Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 9/1 p. 26-30
  • Jehova Elekọtawo M Anya Nke Ọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Elekọtawo M Anya Nke Ọma
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Ndụ Nwata M
  • Ịgbara Ndị Ikwu Àmà
  • Ngọzi n’Agbanyeghị Mmegide
  • Ihe Àmà Ndị Ọzọ nke Nlekọta Jehova
  • Ihe Omume n’Ofesi
  • Ihe Ùgwù Ije Ozi Ndị Ọzọ—Na Otu Ule
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 9/1 p. 26-30

Jehova Elekọtawo M Anya Nke Ọma

AMALITERE m ijere Jehova ozi n’ụzọ pụrụ iche, ka m kwugodị ya otú ahụ. Etolitere m n’otu ime ime obodo mara mma nke ime ime ebe ugwu New Zealand, bụ́ ebe ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị Maori dị ka m bi. N’otu ụbọchị mgbe m na-eme njem n’elu ịnyịnya, nwa nwanne nna m, bụ́ Ben, bịakwutere m n’ụzọ. Nke ahụ bụ na 1942, n’oge mgbụsị akwụkwọ (Ebe Ndịda Ụwa, oge opupu ihe ubi n’Ebe Ugwu Ụwa). Adị m 27 afọ, n’oge ahụ abụkwa m onye òtù Church of England nke na-arụsi ọrụ ike.

Ruo ọtụtụ afọ, Ben anọwo na-agụ akwụkwọ nile nke Judge Rutherford, bụ́ onye isi oche nke Watch Tower Bible and Tract Society n’oge ahụ, ugbu a, o jikwa otu akwụkwọ ozi n’aka ya nke sitere n’isi ụlọ ọrụ New Zealand nke Watch Tower Society, nke na-agwa ya ka ọ kpọọ ndị obodo òkù ka ha bịa n’otu ebe nke ha pụrụ ịnọ mekọọ ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị ọnụ. Ọzọkwa, Ben gaje ime ndokwa maka onye ga-eduzi ofufe ahụ. N’ile m anya n’ihu, Ben sịrị: “Gị onwe gị bụ onye ahụ.” N’ihi obi ụtọ nke ịbụ onye e lere anya dị ka onye ruru eru—nakwa n’ihi ịbụ onye na-anata oriri na chọọchị—ekwetara m.

N’uhuruchi nke ụbọchị ahụ, ihe dị ka 40 mmadụ zukọrọ n’ebe obibi Ben maka ime ememe nke ọnwụ Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa otu onye n’ime ha bụ Onyeàmà Jehova. Mgbe m bịarutere, nwa nwanne nna m nyefere m usoro ndepụta okwu ahụ. Akagburu m abụ ahụ a tụrụ aro ka a bụọ ma kpọkuo di nwanne Ben ka o meghee n’ekpere. Mgbe ahụ, m gara n’ihu ikwu isiokwu ahụ dị n’ihe ndepụta, bụ́ nke gụnyere usoro ajụjụ na azịza ndị dabeere n’Akwụkwọ nsọ. Otu onye ụkọchukwu nọ n’ebe ahụ napụrụ m okwu n’ọnụ site n’ịgbagha ihe m kwuru, ma a zara ajụjụ ndị a site n’ịgụ ntụaka Akwụkwọ nsọ ndị dị n’usoro ndepụta okwu ahụ.

Echetara m na otu n’ime ajụjụ ndị ahụ dị n’usoro ndepụta okwu metụtara oge a ga-eme ememe ahụ n’afọ. Lee ka o si bụrụ ihe na-eju afọ mgbe ndị nile nọ n’ebe ahụ lepụrụ anya na window wee hụ ọnwa gbazuru agbazu. O doro anya na ụbọchị ahụ bụ Nisan 14.

Lee aha abalị nke ahụ bụ! Ememe ahụ anyị mere were hour anọ! A jụrụ ọtụtụ ajụjụ ma zaa ha site n’Akwụkwọ nsọ ndị dị n’usoro ndepụta okwu nke Society. N’ileghachi anya azụ, amaara m na apụghị m imeworị ihe ahụ ma ọ bụghị na Jehova ji ịhụnanya lekọta m—ọ bụ ezie na n’oge ahụ abụghị m otu n’ime Ndịàmà ya raara onwe ha nye. Otú o sina dị, n’abalị Ememe Ncheta ahụ na 1942, achọpụtara m nzube m ná ndụ.

