Mesaịa Ahụ—Ọ̀ Bụ Ezi Olileanya?
Ọ kpọrọ onwe ya Moses. Otú ọ dị, e chefuwo ihe bụ ezi aha ya n’akụkọ ihe mere eme. Na narị afọ nke ise O.A., o mere njem na gburugburu agwaetiti Krit, na-eme ka ndị Juu kweta na ya bụ mesaịa ahụ ha nọworo na-eche. Ọ gwara ha na n’oge na-adịghị anya, mmegbu, ndọrọ n’agha na njide ha ga-akwụsị. Ha kwetara. Mgbe ụbọchị ntọhapụ ha ruru, ndị Juu sooro “Moses” gaa n’otu ebe ugwu chere ihu n’Oké Osimiri Mediterranean. Ọ gwara ha na nanị ihe ha ga-eme bụ ịtụba onwe ha n’ime oké osimiri ahụ na ọ ga-ekewa ụzọ abụọ n’anya ha. Ọtụtụ rubere isi, na-amaba n’ime osimiri ahụ nke na-ekewaghị ụzọ abụọ. Mmiri riri ọtụtụ n’ime ha; ndị ọrụ ụgbọ mmiri na ndị na-akụ azụ zọpụtara ụfọdụ. Otú ọ dị, ọ dịghị ebe ọ bụla a hụrụ Moses. Mesaịa ahụ agbafuwo.
GỊNỊ bụ mesaịa? Okwu ndị ahụ bụ́ “onye nzọpụta,” “onye mgbapụta,” na “onye ndú” pụrụ ịbata n’uche mmadụ. Ọtụtụ ndị na-eche na mesaịa bụ onye na-akpali olileanya na nraranye n’obi ndị na-eso ya, na-ekwe nkwa iduru ha site ná mmegbu gaa ná nnwere onwe. Ebe ọ bụ na akụkọ ihe mere eme nke mmadụ bụ n’akụkụ ka ukwuu akụkọ ihe mere eme nke mmegbu, ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ mesaịa dị otú ahụ apụtawo n’ime ọtụtụ narị afọ. (Tụlee Eklisiastis 8:9.) Ma dịkwa ka onye ahụ kpọrọ onwe ya Moses nke Krit, ọtụtụ mgbe, mesaịa ndị a edugawo ndị na-eso ha ná nkụda aka na ọdachi karịa ná ntọhapụ.
“Nke a bụ Mesaịa bụ́ Eze!” Nke ahụ bụ otú onye rabaị a na-akwanyere ùgwù bụ́ Akiba ben Joseph si kelee Simeon Bar Kokhba n’afọ 132 O.A. Bar Kokhba bụ nwoke dị ike bụ́ onye na-edu òtù agha dị ike. N’ikpeazụ, ka ọtụtụ ndị Juu chere, lee nwoke ga-akwụsị mmegbu ha dịworo anya n’aka Ike Ọchịchị Ụwa Rom. Bar Kokhba dara ada; ọtụtụ narị puku ndị obodo ya ji ndụ ha kwụọ ụgwọ n’ihi ọdịda ahụ.
Na narị afọ nke 12, mesaịa ọzọ nke ndị Juu bilitere, nke ugbu a bụ na Yemen. Mgbe caliph, ma ọ bụ onye ọchịchị, jụrụ ya maka otu ihe ịrịba ama nke ịbụ mesaịa ya, mesaịa nke a mere atụmatụ ka caliph ahụ mee ka e bepụ ya isi ma kwere ka mbilite n’ọnwụ ya nke dị ngwa bụrụ ihe ịrịba ama ahụ. Caliph ahụ kwetara n’atụmatụ ahụ—otú ahụkwa ka mesaịa ndị Yemen ahụ si nwụọ. N’otu narị afọ ahụ, otu nwoke aha ya bụ David Alroy gwara ndị Juu nọ n’Etiti Ọwụwa Anyanwụ Ụwa ka ha kwadebe iso ya ná nku ndị mmụọ ozi laghachi n’Ala Nsọ. Ọtụtụ kwetara na ọ bụ ya bụ mesaịa ahụ. Ndị Juu nke Baghdad ji ndidi chere n’elu ụlọ ha, n’amaghị kpam kpam banyere ndị ohi na-akwakọrọ ihe nile ha nwere.
