Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 11/1 p. 27-31
  • Mgbe Ọ Dị Onye Kpọrọ Òkù, Ị̀ Na-aza?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe Ọ Dị Onye Kpọrọ Òkù, Ị̀ Na-aza?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Zara Òkù M n’Ikpeazụ
  • Ịrụ Ọrụ Ọsụ Ụzọ na Hawaii
  • Ịkpọ Òkù nke M Na-atụghị Anya Ya
  • Inye Uche Ọzụzụ Maka Ihe nke A Na-amaghị
  • Ịkpọrọ Ụmụ Anyị Na-eje Ozi Ala Ọzọ
  • Site n’Ebe Ugwu gaa n’Ebe Ndịda
  • Ọ̀ Bụ nke Na-enweghị Nsogbu?
  • Jehova Na-adọta Ndị Dị Umeala n’Obi n’Eziokwu Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • E Nnyere M Aka Ịkwụsị Ime Ihere
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Site n’Ofufe Eze Ukwu Gaa n’Ezi Ofufe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 11/1 p. 27-31

Mgbe Ọ Dị Onye Kpọrọ Òkù, Ị̀ Na-aza?

DỊ KA SHINICHI TOHARA SI KỌỌ

N’AKỤKỤ mbụ nke ndụ m, akpọkughị m Chineke, achọghịkwa m ntụziaka site n’aka ya. Nne na nna m ochie si Japan kwaga Hawaii, ndị mụrụ m bụkwa ndị okpukpe Buddha. Ha agbasighị ike n’okpukpe ha, ya mere echeghị m echiche nke ukwuu banyere Chineke ka m na-etolite.

Mgbe ahụ amụtara m banyere ozizi evolushọn wee chee echiche ihe nzuzu ọ bụ ikwere na Chineke. Otú ọ dị, ka agụmakwụkwọ m na-aga n’ihu, ihe ọmụmụ sayensị kụziiri m banyere ịgụ kpakpando, ihe ọmụmụ nke ike na ụmụ ihe na-adịghị ndụ, ihe ọmụmụ nke ihe ndị dị ndụ. N’abalị, ana m eleli anya n’igwe ma na-eche otú kpakpando ndị ahụ nile si bịa n’ebe ahụ. Otu olu dị n’ime m malitere ịjụ, sị: ‘Ọ̀ pụrụ ịbụ na e nwere Chineke nke na-achịkwa ihe ndị a nile?’ M mesịrị na-eche na a ghaghị inwe Onye nọ n’elu ebe ahụ. Obi m malitere ịkpọ òkù, sị, ‘Ònye bụ Chineke nke a?’

Mgbe m gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu, ahụrụ m na ohere anaghị adịrị m n’ihi ọrụ m dị ka onye na-arụzi ụgbọ ala n’ụlọ ọrụ na-emepụta ihe ọṅụṅụ sake, enweghịkwa m oge ịtụgharị uche n’ajụjụ banyere Chineke. N’oge na-adịghị anya ezutere m Masako, bụ́ onye ghọrọ nwunye m na 1937, e mesịakwa e ji ụmụ atọ gọzie anyị. Lee aha enyi nke na-ekwesị ntụkwasị obi na nne na-arụsi ọrụ ike Masako ghọworo!

Ugbu a m nwere ezinụlọ, echesiri m echiche ike banyere ọdịnihu anyị. Ọzọ, amalitere m ịpụ n’èzí wee na-ekiri kpakpando. Ekwenyesiri m ike na e nwere Chineke. Amaghị m onye Chineke ahụ bụ, ma amalitere m ịkpọku ya n’agbanyeghị nke ahụ. Ọtụtụ mgbe, arịọrọ m, sị: ‘Ọ bụrụ na ị nọ n’elu ebe ahụ, biko nyere ezinụlọ m aka ịchọta ụzọ isi na-eje ije n’obi ụtọ.’

A Zara Òkù M n’Ikpeazụ

Anyị na ndị mụrụ m anọwo na-ebi kemgbe anyị lụrụ di na nwunye, ma n’afọ 1941, anyị malitere ibi na nke onwe anyị na Hilo, Hawaii. Kpọmkwem mgbe anyị kwabatasịrị n’ebe obibi ọhụrụ anyị, ndị Japan wakwasịrị Pearl Harbor, na December 7, 1941. Ọ bụ oge ọgba aghara, onye ọ bụla chịkwa uche n’aka banyere ọdịnihu.

