọgụgụ nke a dị ukwuu nke ndị mmadụ ga-esi bịa? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na owuwe ihe ubi ahụ dị ukwuu. Ma taa, olee ndị nọ n’ọnọdụ ilekọta ndị ọrụ nile a chọrọ iji wee ihe ubi ahụ?—Matiu 9:37, 38.
5. Ọnọdụ ndị dị aṅaa ka e nwere n’ebe ụfọdụ n’ihi uto nke na-abịa ngwa ngwa?
5 Dị ka ihe atụ, a kọwo akụkọ na n’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, e nwere ọgbakọ ndị nwere dị ka otu narị ndị nkwusa Alaeze nke nanị otu onye okenye nakwa otu onye ohu na-eje ozi ma ọ bụ abụọ na-eje ozi na ha. Mgbe ụfọdụ, otu okenye na-eje ozi n’ọgbakọ abụọ. N’ebe ndị ọzọ, mkpa e nwere maka ndị Kraịst bụ́ ndị ozi ruru eru iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi dị ukwuu nke na ndị ọhụrụ na-echere mgbe ọ ga-erute ha. N’ebe ndị ọzọkwa, a na-eguzobe ọgbakọ ndị ọhụrụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ngwa nke na ọgbakọ atọ, anọ, ma ọ bụ ọbụna ise na-eji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe. Ma eleghị anya ị hụwo uto yiri nke ahụ n’ógbè nke gị.
6. N’ihi gịnị ka ime nnyocha onwe onye ji dị mkpa n’oge a n’ebe anyị nọ?
6 Gịnị ka ihe ndị a tụleworo na-agwa anyị? Na n’ihi oge anyị nọ n’ime ya, ọ dị mkpa ka anyị nile nyochaa ọnọdụ anyị iji hụ ma ànyị na-eji oge na ihe ndị anyị nwere na-eme ihe n’ụzọ kasị mma iji wee buo mkpa ahụ. (Ndị Efesọs 5:15-17) Pọl onyeozi degaara ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst na narị afọ mbụ akwụkwọ, sị: “N’ihi na mgbe unu kwesịrị ịbụ ndị ozizi n’ihi oge, ọ dị unu mkpa ọzọ ka mmadụ zie unu ihe bụ ihe ozizi mbụ nke mmalite okwu si n’ọnụ Chineke pụta; unu aghọwokwa ndị mmiri ara dị mkpa, ọ bụghị nri siri ike.” (Ndị Hibru 5:12) Dị ka okwu ndị ahụ na-egosi, ọ dịkwa mkpa ka ndị Kraịst n’otu n’otu na-eto eto. E nwekwara ezi ihe ize ndụ na mmadụ pụrụ ịnọgide na-abụ nwa ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ kama inwe ọganihu ruo ntozu okè ndị Kraịst. N’ikwekọ na nke a, Pọl na-agba anyị ume, sị: “Na-anwanụ onwe unu, ma unu dị n’okwukwe anyị; na-anwapụtanụ onwe unu.” (2 Ndị Kọrint 13:5) Ị̀ nyochawo onwe gị iji hụ ma ì nọwo na-eto eto n’ime mmụọ kemgbe e mesịrị gị baptism? Ka ị̀ nọwo na-eguzo n’otu ebe? Otú ọ dị, olee ụzọ mmadụ pụrụ isi mata?
“Omume Nwa Ọhụrụ”
7. Iji mee ka ọganihu ime mmụọ pụta ìhè, gịnị ka anyị na-aghaghị ime?
7 “Mgbe m bụrịị nwa ọhụrụ, ana m ekwu dị ka nwa ọhụrụ, ana m atụkwasị uche n’ihe dị ka nwa ọhụrụ, ana m agụ ihe dị ka nwa ọhụrụ: ugbu a mgbe m ghọworo okenye, emewo m ka omume nwa ọhụrụ ghara ịdị irè,” ka Pọl onyeozi kwuru. (1 Ndị Kọrint 13:11) N’uto ime mmụọ, ọ dị mgbe anyị nile dị ka ụmụaka n’echiche na n’omume anyị. Otú ọ dị, iji mee ka ọganihu anyị pụta ìhè, anyị aghaghị ịhapụ “omume nwa ọhụrụ,” dị ka Pọl kwuru. Olee ụfọdụ n’ime omume ndị a?
