Owuwe Ihe Ubi nke Krisendọm n’Africa
ỌCHỊCHỌ Charles Lavigerie nke ịtọghata Algeria ịghọ “mba ndị Kristian” ghọrọ nke ahụ kpọmkwem—ọchịchọ efu. Taa, 99 pasent nke ọnụ ọgụgụ ndị Algeria bụ ndị Alakụba, Krisendọm eguzosighịkwa ike n’akụkụ buru ibu nke Ebe Ugwu Africa. Ma gịnị banyere akụkụ ndị ọzọ nke kọntinent ahụ?
“Iso Ụzọ Kraịst,” ka Dr. J. H. Kane kwuru n’akwụkwọ bụ́ A Concise History of the Christian World Mission, “atọghatawo ọtụtụ ndị karị n’Africa Isi Ojii karịa n’akụkụ nile ọzọ nke Mba Ndị Na-emepebeghị Emepe ma e jikọta ha nile.” Otú ọ dị, ndị a a tọghatara atọghata hà bụ ndị Kraịst n’ezie? “Otu oké ihe ize ndụ dị na chọọchị Africa,” ka Dr. Kane kwetara, “bụ ngwakọ nke Kristian na ọgọ mmụọ.” Ọzọkwa, okwu ya bụ́ “chọọchị Africa” ezighị ezi. N’ụzọ nkịtị, e nwere ọtụtụ puku chọọchị dị iche iche n’Africa, nke ọ bụla nwekwara ụzọ ife ofufe nke ya. N’ihi gịnị?
Ịkụ Mkpụrụ nke Adịghị n’Otu
A kụrụ mkpụrụ nke adịghị n’otu ọbụna tupu ndị ozi ala ọzọ ejiri ụgbọ mmiri bịa n’Africa. Òtù London Missionary Society nwetara ndị òtù site na chọọchị dị iche iche, arụmụka ozizi kpụ ọkụ n’ọnụ wekwaara ọnọdụ n’etiti ndị ozi ala ọzọ ahụ ụgbọ mmiri bu na-eje n’ebe e kenyere ha ọrụ. O doro anya na esemokwu ahụ ga-aka njọ mgbe ha nwetasịrị ebe obibi ha n’ebe e zijere ha.
“Ndị ozi ala ọzọ ahụ,” ka Professor Robert Rotberg dere n’akwụkwọ ya bụ́ Christian Missionaries and the Creation of Northern Rhodesia 1880-1924, “lụsoro ibe ha ọgụ dị ilu, tinyekwara ndị nlekọta ha nọ n’ofesi, bụ́ nke na-emebikarị nzube ha ji bịa nke izisa ozi ọma. . . . Ndị ozi ala ọzọ yiri ka hà tinyere oge na ike dị ukwuu n’ide banyere esemokwu ha dịkwa ka ha mere n’ịchọ ndị ha ga-atọghata.”
Mgbe ụfọdụ, esemokwu ndị ozi ala ọzọ kpatara nguzobe nke ogige okpukpe ndị na-ebuso ibe ha iro. Ogige okpukpe ndị Katọlik na ndị Protestant ji obi ọjọọ na-azọ ndị ha ga-atọghata. Otu ụdị adịghị n’otu nke a aghaghị ịpụta ìhè n’etiti ndị ha tọghatara. Ka oge na-aga ọtụtụ nde ndị Africa hapụrụ chọọchị ndị ozi ala ọzọ ahụ wee guzobe chọọchị nke aka ha.
“Òtù African Independent Churches,” ka onye ozi ala ọzọ na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Dr. Kane dere, “bụ ndị a na-achọta n’akụkụ nile nke Africa . . . A gụkọta ha nile, e nwere ihe dị ka ìgwè puku asaa dị iche iche n’òtù nke a.” Ịsọ mpi n’etiti ndị ozi ala ọzọ nwere nkwenkwe ndị na-emegiderịta onwe ha abụghị nanị ihe so kpata nke a. N’akwụkwọ ya bụ́ The Missionaries, Geoffrey Moorhouse na-akọwa na ihe ọzọ so kpata “nkewapụ ndị isi ojii” bụ “iwe megide ịdị elu nke ndị ọcha.”
Ndị Kristian ka ọ̀ bụ Ndị Europe Na-akpa Ókè Agbụrụ?
“Ndị ozi ala ọzọ ahụ,” ka Dr. Kane kwetara, “chere na ha ka ndị ọzọ.” Ha “kwetara na okpukpe ndị Kristian aghaghị inwe ọdịnala ndị Europe na idu ndú ndị Europe,” ka Adrian Hastings kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ African Christianity.
