Eweturu M Onwe M Ala wee Chọta Obi Ụtọ
NA 1970, adị m 23 afọ, nweekwa oké ọchịchọ. N’ebe m na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ụgbọ ala dị na Ivrea, Itali, e mere m onye isi ndị na-edekọ ihe a na-arụ. Ekpebisiri m ike ịghọ onye dị mkpa. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, enwere m obi ịda mbà, obi adịghịkwa m mma. N’ihi gịnị?
Di m na-etinye ihe ka ukwuu n’oge ya n’ụlọ mmanya, soro ndị enyi ya na-eti kaadị, ọ hapụkwara m ibu ihe ka ọtụtụ n’ibu ezinụlọ. Mmekọrịta anyị malitere ịdakpọ. Ntakịrị ihe ọ bụla na-ewetara anyị esemokwu. N’ihi nke ahụ, uche m jupụtara n’echiche na-ezighị ezi.
‘Ọ dịghị onye nwere mmasị n’ezie n’ebe m nọ,’ ka m na-ekwu. ‘Nanị ihe ha chọrọ bụ iji ọnọdụ gị mere ihe dị ha mma.’ Ana m agwa onwe m, sị: ‘Chineke apụghị ịdị n’ihi na a sị na ọ dị, ọ gaghị ekwe ka oké nhụjuanya na ajọ omume dịrị. Ndụ abụghị ihe ọzọ e wezụga ịchụso ọnwụ.’ Apụghị m ịghọta ihe mere nke a ji dị otú ahụ.
Mmalite nke Mgbanwe
Otu ụbọchị na 1977, mmadụ abụọ n’ime Ndịàmà Jehova kụrụ aka n’ọnụ ụzọ anyị. Di m, bụ́ Giancarlo kpọbatara ha n’ime ụlọ, ha wee banye na palọ ije kwuo okwu. Ebumnuche ya bụ ime ka ha ghọọ ndị kwere n’evolushọn dị ka ya, ma ha bụ ndị gbanwere echiche ya!
N’oge na-adịghị anya, Giancarlo malitekwara ime mgbanwe dị iche iche ná ndụ ya. Ọ ghọrọ onye na-enwe ndidi karị, na-ewepụtara mụ na nwa anyị nwanyị oge karị ma na-elebara anyị anya. Ọ gbalịrị ịkọrọ m banyere ihe ndị ọ na-amụta, m na-anọgidekwa na-eji okwu ọjọọ na-emechi nkwurịta okwu ahụ.
Mgbe ahụ, n’otu ụbọchị mgbe Ndịàmà ahụ bịara, anọdụrụ m ala wee ṅaa ntị n’ezie. Ha kwuru okwu banyere ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a na banyere Alaeze Chineke, elu ala bụ Paradaịs, na mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ. O juru m anya! Ehighị m ụra n’abalị atọ ndị na-esonụ! Achọrọ ịmụtakwu ọtụtụ ihe, ma nganga ekweghị m jụọ di m ajụjụ. Ya mere, n’otu ụbọchị, ọ gwara m n’ụzọ dị ike, sị: “Taa ị ga-aṅa ntị. Enwere m azịza nye ajụjụ gị nile.” Mgbe ahụ ọ kọwaara m nnọọ eziokwu nile nke Bible.
Giancarlo gwara m na Jehova bụ aha nke Onye Okike, na àgwà Ya bụ isi bụ ịhụnanya, na O zitere Ọkpara Ya dị ka ihe mgbapụta ka anyị wee nwee ndụ ebighị ebi, na mgbe e bibisịrị ndị ajọ omume n’Amagedọn, Jisọs Kraịst ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’oge Ọchịchị Puku Afọ ya. Ọ sịrị na ndị bilitere n’ọnwụ ga-etoru izu okè nke uche na nke anụ ahụ, na ha ga-enwe ohere ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala na Paradaịs.
N’ụbọchị na-esonụ, esooro m di m gaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na nke mbụ ya. Mgbe e mesịrị, agwara m ya, sị: “Ndị a hụrụ onwe ha n’anya. Achọrọ m ịnọgide na-abịa ebe a n’ihi na ha nwere obi ụtọ n’ezie.” Amalitere m ịbịachi nzukọ nile anya, e duzikwaara m ọmụmụ Bible. Echere m ọtụtụ ihe banyere ihe m na-amụta, n’oge na-adịghịkwa anya obi siri m ike na achọtawo m ezi ndị Chineke. Na 1979, mụ na di m gosipụtara nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova site n’ịbụ ndị e mere baptism.