8. Dị ka okwu Pọl si dị ná Ndị Hibru 5:13, 14, gịnị bụ otu omume nke onye bụ nwa ọhụrụ n’ime mmụọ?
8 Na mbụ, rịba ama okwu Pọl kwuru ná Ndị Hibru 5:13, 14: “Onye ọ bụla nke na-eketa mmiri ara bụ onye a kanwaghị ya n’okwu ezi omume; n’ihi na ọ bụ nwa ọhụrụ. Ma nri siri ike bụ nke ndị tozuru okè, ndị a nwaworo nghọta ha n’ihi omume ha na-eme mgbe dum ịtụle ihe ọma na ihe ọjọọ.” Ị̀ ‘maara okwu nke ezi omume’? Ị̀ maara Okwu Chineke nke ọma iji nwee ike iji ya na-eme ihe “ịtụle ihe ọma na ihe ọjọọ”? Pọl kwuru na ndị tozuru okè nwere ike ime otú ahụ n’ihi na ha na-eri “nri siri ike” mgbe nile. Otú a, ọchịchọ ma ọ bụ agụụ nke mmadụ nwere maka nri ime mmụọ siri ike bụ ezi ihe na-egosi ma mmadụ ò towo n’ụzọ ime mmụọ ka ọ̀ ka bụ nwa ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ.
9. Olee ụzọ agụụ ime mmụọ nke mmadụ na-enwe si bụrụ ihe na-egosi na mmadụ na-enwe ọganihu ime mmụọ?
9 Mgbe ahụ, olee otú agụụ ihe ime mmụọ si agụ gị? Olee ụzọ i si ele nri ime mmụọ bara ụba nke Jehova na-ewepụta mgbe mgbe site n’akwụkwọ ndị dabeere na Bible na nzukọ na mgbakọ ndị Kraịst dị iche iche anya? (Aịsaịa 65:13) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị na-enwe ọṅụ nke ukwuu ma ọ bụrụ na e wepụta akwụkwọ ọhụrụ ná mgbakọ distrikti a na-enwe kwa afọ. Ma, gịnị ka ị na-eji ha eme ozugbo ị laruru n’ebe obibi gị? Gịnị ka ị na-eme mgbe mbipụta ọhụrụ nke magazin Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta! bịara? Ị̀ na-ewepụta oge iji gụọ akwụkwọ ndị a, ka ị̀ na-asape ime ha iji lee isi ihe ndị e kwuru na ha, mgbe ahụkwa tinye ha n’ebe ndị ọzọ dị n’ebe ndebe akwụkwọ gị? A pụrụ ịjụ ajụjụ ndị dị otú ahụ n’ihe banyere nzukọ nile nke ndị Kraịst. Ị̀ na-abịachi nzukọ nile a na-enwe anya? Ị̀ na-akwadebe ma na-ekerekwa òkè na ha? Ọ pụtara ìhè na ụfọdụ adabawo n’àgwà nke iri nri ime mmụọ n’ụzọ na-adịghị mma, na-agụ akwụkwọ ndị ahụ n’elu elu, na-erikwa ha n’ọkụ n’ọkụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Lee ka nke ahụ si dị iche n’ihe onye ọbụ abụ mere, bụ́ onye sịrị: “Lee ka m si hụ iwu gị n’anya! Ogologo ụbọchị nile ka nke ahụ bụ ihe m na-atụgharị n’uche.” Ọzọkwa, Eze Devid kwuru, sị: “M ga-ekele gị n’etiti mkpọkọta bara ụba: n’etiti òtù ndị nwere ume ka m ga-eto gị.” (Abụ Ọma 35:18; 119:97) N’ụzọ doro anya, ókè anyị nweruru ekele maka ndokwa ihe ime mmụọ bụ ihe ngosi nke ọganihu ime mmụọ.