Onye France ahụ bụ́ Charles Lavigerie bụ otu onye ndú ozi ala ọzọ nwere echiche nke a. Onye ọzọ bụ John Philip, bụ́ onye na-elekọta ogige okpukpe nke òtù London Missionary Society dị n’ebe ndịda Africa. “Ndị ozi ala ọzọ anyị,” ka o turu ọnụ na 1828, “na-agbasa . . . ọdịmma ndị Britain, mmetụta ndị Britain, nakwa alaeze ukwu Britain. Ebe ọ bụla onye ozi ala ọzọ malitere ịchọ ndị ntọghata n’etiti agbụrụ ọ bụla na-emepeghị emepe, ịkpọasị ha megide ọchịchị ndị ọcha na-akwụsị; ndabere ha dabeere n’ọchịchị ndị ọcha na-arị elu site ná mwepụta nke mkpa ndị e chepụtara echepụta; . . . ụlọ ọrụ, azụmahịa, na ọrụ ugbo na-ebiri ọkụ; onye ọ bụla obi ya ziri ezi nke a tọghatara site n’etiti ha . . . na-aghọ enyi na onye ya na ọchịchị ndị ọcha na-emekọ ihe.”
Ọ̀ bụ ihe ijuanya na ọchịchị ndị Europe lere ndị ozi ala ọzọ dị otú ahụ anya dị ka ngwá ọrụ bara uru iji mụbaa ọchịchị ndị ọcha? Nye ha, ndị ozi ala ọzọ nabatara mmeri nke ọchịchị ndị ọcha nwere n’Africa. Dị ka ha kwupụtara ná Nzukọ Ndị Ozi Ala Ọzọ nke Ụwa Nile e mere na 1910 n’Edinburgh: “Ọ gaghị . . . ekwe omume ịnọgide na-enwe ọdịiche dị n’etiti nzube ozi ala ọzọ na nzube nke Ọchịchị.”
Ha Chịrị dị ka Ndị Eze n’Africa
Iji gosipụta ikike ha, ụfọdụ ndị ozi ala ọzọ dabeere n’ike agha nke ọchịchị ndị ọcha. Mgbe ụfọdụ a na-etikpọsi obodo ndị dị n’ụsọ osimiri site n’ụgbọ ndị agha mmiri bu ngwá agha n’ihi na ndị obodo ahụ jụrụ ịnakwere ikike ndị ozi ala ọzọ. Na 1898, Dennis Kemp, bụ́ onye ozi ala ọzọ so n’òtù Wesleyan nke e zigara n’Ọdịda Anyanwụ Africa, kwupụtara ‘nkwenye ya siri ike na Chineke na-eji Ndị Agha Elu Ala na Ndị Agha Mmiri nke Britain na-eme ihe taa iji mezuo nzube Ya.”
Mgbe ha guzosiworo ike, mgbe ụfọdụ ndị ozi ala ọzọ na-eweghara ike ọchịchị nke ndị chiifu agbụrụ. “Ndị ozi ala ọzọ nke òtù London ahụ zipụrụ,” ka Professor Rotberg dere, “na-ejikarị mmanye eme ka e rube isi n’iwu okpukpe ha. Otu ihe na-amasị ha nke ha na-eji eme ka a mata na ha jụrụ ajụ bụ cikoti, bụ́ ogologo ụtarị nke e ji akpụkpọ enyi mmiri e chekpọrọ echekpọ mee. E ji ya pịa ndị Africa ụtarị mgbe ọ bụla n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ maka ihe ọ bụla ha jụrụ ime.” “Otu onye Africa a tọghatara,” ka David Lamb rịbara ama n’akwụkwọ ya bụ́ The Africans, “chetara otu onye Anglican na-eje ozi ala ọzọ na Uganda nke a maara dị ka Bwana Botri, bụ́ onye na-esikarị n’ịkpọ okwu ya rịdata n’oge ofufe na-aga n’ihu ịpịa ndị Africa bịara n’azụ oge ụtarị.”
N’ịbụ onye omume dị otú ahụ nwụrụ ibubo n’ahụ, otu onye ozi ala ọzọ, bụ́ James Mackay, mere mkpesa n’aka ndị nlekọta nke òtù London Missionary Society. “Kama ịbụ ndị e lere anya dị ka ndị ọcha na-eweta ozi ọma nke ịhụnanya Chineke,” ka ọ dọrọ aka ná ntị, “a maara ndị anyị bụ ma na-atụ anyị egwu.”