Sabbatai Zevi bilitere na narị afọ nke 17 site na Smuana. Ọ kpọsara ịbụ mesaịa ya nye ndị Juu bi na gburugburu Europe nile. Ndị Kristian ṅakwara ya ntị. Zevi kwere ndị na-eso ya nkwa ntọhapụ—nke doro anya na ọ bụ site n’ikwe ka ha na-eme mmehie n’enweghị ihe mgbochi. Ndị kasị na-esochi ya anya mere omume nke imebiga ihe arụ ókè, ịgba ọtọ, ịkwa iko, na inwe mmekọahụ ụmụnne, mgbe ahụ ha na-enye onwe ha ahụhụ site n’ịpịa ụtarị, site n’ịgba ahụ ọtọ na-adagharị n’elu snow, na site n’ikpochi onwe ha ájá ruo n’olu n’ime ala jụrụ oyi. Mgbe o jere Turkey, e jidere Zevi wee gwa ya na ọ ghaghị ịghọ onye Alakụba ma ọ bụ e gbuo ya. Ọ tọghatara. E tisara ọtụtụ n’ime ndị òtù ya. Ma, ruo narị afọ abụọ na-esonụ, ụfọdụ ndị ka na-akpọ Zevi mesaịa.
Krisendọm ewepụtawo ọtụtụ mesaịa ndị nke ya n’otu aka ahụ. Na narị afọ nke 12, otu nwoke aha ya bụ Tanchelm wulitere otu ìgwè ndị òtù ma nwee ike n’obodo nke Antwerp. Mesaịa nke a kpọrọ onwe ya chi; o rere ọbụna mmiri o ji saa ahụ ka ndị na-eso ya wee ṅụọ dị ka sakrament! “Onye Kristian” ọzọ bụ́ mesaịa bụ Thomas Müntzer nke Germany narị afọ nke 16. O butere ụzọ n’otu nnupụisi megide ọchịchị nke obodo ya, na-agwa ndị na-eso ya na nke a bụ agha nke Amagedọn. O kwere nkwa na ya ga-ejide mkpụrụ bọmbụ nke ndị iro ha n’aka uwe ya. Kama nke ahụ, e gbukpọrọ ndị ya, e bepụkwara Müntzer isi. Ọtụtụ mesaịa dị otú ahụ bilitere na Krisendọm n’ime ọtụtụ narị afọ.
Okpukpe ndị ọzọ enwewokwa ndị mesaịa nke ha. Okpukpe Alakụba na-arụtụ aka gaa na Mahdi, ma ọ bụ onye a na-enye nduzi ziri ezi, bụ́ onye ga-eweta ọgbọ nke ikpe ziri ezi. N’okpukpe Hindu, ụfọdụ azọrọwo na ha bụ avatar, ma ọ bụ ndị lọọrọ chi dị iche iche ụwa. Ma, dị ka akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica rịbara ama, “ọbụna dị ka okpukpe na-enweghị olileanya onye nzọpụta dị ka okpukpe Buddha emewo ka e nwee nkweta, n’etiti òtù dị iche iche nke ndị Mahāyāna, na Buddha ọdịnihu nke aha ya bụ Maitreya, bụ́ onye ga-agbadata site n’ebe obibi ya dị n’eluigwe ma kpọbata ndị kwesịrị ntụkwasị obi na paradaịs.”
Mesaịa Ndị nke Narị Afọ nke 20
N’ime narị afọ anyị, mkpa nke ezi mesaịa aghọwo nke dị ngwa karịa mgbe ọ bụla ọzọ; mgbe ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ azọrọwo utu aha ahụ. Na Congo nke Africa n’afọ ndị 1920, ndị 1930, na ndị 1940, Simon Kimbangu na onye nọchiri ya bụ́ Andre “Jesus” Matswa bụ ndị a nabatara dị ka mesaịa. Ha nwụrụ, ma ndị na-eso ha ka na-atụ anya ka ha laghachi ma weta narị afọ iri nke Africa.