Ndụ Nwata M

A mụrụ m na 1914. Nna m anwụworị n’ihe dị ka ọnwa anọ tupu a mụọ m, echetakwara m na mgbe m bụ nwatakịrị ana m ekworo ụmụaka ndị ọzọ nwere nna ndị na-ahụ ha n’anya ekworo. Nke ahụ gụrụ m agụụ nke ukwuu. Nye nne m, ịdị ndụ n’enweghị di bụ ndọlị siri ike, bụ́ nke e mere ka o siwanye ike site ná mmetụta nile miri emi nke Agha Ụwa Mbụ.

Dị ka onye ntorobịa, alụrụ m otu nwa agbọghọ aha ya bụ Agnes Cope, ọ nọwokwa na-abụ onye mụ na ya na-ebikọ ndụ ruo ihe karịrị 58 afọ. Ná mmalite anyị mekọrọ mgbalị ọnụ inwe ihe ịga nke ọma ná ndụ. Enweghị m ihe ịga nke ọma dị ka onye ọrụ ugbo n’ihi oké ụkọ mmiri ozuzo. Achọtara m izu ike n’egwuregwu, ma ruo mgbe m nwere ahụmahụ Ememe Ncheta ahụ na 1942, enweghị m ezi nzube ọ bụla ná ndụ.

Ịgbara Ndị Ikwu Àmà

Mgbe Ememe Ncheta ahụ gasịrị, amụsiri m Bible ike, na-esoro ụfọdụ ụmụ ụmụnne nna m na-atụle akwụkwọ ndị e ji amụ Bible nke Watch Tower Society bipụtara. Na September 1943 ụfọdụ Ndịàmà Jehova sitere n’ebe ọzọ bịara ileta ógbè anyị dịpụrụ adịpụ. Anyị nwere nkwurịta okwu kpụ ọkụ n’ọnụ, nke were hour anọ. Mgbe ahụ, mgbe m matara na ha ga-ala n’ụtụtụ echi ya, ajụrụ m, sị: “Gịnị na-egbochi m ịbụ onye e mere baptism ugbu a?” E mikpuru mụ na ụmụ nwanne nna m abụọ n’ime mmiri n’elekere mbụ na ọkara nke ụtụtụ.

Mgbe nke ahụ gasịrị, emere m njem nke ukwuu iji gbaara ndị ikwu m àmà. Ụfọdụ ṅara m ntị, n’ihi nke a emekwara m ka nkwurịta okwu m dabere na Matiu isi nke 24. Ndị ọzọ aṅaghị m ntị, n’ọnọdụ ndị ahụ ejiri m okwu Jisọs gwara ndị Farisii mee ihe bụ́ nke e dekọrọ na Matiu isi nke 23. Otú ọ dị, mgbe oge na-aga, amụtara m ịdị akọ karị, n’iṅomi Nna anyị nke eluigwe bụ́ onye nwere obi ọma na ịhụnanya.—Matiu 5:43-45.

Na mbụ nwunye m megidere ọchịchọ m ijere Jehova ozi. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya o sonyeere m, na December 1943, ọ ghọrọ onye inyeaka raara onwe ya nye, nke e mere baptism. Ndị ọzọ e mere ya na ha baptism n’ụbọchị ahụ a na-agaghị echefu echefu bụ mmadụ ise ọzọ sitere n’obodo anyị bụ́ Waima, na-eme ka ngụkọta ọnụ ọgụgụ nke ndị nkwusa Alaeze e nwere n’ebe ahụ ruo itoolu.

Ngọzi n’Agbanyeghị Mmegide

Na 1944 ụmụnna ndị sitere n’ebe ọzọ letakwara anyị ọzọ, n’oge a, ha nyekwara anyị ọzụzụ dị mkpa n’ije ozi ụlọ ruo n’ụlọ. Ka ọnụnọ anyị nọ n’ógbè ahụ na-apụta ìhè karị, mmegide sitere n’aka ndị nnọchianya Krisendọm mụbara. (Jọn 15:20) Anyị na ndị ụkọchukwu obodo nwere ọtụtụ esemokwu, bụ́ nke mere ka e nwee ogologo nkwurịta okwu ndị metụtara ozizi. Ma Jehova nyere anyị mmeri, ndị ọzọ nọkwa n’ógbè ahụ, gụnyere nwanne m nwanyị, batara n’okpuru nlekọta ịhụnanya Jehova.