Agha Ụwa Ndị Ahụ
“Ruo ihe karịrị otu narị afọ,” ka akwụkwọ ahụ bụ́ The Missionaries kwuru, “a nọwo na-agwa [ndị Africa] mgbe nile nakwa n’ụzọ siri ike na ịlụ ọgụ na mkpali obi ọjọọ nile nke ọ na-akpata bụ ihe na-adịghị arụpụta ezi ihe ọ bụla, bụrụkwa ajọ ihe.” Mgbe ahụ, na 1914, Agha Ụwa Mbụ tiwapụrụ n’etiti mba ndị kpọrọ onwe ha ndị Kristian nke Europe.
“Ndị ozi ala ọzọ nke ihe ka ọtụtụ ná mba ọ bụla bụ ndị e mikpuru n’Oké Agha ahụ,” ka Moorhouse kọwara. Dị ka nke bụ ihe ihere nye ha, ndị ozi ala ọzọ gbara ndị Africa ha tọghataworo ume ka ha nwee ndị ha kwadoro. Ndị ozi ala ọzọ ụfọdụ kpọọrọ ọbụna ìgwè ndị agha Africa gaa agha. Professor Stephen Neill kọwara mmetụta nke agha ahụ nwere nke ọma n’akwụkwọ ya bụ́ History of Christian Missions, sị: “Mba ndị Europe, ya na oké itu ọnụ ha nke ịbụ nanị ndị nwere Iso Ụzọ Kraịst na mmepeanya, ji ikpu ìsì na mgbagwoju anya gbaba n’agha obodo nke mere ka ha daa ogbenye akụ na ụba, meekwa ka ha ghara inwe nkwanye ùgwù ọ bụla.” “Agha Ụwa nke Abụọ,” ka Neill gara n’ihu ikwu, “metọpụrụ nnọọ ihe nke mbụ ahụ mezuwororị. E gosipụtara omume ọma nke e chere na Ndị Ọcha na-eme dị ka ihu abụọ; e kpughere ‘Krisendọm’ dị ka nke bụ nanị akụkọ ifo. Ọ bụghịkwa ihe kwere omume ikwu okwu banyere ‘Ndị Ọcha bụ́ ndị Kristian.’”
Dị ka ihe kwere nghọta, nkewapụ nke ndị isi ojii rịrị elu mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị. Ma gịnị banyere ndị Africa rapagidesiri ike na chọọchị nile nke Krisendọm? È mesịrị kụziere ha eziokwu sitere na Bible?
Nkwenkwe Ndị Africa Banyere Ndị Nna Ochie
Ndị ozi ala ọzọ nke Krisendọm katọrọ ihe omume okpukpe ndị Africa, dị ka ijekwuru ndị na-ajụ mmụọ ase iji mee ka obi dajụọ ndị nna ha ochie nwụrụ anwụ. N’otu mgbe ahụ, ndị ozi ala ọzọ ahụ nọgidere na-ekwu na mmadụ nile nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. Ha kwalitekwara ofufe nke Meri na “ndị nsọ.” Ozizi ndị a gosipụtara izi ezi nke nkwenkwe ndị Africa nke na ndị nna ha ochie nwụrụ anwụ dị ndụ. Ọzọkwa, site n’ife ihe oyiyi okpukpe, dị ka obe, ndị ozi ala ọzọ mere ka oyiyi ndị Africa na-eyi ọgwụ dị ka ihe nchebe pụọ n’aka ndị ajọ mmụọ bụrụ ihe ziri ezi.
Professor C. G. Baëta kọwara n’akwụkwọ ya bụ́ Christianity in Tropical Africa, sị: “Ọ bụ ihe kwere omume onye Africa iji ịnụ ọkụ n’obi nile bụọ abụ na Chọọchị, sị, ‘Enweghị m ebe mgbaba ọzọ e wezụga Chineke,’ ma ka na-eyigharị ọgwụ n’otu akụkụ ahụ ya, ma ọ bụ nwee ike isi na Chọọchị pụọ gaa kpọmkwem na nke onye na-ajụtara ya mmụọ ase, n’echeghị na ya na-emebi ụkpụrụ ọ bụla.”—Tụlee Deuterọnọmi 18:10-12 na 1 Jọn 5:21.