10. Omume dị aṅaa nke onye bụ nwa ọhụrụ n’ime mmụọ ka e gosipụtara ná Ndị Efesọs 4:14?
10 Pọl rụtụrụ aka n’omume ọzọ nke nwa ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ mgbe ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Ka anyị wee ghara ịbụ nwa ọhụrụ ọzọ, ndị ifufe nile ọ bụla nke ozizi na-efegharị na-ebugharịkwa, n’ime ịtụ ntụ nke mmadụ, n’ime aghụghọ, nke ha ji ezupụta nduhie.” (Ndị Efesọs 4:14) Dị ka ndị mụrụ ụmụ maara nke ọma, ụmụ na-enwe ọchịchọ ịma banyere ihe ọ bụla. N’otu ụzọ, nke a bụ omume ziri ezi n’ihi na ọ na-enyere ha aka ịnwale na ịmụta ihe nakwa iji nwayọọ tolite ghọọ ndị tozuru okè. Otú ọ dị, ihe ize ndụ dị na ha ịbụ ndị otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ dọpụrụ uche n’ụzọ dị mfe. Dịkwa ka nke ka njọ, n’ihi enweghị ahụmahụ, ọchịchọ ịma ihe nke a na-edugakarị ha n’oké nsogbu, ọbụna na-etinye onwe ha na ndị ọzọ n’ihe ize ndụ. Nke a bụkwa eziokwu n’ihe banyere ndị bụ ụmụ ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ.
11. (a) Gịnị ka Pọl bu n’uche site n’iji okwu ahụ bụ́ “ifufe nile ọ bụla nke ozizi” mee ihe? (b) ‘Ifufe’ ndị dị aṅaa ka anyị na-ezute taa?
11 Otú ọ dị, gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe ọ sịrị na a na-ebugharị ndị bụ ụmụ ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ site ‘n’ifufe nile ọ bụla nke ozizi’? N’ebe a, a sụgharịrị “ifufe” site n’okwu Grik bụ aʹne·mos, nke akwụkwọ bụ́ International Critical Commentary kwuru ihe banyere ya na o yiri ka “a họọrọ iji ya mee ihe dị ka nke kwekọrọ n’echiche nke ime mgbanwe.” E mere ihe atụ nke a nke ọma site n’okwu Pọl gara n’ihu ikwu, “n’ime ịtụ ntụ nke mmadụ.” Okwu ahụ bụ́ “ịtụ ntụ” n’asụsụ mbụ pụtara n’ụzọ bụ isi “chaa chaa” ma ọ bụ “ịgba chaa chaa,” ya bụ, egwuregwu ihe ndabara. Ihe a na-ekwu bụ na mgbe mgbe anyị na-ezute echiche na nchụso ọhụrụ ndị pụrụ iyi ihe na-adịghị emerụ ahụ, ihe na-adọrọ mmasị, ọbụna ihe kwesịrị ekwesị. Okwu Pọl metụtara n’ụzọ bụ isi okwu ndị na-emetụta okwukwe anyị—òtù njikọ okpukpe dị iche iche, ihe gbasara mmekọrịta mmadụ na ibe ya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na ihe ndị yiri ha. (Tụlee 1 Jọn 4:1.) Ma ụkpụrụ ahụ bụkwa eziokwu n’ihe banyere ihe ndị na-ewu ewu n’ụwa nke na-agbanwe mgbe mgbe—ụdịdị, ntụrụndụ, ihe oriri, ahụ ike ma ọ bụ usoro mmega ahụ, na ihe ndị ọzọ. N’ihi enweghị ahụmahụ na echezighị echiche nke ọma, ihe dị otú ahụ pụrụ ịdọpụ uche nke onye bụ nwa ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ n’ụzọ dị ukwuu, sikwa otú a bụrụ onye e gbochiri inwe ọganihu ime mmụọ na imezu ibu ọrụ ndị Kraịst ya bụ́ ndị ka mkpa.—Matiu 6:22-25.