Narị afọ nke a ahụwokwa mbilite nke “okpukpe nzuzo” na New Guinea na Melanesia. Ndị nọ n’òtù ahụ na-atụ anya ọbịbịa nke otu ụgbọ mmiri ma ọ bụ otu ụgbọ elu, bụ́ nke ndị ọcha yiri mesaịa na-anya, bụ́ ndị ga-eme ka ha baa ọgaranya ma weta ọgbọ nke obi ụtọ mgbe ọbụna ndị nwụrụ anwụ ga-ebilite.
Mba ndị mepere emepe enwewo ndị mesaịa nke ha n’otu aka ahụ. Ụfọdụ bụ ndị ndú okpukpe, dị ka Sun Myung Moon, onye kpọrọ onwe ya onye na-anọchi Jisọs Kraịst, bụ́ onye zubere ime ka ụwa dị ọcha site n’inwe otu ezinụlọ dị n’otu nke ndị òtù ya. Ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị agbalịwokwa ịnọ n’ọnọdụ mesaịa, Adolf Hitler bụkwa ihe atụ kasị atụ ụjọ e nwere na narị afọ nke a, ya na okwu ya na-ada ụda nke Ọchịchị Otu Puku Afọ.
Nkà ihe ọmụma na nzukọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche enwetawo ọnọdụ mesaịa n’otu aka ahụ. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia Americana na-arịba ama na echiche ndọrọ ndọrọ nke Marx na Lenin na-enye nghọta nke ịbụ mesaịa. Òtù United Nations, bụ́ nke a nabatara n’ebe nile dị ka nanị olileanya dịịrị udo ụwa, yikwara ka ọ ghọwo ụdị nnọchianya nke mesaịa n’uche ọtụtụ ndị.
Ọ̀ Bụ Ezi Olileanya?
Ntụleghachi nke a dị mkpirikpi na-eme ka ọ pụta nnọọ ìhè na akụkọ ihe mere eme nke òtù mesaịa dị iche iche bụ n’akụkụ ka ukwuu akụkọ ihe mere eme nke ụgha, nke olileanya dakpọrọ adakpọ na ọchịchọ na-enweghị ihe ndabere. Mgbe ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ ndị taa aghọwo ndị na-ekweghị na e nwere olileanya maka mesaịa.
Otú ọ dị, tupu anyị ajụ olileanya nke mesaịa kpam kpam, anyị kwesịrị ibu ụzọ mụta ebe o sitere. N’ezie, “mesaịa” bụ okwu Bible. Okwu Hibru ahụ bụ ma·shiʹach, ma ọ bụ “onye e tere mmanụ.” N’oge Bible, mgbe ụfọdụ a họpụtara ndị eze na ndị nchụàjà n’ọkwá ha site n’ememe ite mmanụ, bụ́ ebe a na-awụsa mmanụ na-esi ísì ụtọ n’elu isi. Ya mere, e ji okwu ahụ bụ́ ma·shiʹach mee ihe n’ụzọ ziri ezi banyere ha. E nwekwara ndị ikom e tere mmanụ ọ bụla, ma ọ bụ a họpụtara maka ọnọdụ pụrụ iche, n’enweghị ememe ite mmanụ. A kpọrọ Mosis “Kraịst,” ma ọ bụ “onye e tere mmanụ,” ná Ndị Hibru 11:24-26, n’ihi na a họọrọ ya dị ka onye amụma na onye nnọchianya Chineke.
Nkọwa nke a banyere mesaịa dị ka “onye e tere mmanụ” na-eme ka mesaịa ndị nke Bible dị iche kpam kpam pụọ ná mesaịa ụgha nile ndị anyị tụleworo. Mesaịa ndị nke Bible abụghị ndị họpụtara onwe ha; ha abụghịkwa ndị ndị ihe ha na-amasị họọrọ. Ee e, nhọpụta ha sitere n’elu, n’aka Jehova Chineke n’onwe ya.
Ọ bụ ezie na Bible na-ekwu okwu banyere ọtụtụ mesaịa, ọ na-ebuli otu n’ime ha elu karịa ndị ọzọ. (Abụ Ọma 45:7) Mesaịa nke a bụ onye e lekwasịrị anya n’amụma Bible, onye bụ isi ná mmezu nke ihe ka ọtụtụ ná nkwa Bible ndị na-akpali akpali. Mesaịa nke a na-elebakwa anya n’ezie ná nsogbu ndị na-eche anyị ihu n’oge a.