E guzobere otu ọgbakọ na Waima na June 1944. Mkpagbu na ịkpọasị okpukpe mụbara. A jụrụ na Ndịàmà Jehova agaghị na-eli ozu n’ebe ili ozu obodo. Mgbe ụfọdụ, mmegide ahụ ghọrọ ime ihe ike. E nwere mwakwasị nkịtị. Ọkụ gbapịara ụgbọ ala m na ụlọ ebe a na-adọba ya. Otú o sina dị, site ná ngọzi Jehova, n’ihe na-erughị ọnwa atọ, anyị zụtara otu nnukwu ụgbọ ala. Ejikwa m otu ụgbọ nke ịnyịnya na-adọkpụ na-ebuga ezinụlọ m na-amụba amụba ná nzukọ nile.

Ịrị elu nke ọnụ ọgụgụ ndị na-esonyere anyị pụtara na anyị nwere mkpa dị ngwa nke ebe nzukọ buru ibu karị, ya mere anyị kpebiri iwu otu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Waima. Nke a bụ Ụlọ Nzukọ Alaeze mbụ e wuru na New Zealand. Mgbe o mesịrị ọnwa anọ e ji gbutuo úkwù osisi ndị mbụ na December 1, 1949, e nwere mgbakọ na nraranye e jikọrọ ọnụ n’ụlọ nzukọ ọhụrụ ahụ nwere 260 oche. N’oge ndị ahụ, nke ahụ bụ ịrụpụta oké ihe, nke a rụrụ site n’enyemaka Jehova.

Ihe Àmà Ndị Ọzọ nke Nlekọta Jehova

Ebe ọ bụ na ọnụ ọgụgụ nke ndị nkwusa Alaeze nọ n’ime ime ebe ugwu New Zealand nọgidere na-amụba, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-abịa eleta anyị nyere anyị agbamume ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Ná nzaghachi, na 1956, akpọgara m ezinụlọ m na Pukekohe, nke dị nnọọ n’ebe ndịda Auckland. Anyị jere ozi n’ebe ahụ ruo afọ 13.—Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 16:9.

Ihe atụ abụọ nke nlekọta Jehova n’oge a ka dị m n’uche. Ọ bụ ezie na e were m n’ọrụ na kansụl obodo dị ka onye na-akwọ nnukwu ụgbọ ala na onye na-anya nnukwu ígwè ọrụ, a kpọrọ m ka m bịa ọmụmụ ihe ga-ewe izu anọ nke Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze n’alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị n’Auckland. Arịọrọ m ka e nye m ezumike izu anọ iji mee nke a, onye isi injinịa anyị sịrị: “Nsogbu adịghị ma ọlị. Ọ dị m ka ya bụrụ na ọtụtụ ndị dị ka gị. Mgbe ị latara, bịa hụ m n’ọfịs m.” Mgbe m mesịrị jee hụ ya n’ọfịs ya, anatara m ụgwọ ọnwa maka izu anọ ahụ m na-anọghị ya. Otú a, e gboro mkpa ihe onwunwe nke ezinụlọ m.—Matiu 6:33.

Nke ahụ bụ ihe atụ mbụ. Nke abụọ weere ọnọdụ mgbe mụ na nwunye m banyere n’ozi ọsụ ụzọ oge nile na 1968. Ọzọkwa, anyị dabeere n’ebe Jehova nọ maka nkwado, ọ kwụghachikwara anyị ụgwọ ọrụ. N’otu ụtụtụ mgbe anyị risịrị nri ụtụtụ, nwunye m mepere friji anyị wee chọpụta na nanị ihe dị n’ime ya bụ ọkara pound bọta. “Sarn,” ka o kwuru, “ọ dịghị ihe oriri anyị nwere. Ànyị ka ga-eje ozi ọma taa?” Gịnị bụ azịza m? “Ee!”