12. Olee ụzọ ụmụaka na-eto eto si dị iche n’ebe ndị okenye nọ n’ihe banyere ibu ọrụ?
12 Omume ọzọ nke ụmụaka na-eto eto bụ mkpa ha nwere maka enyemaka na nlebara anya n’oge nile. Ha amaghị banyere ibu ọrụ, nke ahụ adịghị echegbu ha; oge ụmụaka bụ oge mgbe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile a na-eme ná ndụ bụ ihe egwuregwu. Dị ka Pọl si kwuo ya, ha ‘na-ekwu okwu dị ka nwa ọhụrụ, na-eche echiche dị ka nwa ọhụrụ, na-atụgharị uche dị ka nwa ọhụrụ.’ Ha na-ewere ya na ndị ọzọ ga-elekọta ha. A pụrụ ikwu otu ihe ahụ banyere onye bụ nwa ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ. Mgbe onye ọhụrụ kwuru okwu Bible ya nke mbụ, ma ọ bụ malite ije ozi ubi, onye mụrụ ya n’ụzọ ime mmụọ na-enwe obi ụtọ ime ihe ọ bụla iji nyere ya aka. Gịnị na-eme ma ọ bụrụ na onye ọhụrụ anọgide na-adabere n’enyemaka dị otú ahụ ma ghọọ onye na-enweghị ike ịnakwere ibu ọrụ nke ilekọta onwe ya? O doro anya na nke ahụ ga-abụ ihe na-egosi emeghị mgbalị onwe onye.
13. N’ihi gịnị ka onye ọ bụla na-aghaghị ịmụta ibu ibu ọrụ nke ya?
13 N’ihe banyere nke a, cheta ndụmọdụ Pọl onyeozi nke na ọ bụ ezie na anyị kwesịrị ‘iburịta ibu na-anyị ibe anyị,’ n’agbanyeghị nke ahụ, “mmadụ nile n’otu n’otu ga-ebu ibu nke aka ha.” (Ndị Galetia 6:2, 5) N’ezie, ọ na-ewe oge na mgbalị mmadụ ịmụta ka e si ebu ibu ọrụ ndị Kraịst ya, ọ pụkwara ịpụta iji ihe ụfọdụ chụọ àjà n’akụkụ ụfọdụ. Otú ọ dị, ọ ga-abụ oké imehie ihe mmadụ itinye aka nke ukwuu n’ihe ụtọ nke ndụ, ma hà bụ ntụrụndụ, ime njem, ihe onwunwe, ma ọ bụ ọbụna nchụso na-adịghị mkpa nke ọrụ ego, nke na onye ahụ na-eguzo nnọọ n’akụkụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, n’enweghị ọchịchị ịmụba òkè ọ na-ekere n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ ma ọ bụ iru eru maka ọganihu na ibu ọrụ ime mmụọ. “Ghọọnụ ndị na-eme okwu ahụ, unu abụkwala ndị na-anụ nanị, ndị na-arafu onwe unu,” ka onye ahụ na-eso ụzọ bụ́ Jemes gbara ume.—Jemes 1:22; 1 Ndị Kọrint 16:13.
14. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji nwee afọ ojuju n’igosipụta omume nke onye bụ nwa ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ?
14 Ee, e nwere ọtụtụ omume ndị pụrụ ịdị mfe nghọta bụ́ ndị na-egosi ọdịiche dị n’etiti nwatakịrị na okenye. Otú ọ dị, ihe dị mkpa, dị ka Pọl si kwuo ya, bụ ka anyị jiri nwayọọ nwayọọ hapụ omume nwa ọhụrụ ma too. (1 Ndị Kọrint 13:11; 14:20) Ma ọ bụghị otú ahụ, anyị pụrụ inwe ihe mgbochi n’ụzọ ime mmụọ. Ma olee ụzọ mmadụ si enwe ọganihu? Gịnị ka ịnọgide na-eto eto n’ụzọ ime mmụọ ruo ntozu okè gụnyere?