Onye Nzọpụta nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ
Mesaịa nke Bible na-eleba anya ná nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ site n’ịga ná mkpọrọgwụ ha. Mgbe nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, nupụrụ isi megide Onye Okike ha site ná mkpali nke mmụọ ahụ e kere eke na-enupụ isi, bụ́ Setan, dị ka a pụrụ isi ghọta ya, ha zọọrọ nye onwe ha ikike kasị elu nke ọchịchị. Ha chọrọ ịbụ ndị ga na-ekpebi ihe ziri ezi na ihe ọjọọ. Ha si otú a zọpụ ụkwụ n’okpuru ọchịchị ịhụnanya Jehova, nke na-enye nchebe ma webata ezinụlọ ụmụ mmadụ n’ọgba aghara na nhụjuanya nke ịchị onwe onye, ezughị okè, na ọnwụ.—Ndị Rom 5:12.
Mgbe ahụ, lee ka o si bụrụ ihe ịhụnanya na Jehova Chineke họọrọ oge ọchịchịrị ahụ n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ inye ihe nile a kpọrọ mmadụ mgbukepụ nke olileanya. N’ịma ndị nnupụisi ahụ bụ mmadụ ikpe, Chineke buru amụma na ụmụ ha ga-enwe onye mgbapụta. N’ịbụ nke e zoro aka dị ka “mkpụrụ” ahụ, Onye Nzọpụta nke a ga-emegharị ajọ ọrụ ahụ nke Setan rụworo n’ebe ahụ n’Iden; Mkpụrụ ahụ ga-echipịa “agwọ” ahụ, bụ́ Setan, n’isi, na-egwepịa ya pụọ n’ịdị adị.—Jenesis 3:14, 15.
Site n’oge ochie, ndị Juu hụrụ amụma nke a dị ka nke ga-eweta Mesaịa. Ọtụtụ Targum, bụ́ nkọwa ndị Juu nke Akwụkwọ Nsọ e jikarịrị mee ihe na narị afọ mbụ, kọwara na amụma nke a ga-emezu “n’ụbọchị nke Eze bụ́ Mesaịa.”
Mgbe ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na site ná mmalite, a kpaliri ndị nwere okwukwe site ná nkwa nke a nke otu Mkpụrụ gaje ịbịa, ma ọ bụ Onye Nzọpụta. Nanị cheedị echiche banyere mmetụta nile nke Abraham mgbe Jehova gwara ya na Mkpụrụ ahụ gaje ịbịa site n’usoro ọmụmụ ya, na “mba nile nke ụwa”—ọ bụghị nanị ụmụ ya—“ga-agọzi onwe ha” site ná Mkpụrụ ahụ.—Jenesis 22:17, 18.
Mesaịa ahụ na Ọchịchị
Amụma ndị e mesịrị buo jikọrọ olileanya nke a na olileanya nke ezi ọchịchị. Na Jenesis 49:10, a gwara nwa nwa nke nwa Abraham bụ́ Juda, sị: “Mkpanaka eze agaghị esi n’ebe Juda nọ wezụga onwe ya, mkpanaka onye na-enye ụkpụrụ agaghị esikwa n’etiti ụkwụ ya abụọ wezụga onwe ya, ruo mgbe Shaịlo ga-abịa; ọ bụkwa ya ga-enwe ịṅa ntị ndị dị iche iche.” N’ụzọ doro anya, “Shaịlo” nke a gaje ịchị achị—ọ ga-achịkwa ọ bụghị nanị ndị Juu kama “ndị dị iche iche.” (Tụlee Daniel 7:13, 14.) Ndị Juu oge ochie matara Shaịlo dị ka Mesaịa; n’ezie, ụfọdụ n’ime Targum ndị Juu jiri nnọọ okwu ahụ bụ “Mesaịa” ma ọ bụ “eze ahụ bụ́ Mesaịa” dochie “Shaịlo.”