Otu ọnwa mgbe mwakwasị nke Pearl Harbor ahụ gasịrị, anọ m na-ehicha ụgbọ ala m mgbe otu nwoke bịakwutere m wee nye m otu akwụkwọ a kpọrọ Children. Ọ sịrị na aha ya bụ Ralph Garoutte, onye ozi nke Ndịàmà Jehova. Aghọtaghị m ihe ọ na-ekwu, ma enwere m mmasị na Chineke, ya mere m natara akwụkwọ ahụ. N’izu na-esonụ, Ralph laghachiri wee chee m ọmụmụ Bible ebe obibi n’ihu. Ọ bụ ezie na anụwo m banyere Bible, nke a bụ nke mbụ m hụrụ otu n’ezie. Anakweere m ọmụmụ Bible ahụ, nwunye m na nwanne ya nwanyị nke ọ tọrọ sonyekwara.

Eziokwu ahụ nke bụ na Bible bụ Okwu Chineke kpaliri mmasị m n’ezie. (2 Timoti 3:16, 17) Na Jehova nwere nzube bụ ihe dị ebube ọbụna karị. Ọ bụ Onye Okike m nọworo na-achọ! (Aịsaịa 45:18) Anyị nwere obi ụtọ ịmụta na a ga-eweghachi Paradaịs mbụ ahụ a tụfuworo kpọmkwem n’ebe a n’elu ala, anyị pụkwara ikere òkè na ya. (Mkpughe 21:1-4) Nke a bụ azịza nke òkù m kpọrọ Chineke!

Anyị gwara onye ọ bụla na mmadụ nile banyere eziokwu ọhụrụ ndị a anyị mụtara. Ndị mụrụ m chere na isi emebiela anyị, ma nke ahụ akụdaghị anyị aka. Mgbe ọnwa atọ nke ọmụmụ Bible siri ike gasịrị, n’April 19, 1942, e mere mụ na nwunye m baptism ná ngosipụta nke nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke anyị, bụ́ Jehova. E mekọta anyị na nwanne nwanyị Masako nke ọ tọrọ bụ́ Yoshi na di ya, bụ́ Jerry, onye sonyewooro anyị n’ọmụmụ Bible anyị n’oge ahụ, baptism. Anyị maara nanị ntakịrị ihe banyere Akwụkwọ Nsọ, ma nke ahụ zuru ezu ịkpali anyị inwe ọchịchọ ijere Chineke ozi.

Ebe agha ụwa nke abụọ ka kpụ ọkụ n’ọnụ, uche m gwara m na ọgwụgwụ usoro ihe nke a dị nnọọ nso, mụ na nwunye m hụkwara mkpa ọ dị ịdọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere nke a. Ezinụlọ Garoutte bụ ihe nlereanya anyị na nke a. Ma Ralph ma nwunye ya na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ, ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. Eji m ọnọdụ anyị tụnyere nke Ralph. O nwere nwunye na ụmụ anọ. Enwere m nwunye na nanị ụmụ atọ. Ọ bụrụ na ọ pụrụ ime ya, m ga-enwe ike imekwa ya. Ya mere mgbe o mere otu ọnwa e ji mee anyị baptism, anyị tinyere akwụkwọ maka ozi ọsụ ụzọ.

Ọbụna tupu a họpụta m dị ka onye ọsụ ụzọ, erere m ihe nile na-adịghị mkpa, gụnyere jịta ígwè m, ngwá egwú saxophone, na violin. Abụwo m onye egwú na-atọ ụtọ nke ukwuu, ma m wepụsịrị ihe egwú m nile e wezụga obere ọ̀jà bekee m. Ọzọkwa, ọrụ m na-arụ n’ụlọ ọrụ ahụ na-emepụta ihe ọṅụṅụ sake eyighịkwa ka ọ masịrị m. (Ndị Filipaị 3:8) Arụrụ m otu ụgbọ dị ka ụlọ nke a na-adọkpụ adọkpụ ma chere ịhụ ma Jehova ọ̀ ga-aza arịrịọ m ịbụ onye a ga-eji rụọ ọrụ. Echeghị m ruo ogologo oge. A họpụtara anyị dị ka ndị ọsụ ụzọ malite na June 1, 1942. Anyị banyere ozugbo n’ijere Jehova ozi oge nile, ọ dịbeghịkwa mgbe ọ bụla anyị kwara ụta n’ihi mkpebi ahụ.