Ụzọ Ọganihu Si Apụta Ìhè
15. Gịnị bụ isi ihe ndị dị n’usoro nke uto?
15 Olee ụzọ uto na-esi ewere ọnọdụ n’ihe ndị e kere eke? “Onye ọ bụla na-amalite ịdị ndụ dị ka otu mkpụrụ ndụ,” ka akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-akọwa. “Mkpụrụ ndụ ahụ na-ewebata ihe dị iche iche ma megharịa ha ịghọ ọkpụrụkpụ ihe ndị e ji ewu ihe nke dị ya mkpa iji too. Otú a, otu mkpụrụ ndụ ahụ na-esi n’ime eto. Mkpụrụ ndụ nke a pụrụ ịmụba ma kewaa iji mepụta mkpụrụ ndụ ndị ọzọ. Usoro nke iwu ihe, ịmụba, na ikewa bụ uto.” Isi ihe dị ịrịba ama n’ebe a bụ na uto na-ewere ọnọdụ site n’ime. Mgbe e riri ezi ihe na-edozi ahụ, ahụ mmadụ ewee nabata ya, jirikwa ya mee ihe, uto na-esi na ya apụta. A na-ahụ nke a nke ọma n’ihe banyere nwa a mụrụ ọhụrụ. Dị ka anyị maara, nwa a mụrụ ọhụrụ na-eri nri pụrụ iche na-apụta mgbe mgbe, nke e mepụtara nke ọma, bụ́ mmiri ara, nke jupụtara n’abụba na n’ihe na-edozi ahụ, bụ́ ihe ndị dị mkpa maka uto. Gịnị na-esi na ya apụta? Uto nke nwa ọhụrụ na-eto n’ihe dị ka ịdị arọ na ogologo n’afọ mbụ ya enweghị atụ n’afọ ọ bụla ọzọ nke ito eto kwesịrị ekwesị n’afọ ndụ ya nile.
16. Ụdị uto dị aṅaa ka a na-ahụ n’ebe ihe ka ọtụtụ ná ndị mmụta Bible ọhụrụ nọ, oleekwa ụzọ nke ahụ si kwe omume?
16 E nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta site n’usoro okike nke a nke uto nke anyị pụrụ iji mee ihe banyere ọganihu ime mmụọ anyị malite n’ihe ndị mbụ ruo ntozu okè. Na nke mbụ, usoro iri nri na-aga n’ihu n’ihu dị mkpa. Chee echiche laa azụ n’oge ị malitere ịmụ Bible. Ọ bụrụ na ị dị ka ihe ka ọtụtụ ná ndị ọzọ, ma eleghị anya ọ dịghị ihe ọ bụla ị maara kpam kpam banyere Okwu Chineke. Ma site n’izu ruo n’izu ị kwadebere ihe ị ga-amụ, nweekwa ọmụmụ Bible gị, n’ime mkpirikpi oge dị ka ọnọdụ gị si dị, ị ghọtara ozizi nile bụ isi nke Akwụkwọ nsọ. Nke ahụ, dị ka ị na-aghaghị ikweta, bụ uto dị ịrịba ama, ha nile bụkwa n’ihi iri Okwu Chineke mgbe nile dị ka nri!