N’ebe mbụ anyị gara, onye nwe ụlọ nakweere akwụkwọ anyị nyere ya wee jiri obi ọma nye anyị ọtụtụ iri àkwá dị ka onyinye. Onye nke abụọ anyị jere na nke ya nyere anyị onyinye nke akwụkwọ nri—kumaras (potato na-atọ ụtọ), cauliflower, na karọt. Ihe oriri ndị ọzọ anyị bu lata n’ụlọ n’ụbọchị ahụ bụ anụ na bọta. Lee ka ihe Jisọs kwuru si mezuo n’ọnọdụ anyị: “Leenụ anụ ufe nke eluigwe, na ha adịghị agha mkpụrụ, ha adịghị ewekwa ihe ubi, ha adịghị ekpokọkwa ihe baa n’ọba; ma Nna unu nke eluigwe na-azụ ha. [Ọ̀ bụ na] unu onwe unu abụghị ihe oké ọnụ ahịa karịa ha?”—Matiu 6:26.

Ihe Omume n’Ofesi

Rarotonga nke dị n’Agwaetiti Cook! Nke a bụ ebe e kenyere anyị ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche na 1970. Ọ gaje ịbụ ebe obibi anyị ruo afọ anọ na-abịanụ. Ihe ịma aka mbụ anyị nwere n’ebe a bụ ịmụta asụsụ ọhụrụ. Otú ọ dị, n’ihi myirịta dị n’etiti Maori nke New Zealand na Maori nke Agwaetiti Cook, enwere m ike ikwu okwu ihu ọha mbụ m mgbe o mesịrị izu ise anyị ji bịa.

N’Agwaetiti Cook, e nwere ndị nkwusa Alaeze ole na ole, ọ dịghịkwa ebe anyị nwere maka ịnọ na-enwe nzukọ. Ọzọkwa, n’ịza ekpere anyị, Jehova gboro mkpa anyị. Otu nkwurịta okwu nkịtị anyị na otu onye nwere ụlọ ahịa nwere rụpụtara n’anyị ịgbazite otu ala dị mma, n’ime otu afọ anyị nwekwara otu obere ebe obibi na Ụlọ Nzukọ Alaeze ga-abata 140 mmadụ. Malite mgbe ahụ gaa n’ihu, anyị natara ọtụtụ ngọzi, maka otuto Jehova.

Ihe anyị nwere obi ekele karịsịa maka ya bụ ọbịa nke ndị agwaetiti ahụ lere anyị. Ọtụtụ mgbe, ka anyị nọ n’ozi, e nyere anyị ihe ọṅụṅụ na-enye ume ọhụrụ—nke dị mma karịsịa n’ihu igwe ahụ na-ekpo ọkụ. Ọtụtụ mgbe, anyị na-alata n’ụlọ ịhụ unere, pọpọ, mango na oroma ndị onye anyị na-amaghị hapụrụ n’ọnụ ụzọ anyị.

Na 1971 mụ na nwunye m, tinyere ndị nkwusa atọ ndị ọzọ sitere Rarotonga, jere n’agwaetiti nke Aitutaki, bụ́ nke e ji ọdọ mmiri ya mara mma wee mara. Anyị chọtara ndị hụrụ Okwu Chineke n’anya n’etiti ndị bi n’ebe ahụ na-ele ọbịa ma malite ọmụmụ Bible ebe obibi anọ, bụ́ nke anyị nọgidere na-eduzi site n’akwụkwọ ozi mgbe anyị latasịrị Rarotonga. Mgbe oge na-aga, e mere ndị mmụta ahụ nọ n’Aitutaki baptism, e guzobekwara otu ọgbakọ. Na 1978, e wuru Ụlọ Nzukọ Alaeze nke abụọ n’Agwaetiti Cook n’ebe ahụ. Jehova nọgidere na-eme ka ihe na-eto ná nzaghachi nye n’ịkụ ihe na ịkwọsa ya mmiri nke anyị na-eme.—1 Ndị Kọrint 3:6, 7.