Ịrụ Ọrụ Ọsụ Ụzọ na Hawaii

Site na anyị na ezinụlọ Garoutte ịrụkọ ọrụ ọnụ, anyị rụzuru Hawaii, agwaetiti Big Island, tinyere Kona, bụ́ ebe a ma ama maka imepụta kọfị, na Kau. N’ụbọchị ndị ahụ, anyị ji ígwè rekọd rụọ ọrụ. Ọ dị nnọọ arọ, ma anyị ka bụ ụmụ okorobịa, gbasiekwa ike. Ya mere, site n’ibu ígwè rekọd ahụ n’otu aka nakwa akpa jupụtara n’akwụkwọ n’aka nke ọzọ, anyị sooro ụzọ ọ bụla pụrụ iduje n’ebe ndị ga-aṅa ntị nọ n’ubi, na mbara ala kọfị ahụ, nakwa ebe ọ bụla ọzọ. Mgbe ahụ, mgbe anyị rụzuru agwaetiti ahụ dum, e kenyere anyị ọrụ ịga Kohala nke dị n’agwaetiti Big Island. Kohala bụ obere mbara ala ebe a na-akọpụta shugaken, nke ndị Caucasus, Philippines, China, Hawaii, Japan, na Portugal bijupụtara. Ìgwè nke ọ bụla nwere ọdịnala, echiche, mmasị, na okpukpe nke ya.

Ozugbo m malitere ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ, ọ dịghị mgbe m rụrụ ọrụ ego ọzọ. Ruo nwa oge, anyị ji ego m kpatara na-adị ndụ, mgbe ọ dịkwa mkpa, m na-eji ube gaa igbu azụ. N’ụzọ na-eju anya, ana m eji azụ alata n’ụlọ mgbe nile. Anyị na-akpata akwụkwọ nri n’ọhịa nakwa ihe ọkụkụ ndị na-esi ísì ụtọ na-eto n’akụkụ ụzọ, ihe ndị ahụ na-achọkwa efere anyị mma n’oge nri abalị. Emepụtara m ovun site na kom kom na-apụghị ịta nchara, Masako mụtakwara ka e si eme bredi. Ọ bụ bredi kasị mma nke m tatụworo mgbe ọ bụla.

Mgbe anyị gara Honolulu maka otu mgbakọ ndị Kraịst na 1943, Donald Haslett, onye bụ onye nlekọta alaka ụlọ ọrụ na Hawaii n’oge ahụ, kpọrọ anyị ịkwabata n’ebe ahụ ma biri n’otu obere ụlọ a rụrụ n’elu ụlọ a na-arụzi ụgbọ ala nke Watch Tower Society. E kenyere m ọrụ dị ka onye na-edebe ihe owuwu alaka ụlọ ọrụ ahụ ọcha, anọkwa m n’ebe ahụ rụọ ọrụ ọsụ ụzọ ruo afọ ise na-esonụ.

Ịkpọ Òkù nke M Na-atụghị Anya Ya

Na 1943, anyị nụrụ na Society amalitewo otu ụlọ akwụkwọ iji nye ndị ozi ala ọzọ ọzụzụ maka ije ozi ná mba ọzọ. Lee otú anyị si nwee mmasị ije! Otú ọ dị, a dịghị akpọ ezinụlọ ndị nwere ụmụ, ya mere anyị echeghị echiche ya ọzọ. Otú ọ dị, na 1947, Nwanna Haslett gwara anyị na Society chọrọ ịma ma e nwere ndị Hawaii ọ bụla dị njikere ịnakwere ije ozi ala ọzọ na Japan. Ọ jụrụ anyị ihe anyị chere, dịkwa ka Aịsaịa, asịrị m: “Ziga m.” (Aịsaịa 6:8) Otu ihe ahụ bụkwa mmetụta nwunye m. Anyị egbughị oge ọ bụla n’ịza òkù Jehova.

Ya mere a kpọrọ anyị òkù ịbịa ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead ịbụ ndị e nyere ọzụzụ dị ka ndị ozi ala ọzọ. Ịkpọ òkù ahụ gụnyere ụmụ anyị atọ na-eto eto. A kpọkwara mmadụ ise ndị ọzọ, Donald na Mabel Haslett, Jerry na Yoshi Toma, na Elsie Tanigawa, dịkwa ka otu ìgwè anyị gawara New York n’oge oyi nke afọ 1948.

Anyị ji bọs gafee kọntinent anyị. Mgbe ụbọchị atọ nke anyị ji nọrọ na bọs gasịrị, ike gwụrụ anyị nile, Nwanna Haslett tụkwara aro ka anyị kwụsịtụ ma rahụ n’otu ụlọ oriri. Mgbe anyị pụtara na bọs ahụ, otu nwoke bịakwutere anyị wee tie mkpu, sị: “Ndị Jap! Ka m ruo ụlọ gaa bute égbè m ga-agba ha!”

“Ha abụghị ndị Japan,” ka Nwanna Haslett kwuru. “Ha bụ ndị Hawaii. Ị́ hụghị ihe dị iche?” Ihe ahụ o kwuru ozugbo zọpụtara anyị.

Ànyị so n’ezie na klasị nke 11 nke Gilead? O yiri ịrọ nrọ mara mma. Otú ọ dị, ọ pụtara ìhè n’oge na-adịghị anya na nke ahụ bụ eziokwu. Na klasị anyị, 25 ụmụ akwụkwọ abụrụwo ndị onye isi oche nke Watch Tower Society n’oge ahụ, bụ́ Nathan H. Knorr, họtara ịbụ ndị e nyere ọzụzụ maka ije ozi ala ọzọ na Japan. Ebe ọ bụ na m sitere Japan, na-asụkwa asụsụ Japanese, e kenyere m ọrụ ịkụziri ìgwè ụmụ akwụkwọ nke a asụsụ ahụ. Ebe ọ bụ na m amachaghị asụsụ ahụ nke ọma, nke a adịghị mfe; ma n’otu ụzọ, anyị nile mere nke ọma!

N’oge ahụ, nwa anyị nwoke, bụ́ Loy, dị afọ iri, ụmụ anyị ndị nwanyị, bụ́ Thelma na Sally, dị afọ asatọ na afọ isii. Mgbe anyị nọ n’ụlọ akwụkwọ, gịnị ka ha mere? Ha onwe ha gakwara akwụkwọ! Otu bọs na-eburu ha n’ụtụtụ ma na-ebulata ha ma e mesịa n’oge ehihie. Mgbe ụmụ anyị si ụlọ akwụkwọ lọta, Loy na-esoro ụmụnna ndị na-arụ n’ebe Society na-emepụta ihe oriri na-arụ ọrụ, Thelma na Sally rụkwara ọrụ n’ebe a na-asa ákwá, na-apịachi hankachif.

Inye Uche Ọzụzụ Maka Ihe nke A Na-amaghị

Mgbe anyị gụsịrị akwụkwọ na Gilead n’August 1, 1948, ọ gụsiri anyị agụụ ike ije n’ebe e kenyere anyị ọrụ. Nwanna Haslett bu anyị ụzọ laa ije chọta ebe ndị ozi ala ọzọ ga-ebi. N’ikpeazụ, ọ chọtara otu ụlọ elu dị okpukpu abụọ na Tokyo, n’August 20, 1949, ezinụlọ anyị gawara n’ebe ga-abụ ebe obibi anyị n’ọdịnihu.

Tupu anyị erute na Japan, echewo m echiche ọtụtụ mgbe banyere ala nke a nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Atụlere m iguzosi ike n’ihe nke ndị Japan nye ndị nwe ha bụ́ mmadụ nakwa onye ọchịchị alaeze ukwu ha. Ọtụtụ ndị Japan tụfuru ndụ ha maka ndị ọchịchị a bụ́ mmadụ. N’oge agha ụwa nke abụọ, ndị kamikaze na-anya ụgbọ elu nwụrụ maka onye ọchịchị alaeze ukwu ha site n’iji ụgbọ agha elu ha gaa kpọkasịa ebe anwụrụ ọkụ nke ụgbọ agha mmiri ndị iro si apụ. Echetara m na ọ dị mgbe m chere echiche na ọ bụrụ na ndị Japan na-ekwesị ntụkwasị obi otú ahụ nye ndị nwe ha bụ́ mmadụ, gịnị ka ha ga-eme ma ọ bụrụ na ha achọta ezi Onyenwenụ, bụ́ Jehova?

Mgbe anyị bịarutere na Japan, e nwere nanị ndị ozi ala ọzọ asaa na ndị nkwusa ole na ole n’ala ahụ dum. Anyị nile malitere ịrụ ọrụ, emekwara m mgbalị ịmụtakwu asụsụ ahụ nke ọma, enwekwara m ike ịmalitere ọtụtụ ndị ọmụmụ Bible, bụ́ ndị na-akpọku Chineke n’ime obi ha. Ọtụtụ n’ime ndị mmụta Bible oge gboo ahụ anọgidewo na-ekwesị ntụkwasị obi kpọmkwem ruo n’oge a.