17. N’ihi gịnị ka inwe usoro iri nri ime mmụọ chiri anya ji dị oké mkpa?
17 Otú ọ dị, gịnị banyere ugbu a? Ị̀ ka na-agbaso usoro iri nri chiri anya? Mmadụ ekwesịghị iche na nanị n’ihi na mmadụ abụwo onye e mere baptism, ọ dịghị mkpa inwe usoro ịmụ ihe a haziri ahazi, nke chiri anya, iji na-eri nri ime mmụọ na-edozi ahụ. Ọ bụ ezie na Timoti bụ onye nlekọta ndị Kraịst tozuru okè, Pọl gbara ya ume, sị: “Na-ejisi ike n’ihe ndị a; na-anọsi ike n’ime ha; ka ịga n’ihu gị wee pụta ìhè n’ebe mmadụ nile nọ.” (1Timoti 4:15) Lee ka o si dị mkpa ka onye ọ bụla n’ime anyị mee otú ahụ karị! Ọ bụrụ na i nwere mmasị ime ka ọganihu ime mmụọ gị pụta ìhè, a ghaghị ime mgbalị ndị dị otú ahụ.
18. Olee ụzọ ọganihu ime mmụọ mmadụ si apụta ìhè?
18 Ime ka ọganihu mmadụ pụta ìhè apụtaghị ime mgbalị pụrụ iche iji gosipụta ihe mmadụ maara ma ọ bụ ịgbalị ime ihe ga-atọ ndị ọzọ ụtọ. Jisọs kwuru, sị: “Unu onwe unu bụ ìhè nke ụwa. A pụghị izo obodo nke e wuworo n’elu ugwu” na, “ọnụ site n’ihe nke obi nwebigara ókè na-ekwu okwu.” (Matiu 5:14; 12:34) Mgbe obi anyị na uche anyị jupụtara n’ihe ọma nile nke Okwu Chineke, ọ dịghị ihe anyị pụrụ ime ma ọ bụghị ime ka nke a pụta ìhè site n’ihe anyị na-eme na ihe anyị na-ekwu.
19. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebi banyere ọganihu ime mmụọ anyị, gịnịkwa ka a na-ele anya na nke ahụ ga-arụpụta?
19 Ya mere, ajụjụ bụ: “Ị̀ na-amụ Bible ma na-abịa nzukọ nile nke ndị Kraịst n’ụzọ chiri anya iji na-eri ihe na-edozi ahụ nke pụrụ ịkpali uto ime mmụọ gị n’ime? Ya ejula gị afọ na ị bụ onye na-ekiri ihe na-emenụ nke na-adịghị ekere òkè mgbe a bịara n’uto ime mmụọ. Mee ihe ndị ziri ezi iji jide n’aka na ị na-eji nri ime mmụọ bara ụba nke Jehova na-ewepụta mee ihe n’ụzọ zuru ezu. Ọ bụrụ na ị bụ onye ‘obi na-atọ ụtọ n’iwu Jehova, i wee na-atụgharị uche n’iwu ya ehihie na abalị,’ mgbe ahụ a pụkwara ikwu banyere gị, sị: “Ọ ga-adịkwa ka osisi a kụworo n’akụkụ iyi jupụtara na mmiri, nke na-amị mkpụrụ ya na mgbe ya, ọzọ, akwụkwọ ya adịghị akpọnwụ; ihe ọ bụla ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.” (Abụ Ọma 1:2, 3) Otú ọ dị, gịnị ka a pụrụ ime iji jide n’aka na ị nọgidere na-enwe ọganihu ime mmụọ? Nke a ka anyị ga-atụle n’isiokwu ọzọ na-esonụ.
Ị̀ Pụrụ Ịza?
◻ N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe dị mkpa n’oge a anyị inyocha ọganihu ime mmụọ anyị?
◻ Olee ụzọ uto ime mmụọ si metụta agụụ ime mmụọ?
◻ Gịnị ka “ifufe nile ọ bụla nke ozizi” pụtara?
◻ N’ihi gịnị ka onye ọ bụla na-aghaghị iji buru ibu ọrụ nke ya?
◻ Olee ụzọ e si enweta ọganihu ime mmụọ?
[Foto dị na peeji nke 10]
Ị̀ na-ewepụta oge iji gụọ akwụkwọ ndị dabeere na Bible?