Ọtụtụ ndị ozi ala ọzọ gwara ndị Africa na a na-ata ndị nna ha ochie gọrọ mmụọ ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ, na nke ahụ ga-abụkwa ihe ga-eme ha ma ọ bụrụ na ha ajụ ịnakwere ozizi nile nke ndị ozi ala ọzọ. Ma ozizi nke ịta ahụhụ ebighị ebi na-emegide okwu ahụ doro anya dị n’ime Bible ahụ nke ndị ozi ala ọzọ mere mgbalị dị ukwuu ịsụgharị gaa n’asụsụ ndị Africa.—Jenesis 3:19; Jeremaịa 19:5; Ndị Rom 6:23.
N’ezie, Bible na-ekwu na mkpụrụ obi mmadụ nke na-emehie emehie na-anwụ anwụ, na “ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.” (Eklisiastis 9:5, 10; Ezikiel 18:4) Banyere ndị Africa na-enwetaghị ohere ịnụrụ eziokwu Bible, ha nwere olileanya nke ịbụ ndị a gụnyere n’ọbịbịa nke “mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume.” (Ọrụ 24:15) A ga-akụziri ndị dị otú ahụ a kpọlitere n’ọnwụ banyere ndokwa Chineke maka nzọpụta. Mgbe ahụ, ọ bụrụ na ha ejiri ekele nara ịhụnanya Chineke, a ga-eji ndụ ebighị ebi kwụghachi ha ụgwọ n’elu ala bụ́ paradaịs.—Abụ Ọma 37:29; Luk 23:43; Jọn 3:16.
Kama ịkụzi eziokwu Bible ndị a dị ebube, Krisendọm eduhiewo ndị Africa site n’ozizi ụgha na ihu abụọ nke okpukpe. N’ezie, òkè ndị ozi ala ọzọ nke Krisendọm keere ná mmeri nke ọchịchị ndị ọcha nwere n’Africa enweghị nkwado ọ bụla na Bible. N’ụzọ megidere nke ahụ, Jisọs kwuru na Alaeze ya “esiteghị n’ụwa” na ezi ndị na-eso ụzọ ya ‘esiteghịkwa n’ụwa’ n’otu aka ahụ. (Jọn 15:19; 18:36) Ndị Kraịst oge gboo bụ ndị nnọchianya nke Jisọs Kraịst, ọ bụghị ndị nke ọchịchị ụwa.—2 Ndị Kọrint 5:20.
Ya mere, owuwe ihe ubi nke Krisendọm n’Africa n’ozuzu ya bụ nke na-adịghị enye obi ụtọ, nke ihe e ji mara ya bụ adịghị n’otu, ekwesịghị ntụkwasị obi, na “ngwakọ Kristian na ọgọ mmụọ” na-anwụ ibubo n’ahụ. Ime ihe ike nke kaworo ọtụtụ akụkụ Africa bụ́ “ndị Kristian” akara bụ n’ezie nke na-ekwekọghị n’ozizi nile nke “Onye Isi Udo.” (Aịsaịa 9:6) Mkpụrụ nke ọrụ Krisendọm mịpụtaworo n’Africa na-emegide kpọmkwem ihe Jisọs kwuru banyere ezi ndị na-eso ụzọ ya. N’ekpere o kpegaara Nna ya nke eluigwe, Jisọs rịọrọ ka “ha bụrụ ndị zuworo okè ịbụ otu; ka ụwa wee mara na gị onwe gị zitere m.”—Jọn 17:20, 23; 1 Ndị Kọrint 1:10.
Nke a ọ̀ pụtara na ọrụ ozi ala ọzọ nile a rụrụ n’Africa abụwo ihe dara ada? Ọ dịghị otú ahụ ma ọlị. A ga-atụlekwu mkpụrụ ọma nke ọrụ ije ozi ala ọzọ nke ezi ndị Kraịst rụrụ n’Africa nakwa gburugburu ụwa n’isiokwu ndị na-amalite na peji nke 10.
[Foto dị na peeji nke 6]
Ndị ndú n’ozi ala ọzọ nke narị afọ ikpeazụ a, dị ka John Philip, kwetara na mmepeanya Europe na Iso Ụzọ Kraịst bụ otu ihe
[Foto dị na peeji nke 6]
Cape Archives M450
[Foto dị na peeji nke 7]
Ndị ozi ala ọzọ nke Krisendọm kwadoro nkwenkwe ndị Africa banyere ndị nna ochie site n’ịgbasa ozizi ndị na-adịghị na Bible, dị ka anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi
[Foto dị na peeji nke 7]
Site n’ikike nke Africana Museum, Johannesburg