Ịkpọrọ Ụmụ Anyị Na-eje Ozi Ala Ọzọ

Olee ụzọ anyị pụrụ isi kpọrọ obere ụmụaka atọ a ga-elekọta anya nọgide n’ozi ala ọzọ? Leenụ, Jehova bụ onye nyere ike iji mee nke ahụ. Anyị natara obere ego mmachi akpa site n’aka Society, Masako kwakwaara ụmụ anyị ákwà. Tụkwasị na nke ahụ, anyị nwetara enyemaka ụfọdụ site n’aka ndị mụrụ m.

Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ na kọleji ndị obere, Loy jere ozi n’alaka ụlọ ọrụ Japan nke Watch Tower Bible and Tract Society ruo nwa oge. Otú ọ dị, n’ihi nsogbu ahụ ike, o kpebiri ịlaghachi Hawaii maka ọgwụgwọ. Ya na nwunye ya ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ugbu a na California. Alụmdi na nwunye ya nwetaara anyị ngọzi nke inwe ụmụ ụmụ anọ na-ekwesị ntụkwasị obi. E mewo ha nile baptism, otu, ya na nwunye ya, na-eje ozi na Brooklyn Betel, bụ́ isi ụlọ ọrụ ụwa nke Ndịàmà Jehova.

Ụmụ m ndị nwanyị, Thelma na Sally, abụwo ndị e mere ndị ozi ala ọzọ mgbe ha tolitere. Thelma na-eje ozi ugbu dị ka onye ozi ala ọzọ n’obodo Toyama. Sally lụrụ otu nwanna nwoke bụ́ onye ozi ala ọzọ, bụ́ Ron Trost, ha anọwokwa na-eje ozi na Japan dị ka ndị ozi ala ọzọ nọ n’ọrụ njegharị ruo ihe karịrị 25 afọ.

Site n’Ebe Ugwu gaa n’Ebe Ndịda

Mgbe anyị nọsịrị afọ abụọ na Tokyo, e zigara anyị n’Osaka ruo afọ abụọ. Ọrụ ọzọ e kenyere anyị kpọgara anyị n’ebe ugwu gaa Sendai, bụ́ ebe anyị jere ozi ruo afọ isii. Afọ ndị ahụ anyị nọrọ na Sendai nyere anyị ọzụzụ maka ịrụ ọrụ n’agwaetiti dị n’ime ime ebe ugwu Japan, bụ́ Hokkaido. Ọ bụ na Hokkaido ka e mere ụmụ anyị nwanyị ndị ozi ala ọzọ. Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka ọ maara anyị ahụ ịnọ n’ebe oyi na-atụ bụ́ nke na-ajụ oké oyi mgbe ụfọdụ. Isi na Hawaii ahụ nwere okpomọkụ bịa n’ebe a bụ nnọọ ihe dị iche!

Mgbe ahụ, n’otu ụbọchị, anụrụ m òkù ọhụrụ n’ụdị nke akwụkwọ ozi sitere n’aka Society. Ọ gwara m ka m mepee alaka ụlọ ọrụ n’Okinawa, nke ka dị n’okpuru nlekọta nke U.S. Isi n’ebe ime ime ugwu ahụ na-atụ oyi nke Japan kwaga n’ebe ghọworo ugbu a ebe ime ime ndịda nke mpaghara Japan ga-abụ oké ihe ịma aka. Gịnị ka m ga-eme? Ọ bụ ezie na m nwere mmetụta nke erughị eru, n’ịbụ onye nwunye m na-ekwesị ntụkwasị obi sonyeere dị ka ọ na-emebu, abịarutere m n’Okinawa na November 1965. Ndụ n’Okinawa ọ̀ ga-abụ otu ihe ahụ dị ka ndụ anyị biri na Japan? Gịnị banyere ọdịnala ha? Ndị mmadụ hà ga-azaghachi n’ozi nzọpụta nke Jehova?

Mgbe anyị bịarutere, e nwere ihe na-erughị 200 ndị nkwusa n’Okinawa. Ugbu a e nwere ihe karịrị 2,000. N’oge mmalite ahụ, abụ m onye nlekọta sekit nwa oge na onye nlekọta alaka ụlọ ọrụ nwa oge. Ime njegharị na gburugburu agwaetiti ndị ahụ nile nyeere m aka iwulite mmekọrịta chiri anya n’ebe ụmụnna ahụ nọ, ana m agụkwa ya n’ihe ùgwù ijeworo ha ozi.

Ọ̀ Bụ nke Na-enweghị Nsogbu?

Ọrụ ije ozi ala ọzọ anyị abụghị nke na-enweghị nsogbu ma ọlị. Mgbe anyị nọ ezumike na United States na 1968, Masako rịawara ọrịa, a wawokwa ya ahụ. E wepụrụ ya otu ọkpụrụkpụ ihe toro ya n’eriri afọ, mgbe ahụ ọ gbakere ngwa ngwa. Anyị enweghị ego ịnshọransị ahụ ike ọ bụla, obi koro anyi n’elu na ma eleghị anya anyị agaghị enwe ike ịlaghachi n’ebe e kenyere anyị ọrụ. Otú ọ dị, n’ịbụrụ anyị ihe ijuanya, ụmụnna anyị n’okwukwe hụrụ maka ihe nile.

N’ihe banyere mụ onwe m, enwere m nsogbu nke ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa shuga na-enwe. Ọ bụ ezie na ekpughị m ìsì, ọhụhụ ụzọ m adịwo njọ nke ukwuu. Ma site n’ịhụnanya obi ebere Jehova, ana m enwe ike iri nri ime mmụọ na-edozi ahụ n’ụzọ chiri anya site n’igere Ụlọ Nche na Teta! ndị a gụnyere na tepu. Ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwanyị n’okwukwe na-enyekwa aka site n’ịgụpụtara m isiokwu dị iche iche.

Olee otú m pụrụ isi nọgide na-ekwu okwu ihu ọha ebe m na-adịghị ahụcha ụzọ nke ọma? Na mbụ, m na-agụnye okwu m na tepu, werekwa ígwè okwu kpọọ ha ka m na-emegharị ọnụ na aka. Otú ọ dị, site n’aro nke nwa m nwanyị tụrụ, emeziwanyere m nke a. Ugbu a, ana m agụnye okwu n’otu obere tepu ma na-ekwu ha site n’iji fon a na-akwụnye ná ntị na-egere okwu m buworo ụzọ gụnye na tepu.

Mgbe ọ bụla anyị chere ezi nsogbu ihu, ọ dịghị mgbe anyị na-ahapụ ịkpọku Jehova. E mesịa, ngọzi ndị na-esite n’aka Jehova ịgwọta nsogbu ahụ na-eyi ihe dị ukwuu karịa ka nsogbu ndị ahụ n’onwe ha yiri ka hà bụ. Ịnọgide n’ozi ya bụ nanị ụzọ isi gosi obi ekele anyị.

Mgbe anyị nọsịrị 23 afọ n’Okinawa, e kenyere anyị ọrụ ọzọ n’otu ebe ahụ anyị jeworo ozi na ya mgbe mbụ anyị zọrọ ụkwụ na Japan. Isi ụlọ ọrụ Society na ebe obibi ya kasị ibu nke ndị ozi ala ọzọ dị n’ebe mbụ e nwere ụlọ elu ahụ dị okpukpu abụọ na Tokyo, nke Nwanna Haslett zụtara n’ọtụtụ afọ gara aga.

E wezụga mụ na Masako, 11 n’ime ndị ikwu anyị na-eje ozi ugbu a dị ka ndị ozi ala ọzọ na Japan. Ha nile na-ewere ya dị ka oké ihe ùgwù ịbụ ndị hụworo mmụba nke Jehova wetaworo n’ala nke a nke jupụtara n’ọdịnala nile nke okpukpe Buddha na Shinto. Ọrụ a rụrụ na Japan malitere n’ụzọ dị nta, ma ike Jehova amụpụtawo “mba” nke ihe karịrị 167,000 ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ.—Aịsaịa 60:22.

Mgbe m kpọkuru Chineke, ọ zara m. Mgbe ọ kpọrọ m òkù, azara m n’ụzọ ziri ezi. Mụ na nwunye m na-eche na anyị emewo nanị ihe anyị kwesịrị imeworị. Olee banyere gị? Mgbe Onye Okike gị na-akpọ òkù, ị̀ na-aza?

[Foto dị na peeji nke 28]

Ezinụlọ Tohara na ụfọdụ n’ìgwè ndị ọrụ ọsụ ụzọ ha na Hawaii, 1942

[Foto dị na peeji nke 29]

Ụmụ Tohara na Gilead n’afọ 1948

[Foto dị na peeji nke 31]

N’inwe obi ụtọ na ha zara òkù ahụ, Shinichi na Masako Tohara anọzuwo 43 afọ n’ozi ala ọzọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya