Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 11/1 p. 3-4
  • Olee Otú I Si Ele Mmehie Anya?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú I Si Ele Mmehie Anya?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Echiche Na-adalata Adalata Banyere Mmehie n’Ebe Ọdịda Anyanwụ
  • Ụwa Mmehie Na-adịghị na Ya—n’Ụzọ Dị Aṅaa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Mgbe Mmehie Na-adịkwaghị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Mmehie—Olee Ihe Gbanwere na Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Gịnị Bụ Mmehie?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 11/1 p. 3-4

Olee Otú I Si Ele Mmehie Anya?

“N’IHI gịnị ka o ji nọgide na-arịọ maka mgbaghara nke mmehie anyị nile n’ekpere?” ka otu nwunye na-arụ ọrụ n’ụlọ, bụ́ onye so otu n’ime Ndịàmà Jehova na-amụ Bible kpesara. “Ọ na-eyi nnọọ ka m bụ onye omempụ.” Dị nnọọ ka nwanyị a, ọtụtụ mmadụ taa amaghị banyere mmehie ha ọ gwụla ma ha emewo mpụ.

Nke a bụ eziokwu karịsịa n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ, ebe dị ka omenala si dị, ndị mmadụ enweghị echiche nke mmehie e ketara eketa dị ka a na-akụzi n’okpukpe nile nke ndị Juu na nke ndị Kristian. (Jenesis 3:1-5, 16-19; Ndị Rom 5:12) Dị ka ihe atụ, ndị Shinto na-ewere mmehie dị ka unyi nke a pụrụ iji mfegharị nke osisi onye nchụàjà, bụ́ nke e tinyere akwụkwọ ma ọ bụ osisi flax n’ọnụ ọnụ ya, hichapụ n’ụzọ dị mfe. Ọ dịghị nchegharị n’ihi mmejọ e mere dị mkpa n’usoro nke a. N’ihi gịnị? “Ọ bụghị nanị ihe omume ndị jọrọ njọ, kamakwa, ọdachi ndị ọ na-abụghị mmadụ na-akpata bụ́ ndị a na-apụghị ịchịkwa achịkwa, ka a na-akpọ tsumi [mmehie],” ka akwụkwọ bụ́ Kodansha Encyclopedia of Japan na-akọwa. A na-ele ọdachi ndị ọ na-abụghị mmadụ na-akpata ha, tsumi ndị na-esighị n’aka mmadụ, anya ịbụ mmehie ndị ememe ido ihe ọcha mere ka ha kwụsị ịdị adị.

Nke a dubara n’echiche nke na a pụrụ iji ememe ido ihe ọcha hichapụ mmehie ọ bụla, ọbụna ihe omume ndị jọrọ njọ ndị a ma ụma mee (e wezụga imempụ ndị a ga-enye ahụhụ maka ha site n’iwu). N’okpuru isiokwu bụ “Ememe Okpukpe nke Ido Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Ọcha n’Ime Japan,” akwụkwọ bụ́ The New York Times zoro aka n’echiche dị otú ahụ ma kọwaa na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Japan ndị tinyeworo aka n’omume ọjọọ na-ele onwe ha anya ịbụ ndị “e mere ka ha dị ọcha” mgbe ndị na-atụli aka họpụtaghachiri ha. Otú a, ọ dịghị ezi mgbazi olu a na-eme, a pụkwara imeghachi omume ọjọọ ndị dị otú ahụ.

Ndị Buddha kwenyere na samsara, ma ọ bụ mmụghachi, na ozizi nke Karma nwere echiche dị iche. “Dị ka ozizi karman si dị,” ka akwụkwọ The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, “omume ọma na-arụpụta ihe ọma na nke obi ụtọ ma na-eme ka e nwee ọnọdụ na-eduga n’ime ihe ọma ndị dị otú ahụ, ebe ajọ omume na-arụpụta ihe ọjọọ ma na-eme ka e nwee ọnọdụ na-eduga n’imeghachi ihe ndị dị njọ.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, omume mmehie na-amị mkpụrụ ọjọọ. E kekọtara ozizi Karma na ozizi mmụghachi, ebe a si na Karma ụfọdụ na-amị mkpụrụ ná ndụ ọdịnihu ọtụtụ afọ mgbe ndụ nke e mere ihe ahụ na ya gasịworo.

Olee otú ozizi nke a si emetụta ndị kwere na ya? Otu nwanyị bụ onye Buddha nke kwenyesiri ike na Karma sịrị: “Echeghị m na ezi echiche dị n’ịta ahụhụ maka ihe a mụnyere m n’ime ya ma bụrụ ihe m na-amaghị ihe ọ bụla banyere ya. Aghaghị m ịnakwere ya dị ka akara aka m. Ịdị na-agụ sutra ma na-agbalịsi ike ibi ezi ndụ agwọtaghị nsogbu m nile. M malitere inwe obi ilu, gharakwa inwe afọ ojuju, na-eme mkpesa mgbe nile.” Ozizi ndị Buddha banyere ihe ajọ omume na-akpata mere ka o nwee mmetụta nke abaghị uru.

Ndị okpukpe Confucius, okpukpe ọzọ dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ, na-akụzi ụzọ dị iche isi chee ajọ ihe mmadụ ihu. Dị ka Hsün-tzu, bụ́ otu n’ime ndị ọkà ihe ọmụma atọ ukwu nke okpukpe Confucius bụ́ ndị a ma ama na-ekwu, ọdịdị mmadụ dị njọ, ọ na-achọkwa ọdịmma onwe onye nanị. Iji nọgide na-enwe usoro n’etiti ọha mmadụ nwere ọdịdị nke mmehie, o mesiri mkpa nke li ike, nke pụtara ikwesị ekwesị, àgwà ọma, na usoro e nwere n’ihe nile. Meng-tzu, onye ọkà ihe ọmụma ọzọ nke okpukpe Confucius, ọ bụ ezie na ọ na-akọwa echiche dị iche nke ọdịdị mmadụ, nakweere ịdị adị nke ajọ ihe ọha mmadụ na n’ịtụkwasị obi na ọdịdị mmadụ dị mma, dabeere n’imeziwanye ọnọdụ onwe onye dị ka ihe ngwọta. Nke ọ sọrọ ya bụrụ, ndị ọkà ihe ọmụma okpukpe Confucius kụziri ịdị mkpa nke nkụzi na ọzụzụ iji lụsoo mmehie ọgụ n’ime ụwa. Ọ bụ ezie na nkụzi ha kwekọrịtara n’ịdị mkpa nke li, echiche ha banyere mmehie na ihe ọjọọ edoghị anya ma ọlị.—Tụlee Abụ Ọma 14:3; 51:5.

Echiche Na-adalata Adalata Banyere Mmehie n’Ebe Ọdịda Anyanwụ

N’Ebe Ọdịda Anyanwụ, echiche ndị e nwere banyere mmehie edowo anya nke ọma n’omenala, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ ekwerewokwa na mmehie dị adị, e kwesịkwara izere ya. Otú ọ dị, àgwà e nwere n’Ebe Ọdịda Anyanwụ banyere mmehie na-agbanwe. Ọtụtụ na-ajụ nghọta nile banyere mmehie, na-akpọ ụda olu nke akọ na uche “njem obi ọmụma ikpe,” ihe a ga-ezere ezere. Ihe karịrị 40 afọ gara aga, Pope Pius nke Iri na Abụọ kwara arịrị kwuo, sị: “Mmehie nke narị afọ nke a bụ ntụfu echiche nile nke mmehie.” Dị ka nnyocha e bipụtara n’akwụkwọ akụkọ ndị Katọlik a na-ebipụta kwa izu bụ́ Le Pèlerin na-egosi, 90 pasent na-atụ n’anya nke ụba mmadụ bi na France, ebe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ na-ekwu na ha bụ ndị Roman Katọlik, ekwekwaghị ná mmehie.

N’ezie, ma n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ ma n’Ebe Ọdịda Anyanwụ, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ yiri ka ha na-ebi ndụ afọ ojuju na-abụghị ezie, na-adịghị enwe nchegbu banyere ịdị adị nke mmehie. Otú ọ dị, nke ahụ ọ̀ pụtara na mmehie adịghị adị? Ànyị pụrụ ileghara ya anya n’enweghị mmerụ ahụ? Ọ̀ dị mgbe mmehie ga-apụ n’anya?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya