Nsụgharị Bible N’asụsụ Ndị Africa
Nsụgharị kasị mee ochie nke akụkụ Bible dum gaa n’asụsụ ndị Africa bụ nke e mere n’Ijipt. N’ịbụ nke a maara dị ka nsụgharị Coptic, e kwetara na ha malitere ịdị na narị afọ nke atọ ma ọ bụ nke anọ O.A. Mgbe ihe dị ka narị afọ atọ gasịrị, a sụgharịrị Bible gaa n’asụsụ Ethiopic.
Ọtụtụ narị asụsụ ndị a na-adịghị ede ede nke a na-asụ n’ebe ndịda Etiopịa na Sahara aghaghị ichere ọbịbịa nke ndị ozi ala ọzọ na narị afọ nke 19. N’afọ 1857 e mere ihe dị oké mkpa mgbe Robert Moffat rụsịrị ọrụ ná nsụgharị nke Bible gaa n’asụsụ Tswana, bụ́ asụsụ a na-asụ n’ebe ndịda Africa. O bipụtakwara ya ná nkebi ná nkebi n’ígwè aka na-ebi akwụkwọ. Nke a bụ Bible mbụ zuru ezu e bipụtara n’Africa, bụrụkwa nsụgharị mbụ zuru ezu nke dị n’asụsụ Africa a na-adịghị ede ede na mbụ. N’ụzọ na-akpali mmasị, Moffat jiri aha Chineke bụ́ Yehova mee ihe ná nsụgharị ya. Ná nsụgharị 1872 nke e bipụtara site n’aka òtù British and Foreign Bible Society, e ji aha ahụ bụ́ Yehova mee ihe n’okwu ndị bụ isi Jisọs kwuru dị ka e dekọrọ na Matiu 4:10 na Mak 12:29, 30.
Ka ọ na-erule afọ 1990, a sụgharịwo Bible dum gaa na 119 asụsụ ndị Africa, e nwekwara akụkụ ya ụfọdụ na 434 asụsụ ndị ọzọ.