Ka ìhè nke amụma sitere n’ike mmụọ nsọ nọgidere na-enwupụta, e kpughekwuru ọtụtụ ihe banyere ọchịchị nke Mesaịa nke a. (Ilu 4:18) Na 2 Samuel 7:12-16, a gwara Eze David, bụ́ onye sitere n’agbụrụ Juda, na Mkpụrụ ahụ ga-esite n’usoro ọmụmụ ya. Ọzọkwa, Mkpụrụ nke a gaje ịbụ Eze pụrụ iche. Ocheeze, ma ọ bụ ịchịisi ya, ga-adị ruo mgbe ebighị ebi! Aịsaịa 9:6, 7 na-akwado isi ihe nke a: “A mụworo anyị otu nwa, otu nwa nwoke ka e nyeworo anyị; ịbụ onye isi [“ọchịchị,” King James Version] ga-adịkwasịkwa n’ubu ya. . . . Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onye isi ya na udo ya ga-agwụ, n’elu ocheeze Devid, na n’elu alaeze ya, ime ka o guzosie ike, na ịkwagide ya n’ikpe ziri ezi na n’ezi omume, site n’ugbu a wee ruo mgbe ebighị ebi. Ekworo Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-eme nke a.”
Ị̀ pụrụ iche echiche banyere ọchịchị dị otú ahụ? Onye ọchịchị ezi omume, nke na-ekpe ikpe ziri ezi bụ́ onye na-eguzobe udo na onye na-achị ruo mgbe ebighị ebi. Lee ka nke ahụ si dịwaga iche pụọ n’akụkọ ihe mere eme na-agba anya mmiri nke ndị mesaịa ụgha na-abịa ná nsochi ná nsochi! N’adịghị n’ụzọ ọ bụla ka onye ndú ụgha nke họpụtara onwe ya, Mesaịa nke Bible bụ onye ọchịchị ụwa nke nwere ike na ikike nile dị mkpa iji gbanwee ọnọdụ ụwa.
Olileanya nke a pụtara ihe dị omimi n’oge anyị a nke nsogbu. Ihe a kpọrọ mmadụ anọtụbeghị n’oké mkpa nke olileanya dị otú ahụ. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na ọ dị mfe ịtụkwasị obi n’olileanya ụgha, ọ dị mkpa ka onye ọ bụla n’ime anyị jiri nlezianya tụlee ajụjụ nke a: Jisọs onye Nazaret ọ̀ bụ Mesaịa ahụ e buru n’amụma dị ka ọtụtụ ndị kwetara? Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ nke a.
[Igbe dị na peeji nke 6]
È Nwere Mesaịa na Brooklyn?
Ihe mmapawa, bọdụ mkpọsa ozi, na ihe odide ndị na-enwu ọkụ n’Israel akpọsawo n’oge na-adịbeghị gara aga, sị “Kwadebenụ maka ọbịbịa nke Mesaịa.” Mkpọsa ihu ọha nke a ruru $400,000 abụwo nke ndị òtù Lubavitcher mere, bụ́ ịrọ òtù ọdịnala siri oké ike nke okpukpe Hasidic ndị Juu. E nwere nkwenkwe gbasara ebe nile n’etiti ìgwè ahụ nke nwere 250,000 ndị òtù na rabaị ukwu ha, bụ́ Menachem Mendel Schneerson nke Brooklyn, New York, bụ Mesaịa ahụ. N’ihi gịnị? Schneerson na-akụzi na Mesaịa ahụ ga-abịa n’ọgbọ nke a. Dịkwa ka magazin Newsweek si kwuo, ndị isi òtù Lubavitcher nọgidere na-ekwu na rabaị ahụ dị 90 afọ agaghị anwụ tupu Mesaịa ahụ abịa. Ruo ọtụtụ narị afọ, ịrọ òtù ahụ akụziwo na ọgbọ nke ọ bụla na-ewepụta, ya dịkarịa ala, otu nwoke ruru eru ịbụ Mesaịa. Schneerson yiri onye dị otú ahụ n’anya ndị na-eso ya, ọ họpụtabeghịkwa onye ga-anọchi anya ya. Ma, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị Juu anabataghị ya dị ka Mesaịa ahụ, ka magazin Newsweek na-ekwu. Dị ka akwụkwọ akụkọ ahụ bụ́ Newsday si kwuo, onye ya na ya na-azọ rabaị, bụ́ Eliezer Schach, akpọwo ya “mesaịa ụgha.”
[Foto dị na peeji nke 7]
Nkwenkwe ahụ bụ na Moses nke Krit bụ mesaịa ahụ mere ka ọtụtụ ndị tụfuo ndụ ha