Ije Ozi Oge Nile
N’otu mgbakọ sekit e nwere mgbe oge ụfọdụ gasịrị n’afọ ahụ, e kwuru otu okwu na-agba ume ịrụ ọrụ nkwusa ahụ n’oge nile. A kpaliri m iwere ozi ahụ, agakwuuru m Jehova n’ekpere banyere okwu ahụ. Ma mgbe ahụ atụụrụ m ime, e mebikwara atụmatụ m. N’ihe karịrị afọ anọ na-esonụ, anyị mụtara ụmụ atọ. Abụọ n’ime ha, n’oge dị iche iche, nwetara ọrụsị ndị na-eyi ndụ egwu. Anyị nwere ekele na, n’ọnọdụ nke ọ bụla, ha gbakere nke ọma.
Ugbu a echere m na apụghị ịhapụ atụmatụ m nke ije ozi oge nile. Akwụsịrị m ọrụ ego m iji tụkwasị uche m n’ụzọ ka mma n’ibu ọrụ m dị ka onye bụ nwunye na nne. Mụ na di m mere atụmatụ iji ihe otu onye na-akpata na-ebi ndụ, nke pụtara ịhapụ ihe nile na-adịghị mkpa. Ma, Jehova gọziri anyị nke ukwuu, ọ dịghị mgbe ọ hapụrụ anyị n’ogbenye ma ọ bụ ná mkpa.
Na 1984 nwa m nwanyị, bụ́ onye dị 15 afọ mgbe ahụ na onye e meworo baptism n’oge na-adịbeghị anya, malitere ije ozi oge nile dị ka onye ọsụ ụzọ. N’otu oge ahụ, a họpụtara di m dị ka okenye. Gịnị banyere m? N’iche na apụghị m ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ n’oge ahụ, esetịpụrụ m ihe mgbaru ọsọ nke inye 30 hour kwa ọnwa n’ọrụ nkwusa ahụ. Eruru m ya, m wee gwa onwe m, sị: ‘I mere nke ọma! Ị na-eme ihe dị ukwuu.’
Otú ọ dị, nganga ghọkwara nsogbu m ọzọ. (Ilu 16:18) Anọgidere m na-eche banyere ụzọ m si na-eme nke ọma, na ọ dịghịkwa mkpa inwe ọganihu ime mmụọ ọ bụla ọzọ. Ọnọdụ ime mmụọ m malitere ịdakpọ, amalitekwara m ọbụna ịhapụ àgwà ọma ndị m zụliteworo. Mgbe ahụ, anatara m ịdọ aka ná ntị nke dị m mkpa.
Na 1985 ndị nlekọta abụọ na-ejegharị ejegharị na nwunye ha bụ ndị ọbịa n’ebe obibi anyị ka ha nọ ná nleta ha na-eme site n’oge ruo n’oge n’ọgbakọ anyị. Ikiri ndị Kraịst ndị a dị umeala, ndị na-eji onwe ha achụ àjà, kpaliri m n’ezie ịtụgharị uche n’okwu ụfọdụ. Emere m nnyocha n’isiokwu banyere ịdị umeala, na-eji akwụkwọ dị iche iche nke Watch Tower Society na-eme ihe. Echere m echiche banyere ịdị umeala n’obi dị ukwuu Jehova na-egosipụta n’ụzọ o si emeso anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-emehie emehie. (Abụ Ọma 18:35) Amaara m na m ghaghị ịgbanwe echiche m.
Arịọrọ m Jehova ka o nyere m aka ịzụlite ịdị umeala n’obi iji jeere ya ozi n’ụzọ o si chọọ ka m mee, duziekwa m n’iji onyinye ndị m nwere na-eme ihe iji wetara ya otuto. Edejupụtara m akwụkwọ maka ozi ọsụ ụzọ, amalitekwara m ijere ya ozi n’ozi oge nile na March 1989.
Apụrụ m ikwu ugbu a na ana m enwe obi ụtọ n’ezie, na iwetu onwe m ala bụ ihe meworo ka m nwee obi ụtọ. Achọtawo m ezi ihe mere m ga-eji adị ndụ—nke bụ inyere ndị nọ ná mkpa aka ịmara na Jehova, bụ́ ezi Chineke ahụ, anọghị n’ebe dị anya nye ndị na-achọ ya.—Dị ka Vera Brandolini si kọọ.