Enwere m ihe ùgwù nke ileta agwaetiti iri ndị dị n’ìgwè Agwaetiti Cook, ọtụtụ mgbe n’okpuru ọnọdụ ndị na-etinye mmadụ n’ule. Otu njem ụgbọ mmiri anyị mere ruo Atiu, nke dị 180 kilomita, were ihe karịrị ụbọchị isii n’ihi oké ifufe mmiri na mmagharị osimiri. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 11:26.) Ọ bụ ezie na ihe oriri anyị nwere dị ntakịrị, ọtụtụ ndị mụ na ha nọ na-atụkwa egwu mmiri, enwere m obi ekele maka nlekọta Jehova, bụ́ nke mere ka anyị ruo n’udo n’ebe anyị na-aga.

Na 1974, a jụrụ inye anyị akwụkwọ ikike ịnọ n’Agwaetiti Cook, ya mere anyị laghachikwara New Zealand. Ka ọ dị n’oge ahụ, e nwere ọgbakọ atọ n’agwaetiti ahụ.

Ihe Ùgwù Ije Ozi Ndị Ọzọ—Na Otu Ule

Mgbe anyị laghachiri na New Zealand, ọnụ ụzọ ọhụrụ nke ịrụ ọrụ meghere. (1 Ndị Kọrint 16:9) Society chọrọ onye pụrụ ịsụgharị Ụlọ Nche nakwa akwụkwọ Bible ndị ọzọ gaa n’asụsụ Maori nke Agwaetiti Cook. E nyere m ihe ùgwù ahụ, ọ nọgidewokwa na-abụ nke m ruo n’oge a. Mgbe ahụ, enwere m ihe ùgwù nke ime nletaghachi mgbe mgbe n’ebe ụmụnna m nọ n’Agwaetiti Cook nọ, na mbụ dị ka onye nlekọta sekit, mesịakwa dị ka onye nlekọta distrikti na-enye aka.

N’otu n’ime nleta ndị ahụ, Nwanna Alex Napa, bụ́ onye ọsụ ụzọ pụrụ iche sitere Rarotonga, sooro m mee njem ụgbọ mmiri were 23 ụbọchị nke kpọgara anyị na Manahiki, Rakahanga, na Penrhyn—agwaetiti ndị dị n’ebe ugwu Cook. N’agwaetiti nke ọ bụla, Jehova kpaliri obi nke ndị obodo ahụ na-ele ọbịa nke ọma inye anyị ebe obibi na ịnakwere ọtụtụ akwụkwọ Bible. (Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 16:15.) N’agwaetiti ndị a, pearl nke anụ oyster na-adị ọtụtụ, n’ọtụtụ mgbe ndị mmadụ na-enyekwa pearl dị ka onyinye ha maka ego a na-emefu n’ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ. Ya mere, ka anyị na-enye pearl ime mmụọ, anyị na-anata nke nkịtị.—Tụlee Matiu 13:45, 46.

Lee ka akụkụ ụwa ahụ dịpụrụ adịpụ si bụrụ nke mara mma! Cheedị echiche banyere nnukwu azụ shark ka ha na ụmụaka na-egwukọrịta mmiri n’otu ọdọ mmiri n’udo! Lee ihe mara mma ile anya urukpuru ndị ahụ na-abụ n’oge abalị! Lee ka okwu onye ọbụ abụ ahụ si bụrụ eziokwu: “Otu ụbọchị na-agwawara ụbọchị ibe ya okwu ọnụ n’ụba, otu abalị na-ekwupụtakwara abalị ibe ya ihe ọmụma.”—Abụ Ọma 19:2.

Mgbe ahụ, n’afọ itoolu gara aga, ezi ule nke iguzosi ike n’ezi ihe bịara. E nyere nwunye m àkwà n’ụlọ ọgwụ maka inwe oruru ọbara n’ụbụrụ. Ịwa ahụ dị mkpa, ma dọkịta agaghị ekwe ime ya n’ejighị ọbara. Akọ na uche mụ na nwunye m apụghị ikwe anyị nara ụkpụrụ ịgwọ ọrịa nke ga-emebi iwu Chineke. Ma akọ na uche nke dọkịta ahụ na-awa ahụ na-agwa ya ka o jiri ụzọ ọ bụla kwere omume, gụnyere ọbara, mee ihe iji zọpụta ndụ.

Ahụ ike nwunye m jọwanyere njọ, e tinyekwara ya n’ogige ebe a na-elekọta ndị ọrịa ha dị njọ, na-ekwe ka m bịa na-ahụ ya ugbo ole na ole. Ọ kwụsịrị ịnụ ihe n’ihi nrụgide nke ime ntị. Nke ahụ ghọrọ ọnọdụ dị oké njọ. Mgbe m bịasịrị leta ya n’otu oge, otu dọkịta sogidere m ruo n’ebe ụgbọ ala m dị, na-ekwusi ike na nanị ohere nwunye m nwere bụ ma e jiri ọbara waa ya ahụ, na-arịọkwa m ka m sị ha gaa n’ihu. Otú o sina dị, mụ na nwunye m tụkwasịrị Jehova obi—ọbụna ma à sị na irube isi n’iwu ya akpata ịtụfu ndụ a na-adị ugbu a ruo afọ ole na ole.

Na mberede, e nwere mgbake pụtara ìhè n’ọnọdụ nke nwunye m. M bịarutere otu ụbọchị wee hụ ka ọ nọdụ ala n’elu àkwà na-agụ akwụkwọ. N’ụbọchị ndị na-eso ya ọ malitere ịgbara ndị ọrịa na ndị ọrụ nọọsụ àmà. Mgbe ahụ a kpọrọ m òkù ije n’ọfịs dọkịta ahụ na-awa ahụ. “Maazi Wharerau,” ka o kwuru, “ị bụ onye ihe na-adabara nke ọma! Anyị kwere na nsogbu nwunye gị alawo.” N’ụzọ a na-atụghị anya ya, ọnọdụ ọbara ya adịwo otú o kwesịrị. Mụ na nwunye m kelekọrọ Jehova ma mee ka mkpebi anyị dịghachi ọhụrụ nke ime ihe nile anyị nwere ike n’ozi ya.

Ugbu a, e kenyewo m ọrụ ọzọ n’Agwaetiti Cook, amalitewokwa m ije ozi ọzọ na Rarotonga. Lee aha ihe ùgwù a gọziri agọzi nke ahụ bụ! N’ileghachi anya azụ, mụ na nwunye m nwere ekele maka nlekọta Jehova ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ iri afọ ise n’ozi ya. N’ụzọ ihe onwunwe, ọ dịghị mgbe ọ bụla ihe ndị dị mkpa ná ndụ kọrọ anyị. N’ụzọ ihe ime mmụọ, ngọzi ndị anyị nwere adịwo ọtụtụ ịkọcha. Otu nke dị ịrịba ama bụ ọnụ ọgụgụ nke ndị ikwu m n’anụ ahụ bụ́ ndị nataworo eziokwu. Apụrụ m ịgụta ihe karịrị 200 bụ́ Ndịàmà Jehova e meworo baptism ugbu a, gụnyere 65 ndị si n’usoro ọmụmụ ya kpọmkwem. Otu nwa nwa ya so n’ezinụlọ Betel nke New Zealand, ebe otu nwa ya nwanyị na di ya nakwa ụmụ ya nwoke abụọ na-arụ ọrụ ihe owuwu n’alaka dị iche iche.—3 Jọn 4.

N’ilepụ anya n’ihu, eji m olileanya nke ịdị ndụ na paradaịs kpọrọ ihe, bụ́ ebe, n’ụwa nile, ịma mma ya ga-akarị ọbụna nke ọmarịcha ndagwurugwu ahụ na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ nke a mụrụ m na ya. Lee ihe ùgwù ọ ga-abụ ịnabata nne na nna m ná mbilite n’ọnwụ wee kọrọ ha banyere ihe mgbapụta ahụ, Alaeze, na ihe àmà ndị ọzọ nile nke nlekọta Jehova.

Mkpebi m, bụ́ nke na-esiwanye ike site n’ihe ọmụma nke na Chineke na-elekọta m anya, bụ dị ka onye ọbụ abụ si kwupụta n’Abụ Ọma 104:33, sị: “M ga-abụku Jehova abụ n’ogologo ndụ m nile: m ga-abụku Chineke m abụ ọma mgbe m nọ na-adị ndụ.”—Dị ka Sarn Wharerau si kọọ.

[Foto dị na peeji nke 28]

Ụlọ Nzukọ Alaeze mbụ e wuru na New Zealand, 1950

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya